Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE JULAỊ 2014

Ị̀ Ga-ahụli Chineke Onye Mmadụ Na-enweghị Ike Ịhụ Anya?

Ị̀ Ga-ahụli Chineke Onye Mmadụ Na-enweghị Ike Ịhụ Anya?

“CHINEKE bụ Mmụọ.” Mmadụ enweghị ike ịhụ ya anya. (Jọn 4:24) Ma, ihe Baịbụl kwuru gosiri na e nwere ike ikwu na ụfọdụ ndị ahụtụla Chineke. (Ndị Hibru 11:27) Olee otú mmadụ ga-esi ahụ Chineke anya? Ị̀ ga-ahụli Chineke onye “a na-apụghị ịhụ anya”?—Ndị Kọlọsi 1:15.

Weregodị ọnọdụ anyị tụnyere nke onye kpụrụ ìsì kemgbe a mụrụ ya. Ìsì ahụ o kpuru ọ̀ na-eme ka ọ ghara inwe ihe na-emenụ ọ na-aghọta? Mba. E nwere ọtụtụ ụzọ onye ìsì si amata ndị mmadụ na ihe dị iche iche ọ na-anaghị ahụ, na ihe ndị na-emenụ n’ebe ọ nọ. Otu onye ìsì kwuru, sị: “Ihe mmadụ ji ahụ ụzọ abụghị anya. Ọ bụ obi.”

Otú ahụ ka ọ dịkwa anyị. Ọ bụ eziokwu na anyị agaghị ejili anya nkịtị hụ Chineke, ma anyị nwere ike iji “anya nke obi” anyị hụ ya. (Ndị Efesọs 1:18) E nwere ụzọ atọ i nwere ike isi hụ Chineke. Ka anyị leba ha anya.

‘A NA-AHỤ YA NKE ỌMA MALITE MGBE E KERE ỤWA’

Ntị onye ìsì na-anụ ihe nke ọma karịa nke onye na-ahụ ụzọ, ọ na-abụkwa ya metụ ihe aka, ụbụrụ ya agwa ya ihe ihe ahụ bụ ngwa ngwa. Ọ bụ ihe ọ nụrụ na ihe o bitụrụ aka ka o ji aghọta ihe ndị ọ na-enweghị ike ịhụ anya. Anya gị, ntị gị, imi gị, na aka gị nwekwara ike inyere gị aka ka i nyochaa ihe ndị dị n’ụwa ma ghọta onye Chineke bụ n’agbanyeghị na anyị enweghị ike ịhụ ya anya. Baịbụl kwuru na “àgwà ya ndị a na-apụghị ịhụ anya ka a na-ahụ nke ọma malite mgbe e kere ụwa gaa n’ihu, n’ihi na a na-aghọta ha site n’ihe ndị e kere eke.”—Ndị Rom 1:20.

Dị ka ihe atụ, chebagodịrị ụwa anyị a echiche. Otú Chineke si kee ụwa anyị a gosiri na ọ bụghị naanị ka anyị dịrị ndụ na ya mere o ji kee ya, ọ chọkwara ka ndụ na-atọ anyị ụtọ. Ọ na-abụ ezigbo ikuku kusa anyị n’ahụ́, obi na-atọ anyị ụtọ. Anwụ ụtụtụ chasa anyị, ahụ́ na-ekporo anyị ọkụ. Ọ na-abụkwa anyị taa mkpụrụ osisi dị ụtọ ma ọ bụ nụ ubé nnụnụ, obi adị anyị mma. Ọ̀ bụ na ihe ọma ndị a Chineke na-emere anyị egosighị na ọ na-echebara anyị echiche, na-emesapụ aka, ma dị ọmịiko?

Gịnị ka ihe ndị anyị na-ahụ ná mbara ígwé na-akụziri anyị banyere Chineke? Otu ihe ihe ndị dị n’eluigwe na-akụziri anyị bụ na Chineke dị ike. Ihe ndị sayensị chọpụtara ná nso nso a gosiri na ụwa na ihe ndị dị na mbara ígwé na-asakwu mbara n’ike n’ike. I lee anya n’eluigwe n’abalị, jụọ onwe gị, sị: Ike ahụ mere ka ụwa na ihe ndị dị na mbara ígwé na-asakwu mbara n’ike n’ike si ebee? Baịbụl gwara anyị na ike Onye kere ihe ndị a “dị ukwuu.” (Aịzaya 40:26) Ihe ndị Chineke kere na-egosi na ọ bụ “Onye Pụrụ Ime Ihe Niile,” onye “ike ya dị ukwuu.”—Job 37:23.

‘ONYE KỌWAARA ANYỊ ONYE CHINEKE BỤ’

E nwere otu nwaanyị mụrụ ụmụ abụọ kpuru ìsì. Nwaanyị ahụ sịrị: “Ụmụ m na-esikarị n’ihe m gwara ha amụta ihe. M gwa ha ihe m na-anụ na ihe m na-ahụ, ha ejiri ajụjụ so m ruo mgbe m kọwaara ha ihe niile. Ọ bụ m bụ anya ha.” Otú ahụ ka ọ dịkwa anyị. N’agbanyeghị na “ọ dịghị mmadụ hụtụrụla Chineke mgbe ọ bụla,” Ọkpara Chineke, bụ́ Jizọs, onye nọ n’akụkụ Chineke, kọwaara anyị onye Chineke bụ. (Jọn 1:18) Ebe Jizọs bụ onye mbụ Chineke kere, bụrụkwa onye Chineke mụrụ naanị ya, ọ ghọọrọ anyị anya anyị ji ahụ ihe ndị dị n’eluigwe. Ọ bụ ya ga-agwa anyị nke bụ́ eziokwu banyere Chineke, bụ́ onye anyị na-enweghị ike ịhụ anya.

Jizọs na Nna ya nọrọ ọtụtụ afọ a na-enweghị ike ịgụta ọnụ. Lee ihe ụfọdụ o kwuru banyere Chineke:

  • Chineke na-arụ ọrụ mgbe niile. “Nna m anọwo na-arụ ọrụ ruo ugbu a.”—Jọn 5:17.

  • Chineke maara mkpa anyị. “Nna unu maara ihe ndị na-akpa unu tupu unu arịọ ya.”—Matiu 6:8.

  •  Chineke na-enye anyị ihe ndị dị anyị mkpa. ‘Nna unu nọ n’eluigwe na-eme ka anyanwụ ya waara ndị ọjọọ na ndị ọma, na-emekwa ka mmiri zooro ndị ezi omume na ndị ajọ omume.’—Matiu 5:45.

  • Chineke ji onye ọ bụla n’ime anyị kpọrọ ihe. “Ọ̀ bụ na a dịghị ere nza abụọ otu mkpụrụ ego nke ga-azụtali naanị ihe dị nta? Ma o nweghị otu n’ime ha ga-ada n’ala, Nna unu aghara ịma. Ma a gụwo ntutu niile dị n’isi unu ọnụ. Ya mere, unu atụla egwu: Unu dị oké ọnụ ahịa karịa ọtụtụ nza.”—Matiu 10:29-31.

ONYE MERE KA A MATA CHINEKE A NA-ENWEGHỊ IKE ỊHỤ ANYA

Otú ndị kpuru ìsì na-esikarị aghọta ihe na-adị iche n’otú ndị na-ahụ ụzọ si aghọta ihe. Onye kpuru ìsì nwere ike iwere ebe gbara ọchịchịrị ka ebe juru oyi anwụ na-anaghị acha kama iwere ya ka ebe gbara itiri. Otú ahụ onye na-anaghị ahụ ụzọ chaa chaa na-agaghị ama ihe bụ́ ìhè na ọchịchịrị, ọ bụ otú ahụ ka anyị na-enweghị ike ịghọta onye Jehova bụ ma ọ bụrụ na e nyereghị anyị aka. Ọ bụ ya mere Jehova ji zitere anyị onye na-akpa àgwà ka ya.

Onye ahụ Jehova zitere bụ Jizọs. (Ndị Filipaị 2:7) Ihe Jizọs mere abụghị naanị ịgwa anyị banyere Nna ya, o gosikwara anyị ụdị onye Chineke bụ. E nwere mgbe onye na-eso ụzọ Jizọs aha ya bụ Filip gwara Jizọs, sị: “Onyenwe anyị, gosi anyị Nna ahụ.” Ma, Jizọs sịrị ya: “Onye hụrụ m ahụwokwa Nna m.” (Jọn 14:8, 9) Olee àgwà ndị Jizọs kpara bụ́ ndị mere ka anyị ‘hụ’ ma ọ bụ ghọta ụdị onye Nna ya bụ?

Jizọs dị umeala n’obi, ọ na-emesapụkwara ndị mmadụ ihu. (Matiu 11:28-30) Àgwà ọma ya mere ka ndị mmadụ na-akpa ya nso. Ọ na-ewute Jizọs ma ọ hụ ka ndị mmadụ nọ ná mwute. Ọ na-esokwa ndị na-aṅụrị ọṅụ aṅụrị ọṅụ. (Luk 10:17, 21; Jọn 11:32-35) Mgbe ọ bụla ị na-agụ ebe kọrọ gbasara Jizọs na Baịbụl ma ọ bụ na-egere ya egere, mee ka obi gị dịrị na ya, gbalịakwa ka ọ dị gị ka ị̀ na-ahụ ka ihe ahụ na-eme. Ọ bụrụ na i chebara otú Jizọs si mesoo ndị mmadụ ihe echiche, ị ga-aghọtakwu àgwà ndị magburu onwe ha Chineke nwere, àgwà ndị ahụ ga-emekwa ka ị hụ Chineke n’anya.

IHE NDỊ Ị GA-EME KA Ị GHỌTA ONYE CHINEKE BỤ NKE ỌMA

Otu onye na-ede akwụkwọ kwuru otú ndị ìsì si aghọta ihe ndị na-eme n’ụwa. Ọ sịrị: “Ndị ìsì na-aghọta ihe obere obere. Ha na-esi ụzọ dị iche iche aghọta ya (aka ha metụrụ n’ihe, ísì ha nụrụ, olu ma ọ bụ ụda ha nụrụ, na ụzọ ndị ọzọ). Ha jikọta ihe niile a, ha aghọta ihe na-emenụ.” Otú ahụ ka i kwesịkwara ime. Ọ bụrụ na i kirie ihe ndị Chineke kere, gụọ ihe Jizọs kwuru banyere Nna ya ma chee echiche banyere otú àgwà Jizọs kpara si gosi ụdị onye Chineke bụ, ị ga-aghọtazi onye Jehova bụ nke ọma. Jehova ga-adịkwa gị ka onye ị na-ahụ anya.

Ọ bụ otú ahụ ka ọ dị nwoke dịrị ndụ n’oge ochie aha ya bụ Job. Ná mmalite, ‘o kwuru ihe ọ na-aghọtaghị.’ (Job 42:3) Ma mgbe o chebachaara ihe ndị dị ịtụnanya Chineke kere echiche, o kwuru, sị: “Ọ bụ n’akụkọ ka m nụrụ banyere gị, ma ugbu a, anya m na-ahụ gị.”—Job 42:5.

‘Ọ bụrụ na ị chọọ Jehova, ọ ga-ekwe ka ị chọta ya’

Anya gị nwekwara ike ịhụ Chineke. “Ọ bụrụ na ị chọọ [Jehova], ọ ga-ekwe ka ị chọta ya.” (1 Ihe E Mere 28:9) Obi ga-adị Ndịàmà Jehova ụtọ inyere gị aka ka ị chọọ Chineke ma chọta ya n’agbanyeghị na mmadụ enweghị ike iji anya nkịtị hụ ya.