Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE JULAỊ 2014

Olee Otú I Kwesịrị Isi Na-adọ Ụmụ Gị Aka ná Ntị?

Olee Otú I Kwesịrị Isi Na-adọ Ụmụ Gị Aka ná Ntị?

“M nụhaala ụda ụgbọala, mụ echee na ọ bụ nwa m Jordan na-alọta. Ihe a bụ nke ugboro atọ ọ na-alọtaghị mgbe anyị gwara ya ka ọ lọta. M nọ na-ajụ onwe m, sị: ‘Olee ebe nwa a nọ? Ọ̀ ga-abụ na ọ baala ná nsogbu? Ọ̀ makwadị na o kowela anyị obi n’elu?’ Mgbe ọ na-alọtala, ọ fọziri obere ka obi gbawaa m.”GEORGE.

“Mkpu nwa m nwaanyị tiri mere ka m kụja. M tụgharịrị hụ ya ka o bu aka ya n’isi na-ebe ákwá. Nwanne ya nwoke dị afọ anọ kụrụ ya ihe.”—NICOLE.

“Nwa m nwaanyị dị afọ isii aha ya bụ Natalie kwuru, sị: ‘Ezughị m mgbaaka ahụ ezu. M hụrụ ya ebe ọ dapụrụ, mụ atụtụta ya.’ I lee ya anya ná mkpụrụ anya, ị ga-asị na o kwuru eziokwu. Agọ ọ nọ na-agọ wutere mụ na nwunye m nke na anyị bewere ákwá. Anyị ma na ọ na-agha ụgha.”—STEPHEN.

Ọ BỤRỤ na ị bụ nna ma ọ bụ nne, ị̀ ghọtara otú obi dị mmadụ atọ a e dere ihe ha kwuru? Ọ bụrụ na ụdị ihe a emee gị, ị̀ na-echewe otú ị ga-esi dọọ nwa gị aka ná ntị ma ọ bụkwanụ ma ì kwesịdịrị ịdọ ya aka ná ntị? Mmadụ ịdọ nwa ya aka ná ntị ọ̀ bụ ihe ọjọọ?

IHE ỊDỌ MMADỤ AKA NÁ NTỊ PỤTARA

Na Baịbụl, okwu a sụgharịrị ịdọ aka ná ntị apụtachaghị ịta mmadụ ahụhụ. Isi ihe ọ pụtara bụ inye mmadụ ndụmọdụ, ịkụziri mmadụ ihe, na ịgwa mmadụ ihe ọ na-emetaghị ka o nwee ike mezie ya. O nweghị ihe gbasara ịdọ mmadụ aka ná ntị na imegbu mmadụ ma ọ bụ ịrụsa mmadụ arụrụala.—Ilu 4:1, 2.

E nwere ike iji otú nne ma ọ bụ nna si adọ ụmụ ya aka ná ntị tụnyere ọrụ ugbo. Onye ọrụ ugbo na-akọ ala ya, na-agba ihe ọ kụrụ mmiri ma na-etinyere ya ihe ga-eme ka ọ na-eto nke ọma. Ọ na-abọ ubi ya ahịhịa, na-agbalịkwa ka ụmụ ahụhụ ghara imebisị ihe ọ kụrụ. Ọ na-akwacha osisi ọ kụrụ ka o nwee ike ito nke ọma. Ọ ma na ime ihe niile a ga-eme ka ihe ọ kụrụ mee nke ọma. E nwekwara ọtụtụ ụzọ ndị nne na nna si elekọta ụmụ ha. Ma mgbe ụfọdụ, ha nwere ike ime ụmụ ha ihe yiri ịkwacha osisi, ya bụ, ịdọ ha aka ná ntị. Ọ bụrụ na ha adọọ ụmụ ha aka ná ntị, o nwere ike ime ka ha kwụsị ihe na-adịghị mma ha na-eme tupu ya amara ha ahụ́, meekwa ka ha bụrụ ndị ezigbo mmadụ ma ha too. Ma, a na-akpachara anya ma a kwachawa osisi ka a ghara igbu osisi ahụ. Otú ahụ ka ọ dịkwa ndị nne na nna. Ha kwesịrị ịgbalị ka ọ bụrụ ịhụnanya ga-eme ka ha na-adọ ụmụ ha aka ná ntị.

Ndị nne na nna nwere ike ịmụta ihe n’otú Jehova si adọ ndị na-efe ya aka ná ntị. Otú o si adọ ha aka ná ntị na-adị ha mma, na-abakwara ha uru nke na ha ‘na-ahụ ịdọ aka ná ntị ọ na-enye ha n’anya.’ (Ilu 12:1) Ha ‘na-ejisi ịdọ aka ná ntị ike,’ ha ‘anaghịkwa ahapụ ya.’ (Ilu 4:13) I nwere ike inyere nwa gị aka ka ọ na-anabata ịdọ aka ná ntị gị ma ọ bụrụ na ị gbalịa ka otú i si adọ ya aka ná ntị yie otú Chineke si adọ ndị na-efe ya aka ná ntị. E nwere ụzọ ihe atọ anyị ga-amụta n’otú Chineke si adọ ndị mmadụ aka ná ntị. (1) Ọ bụ ịhụnanya mere o ji adọ ndị mmadụ aka ná ntị. (2) Ọ na-adọ ha aka ná ntị otú kwesịrị ekwesị. (3) Ọ na-adọ ha aka ná ntị mgbe ọ bụla o kwesịrị ime otú ahụ.

Ọ BỤ ỊHỤNANYA MERE JEHOVA JI ADỌ NDỊ MMADỤ AKA NÁ NTỊ

Ihe mere Chineke ji adọ ndị mmadụ aka ná ntị bụ na ọ hụrụ ha n’anya. Baịbụl sịrị: “Onye Jehova hụrụ n’anya ka ọ na-abara mba, ọbụna dị ka nna si abara nwa ya nke ihe ya dị ya mma mba.” (Ilu 3:12) Ihe ọzọ bụ na Jehova bụ “Chineke nke na-eme ebere, na-emekwa  amara, onye na-adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ.” (Ọpụpụ 34:6) Ọ bụ ya mere na o nweghị mgbe Jehova na-emegbu ndị mmadụ ma ọ bụ na-echi ha ọnụ n’ala. Ọ naghịkwa agwa ha okwu ga-egbu ha mmụọ ma ọ bụ na-akatọkarị ha n’ihi na ọ ma na ụdị okwu ahụ ga-adị ka “ebe e ji mma agha maa mmadụ.”—Ilu 12:18.

GEE NWA GỊ NTỊ

O doro anya na ebe ọ bụ na ndị nne na nna ezughị okè, ha agaghị ejideli onwe ha otú Jehova na-eme. Mgbe ụfọdụ, o nwere ike ịdị gị ka ọ̀ bụ na ị gaghị edili ihe nwa gị na-eme. Ya dị otú ahụ, cheta na i jiri iwe taa nwa gị ahụhụ, o nwere ike ime ka ahụhụ ị ga-ata ya gafee ókè, o nwechaghịkwa uru ọ ga-abara ya. Buru n’obi na ọ bụrụ na i jiri iwe taa nwa gị ahụhụ, ọ bụghị aka ná ntị ka ị dọrọ ya. Naanị ihe i gosiri ya bụ na i jideghị onwe gị.

Ma, ọ bụrụ na ihe mere i ji dọọ nwa gị aka ná ntị bụ na ị hụrụ ya n’anya, gị adọọkwa ya aka ná ntị otú gosiri na ị na-ejide onwe gị, ọ ga-abara nwa gị uru. Ka anyị hụ ihe George na Nicole ahụ e kwuru okwu ha ná mmalite isiokwu a mere mgbe ụmụ ha kpasuru ha iwe.

KPEKỌỌNỤ EKPERE ỌNỤ

“Mgbe Jordan mechara lọta, ezigbo iwe jizi mụ na nwunye m. Ma, anyị jidere onwe anyị ma gee ya ntị mgbe ọ na-agwa anyị ihe mere ọ na-alọtaghị mgbe anyị gwara ya. Ebe ọ bụ na chi ejimiela mgbe ahụ, anyị kpebiri na anyị ga-akpa ya n’ụtụtụ. Anyị niile kpekọrọ ekpere ọnụ ma gaa hie ụra. N’echi ya, obi alọdatụla anyị nke na anyị nweziri ike imeda obi kwurịta ihe ahụ. Otú anyị si meda obi kwuo okwu ruru nwa anyị n’obi, ya ejiri obi ya niile nabata iwu ndị anyị nyere ya, nabatakwa ihe anyị gwara ya na anyị ga-eme ya maka iwu ahụ ọ dara. Obi dị anyị ụtọ na anyị ghọtara na ọ bụrụ na anyị emee ihe ọkụ ọkụ mgbe a kpasuru anyị iwe, ọ ga-aghọ anyị ahịa. Ihe na-aka mma mgbe ọ bụla anyị bu ụzọ gee nwa anyị ntị tupu anyị emewe ihe ọ bụla.”—George.

GỊ NA YA KWURỊTA OKWU

“Ezigbo iwe were m mgbe m hụrụ otú nwa m nwoke si kụọ nwanne ya nwaanyị ihe. Kama iti ya ihe ozugbo, m gwara ya ka ọ baa n’ime ụlọ ya n’ihi na iwe nwere ike ime ka m mee ya ihe m na-ekwesịghị ime ya. Mgbe obi dajụrụ m, abịara m kọwaara ya na ime ihe ike jọgburu onwe ya nakwa na ihe ọ kụrụ nwanne ya nyere nwanne ya nsogbu. Otú a m si dọọ ya aka ná ntị ruru ya n’ahụ́. Ọ sịrị nwanne ya nwaanyị ndo ma makụọ ya.”Nicole.

N’eziokwu, ọ bụrụgodị na ndị nne na nna tara ụmụ ha ahụhụ mgbe ha na-adọ ha aka ná ntị, ihe ha mere adịghị njọ ma ọ bụrụhaala na ihe mere ha ji dọọ ha aka ná ntị ahụ bụ na ha hụrụ ha n’anya.

JEHOVA NA-ADỌ NDỊ MMADỤ AKA NÁ NTỊ OTÚ KWESỊRỊ EKWESỊ

Mgbe ọ bụla Jehova na-adọ ndị mmadụ aka ná ntị, ọ na-eme ya “ruo n’ókè kwesịrị ekwesị.” (Jeremaya 30:11; 46:28) Jehova na-echebara otú ihe niile si mee echiche, ọ na-ahụkwa ihe ndị mmadụ na-anaghị ahụ. Olee otú ndị nne na nna ga-esi eme ka ya? Stephen ahụ anyị kwuru okwu ya ná mbido isiokwu a sịrị:  “Ọ bụ eziokwu na ezigbo iwe were anyị, anyị amaghịkwa ihe mere Natalie ga-eji gọwa agọ na ya ezughị mgbaaka ahụ ezu, ma anyị chebaara afọ ole ọ dị echiche ma ghọta na ọ ka bụkwanụ nwata.”

Di Nicole aha ya bụ Robert na-agbakwa mbọ ka o chebara ihe niile merenụ echiche tupu ya adọwa ụmụ ya aka ná ntị. Mgbe ọ bụla nwa ya kpara àgwà na-adịghị mma, ọ na-ajụ onwe ya ugboro ugboro, sị: ‘Ihe a ọ̀ bụ nke mbụ nwa a na-eme ihe a, ka ọ̀ na-emebu ya eme? Ọ̀ ga-abụ na ahụ́ adịghị ya ma ọ bụkwanụ na ike gwụchara ya? Ọ̀ ga-abụ na o nwere nsogbu ọzọ mere o ji kpaa àgwà ahụ?’

Ndị nne na nna ma nke a na-akọ ghọtara na ụmụaka bụ ụmụaka, ha abụghị ndị dimkpa. Pọl onyeozi kwetara na ụmụaka abụghị ndị dimkpa. Ọ bụ ya mere o ji dee, sị: “Mgbe m bụ nwa ọhụrụ, m na-ekwu okwu dị ka nwa ọhụrụ, na-eche echiche dị ka nwa ọhụrụ.” (1 Ndị Kọrịnt 13:11) Robert sịrị: “Otu ihe na-enyere m aka ile ihe anya otú kwesịrị ekwesị ma ghara imefe ihe ókè bụ na m na-echetara onwe m ihe ndị m na-eme mgbe m bụ nwatakịrị.”

Atụla anya na nwa gị emekataghị mee ihe na-adịghị mma. Ma, ọ pụtaghị na ị ga-agba ya nkịtị ma o mee ihe ọjọọ ma ọ bụ mee ka à ga-asị na ihe o mere adịghị njọ. Ọ bụrụ na ị ghọta na nwa gị abụbeghị dimkpa, ghọtakwa ihe ndị na-eme ná ndụ ya, na ihe ndị ọzọ, ọ ga-eme ka ị dọọ ya aka ná ntị otú kwesịrị ekwesị ma ghara imefe ya ókè.

JEHOVA NA-ADỌ NDỊ MMADỤ AKA NÁ NTỊ MGBE Ọ BỤLA O KWESỊRỊ IME OTÚ AHỤ

Jehova kwuru na Malakaị 3:6, sị: “Abụ m Jehova; adịghị m agbanwe agbanwe.” Ndị na-efe Chineke kwetara na ihe a Jehova kwuru bụ eziokwu, ọ bụ ya mere obi ji sie ha ike ife ya. Obi ga-esikwa ụmụaka ike na ndị mụrụ ha ma ihe ha na-eme ma ọ bụrụ na ha na-adọ ha aka ná ntị mgbe ọ bụla ha kwesịrị ime otú ahụ. Ọ bụrụ na ọ bụ otú obi dị gị na-eme ka ị dọọ ụmụ gị aka ná ntị ma ha mee ihe na-adịghị mma, ụmụ gị agaghị ama ebe ị kwụ akwụ, ha agaghịkwa ama ihe ha ga-eme mete gị.

Ì chetara na Jizọs sịrị: “Ka Ee unu kwuru bụrụ Ee, ka Ee e unu kwuru bụrụ Ee e”? Ihe a o kwuru gbasakwara ịzụ ụmụ. (Matiu 5:37) N’ihi ya, chee echiche nke ọma ka ị ghara ikwu ihe ị ma na ị gaghị eme nwa gị ma o mee ihe na-adịghị mma. Ọ bụrụ na ị gwa nwa gị ihe ị ga-eme ya ma o mee ihe na-adịghị mma, hụ na i mere ya ihe ahụ ma o mee ihe ahụ na-adịghị mma.

Ihe ga-enyere gị aka ka ị na-adọ ụmụ gị aka ná ntị mgbe ọ bụla i kwesịrị ime otú ahụ bụ gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị ịna-ekwurịta okwu nke ọma. Robert kwuru, sị: “Ọ bụrụ na o nwee otú ụmụ m si mee ka m kweta ka ha mee ihe nwunye m sịrị ha emela, mụ emechaa chọpụta na nwunye m sịrị ha emela ihe ahụ, m na-agwazi ha ka ha hapụ ime ihe ahụ.” Ọ bụrụ na ihe nwoke chọrọ ka e mee n’ụlọ dị iche n’ihe nwunye ya chọrọ, ọ ga-akacha mma ka ha kwurịta ya mgbe naanị ha abụọ nọ ma kpebie ihe ha ga-eme.

ỊDỌ ỤMỤAKA AKA NÁ NTỊ BARA EZIGBO URU

Ọ bụrụ na ị mụta ịdọ ụmụ gị aka ná ntị otú Jehova si adọ ndị mmadụ aka ná ntị, ya bụ, ịdọ ha aka ná ntị maka na ị hụrụ ha n’anya, ịdọ ha aka ná ntị otú kwesịrị ekwesị nakwa mgbe ọ bụla i kwesịrị ime otú ahụ, ọ ga-abara ụmụ gị uru. Ndụmọdụ ị na-enye ha maka na ị hụrụ ha n’anya ga-eme ka ha ghọọ ndị ma ihe na ndị anya ruru ala ma ha too. Baịbụl sịrị: “Zụlite nwata dị ka ụzọ kwesịrị ya si dị; ọbụna mgbe o mere okenye, ọ gaghị ahapụ ya.”—Ilu 22:6.

 

GỤKWUO GBASARA YA

Otú Ị Ga-esi Kụziere Nwa Gị Ka Ọ Na-erubere Gị Isi

Ịgbazi nwatakịrị pụtara ịkụziri ya ihe. Baịbụl ga-enyere gị aka ịkụziri nwa gị ka ọ na-eme ihe ị sị ya mee.