Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE ỌGỌST 2014

 ṄOMIE OKWUKWE HA | JOSEF

“Biko, Geenụ Ntị ná Nrọ A”

“Biko, Geenụ Ntị ná Nrọ A”

JOSEF lere anya n’azụ, ya adị ya ka ọ̀ bụ ya hapụ ndị kpọ ya rie mbọ mbọ. Ma, ha agateela aka. Ebe ya na ezinụlọ nna ya bi na Hibrọn dịzi ezigbo anya. Ọ ga-abụ na nna ya Jekọb na-ezu ike ugbu a chi jiwerela. Ọ madịghị ihe mere nwa ya nwoke a ọ kacha hụ n’anya. Josef enweghị ike ịgakwuru nna ya ugbu a. Ọ ma na e nwere ike ọ gaghị ahụ nna ya ọzọ. Ka Josef na ndị ahịa ahụ kpọ ya nọ na-aga n’okporo ụzọ ahụ ndị mmadụ na-esikarị aga ebe ndịda, ọ na-abụ ha gatụ, ha elee Josef anya ma duziekwa kamel ha. Ọ bụ ha nwe Josef ugbu a, ha agaghịkwa achọ ka ihe ọ bụla mee ka ha chọọ ya achọ n’ihi na ha weere ya ka ngwá ahịa dị oké ọnụ otú ha si were mmanụ na ihe ndị na-esi ìsì ụtọ ha bu, bụ́ ndị ha ga-erete ezigbo ego n’Ijipt.

Ọ ga-abụ na Josef akarịbeghị afọ iri na asaa mgbe ahụ. Weregodị ya na ị na-ahụ ka ọ tachitụrụ anya lee anya n’ebe ọdịda anyanwụ, na-eche otú ụwa ya si ghasasịa. N’oge ahụ, anyanwụ adawala. Ọ dịzi ka anyanwụ ò guzo n’akụkụ Oké Osimiri Mediterenian. O siiri ya ike ikweta na ọ fọrọ obere ka ụmụnne ya gbuo ya, ma ha emechazie ree ya ka ọ ghọọ ohu. Ọ ga-abụkwa na o jidelighị onwe ya, ya ebewe ákwá. Ọ maghị otú ihe ga-emecha dịrị ya.

N’agbanyeghị na e ji Josef eji, ọ kwụsịghị inwe okwukwe

Olee otú Josef si baa n’ụdị nsogbu a? Oleekwa ihe okwukwe nwata nwoke a ụmụnne ya megburu emegbu ma kpọọ asị na-akụziri anyị?

EZINỤLỌ EBE ỤMỤ NWAANYỊ ANỌ MỤỤRỤ OTU NWOKE ỤMỤ

A mụrụ Josef n’ezinụlọ buru ibu. Ma, ha anaghị enwecha obi ụtọ, udo anaghị adịkarịkwa n’ụlọ ha. Ihe Baịbụl kọọrọ anyị gbasara ezinụlọ Jekọb gosiri na nwoke ịlụ ihe karịrị otu nwaanyị na-akpata nsogbu n’ezinụlọ. N’oge ochie, ọtụtụ ndị na-alụ ụmụ nwaanyị abụọ ma ọ bụ karịa. Chineke gbara ndị na-efe ya nkịtị ka ha na-eme otú ahụ ruo mgbe Ọkpara ya mere ka o doo onye ọ bụla anya na kemgbe ụwa Chineke chọrọ ka nwoke na-alụ naanị otu nwaanyị. (Matiu 19:4-6) Jekọb mụrụ ụmụ nwoke iri na abụọ na ụmụ nwaanyị abụọ, ma ọ dịkarịa ala. Ọ bụ ụmụ nwaanyị anọ mụụrụ ya ụmụ ndị ahụ. Abụọ n’ime ha bụ ndị nwunye ya. Onye nke mbụ bụ Lia, onye nke abụọ abụrụ Rechel, onye Lia tọrọ. Abụọ ndị nke ọzọ bụ ụmụ nwaanyị na-ejere Lia na Rechel ozi. Aha ha bụ Zilpa na Bilha. Onye Jekọb hụrụ n’anya bụ ọmarịcha nwunye ya Rechel. O nweghị mgbe ọ hụrụ Lia n’anya otú ọ hụrụ Rechel. Ma, e ji aghụghọ mee ka ọ lụwa Lia. O nweghị mgbe Lia  na Rechel na-anaghị amarịta aka. Aka ahụ ha na-amarịta mekwara ka ụmụ ha mewere ibe ha anyaụfụ.—Jenesis 29:16-35; 30:1, 8, 19, 20; 37:35.

Rechel nọrọ ọtụtụ afọ n’amụtaghị nwa. Mgbe o mechara mụta Josef n’oge Jekọb mere agadi, Jekọb weere Josef ka nwata pụrụ iche. Dị ka ihe atụ, mgbe Isọ nwanne Jekọb nọ n’ụzọ na-abịa ịhụ Jekọb na ezinụlọ ya, Jekọb chị obi n’aka n’ihi na e nwere mgbe Isọ chọrọ igbu ya. Jekọb dowere Rechel na Josef nwa ya n’azụ azụ, n’ebe ọ ga-akacha adịrị ha mfe ịgbalaga ma Isọ chọọ igbu ha. Josef dị obere mgbe ahụ. Ma, ọ ga-abụ na o chefughị ihe ahụ nna ya mere. Chegodị otú obi dị ya n’ụtụtụ ụbọchị ahụ mgbe ọ nọ na-ele nna ya merela agadi anya, na-eche ihe mere o jizi ete ụkwụ n’agbanyeghị na ahụ́ ka gbasiri ya ike. Ọ ga-abụ na ọ tụrụ ya n’anya mgbe ọ matara ihe kpatara ya, ya bụ, na nna ya na otu mmụọ ozi dị ike gbara mgba n’abalị ụnyaahụ ya. Gịnị mekwaranụ ya na mmụọ ozi ji gbaa mgba? Ọ bụ maka na Jekọb chọrọ ka Jehova Chineke gọzie ya. A gọziri Jekọb. Otú e si gọzie ya bụ na a gụgharịrị ya aha, ya azawazie Izrel. A ga-enwe otu mba ga na-aza aha ya. (Jenesis 32:22-31) Josef mechara mata na ọ bụ ụmụ ndị nwoke Izrel mụrụ ga-amụta ebo dị iche iche a ga-enwe ná mba ahụ.

Ka oge na-aga, nsogbu bịaara Josef. Onye ọ kacha hụ n’anya, bụ́ nne ya, nwụnahụrụ ya mgbe ọ na-amụ nwanne ya nwoke nke nta aha ya bụ Benjamin. Nna ya ruru uju ọnwụ ya. Weregodị ya na ị na-ahụ Jekọb ka o ji nwayọọ na-ehicha Josef anya mmiri ákwá ma na-agwa ya ihe ga-akasi ya obi, bụkwanụ ihe kasiri nna nna yanwa aha ya bụ Ebreham obi. Ọ ga-abụrịrị na obi jụụrụ Josef mgbe ọ nụrụ na otu ụbọchị, Jehova ga-akpọlite nne ya n’ọnwụ. O nwere ike ịbụ na Josef bịara hụkwuo Jehova bụ́ “Chineke nke ndị . . . dị ndụ” n’anya n’ihi ihe ọma ọ na-emere ụmụ mmadụ. (Luk 20:38; Ndị Hibru 11:17-19) Mgbe Rechel nwụchara, Jekọb ejighị ụmụ nwoke abụọ ọ mụtaara ya egwu egwu.—Jenesis 35:18-20; 37:3; 44:27-29.

E nwere ụmụaka ọ ga-abụ a hụ ha n’anya otú ahụ, ha adaa iberiibe. Ma, Josef mụtara àgwà ọma n’aka nne na nna ya. Ọ bịara nwee okwukwe siri ike na Jehova, marakwa ihe dị mma na ihe na-adịghị mma. Mgbe Josef dị afọ iri na asaa, o so ụmụnne ya ndị tọrọ ya na-azụ atụrụ. Ọ nọ na-enyere ụfọdụ n’ime ha aka. N’oge ahụ, ọ hụrụ ihe ọjọọ ha mere. Ọ̀ dị Josef ka ya mechie ọnụ ka ha kpọọ ya ezigbo mmadụ? Otú ọ bụla ọ dị ya, ihe anyị ma bụ na o mere ihe ziri ezi. Ọ kọọrọ nna ya ihe ọjọọ ahụ ha mere. (Jenesis 37:2) O nwere ike ịbụ na ihe a Josef katara obi mee mere ka obi sikwuo Jekọb ike na nwata a ọ hụrụ n’anya bụ ezigbo nwa. Ndị Kraịst na-eto eto kwesịrị ịmụta ihe n’ihe a Josef mere. Ọ bụrụ na e nwee mgbe ọ dị ha ka hà kpuchie mmehie dị oké njọ onye ọzọ mere, ha kwesịrị ime ka Josef, ọ bụrụgodị na ọ bụ nwanne ha ma ọ bụ enyi ha mere mmehie ahụ. Ha kwesịrị ịhụ na e mere ka ndị ga-enyere onye ahụ mehierenụ aka mara gbasara mmehie ahụ.—Levitikọs 5:1.

 Ihe mere n’ezinụlọ Jekọb na-akụziri anyị ihe. Ọ bụ eziokwu na nwoke ọ bụla bụ́ Onye Kraịst taa na-alụ naanị otu nwaanyị, ma n’ụfọdụ ezinụlọ Ndị Kraịst, ọ bụghị di na nwunye nwe ụlọ mụrụ ụmụ niile ha na ha bi. E nwere ụmụaka ọ bụ naanị nwoke nwe ụlọ ma ọ bụ nwunye ya mụrụ tupu ha alụọ. Ihe anyị niile nwere ike ịmụta bụ na nne ma ọ bụ nna ịna-emelara otu n’ime ụmụ ya ihe mgbe niile na-eme ka udo ghara ịdị n’ezinụlọ. Ndị nne na nna ma ihe na-eme ihe niile ha nwere ike ime ka o doo ụmụ nke ha nakwa ndị nke ọ na-abụghị ha mụrụ anya na ha hụrụ onye nke ọ bụla n’ime ha n’anya. Ha na-emekwa ka nwata nke ọ bụla mara na Chineke nyere ya onyinye pụrụ iche nakwa na o nwere ike iso mee ka ezinụlọ ha na-enwe obi ụtọ.—Ndị Rom 2:11.

ANYAỤFỤ KPATARA NSOGBU N’EZINỤLỌ JEKỌB

Jekọb hụrụ Josef n’anya n’ihi na ọ na-eme ezi omume, bụrụkwa onye e kwesịrị ịtụkwasị obi

Jekọb kwaara Josef uwe mwụda pụrụ iche. O nwere ike ịbụ na ihe mere o ji kwaa ya bụ na Josef katara obi na-eme ihe dị mma. (Jenesis 37:3) Ọ ga-abụ na uwe ahụ bụ uwe mara ezigbo mma nke nwere aka ogologo ma gbadaa Josef agbada. O nwere ike ịbụ ụdị uwe ndị ukwu ma ọ bụ ụmụ ndị eze na-eyi.

O nweghị ihe ọjọọ Jekọb bu n’obi kwaara Josef uwe ahụ. Ọ ga-abụkwa na ihe a o meere Josef maka na ọ hụrụ Josef n’anya ma jiri ya kpọrọ ihe dị Josef mma. Ma, uwe ahụ ga-akpatara Josef ezigbo nsogbu. Cheta na Josef na-azụ atụrụ. Ọrụ ịzụ atụrụ adịghị mfe. Weregodị ya na ị na-ahụ Josef ka o yi uwe ahụ yiri nke ụmụ ndị eze na-aga n’ebe e nwere ahịhịa ndị toro eto, na-arị ugwu ma ọ bụ na-agbalị ka o kupụta nwa atụrụ furu efu nke osisi ogwu kogidere. Nke ka njọ bụ otú ụmụnne ya ndị nwoke ga-esizi na-emeso ya.

Baịbụl sịrị: “Mgbe ụmụnne ya hụrụ na nna ha hụrụ ya n’anya karịa ụmụnne ya niile, ha malitere ịkpọ ya asị, ha enweghịkwa ike iji obiọma na-agwa ya okwu.” * (Jenesis 37:4) N’eziokwu, ụdị ihe a nwere ike ime ka mmadụ mewere ibe ya anyaụfụ, ma ụmụnne Josef kpaziri àgwà ka ndị na-amaghị ihe n’ihi na ha hapụrụ ka ekworo gbaa mgbọrọgwụ n’obi ha. (Ilu 14:30; 27:4) Ò nwetụla mgbe ọsụkọsụ sụrụ gị maka na a na-akwanyere onye ọzọ ùgwù ị chọrọ ka a na-akwanyere gị? Cheta ụmụnne Josef. Anyaụfụ mere ka ha mee ihe ha ga-emecha kwaara mmakwaara. Ihe ha mere na-akụziri Ndị Kraịst na ọ ka mma iso “ndị na-aṅụrị ọṅụ ṅụrịa ọṅụ.”—Ndị Rom 12:15.

Ọ ga-abụrịrị na Josef ghọtara na ụmụnne ya na-ewere ya iwe. Ma nke a ò mere ka ọ ghara iyi uwe ọma ahụ mgbe ya na ụmụnne ya nọ? O nwere ike ịbụ na ọ na-adị ya ka ya mee otú ahụ. Ma, cheta na ihe mere Jekọb ji kwaara ya uwe ahụ bụ ka o gosi na ya hụrụ Josef n’anya. Josef chọrọ ime nna ya obi ụtọ, n’ihi ya, ọ kwụsịghị iyi uwe ahụ. Ihe a Josef mere baara anyị uru. Ọ bụ eziokwu na Nna anyị nke eluigwe anaghị akpa ókè, ma mgbe ụfọdụ, ọ na-emere ndị ohu ya ihe pụrụ iche. Ọ chọkwara ka àgwà ndị  na-efe ya na-akpa dịrị iche n’àgwà ọjọọ ndị mmadụ na-akpa taa. Otú ahụ uwe Josef si pụọ iche bụkwa otú àgwà ezigbo Ndị Kraịst si dị iche na nke ndị ọzọ. Nke a na-eme mgbe ụfọdụ ka ndị mmadụ mewere ha anyaụfụ ma tụọ ha iro. (1 Pita 4:4) Ma, Onye Kraịst ò kwesịrị ime ka ndị mmadụ ghara ịma na ọ na-efe Chineke? Mba. Onye Kraịst ekwesịghị ime otú ahụ ebe ọ bụ na Josef ezoghị uwe ya ka ụmụnne ya ghara ịhụ ya.—Luk 11:33.

NRỌ ABỤỌ JOSEF RỌRỌ

Mgbe obere oge gachara, Josef rọrọ nrọ abụọ pụrụ iche. Ná nrọ nke mbụ, Josef hụrụ ebe ya na ụmụnne ya nọ na-eke okporo ọka n’ùkwù n’ùkwù. Ma, ka ùkwù ọka ya guzo kwem, ùkwù ọka ụmụnne ya gbara ya gburugburu ma kpọọrọ ya isiala. Ná nrọ nke abụọ Josef rọrọ, ọ hụrụ ebe anyanwụ na ọnwa na kpakpando iri na otu nọ na-akpọrọ ya isiala. (Jenesis 37:6, 7, 9) Olee ihe Josef ga-eme gbasara nrọ abụọ a pụrụ iche ọ rọrọ?

Ọ bụ Jehova Chineke mere ka Josef rọọ nrọ ndị ahụ. Nrọ abụọ ahụ na-egosi ihe ga-eme n’ọdịnihu. Chineke chọkwara ka Josef kọọrọ ndị ọzọ nrọ abụọ ahụ. E nwere ike ikwu na ihe a Josef ga-eme yiri ihe ndị amụma Chineke ga-emecha mee, ya bụ, izi ndị Chineke, bụ́ ndị na-enupụrụ Chineke isi, ozi o ziri ha nakwa ime ka ha mara ikpe ọ mara ha.

Josef medara obi gwa ụmụnne ya, sị: “Biko, geenụ ntị ná nrọ a m rọrọ.” Ụmụnne ya ghọtara ihe nrọ ahụ pụtara. Ma, ọ dịtụdịghị ha mma. Ha gwara ya, sị: “Ị̀ ga-abụnụ eze anyị? ka ị̀ ga-achịnụ anyị?” Baịbụl sịrị: “Ha wee hụ ihe ọhụrụ mere ha ga-eji kpọ ya asị, n’ihi nrọ ndị ọ rọrọ nakwa n’ihi ihe ndị o kwuru.” Mgbe Josef kọọrọ nna ya na ụmụnne ya nrọ nke abụọ ọ rọrọ, ihe a gwara ya adịkwaghị mma. Baịbụl sịrị: “Nna ya wee bawara ya mba wee sị ya: ‘Gịnị ka nrọ a ị rọrọ pụtara? Mụ onwe m na nne gị na ụmụnne gị ànyị ga-akpọrọ gị isiala?’” Ma Jekọb buuru okwu ahụ n’obi, na-echebara ya echiche. O nwere ike ịbụ na ọ nọ na-eche ma ọ̀ ga-abụ na Jehova ji nrọ ahụ na-agwa Josef okwu.—Jenesis 37:6, 8, 10, 11.

Josef abụghị onye mbụ nke o ji abụ onye ikpeazụ na-efe Jehova a gwara ka o kwuo ihe ga-eme n’ọdịnihu nke na-agaghị adị ndị mmadụ mma ma ọ bụ nke ga-eme ka a kpagbuo ya. Ọ bụ Jizọs bụ ohu Jehova a kacha kpagbuo nke kwuru ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu. Ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ọ bụrụ na ha akpagbuwo m, ha ga-akpagbukwa unu.” (Jọn 15:20) E nwere ọtụtụ ihe okwukwe na obi ike Josef nwere na-akụziri Ndị Kraịst niile, ma ndị toro eto ma ụmụaka.

ỊKPỌASỊ MERE KA ỤMỤNNE JOSEF MEE IHE JỌGBURU ONWE YA

Mgbe obere oge gachara, Jekọb dunyere Josef ka ọ gaa leta ụmụnne ya ndị nke tọrọ ya n’ebe ha na-azụ atụrụ n’ebe ugwu. Ebe ahụ dị nso na Shikem. O tebeghị aka ha nọ na Shikem kpaa arụ nke mere ka ndị mmadụ kpọọ ha asị. Ọ ga-abụ ihe ahụ mere na Shikem mere Jekọb ji chọọ ịma otú ụmụ ya mere. N’ihi ya, o dunyere Josef ka ọ gaa mara otú ha mere. Olee otú i chere obi dị Josef mgbe e dunyere ya ozi a? Ọ ma na ụmụnne ya akpọkwuola ya asị. Obi ọ̀ ga-adị ha mma ma ha hụ na ọ bụ ya ka nna ha dunyere ka ọ bịa mata otú ha mere? N’agbanyeghị nsogbu dị na ya, o rubeere nna ya isi ma gawa.—Jenesis 34:25-30; 37:12-14.

Josef gara ije ihe dị ka ụbọchị anọ ma ọ bụ ise tupu ya eruo ebe ụmụnne ya nọ. Ihe kpatara ya bụ na Shikem dị ihe dị ka kilomita iri asatọ ma e si Hibrọn gbagowe ya. Ihe ọzọ bụ na mgbe o ruru Shikem, ọ nụrụ na ụmụnne ya agaala Dotan. Dotan dịkwanụ kilomita iri abụọ na abụọ ma e si Shikem gawa ya. Mgbe Josef rutewere Dotan, ụmụnne ya nọ ebe dị anya hụ ya. Ozugbo ha hụrụ ya, iwe juru ha obi. Baịbụl sịrị: “Ha wee gwa ibe ha, sị: ‘Lee! Ọrọ nrọ abịawala. Bịanụ ka anyị gbuo ya ma tụba ya n’otu olulu mmiri; anyị ga-asịkwa na ajọ anụ ọhịa eriwo ya. Ka anyị hụzie otú nrọ ya ga-esi mezuo.’” Ma, Ruben gwara ha ka ha ghara igbu ya, kama ka ha tụba ya n’olulu. Ruben bu n’obi na e mechaa, ọ ga-akpọpụta Josef n’olulu ahụ.—Jenesis 37:19-22.

Josef amadịghị ihe na-aga. Ọ ga-abụ na ọ tụrụ anya na ha ga-anabata ya nke ọma. Ma, ụmụnne ya jidere ya, yipụ ya uwe ọma ya ahụ n’ike ma dọrọ ya gaa n’otu olulu mmiri mmiri na-adịghị ma kwaba ya n’ime ya. Ahụ́ nwụrụ Josef. Ma mgbe o nwetere onwe ya, o jisiri ike guzoro ọtọ. Ma, o nweghị otú ọ ga-esi apụta n’olulu ahụ n’onwe ya. Naanị ihe ọ na-ahụ bụ eluigwe. Ọ na-anụzi olu ụmụnne ya obere obere. Ọ kpọsiri ha òkù ike, na-arịọ ha,  ma ha gbara ya nkịtị. Ihe ha mere Josef emetụdịghị ha n’obi. Ha nọdụrụ ala n’ebe dị nso n’olulu mmiri ahụ rie ihe oriri. Mgbe Ruben pụrụ, ha kwukwara ọzọ ka ha gbuo Josef. Ma, Juda gwara ha egbula ya, kama ka ha resị ya ndị ahịa si n’ebe ahụ na-agafe. Dotan dị nso n’ụzọ ndị ahịa si aga Ijipt. Obere oge, ndị Ishmel na ndị Midian na-eme njem gafewara. Tupu Ruben alọta, ha ereela Josef nara ego ya tinye n’akpa. Ha rere ya shekel iri abụọ, ya aghọọ ohu. *Jenesis 37:23-28; 42:21.

Josef anaghị ekwenyere ihe ọjọọ, ma ụmụnne ya kpọrọ ya asị

Ka anyị laghachizie n’ihe anyị kọrọ ná mmalite isiokwu a. Mgbe e du Josef na-agbada Ijipt, ọ dị ka à ga-asị na ihe niile efunahụla ya. A kpọpụla ya n’ike n’ezinụlọ ya. Ọ ga-anọ ọtụtụ afọ n’amaghị ihe ọ bụla gbasara ezinụlọ ya. Dị ka ihe atụ, ọ gaghị ama otú obi si gbawaa Ruben mgbe ọ lọghachiri hụ na ọ nọkwaghị ma ọ bụkwanụ otú Jekọb si ruo uju mgbe a ghọgburu ya, ya ekweta na Josef anwụọla. Ọ gaghịkwa ama banyere nna nna ya Aịzik, onye ka nọ ndụ mgbe ahụ ma ọ bụkwanụ banyere nwanne ya Benjamin, onye ọ ga na-agụsi ya agụụ ike ịhụ. Ma, ọ̀ pụtara na Josef gbazi aka?—Jenesis 37:29-35.

Ọ ka nwere ihe Josef nwere nke ụmụnne ya na-enweghị ike ịnara ya. Ihe ahụ bụ okwukwe ya. Ọ ma Chineke ya bụ́ Jehova nke ọma, o nweghịkwa ihe ga-eme ka ọ gharazie inwe okwukwe na ya, ma mkpọpụ a kpọpụrụ ya n’ụlọ ha ma ahụhụ ọ tara n’okporo ụzọ mgbe a kpọ ya na-aga Ijipt. Ọ gakwaghị ekwe ka ihere mee ka ọ kwụsị inwe okwukwe na Chineke n’agbanyeghị na e rere ya, ya aghọọ ohu onye Ijipt nwere ego aha ya bụ Pọtịfa. (Jenesis 37:36) Nsogbu ndị a mere ka okwukwe Josef sikwuo ike, meekwa ka o kpebisikwuo ike na ya agaghị ahapụ Chineke ya. N’isiokwu ndị ọzọ anyị ga-ebipụta gbasara Josef, anyị ga-ahụ otú okwukwe ya si mee ka Jehova jiri ya rụkwuo ọrụ, meekwa ka o nyere ụmụnne ya na nna ya aka mgbe ha nọ ná nsogbu. N’eziokwu, anyị ga-egosi na anyị ma ihe ma anyị ṅomie okwukwe Josef.

^ para. 15 Ụfọdụ ndị na-eme nchọpụta kwuru na ọ ga-abụ na ụmụnne Josef chere na ihe ahụ nna ha meere Josef gosiri na ọ chọrọ iji Josef mere ọkpara. Ha ma na Josef bụ nwa mbụ nwunye Jekọb kacha hụ n’anya mụrụ. Ọ bụkwa nwaanyị ahụ gaara abụ nwunye mbụ ya. Ihe ọzọ bụ na Ruben, bụ́ ọkpara Jekọb, gara dinaa iko nna ha. Ihe a o mere menyere nna ha ihere, meekwa ka a gharazie iji ya mere ọkpara.—Jenesis 35:22; 49:3, 4.

^ para. 25 Ihe Baịbụl kwuru n’ihe a na-enweghị oké ihe ọ bụ bụ eziokwu. Ihe e dere n’oge ahụ gosiri na ọ bụ shekel iri abụọ ka a na-erekarị ndị ohu n’Ijipt.

GỤKWUO GBASARA YA

“Olee Otú M Ga-esi Mee Oké Ihe Ọjọọ A?”

Olee ihe Josef mere ka nwunye Pọtịfa, bụ́ onye fooro ntutu taa na ọ ga-enweta ya, ghara ịnwata ya?