Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE JUN 2014

Gịnị Ka Mmadụ Atọ Chọrọ Ịmụta Eziokwu n’Oge Gboo Chọpụtara?

Gịnị Ka Mmadụ Atọ Chọrọ Ịmụta Eziokwu n’Oge Gboo Chọpụtara?

MGBE Pọntiọs Paịlet, bụ́ gọvanọ Judia, na-ekpe Jizọs ikpe, ọ jụrụ Jizọs, sị: “Gịnị bụ eziokwu?” (Jọn 18:38) Ma, ihe bụ́ mkpa Paịlet abụghị ka ọ mata eziokwu. Ajụjụ a ọ jụrụ gosiri na obi esighị ya ike na e nwere ihe bụ́ eziokwu ma ọ bụkwanụ na o kwetaghị na e nwere ihe bụ́ eziokwu. O nwere ike ịbụ na Paịlet chere na ihe bụ́ eziokwu bụ ihe ọ bụla mmadụ weere na ọ bụ eziokwu ma ọ bụkwanụ ihe ọ bụla a kụziiri onye ahụ, ya ekweta. Paịlet chere na e nweghị otú mmadụ ga-esi amata ihe bụ́ eziokwu. Ihe a o chere bụkwa ihe ọtụtụ ndị chere taa.

N’ihe dị ka narị afọ ise gara aga, ndị na-aga chọọchị na Yurop amaghị ihe ha ga-ekwere ekwere. Ebe ọ bụ na a kụziiri ha na poopu bụ o kwuchaa o bie nakwa na mmadụ ekwesịghị ịgba ihe chọọchị kwuru ụkwụ, ha amaghị nke ha ga-eso eso mgbe ndị chọrọ ka chọọchị Katọlik gbanwee nkụzi ha bidoro ịkụzi ihe dị iche n’ihe chọọchị Katọlik na-akụzi. Olee otú ndị ahụ na-aga chọọchị ga-esi amata nke bụ́ eziokwu?

Ọ dịkarịa ala, e nwere ụmụ nwoke atọ n’oge ahụ kpebisiri ike na ha ga-amata nke bụ́ eziokwu. * Gịnị ka ha mere ka ha chọpụta nke bụ́ eziokwu na nke bụ́ ụgha? Oleekwa ihe ha chọpụtara? Ka anyị leba ajụjụ ndị a anya.

‘BAỊBỤL KWESỊRỊ ỊBỤ O KWUCHAA O BIE’

E nwere otu nwa okorobịa aha ya bụ Vọlfgang Kapito. O jighị ịga chọọchị egwu egwu. Ọ gụrụ otú e si agwọ ọrịa n’ụlọ akwụkwọ, mụọkwa gbasara iwu na okpukpere chi. N’afọ 1512, ọ ghọrọ ụkọchukwu. Achịbishọp chọọchị dị na Maịnts mechara họpụta ya ka ọ kụziwe ihe na chọọchị ya.

Ná mmalite, Kapito gbalịrị ka o mee ka ndị na-akụzi ihe dị iche n’ihe chọọchị Katọlik na-akụzi selata aka n’otú ha si agba chọọchị Katọlik ụkwụ. Ma mgbe obere oge gachara, Kapito sooro ha kwuwe ka chọọchị Katọlik gbanwee ihe ha na-akụzi. Olee ihe Kapito mere? Otu ọkọ akụkọ ihe mere eme aha ya bụ James M. Kittelson kwuru na mgbe a jụrụ Kapito ajụjụ gbasara ihe dị iche iche a na-akụzi na chọọchị, Kapito kwuru na ya kweere na ‘ọ bụ Baịbụl bụ ihe kacha mma a ga-eji amata ma ihe a na-akụzi ọ̀ bụ eziokwu n’ihi na ọ bụ sọọsọ Baịbụl na-ekwu eziokwu.’ Kapito kwuziri na nkụzi chọọchị Katọlik, nke bụ́ na achịcha na mmanya e ji edo mas na-aghọ anụ ahụ́ na ọbara Jizọs, esighị na Baịbụl. O kwukwara na ịkpọrọ ndị sent isi ala, esighị  na Baịbụl. (Gụọ igbe isiokwu ya bụ ‘ Iji Mara Ma Ihe Ndị A Kụziiri Ha Hà Dị Otú Ahụ.’) N’afọ 1523, Kapito hapụrụ ọrụ ahụ achịbishọp nyere ya gaa biri n’obodo Strasbọg. N’oge ahụ, ndị chọrọ ka chọọchị Katọlik gbanwee nkụzi ha na ihe ha na-eme juru eju na Strasbọg.

Ọ bụ n’ụlọ Kapito dị na Strasbọg ka ndị na-agba nkụzi chọọchị Katọlik ụkwụ na-ezukọ ekwurịta gbasara okpukpe na Baịbụl. Ọ bụ eziokwu na ụfọdụ n’ime ha ka na-akụzi Atọ n’Ime Otu, otu akwụkwọ sịrị na akwụkwọ ndị Kapito dere gosiri na Kapito “ekwughị ihe ọ bụla gbasara Atọ n’Ime Otu.” Gịnị mere na o kwughị ihe ọ bụla gbasara ya? Ọ bụ maka na otú otu onye Spen, bụ́ ọkà mmụta n’ihe gbasara okpukpere chi, si jiri Baịbụl gosi na nkụzi Atọ n’Ime Otu abụghị eziokwu masịrị ya. Aha ọkà mmụta ahụ bụ Maịkel Sevitọs.

Ọ bụrụ na ndị mmadụ anụ na e nwere onye na-ekwu na nkụzi Atọ n’Ime Otu bụ nkụzi ụgha, e nwere ike igbu onye ahụ. Ọ bụ ya mere na Kapito ekweghị ekwu ihe o chere gbasara nkụzi Atọ n’Ime Otu. Akwụkwọ ndị Kapito dere gosiri na ọ malitela inwe obi abụọ gbasara nkụzi Atọ n’Ime Otu tupu ya na Sevitọs amata. Otu ụkọchukwu Katọlik mechara dee na Kapito na ndị òtù ya “na-anọ ná nzuzo ekwurịta ihe ndị kacha omimi gbasara okpukpe; ha kwetakwara na nkụzi Atọ n’Ime Otu dị asọ abụghị eziokwu.” Mgbe otu narị afọ gachara, e denyere aha Kapito n’ebe e depụtara aha ndị a ma ama dere n’akwụkwọ ha na nkụzi Atọ n’Ime Otu abụghị eziokwu. Aha ya bụ aha mbụ e depụtara.

Vọlfgang Kapito kweere na ihe kacha mee ka chọọchị kụọ afọ n’ala bụ na ha “leghaara Akwụkwọ Nsọ anya”

Kapito kweere na ọ bụ na Baịbụl ka mmadụ ga-esi amata nke bụ́ eziokwu. O kwuru, sị: “Ọ bụ Baịbụl na iwu Kraịst kwesịrị ịbụ o kwuchaa o bie mgbe niile n’ihe gbasara okpukpere chi.” Kittelson kwuru na Kapito “kwetasiri ike na ihe kacha mee ka ndị ọkà mmụta n’ihe gbasara okpukpere chi kụọ afọ n’ala bụ na ha leghaara Akwụkwọ Nsọ anya.”

E nwekwara nwa okorobịa ọzọ chọrọ ịmụta eziokwu dị n’Okwu Chineke. Aha ya bụ Matịn Selariọs, (ihe ọzọ a na-akpọ ya bụ Matịn Bọhọs). O bi n’ụlọ Kapito n’afọ 1526.

“ỊMỤTA EZIOKWU GBASARA EZI CHINEKE”

Ihu akwụkwọ aha ya bụ On the Works of God. Ọ bụ Matịn Selariọs dere ya. N’akwụkwọ a, o gosiri ihe dị iche n’ihe chọọchị na-akụzi na ihe Baịbụl na-akụzi

A mụrụ Selariọs n’afọ 1499. Ọ mụrụ gbasara okpukpere chi na nkà ihe ọmụma n’ụlọ akwụkwọ. O mechakwara kụziwe ihe n’obodo Witinbeg, nke dị na Jamanị. Ọ bụ n’obodo a ka ndị mmadụ malitere ịgba nkụzi chọọchị Katọlik ụkwụ. Obere oge, Selariọs matara Matịn Luta na ndị ọzọ chọrọ ka chọọchị Katọlik gbanwee ihe ha na-akụzi. Ma, olee otú Selariọs ga-esi amata nkụzi nke si n’Akwụkwọ Nsọ na nke ụmụ mmadụ chepụtara?

Otu akwụkwọ kwuru na Selariọs kwetara na otú mmadụ ga-esi aghọta nke bụ́ eziokwu bụ “ịgụsi Akwụkwọ Nsọ ike, iji ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru n’otu ebe tụnyere ihe o kwuru n’ebe ọzọ, ikpe ekpere, nakwa ichegharị.” Gịnị ka Selariọs chọpụtara mgbe o lebachara anya na Baịbụl?

N’ọnwa Julaị afọ 1527, Selariọs bipụtara ihe ndị ọ chọpụtara n’akwụkwọ a kpọrọ On the Works of God. O kwuru na sakramentị nwere ihe ndị ha nọchiri anya ha. Dị ka ihe atụ, ọ sịrị na achịcha na mmanya e ji eme oriri nsọ anaghị aghọ anụ ahụ́ na ọbara Kraịst. Otu ọkachamara aha ya bụ Robin Barnes kwuru na n’akwụkwọ Selariọs dere, “ọ kọwara amụma dị iche iche dị n’Akwụkwọ Nsọ bụ́ ndị kwuru na oge na-abịa mgbe a ga-enwe ọdachi na ahụhụ n’ebe niile, e mechazie, e dozigharịa ihe niile dị n’eluigwe na n’ụwa, ihe niile adị mma.”—2 Pita 3:10-13.

Otu ihe e kwesịrị ilebara anya bụ obere ihe Selariọs dere gbasara onye Jizọs Kraịst bụ. Ọ bụ eziokwu na o kwughị hoo haa na nkụzi Atọ n’Ime Otu abụghị eziokwu, ma o gosiri na e nwere ihe dị iche na “Nna Anyị nke Eluigwe” na “Ọkpara ya bụ́ Jizọs Kraịst.” O dekwara na Jizọs bụ otu n’ime ọtụtụ chi e nwere, bụrụkwa otu n’ime ọtụtụ ụmụ Chineke onye pụrụ ime ihe niile.—Jọn 10:34, 35.

 Otu nwoke aha ya bụ Rọbọt Wọles kwuru n’akwụkwọ o dere n’afọ 1850, na ihe Selariọs dere n’akwụkwọ ya dị iche n’ihe ndị kweere n’Atọ n’Ime Otu dere n’ihe dị ka narị afọ ise gara aga. * Ọ bụ ya mere ọtụtụ ndị ọkà mmụta ji kwuo na ọ ga-abụ na Selariọs ekweghị na nkụzi Atọ n’Ime Otu bụ eziokwu. E kwuola na Selariọs so ná ndị Chineke ji mee “ka ndị mmadụ mata ezi Chineke na Kraịst.”

Ọ TỤRỤ ANYA NA CHỌỌCHỊ KATỌLIK GA-EMECHA KỤZIWE EZIOKWU

N’ihe dị ka afọ 1527, otu ọkà mmụta n’ihe gbasara okpukpere chi kwafetara n’obodo Witinbeg. Aha ya bụ Johanes Kampanọs. Nwoke a so ná ndị e weere ka ndị ọkà mmụta a kacha mara amara n’oge ahụ. N’agbanyeghị na Kampanọs bizi n’ebe ọtụtụ ndị chọrọ ka chọọchị Katọlik gbanwee ihe ha na-akụzi bi, ihe Matin Luta nọ na-akụzi adịghị ya mma. Gịnị mere na ọ dịghị ya mma?

Kampanọs ekwetaghị na achịcha na mmanya na-agbanwe ghọọ anụ ahụ́ na ọbara Kraịst n’oge a na-edo Mas. O kwetaghịkwa ihe Luta na-akụzi nke bụ́ na anụ ahụ́ na ọbara Kraịst na-abanye n’achịcha na mmanya ahụ. Otu onye na-ede akwụkwọ aha ya bụ André Séguenny kwuru na Kampanọs kweere na “o nweghị ihe achịcha ahụ na-aghọ, kama, ebe ọ bụ sakramentị, ọ nọchiri anya ahụ́ Kraịst.” Ná nnọkọ e nwere na Mabọg n’afọ 1529 ka e kwuo ihe na-eme achịcha na mmanya mgbe a na-edo mas, e kweghị Kampanọs kwuo ihe ọ mụtara n’Akwụkwọ Nsọ. Ndị ha na ya so agba nkụzi chọọchị Katọlik ụkwụ na Witinbeg mechara gbaa ya mkpe.

Johanes Kampanọs gbara nkụzi Atọ n’Ime Otu ụkwụ n’akwụkwọ a o dere nke aha ya bụ Restitution

Ihe kacha wute ndị ahụ gbara Kampanọs mkpe bụ ihe Kampanọs kweere banyere Nna, Ọkpara, na mmụọ nsọ. N’akwụkwọ Kampanọs dere n’afọ 1532, o kwuru na Jizọs dị iche, Nna ya adịrị iche. Ọ kọwara na otú Nna ahụ na Ọkpara ya si ‘bụrụ otu’ bụ otú di na nwunye si bụrụ “otu anụ ahụ́,” ya bụ, ha abụọ na-emekọ ihe. Ma, otu onye dị iche n’ibe ya. (Jọn 10:30; Matiu 19:5) Kampanọs sịrị na e kwukwara ụdị ihe a n’Akwụkwọ Nsọ mgbe a chọrọ igosi anyị na Nna ahụ karịrị Ọkpara ya. Baịbụl sịrị: ‘Nwoke bụ isi nke nwaanyị; Chineke bụkwa isi nke Kraịst.’—1 Ndị Kọrịnt 11:3.

Oleekwanụ ihe Kampanọs kwuru gbasara mmụọ nsọ? Na nke a, o sokwaara ihe Baịbụl kwuru. Ọ sịrị: “O nweghị ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru nke gosiri na Mmụọ Nsọ bụ onye nke atọ . . . E kwesịrị ịghọta mmụọ Chineke ka ihe o ji arụ ọrụ, ya bụ na Chineke ji ike ya a na-anaghị ahụ anya akwadebe ihe niile ọ chọrọ ịkwadebe, jirikwa ya na-arụ ihe niile ọ chọrọ ịrụ.”—Jenesis 1:2.

Luta kpọrọ Kampanọs onye na-ekwulu Chineke na onye iro Ọkpara Chineke. Otu onye ọzọ so ná ndị ahụ gbara Kampanọs mkpe gwara ndị ibe ya ka ha gbuo Kampanọs. Ma, ihe ndị a emeghị ka ike gwụ Kampanọs. Otu akwụkwọ kwuru, sị: “Kampanọs kwetasiri ike na ihe mere chọọchị Katọlik ji kụọ afọ n’ala bụ na ha hapụrụ ihe a si na Baịbụl ndịozi ghọtara gbasara Chineke na mmadụ gaa kụziwe ihe ọzọ.”

Ma, Kampanọs achọghị imepe chọọchị nke ya. Ọ sịrị na mbọ niile ya gbara ka ya chọta ebe a na-akụzi eziokwu “n’etiti òtù dị iche iche na ndị hapụrụ chọọchị Katọlik” enweghị isi. N’ihi ya, o chere na chọọchị Katọlik ga-emecha kụziwe ihe ezigbo Ndị Kraịst kwesịrị  ịna-akụzi. Ma, ndị isi chọọchị Katọlik mechara nwụchie Kampanọs. O nwekwara ike ịbụ na ọ nọruru afọ iri abụọ n’ụlọ mkpọrọ. Ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme chere na Kampanọs nwụrụ n’ihe dị ka afọ 1575.

“NA-ACHỌPỤTANỤ IHE NIILE”

Kapito, Selariọs, Kampanọs na ndị ọzọ mụsiri Baịbụl ike ka ha mata ihe dị iche n’eziokwu na ụgha. N’agbanyeghị na Baịbụl akwadochaghị ihe niile ha kweere, ha wedara onwe ha ala ma nyochaa Akwụkwọ Nsọ, jirikwa eziokwu ha mụtara kpọrọ ihe.

Pọl onyeozi gwara Ndị Kraịst ibe ya, sị: “Na-achọpụtanụ ihe niile; jisiekwanụ ihe dị mma aka ike.” (1 Ndị Tesalonaịka 5:21) Ndịàmà Jehova chọrọ inyere gị aka ka ị mụta eziokwu. Ọ bụ ya mere ha ji bipụta akwụkwọ aha ya bụ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?

^ para. 4 Gụọ Ụlọ Nche Jenụwarị 15, 2012, peeji nke 7-8, paragraf nke 14-17. Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya.

^ para. 17 Akwụkwọ ahụ kwuru na ọ na-abụ Selariọs dewe gbasara Kraịst, ọ naghị ede ya “Chi” kama ọ na-eji aka akwụkwọ ntakịrị ede ya “chi.” Naanị mgbe ọ na-ede “Chi” bụ ma o dewe gbasara Chineke Onye Kasị Elu.