Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE MEE 2014

 ṄOMIE OKWUKWE HA | MERI

O Diri Ọnwụ Nwa Ya

O Diri Ọnwụ Nwa Ya

MERI gbusara ikpere n’ala na-ebe ákwá. Otú obi si jọọ ya njọ abụghị ihe e ji ọnụ ekwu. Nwa ya tara ahụhụ ọtụtụ awa n’elu osisi tupu ya ekubie ume. Ọ dịkwa ya ka ọ̀ ka na-anụ mkpu ikpeazụ nwa ya tiri. Ọchịchịrị gbara n’obodo ahụ n’elekere iri na abụọ nke ehihie. Ugbu a, ala amaakwala jijiji. (Matiu 27:45, 51) O nwere ike ịdị Meri ka Jehova ò ji ọchịchịrị ahụ gbaranụ na ala ọma jijiji ahụ merenụ na-egosi ndị mmadụ na ọnwụ Jizọs Kraịst wutere ya karịa otú o wutere onye ọ bụla ọzọ.

Meri nọ ebe ahụ a na-akpọ Gọlgọta ma ọ bụ Ebe Okpokoro Isi na-eruru nwa ya uju. Anwụ na-acha n’ehihie ahụ. Anwụ ahụ jikwa nke nta nke nta mee ka ebe niile gbachapụ. (Jọn 19:17, 25) Ọ ga-abụ na e nwere ọtụtụ ihe Meri chetara. Otu n’ime ha nwere ike ịbụ ihe mere n’afọ iri atọ na atọ tupu mgbe ahụ. Ya na Josef ku ọmarịcha nwa ha bịa n’ihu Chineke n’ụlọ nsọ dị na Jeruselem. Ka ha nọ n’ebe ahụ, otu agadi nwoke aha ya bụ Simiọn si n’ike mmụọ nsọ buo amụma. O kwuru ihe ndị dị ebube Jizọs ga-eme, kwuokwa na otu ụbọchị, ọ ga-adị Meri ka à manyere ya ogologo mma agha n’obi. (Luk 2:25-35) Ọ bụzi ugbu a nwa ya nwụrụ ka ọ ghọtara ihe ahụ Simiọn gwara ya.

Ọnwụ Jizọs wutere Meri. Ọ dị ya ka è ji mma agha maa ya n’obi

Ndị mmadụ ekwuola na o nweghị ihe na-agbawa obi ka nwa mmadụ ịnwụ. Ọnwụ bụ onye iro kacha njọ anyị nwere, o nweghịkwa onye ga-asị na e nwetụbeghị onye ọ hụrụ n’anya nwụrụnụ. (Ndị Rom 5:12; 1 Ndị Kọrịnt 15:26) Ọ bụrụ na onye mmadụ hụrụ n’anya anwụọ, ọ̀ ga-edili ya? Anyị ga-eleba anya n’ihe mere ná ndụ Meri malite mgbe Jizọs bidoro ikwusa ozi ọma ruo mgbe ọ nwụrụ, a kpọlite ya n’ọnwụ. Anyị ga-esi na ya mụta ọtụtụ ihe banyere okwukwe Meri n’ihi na ọ bụ okwukwe ya nyeere ya aka idi ọnwụ nwa ya.

“IHE Ọ BỤLA Ọ GWARA UNU, MEENỤ YA”

Ka anyị burugodị ụzọ leba anya n’ihe mere afọ atọ na ọnwa isii tupu mgbe ahụ. Meri chọpụtara na ihe na-aga ịgbanwe n’ala Izrel. N’obere obodo ha bụ́ Nazaret, ndị mmadụ na-ekwu banyere Jọn onye na-eme baptizim na ozi ọ na-ezisa. Ọ nọ na-agwa ndị mmadụ ka ha chegharịa. Meri chọpụtara na ọkpara ya weere ozi ahụ Jọn na-ezisa ka ihe na-egosi na oge ọ ga-eji ebido ozi nke ya eruola. (Matiu 3:1, 13) Ma, ọ bụrụ na Jizọs ahapụ Meri na ụmụ ya bido ozi ya, ọ ga-enyetụ Meri na ụmụ ya nsogbu. Gịnị mere anyị ji kwuo otú ahụ?

Ọ ga-abụ na Josef, bụ́ di Meri, anwụọla mgbe ahụ. Ọ bụrụ na ọ nwụọla, ihe ọ pụtara bụ na Meri amarala otú imi na anya na-adị onye mmadụ nwụnahụrụ. * Ihe a na-akpọ Jizọs n’oge ahụ abụghị naanị “nwa ọkwá nkà,” a na-akpọkwa ya “ọkwá nkà.” Ihe a a na-akpọ Jizọs gosiri na ọ rụwaziri ọrụ Josef na-arụbu ma na-akpa afọ ezinụlọ ha. Ma ó nweghị ihe ọzọ, ọ na-akpa afọ ụmụnne ya isii ọ tọrọ. (Matiu 13:55, 56; Mak 6:3) Ọ bụrụgodị na Jizọs akụzierela Jems ọrụ ịkwa nkà mgbe ahụ, maka na o nwere ike ịbụ ya na-esote Jizọs, ihe agaghị adịchara ndị ezinụlọ ya mfe ma ọ hapụ ha. Ọrụ Meri na-arụ n’ụlọ karịrị akarị. Ọ̀ ga-abụ na ụjọ na-atụ ya na Jizọs ga-ahapụ ha? Anyị amaghị. Ma ajụjụ ka mkpa bụ: Olee ihe Meri ga-eme ma Jizọs onye  Nazaret ghọọ Jizọs Kraịst, ya bụ, Mesaya ahụ e kwere ná nkwa? Otu akụkọ a kọrọ na Baịbụl ga-aza anyị ajụjụ a.—Jọn 2:1-12.

Jizọs gakwuuru Jọn ka o mee ya baptizim. Mgbe e mechara ya baptizim, ọ ghọrọ Onye Chineke Tere Mmanụ ma ọ bụ Mesaya. (Luk 3:21, 22) Ọ bụ mgbe ahụ ka ọ malitere ịhọrọ ndị ga-abụ ndị na-eso ụzọ ya. N’agbanyeghị na ọrụ ya dị ezigbo mkpa, o wepụtara ohere ka ya na ndị ezinụlọ ya na ndị enyi ya kporie ndụ. Ya na nne ya na ndị na-eso ụzọ ya na ụmụnne ya so gaa oriri agbamakwụkwọ e nwere na Kena. Kena dị ihe dị ka kilomita iri na atọ ma e si Nazaret gawa ya. O nwere ike ịbụ na Kena dị n’elu ugwu. Mgbe a na-eri oriri agbamakwụkwọ ahụ, Meri chọpụtara na e nwere nsogbu. O nwere ike ịbụ na ọ hụrụ na ahụ́ erughịzi ụfọdụ ndị ezinụlọ di na nwunye ahụ ala n’ihi otú ha si na-elerịta ibe ha anya ma na-atakwunyere ibe ha okwu ná ntị. Nsogbu ha bụ na mmanya ha agwụla. N’ala Izrel, ọ bụrụ na ụdị ihe a emee, ihere na-ejide ezinụlọ kpọrọ ndị mmadụ oriri n’ihi na a na-ewere ya na ha eleghị ndị ha kpọrọ oriri ọbịa nke ọma. Oriri ahụ agaghịzi adị ndị bịara ya ụtọ. Ihe a Meri chọpụtara metụrụ ya n’obi, ya agakwuru Jizọs.

Ọ gwara Jizọs na “ha enweghị mmanya.” Olee ihe ọ chọrọ ka Jizọs mee? Anyị amaghị. Ma, otu ihe doro ya anya bụ na nwa ya ga-arụ ọrụ ndị dị egwu. O nwere ike ịbụ na Meri tụrụ anya na Jizọs ga-amalite ịrụ ọrụ ndị ahụ n’oge ahụ. Ihe ọ na-agwa Jizọs bụ, “Nwa m, biko nyere ndị a aka.” O doro anya na ihe Jizọs gwaziri ya juru ya anya. Jizọs sịrị ya: “Nwaanyị, gịnị jikọrọ mụ na gị?” Ụfọdụ na-asị na ihe a Jizọs gwara nne ya bụ mkparị. Ma, ọ bụghị mkparị. Ihe o mere bụ ịbatụrụ ya mba. Jizọs na-agwa Meri na ọ bụghị ya ga-agwa ya otú ọ ga-esi na-eje ozi ya. Ọ bụ naanị Nna ya, bụ́ Jehova, kwesịrị ime otú ahụ.

Meri nabatara ihe ahụ nwa ya gwara ya n’ihi na ọ dị umeala n’obi, ọ na-aghọtakwa ihe ngwa ngwa. Ọ gwaziri ndị na-eje ozi, sị: “Ihe ọ bụla ọ gwara unu, meenụ ya.” Meri chọpụtara na ọ bụghịzi ya ga na-agwa nwa ya ihe ọ ga-eme, kama ọ bụ nwa ya ga na-agwa ma yanwa ma ndị ọzọ ihe ha ga-eme. Ma, ihe ahụ nne ya gwara ya metụrụ ya n’obi otú o metụrụ nne ya. N’ihi ya, o mere ka mmiri ghọọ mmanya. Ihe a bụ ọrụ ebube mbụ Jizọs rụrụ. Gịnịzi mere mgbe ọ rụchara ọrụ ebube a? Baịbụl sịrị na ‘ndị na-eso ụzọ ya nwere okwukwe n’ebe ọ nọ.’ Meri nwekwara okwukwe na Jizọs. O weere Jizọs ka Onyenwe ya na Onye Nzọpụta ya, ọ bụghị naanị ka nwa ya.

Ndị nne na nna nwere ọtụtụ ihe ha ga-amụta n’aka Meri. N’eziokwu, o nweghị nne ma ọ bụ nna zụtụrụla nwatakịrị dị ka Jizọs. Ma, mgbe nwatakịrị ghọrọ dimkpa, o nwere ike isitụrụ ndị mụrụ ya ike ịghọta na ọ bụkwaghị nwata. Nne na nna nwere ike ịna-eme nwa ha torola eto ka ọ̀ ka bụ nwata. Ma, ime otú ahụ adịghị mma. (1 Ndị Kọrịnt 13:11) Olee otú nne ma ọ bụ nna nwere ike isi nyere nwa ya torola eto aka? Otu ụzọ ọ ga-esi eme ya bụ ime ka nwa ya mara na obi siri yanwa bụ́ nne ya ma ọ bụ nna ya ike na ọ ga na-eme ihe Baịbụl kwuru nakwa na Jehova ga-agọzi ya ma ọ na-eme otú ahụ. Ọ bụrụ na nne na nna ana-eme otú ahụ, ọ ga-abara ụmụ ha ezigbo uru. O doro anya na otú Meri si nyere Jizọs aka n’afọ ndị sochirinụ mere ka obi tọọ Jizọs ụtọ.

“ỤMỤNNE YA NDỊ IKOM ENWEGHỊ OKWUKWE N’EBE Ọ NỌ”

Matiu, Mak, Luk, na Jọn kọrọ ọtụtụ ihe mere n’ime afọ atọ na ọnwa isii Jizọs kwusara ozi ọma. Ma, o nweghị oké ihe ha kọrọ banyere Meri. Ọ gaghị adịrị ya mfe iso Jizọs na-aga ezi ndị mmadụ ozi ọma n’ebe niile n’ala Izrel n’ihi na o nwere ike ịbụ na ụfọdụ ụmụnne Jizọs ka dị obere mgbe ahụ. O nwekwara ike ịbụ naanị Meri na-elekọta ha n’ihi na ọ ga-abụ  na di ya anwụọla. (1 Timoti 5:8) Ma, Meri ka na-echebara ihe ndị ọ mụtara gbasara Mesaya echiche. Ọ na-agakwa n’ụlọ nzukọ ndị Juu dị na Nazaret anụrụ okwu Chineke otú ndị ezinụlọ ya na-eme kemgbe.—Luk 2:19, 51; 4:16.

Ọ ga-abụ na Meri so ná ndị gere Jizọs ntị mgbe o ziri ndị mmadụ ihe n’ụlọ nzukọ dị na Nazaret. Jizọs gwara ha banyere amụma e buru ọtụtụ narị afọ tupu mgbe ahụ gbasara Mesaya, gwakwa ha na amụma ahụ mezuru n’isi ya n’ụbọchị ahụ. O doro anya na obi tọrọ Meri ezigbo ụtọ mgbe ọ nụrụ ihe a nwa ya kwuru. Ma, ọ ga-ewute Meri mgbe ọ hụrụ na ndị Nazaret ibe ya ekwetaghị na Jizọs bụ Mesaya. Ha nwadịrị ka ha gbuo nwa ya.—Luk 4:17-30.

Ihe ọzọ wutere Meri bụ na ụmụnne Jizọs ndị nwoke ekweghị na Jizọs. Akwụkwọ Jọn 7:5 gosiri na ụmụnne ya ndị nwoke anọ enweghị okwukwe ka Meri. Ebe ahụ sịrị: “Ụmụnne ya ndị ikom enweghị okwukwe n’ebe ọ nọ.” Ọ dịkarịa ala, Jizọs nwere ụmụnne nwaanyị abụọ. Ma, Baịbụl agwaghị anyị ma hà nwere okwukwe na Jizọs. * Ma hà nwere ma ọ bụ na ha enweghị, Meri hụrụ otú obi na-adị onye na-efe Chineke ma ọ bụrụ na ndị ezinụlọ ya esoghị ya efe Chineke. Ihe ọ pụtara bụ na Meri ga-agbarịrị mbọ ka ọ nọsie ike na-efe Chineke, na-agbalịkwa ka ndị ezinụlọ ya soro ya fewe Chineke. Ọ ga na-eme ya otú ọ na-agaghị adị ka ọ̀ na-amanye ha amanye ka ha soro ya ma ọ bụ otú na-agaghị esere ha na ya okwu.

O nwere mgbe ndị ikwu Jizọs gara ka ha “jide” Jizọs. Ọ ga-abụ na ụmụnne ya ndị nwoke so ha gaa. Ha nọ na-asị na “isi emebiela” Jizọs. (Mak 3:21, 31) Meri ma na isi emebighị Jizọs. Ma, ihe mere o ji soro ha gaa bụ na o nwere olileanya na ụmụ ya ga-amụta ihe ga-enyere ha aka ka ha nwee okwukwe na Jizọs. Hà mụtaranụ ya? N’agbanyeghị na Jizọs nọ na-arụ ọrụ ebube, na-akụzikwara ndị mmadụ ọtụtụ ihe banyere Chineke, ụmụnne ya ekweghị na ya. Meri ò were iwe ma na-ajụ onwe ya ma ò nwekwara ihe a ga-eme meta ha?

È nwere ndị ezinụlọ gị na-anaghị efe Jehova? E nwere ọtụtụ ihe ị ga-amụta n’aka Meri. Meri echeghị na ndị ezinụlọ ya emekataghị fewe Chineke. Kama, o mere ka ha hụ na okwukwe yanwa nwere mere ka ahụ́ ruo ya ala, meekwa ka obi na-adị ya ụtọ. Ma, ọ nọkwa na-enyere Jizọs aka. Ọ̀ na-agụ ya agụụ ịhụ Jizọs? Ò nwere mgbe ọ na-adị ya ka ya bụrụ na Jizọs ka so ha biri n’ụlọ? Ọ bụrụ otú ahụ, o jidere obi ya aka. Ọ ma na e nweghị ihe a ga-eji tụnyere aka ọ na-enyere Jizọs na ume ọ na-agba ya. Ọ dịkwa mma ka ị na-enyere ụmụ gị aka ka ha were ofufe Chineke ka ihe kacha mkpa ná ndụ ha.

‘A GA-AMANYE OGOLOGO MMA AGHA N’IME MKPỤRỤ OBI GỊ’

Okwukwe Meri nwere na Jizọs ọ̀ baara ya uru? Jehova na-agọzi ndị nwere okwukwe. Ọ gọzikwara Meri. (Ndị Hibru 11:6) Chegodị echiche otú obi dị ya mgbe ọ nọ na-anụ ihe nwa ya Jizọs na-akụzi nakwa ihe ndị Jizọs kụziiri ihe na-ekwu.

Ọtụtụ ihe atụ Jizọs mere mgbe ọ na-akụzi ihe gosiri ihe ndị mere mgbe Josef na Meri na-azụ ya

Ihe atụ ndị Jizọs mere hà chetaara Meri ihe ndị mere mgbe Jizọs na-eto na Nazaret? Mgbe Jizọs kọrọ gbasara otu nwaanyị zara ụlọ ya nke ọma ka o nwee ike hụ mkpụrụ ego ya furu efu na ụmụ nwaanyị na-egwe nri nakwa oriọna a mụnyere ma dosa ya n’ebe a na-edosa oriọna, Meri ò chetara mgbe Jizọs na-ahụ ya ka ọ na-eme ihe ndị ahụ n’oge Jizọs dị obere? (Luk 11:33; 15:8, 9; 17:35) Mgbe Jizọs kwuru na yok ya adịghị egbu mgbu nakwa na ibu ya dị mfe, ọ̀ ga-abụ na Meri chetara mgbe Josef na-akụziri Jizọs otú e si arụ yok ma kpụchaa ya nke ọma otú ọ na-agaghị egbu anụmanụ mgbu? (Matiu 11:30) N’eziokwu, obi ga na-atọ Meri ụtọ mgbe ọ bụla o chetara ihe ọma Jehova meere ya, nke bụ́ ikwe ka ọ zụọ nwata nwoke ga-emecha  ghọọ Mesaya. O doro anya na obi na-atọ ya ụtọ mgbe ọ bụla ọ na-ege ntị n’ihe Jizọs na-akụzi n’ihi na Jizọs bụ ọkaibe n’ịkụzi ihe. Jizọs na-ejikwa ihe dị iche iche ndị mmadụ na-ahụ kwa ụbọchị na ihe ndị ha na-eme akụziri ndị mmadụ ihe otú ga-eru ha n’obi.

Ma, Meri ekweghị ka ihe ọma niile a Jehova meere ya buwe ya isi. O nweghịkwa mgbe Jizọs mere ka ndị mmadụ nyewe nne ya otuto, ma ya fọdụzie ịkpọrọ ya isiala. N’oge Jizọs na-akụziri ìgwè mmadụ ihe, otu nwaanyị so na-ege ya ntị kwuru na obi ụtọ na-adịrị nwaanyị mụrụ Jizọs. Ma, Jizọs sịrị: “Ee e, kama nke ahụ, obi ụtọ na-adịrị ndị na-anụ okwu Chineke ma na-edebe ya!” (Luk 11:27, 28) E nwekwara mgbe ndị Jizọs na-akụziri ihe gwara ya na nne ya na ụmụnne ya ndị nwoke na-achọ ya. Ma, ọ gwara ha na ndị bụ́ nne ya na ụmụnne ya ndị nwoke bụ ndị na-eme uche Chineke. Meri ewesaghị Jizọs iwe maka ihe ndị a o kwuru. Ọ ghọtara na ihe ka mkpa abụghị na mmadụ na ibe ya si n’otu ezinụlọ, kama na ha na-efe Chineke.—Mak 3:32-35.

Ma, otú obi si jọọ Meri njọ mgbe ọ hụrụ ka nwa ya nwụrụ ọnwụ ike n’elu osisi abụghị ihe e ji ọnụ ekwu. Jọn onyeozi hụrụ mgbe ihe ahụ mere. O mechakwara dee na Meri “guzo n’akụkụ osisi ịta ahụhụ Jizọs” n’oge ahụ. Nwaanyị a nke hụrụ nwa ya n’anya ekweghị ka ihe ọ bụla mee ka ọ ghara iguzo n’akụkụ nwa ya ruo mgbe nwa ya kubiri ume. Mgbe Jizọs hụrụ Meri, ọ gwara ya okwu n’agbanyeghị na iku ume na ikwu okwu na-esiri ya ezigbo ike. Ọ gwara onyeozi ya ọ hụrụ n’anya, bụ́ Jọn, ka o lekọtawa nne ya. Ihe mere o ji gwa Jọn ka o lekọtawa nne ya bụ na ụmụnne ya ndị nwoke enwebeghị okwukwe na ya. Ihe a Jizọs mere gosiri na ọ dị ezigbo mkpa ka onye nwere okwukwe na Jehova na-elekọta ndị ezinụlọ ya, karịchaa, ka ọ na-akụziri ha okwu Chineke.—Jọn 19:25-27.

Mgbe Jizọs mechara nwụọ, ihe ahụ a gwara Meri mgbe ya na Josef ku Jizọs gaa Jeruselem mezuru. Otú ọnwụ Jizọs si wute Meri mere ka ọ dị ya ka à manyere ya ogologo mma agha n’obi. Ọ bụrụ na o siiri anyị ike ịghọtacha otú obi dị Meri mgbe ahụ ọ na-eru uju, ọ ga-esikwara anyị ike ịghọtacha otú obi tọruru ya ụtọ mgbe Chineke mechara kpọlite Jizọs n’ọnwụ n’ụbọchị nke atọ. Ọrụ ebube a Meri hụrụ bụ ọrụ ebube kachanụ a rụtụrụla. Ihe ọzọ mere ka obi tọọ Meri ụtọ bụ na Jizọs mechara pụta n’ihu Jems nwanne ya. Ọ ga-abụ na Jems nọ naanị ya mgbe ahụ. (1 Ndị Kọrịnt 15:7) Otú ahụ Jizọs si pụta n’ihu Jems metụrụ ma Jems ma ụmụnne ya ndị nwoke n’obi. Baịbụl gosiri na ha mechara kwere na Jizọs bụ Kraịst. Mgbe obere oge gachara, ha sooro nne ha gaa n’ebe Ndị Kraịst zukọrọ ma “nọgide na-ekpe ekpere.” (Ọrụ Ndịozi 1:14) Mmadụ abụọ n’ime ha, ya bụ, Jems na Jud, mechara soro dee Baịbụl.

Obi tọrọ Meri ezigbo ụtọ na ụmụ ya ndị nwoke ghọrọ Ndị Kraịst

Ihe ikpeazụ Baịbụl gwara anyị banyere Meri bụ na ya na ụmụ ya ndị nwoke so ná Ndị Kraịst zukọrọnụ na-ekpe ekpere. Otú a Baịbụl si pịachie akụkọ Meri magburu onwe ya. Anyị kwesịrị iṅomi ihe ahụ o mere. Okwukwe ya mere ka o die ọnwụ nwa ya, meekwa ka Chineke gọzie ya. Ọ bụrụ na anyị enwee ụdị okwukwe Meri nwere, anyị ga-edi nsogbu ọ bụla nwere ike ịbịara anyị n’ụwa ọjọọ a otú ahụ Meri diri nke ya. Chineke ga-agọzikwa anyị karịa otú anyị tụrụ anya ya.

^ para. 8 Mgbe Baịbụl kọchara ihe Josef na Meri mere n’oge Jizọs dị afọ iri na abụọ, o nwezighị ebe Baịbụl kwuru gbasara Josef. Baịbụl mechara kwuo gbasara Meri na ụmụ ya ndị ọzọ, ma o kwughị gbasara Josef. O nwedịrị mgbe a kpọrọ Jizọs “nwa Meri” kama ịkpọ ya nwa Josef.—Mak 6:3.

^ para. 16 Ọ bụghị Josef mụrụ Jizọs. N’ihi ya, ọ bụ nne ji Jizọs na ụmụnne ya.—Matiu 1:20.