Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE JUN 2014

Ị̀ Tatụla Achịcha ahụ Na-enye Ndụ?

Ị̀ Tatụla Achịcha ahụ Na-enye Ndụ?

E NWERE ndị gara ilegharị anya n’obodo Betlehem. Ha nọ na-elegharị anya n’ebe dị iche iche dị kemgbe na Betlehem. Mgbe agụụ bidoro ịgụ ha, ha chọwara ebe ha ga-ahụ nri ndị obodo ahụ. Otu onye n’ime ha hụrụ ebe a na-ere nri. Ihe a na-ere ebe ahụ bụ nri a na-akpọ falafel. Ihe e ji eme falafel bụ àgwà e gwere egwe, tomato, yabaasị, na ihe ndị ọzọ. A na-erikọta nri a na achịcha dị mbadamba a na-akpọ achịcha pita. Nri a ha riri tọrọ ha ụtọ, meekwa ka ha nweta ume ha ga-eji gachapụ ebe ha gafọrọ.

Ndị ahụ gara ilegharị anya amaghị na ọ dịla ezigbo anya e mewere achịcha ahụ na Betlehem. O nwere ike ịbụ na e mewala ya tupu e bido ime ihe ndị ọzọ ha hụrụ n’ụbọchị ahụ. Ihe Betlehem pụtara bụ “Ụlọ Achịcha,” ọ dịkwala ezigbo anya e mewere achịcha na Betlehem. (Rut 1:22; 2:14) Achịcha ahụ a na-akpọ achịcha pita so n’achịcha a na-eme na Betlehem n’oge a.

Ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ puku afọ anọ gara aga, nwunye Ebreham aha ya bụ Sera ji aka ya meere ndị ọbịa atọ ha na-atụghị anya na ha na-abịa achịcha ha ga-ata. N’oge ahụ, Ebreham na Sera bi n’ebe dị nso n’ebe ndịda Betlehem. (Jenesis 18:6) O nwere ike ịbụ ụdị ọka wit a na-akpọ ema ma ọ bụ ọka bali ka Sera “gwere nke ọma,” jiri ya mee achịcha ahụ. Sera kwadoro achịcha ahụ ọsọ ọsọ. Ọ ga-abụkwa n’elu nkume dị ọkụ ka o dosara ya ka o ghee.—1 Ndị Eze 19:6.

Akụkọ a gosiri na ndị ezinụlọ Ebreham na-eji aka ha eme achịcha ha na-ata. Ebe ọ bụ na ọ na-abụ ha bitụ otu ebe, ha akwaga ebe ọzọ, ọ pụtara na ọ bụghị ụdị ekwú a na-ejikarị eme achịcha n’obodo Sera, bụ́ Ọọ, ka Sera na ndị na-ejere ya ozi ji eme achịcha ha. Sera na-esi n’ọka ndị a kụrụ n’obodo ọ bụla ha bi enweta ọka ọ na-egwe. Igwe ọka adịghị mfe n’oge ahụ n’ihi na ihe e ji egwe ya bụ obere nkume igwe nri ma ọ bụkwanụ ikwe na ọdụ.

Mgbe narị afọ anọ gachara, Mozis nyere ụmụ Izrel iwu na ọ bụrụ na mmadụ agbazinye onye ọzọ ego, ọ gaghị eburu nkume igwe nri onye ahụ ọ gbazinyere ego ka ọ bụrụ ihe ibé n’ihi na nkume igwe nri bụ “mkpụrụ obi” onye ahụ, ya bụ, ihe o ji azọ onwe ya ndụ. (Diuterọnọmi 24:6) Chineke weere nkume igwe nri ka ihe dị ezigbo mkpa n’ihi na e buru ya, ezinụlọ nwe ya agaghị emeli achịcha ha ga-ata n’ụbọchị.—Gụọ igbe isiokwu ya bụ “ Otú E Si Egwe Ọka na Otú E Si Eme Achịcha n’Oge Baịbụl.”

ACHỊCHA NA-EME KA MMADỤ NWEE UME

Na Baịbụl, e kwuru banyere achịcha ihe karịrị narị ugboro atọ na iri ise. Ndị dere Baịbụl kpọkwara ihe oriri achịcha n’ọtụtụ ebe na Baịbụl. Jizọs gosiri na ndị na-efe Chineke nwere ike ịrịọ Chineke ka o nye ha “nri taa maka ụbọchị taa.” (Matiu 6:11) Mgbe Jizọs kwuru ihe a, ihe ọ kpọrọ nri a bụ achịcha. Ihe a o kwuru gosiri na anyị nwere ike ịtụkwasị Chineke obi na ọ ga-enye anyị ihe anyị ga-eri n’ụbọchị ọ bụla.—Abụ Ọma 37:25.

Ma, e nwere ihe ka achịcha ma ọ bụ nri mkpa. Jizọs sịrị: “Ọ bụghị naanị achịcha ga-eme ka mmadụ dị ndụ, kama ọ bụ okwu niile nke na-esi n’ọnụ Jehova pụta.” (Matiu 4:4) Jizọs na-ekwu ihe mere n’oge Chineke na-enye ndị Izrel ihe niile ha na-eri. Ọ bụ mgbe ha ka si n’Ijipt pụta ka o bidoro nyewe ha ihe oriri. Ihe dị ka otu ọnwa ndị Izrel batara n’Ọzara Saịnaị, nri ha gwụwara n’ike n’ike. Ha tụwara ụjọ na agụụ nwere ike igbu ha n’ala ịkpa ahụ, ha ejiri iwe mee mkpesa. Ha sịrị na ha na-ataju achịcha afọ, ya bụ na ha “na-eriju ihe oriri afọ” n’Ijipt.—Ọpụpụ 16:1-3.

O doro anya na achịcha ndị Ijipt na-atọ ezigbo ụtọ. N’oge Mozis nọ ndụ, ndị ọrụ ha bụ ime achịcha na-emere ndị Ijipt ụdị achịcha na keeki dị iche iche. Ma,  o nweghị mgbe Jehova bu n’obi na ya agaghị enye ndị ya achịcha ọ bụla. O kwere ha nkwa, sị: “M ga-eme ka ihe oriri si n’eluigwe zooro unu dị ka mmiri.” N’isi ụtụtụ echi ya, ihe oriri si n’eluigwe daara ha otú ahụ Chineke kwuru. Ihe oriri ahụ “dị imurimu imurimu,” o yikwara igirigi. Ụbọchị mbụ ụmụ Izrel hụrụ ya, ha nọ na-asị, “Gịnị ka ọ bụ?” Mozis gwara ha, sị: “Ọ bụ achịcha Jehova nyere unu ka unu na-eri.” Ha gụrụ ya mana, * ọ bụkwa ya ka ha riri afọ iri anọ.—Ọpụpụ 16:4, 13-15, 31.

Ọ ga-abụ na obi dị ụmụ Izrel ụtọ ná mmalite na Chineke nyere ha mana. Mana na-atọ ka “achịcha dị mbadamba e tinyere mmanụ aṅụ.” E nwekwara nke ga-ezuru onye ọ bụla. (Ọpụpụ 16:18) Ma ka oge na-aga, nri dị iche iche ha riri n’Ijipt bidoro gụwa ha. Ha tamuru ntamu, sị: “O nweghị ihe ọ bụla ọzọ anya anyị na-ahụ ma ọ bụghị mana.” (Ọnụ Ọgụgụ 11:6) Ha mechara jiri iwe kwuo, sị: ‘Mkpụrụ obi anyị akpọwo ihe oriri a na-enweghị isi asị.’ (Ọnụ Ọgụgụ 21:5) ‘Achịcha ahụ si n’eluigwe’ gbụrụ ha, sọwakwa ha oyi.—Abụ Ọma 105:40.

ACHỊCHA NKE NA-ENYE NDỤ

Achịcha so n’ọtụtụ ihe ndị mmadụ nwere ike iwere ka ihe ndị na-adịchaghị mkpa. Ma, Baịbụl kwuru na e nwere achịcha pụrụ iche nke anyị na-ekwesịghị ileda anya. Jizọs ji achịcha ahụ tụnyere mana ahụ ụmụ Izrel jụrụ. Achịcha ahụ nwere ike ịbara mmadụ uru ruo mgbe ebighị ebi.

Jizọs gwara ndị na-ege ya ntị, sị: “Abụ m achịcha na-enye ndụ. Nna nna unu hà riri mana n’ala ịkpa ma mechaa nwụọ. Nke a bụ achịcha ahụ nke si n’eluigwe bịa, ka onye ọ bụla wee rie ya ma ghara ịnwụ. Abụ m achịcha na-enye ndụ nke si n’eluigwe bịa; ọ bụrụ na onye ọ bụla erie achịcha a, ọ ga-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi; n’eziokwu, achịcha ahụ m ga-enye bụ anụ ahụ́ m n’ihi ndụ nke ụwa.”—Jọn 6:48-51.

 Ọtụtụ n’ime ndị Jizọs gwara ihe a aghọtaghị ihe “achịcha” na “anụ ahụ́” ọ na-ekwu okwu ha bụ. Ọ bụghị achịcha nkịtị na anụ ahụ́ nkịtị ka ọ na-ekwu. Achịcha nkịtị ndị Juu na-ata mere ka ha dị ndụ otú ahụ mana ụmụ Izrel riri afọ iri anọ mgbe ha nọ n’ala ịkpa mere ka ha dị ndụ. N’agbanyeghị na ọ bụ Chineke nyere ụmụ Izrel mana, mana emeghị ka ndị riri ya nwee ndụ ebighị ebi. Ma, àjà Jizọs chụrụ ga-eme ka ndị nwere okwukwe na ya nwee ndụ ebighị ebi. N’eziokwu, Jizọs bụ “achịcha na-enye ndụ.”

O nwere ike ịbụ na ị na-ewere achịcha ata ma agụụ gụwa gị. O nwekwara ike ịbụ na ị na-ekele Chineke maka achịcha ma ọ bụ “nri nke ụbọchị taa.” (Matiu 6:11, Baịbụlụ Nsọ nke International Bible Society) Ọ bụ eziokwu na ihe oriri a kwọrọ aka sie na-adị anyị mma, ma anyị ekwesịghị ichefu uru ‘achịcha ahụ na-enye ndụ,’ bụ́ Jizọs Kraịst, baara anyị.

Olee ihe anyị ga-eme nke ga-egosi na anyị ji achịcha ahụ na-enye ndụ kpọrọ ihe nakwa na anyị adịghị ka ụmụ Izrel ndị dịrị ndụ n’oge Mozis, bụ́ ndị na-ejighị mana Chineke nyere ha kpọrọ ihe? Jizọs sịrị: “Ọ bụrụ na unu hụrụ m n’anya, unu ga-edebe ihe niile m nyere n’iwu.” (Jọn 14:15) Ọ bụrụ na anyị ana-erubere Jizọs isi, anyị ga-enwe olileanya ịdị ndụ ruo mgbe ebighị ebi mgbe anyị ga na-ata achịcha, obi ana-atọ anyị ụtọ.—Diuterọnọmi 12:7.

^ para. 10 O nwere ike ịbụ na ebe e si nweta okwu bụ́ “mana” bụ n’okwu Hibru bụ́ “man hu’?” nke pụtara “gịnị ka ọ bụ?”