Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE MEE 2014

 ISIOKWU ỤLỌ NCHE A

È Nwere Onye Ma Ihe Ga-eme n’Ọdịnihu?

È Nwere Onye Ma Ihe Ga-eme n’Ọdịnihu?

O nweghị onye n’ime anyị na-anaghị eche gbasara ihe ga-eme n’ọdịnihu. Anyị chọrọ ịma otú ihe ga-adịrị anyị nakwa ndị anyị hụrụ n’anya. Onye ọ bụla n’ime anyị na-ajụ ajụjụ ndị a ma ọ bụ ndị yiri ya: ‘Ihe ọ̀ ga-adị mma n’ụwa mgbe ụmụ m ga-eto? Ọdachi ndị a na-enwe n’ụwa, hà ga-eme ka ụwa laa n’iyi? Ò nwere ihe m ga-eme ka ihe dịrị m mma n’ọdịnihu?’ Ihe mere anyị ji ajụ ajụjụ ndị a bụ na anyị chọrọ ka ihe anyị na-eme doo anyị anya, ka ihe na-agazi agazi, ka obi sie anyị ike, nakwa ka anyị mara ebe anyị kwụ akwụ. Ọ bụrụ na anyị amata ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu, ọ ga-eme ka anyị jikere maka ihe ọ bụla ga-emenụ, obi aghara ikoro anyị n’elu.

Ị̀ ma otú ihe ga-adịrị gị n’ọdịnihu? Ọ bụrụ na ị maghị, è nwere onye ma? Ndị ọkachamara na-agbalị ka ha kwuo ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu. Ma, ọtụtụ ihe ha na-ekwu anaghị emezu. Ọ bụ naanị Chineke sịrị na ihe niile o kwuru ga-emezu. O kwuru na ya ‘na-anọ ná mmalite kwuo ihe ga-eme n’ikpeazụ, nọrọkwa n’oge dị anya gara aga kwuo ihe a na-emebeghị eme.’ (Aịzaya 46:10) Ihe Chineke kwuru hà na-emezu n’eziokwu?

IHE GOSIRI NA IHE CHINEKE KWURU NA-EMEZU

Gịnị mere i ji kwesị ịmata ma amụma niile Chineke buru n’oge ochie hà mezuru? Weregodị ya na e nwere otu ọkachamara na-ekwu ụbọchị mmiri ga-ezo na ụbọchị anwụ ga-acha. Ọ bụrụ na mgbe ọ bụla o kwuru na mmiri ga-ezo, mmiri ezoo ma ọ bụ na anwụ ga-acha, anwụ achaa, o doro anya na ị ga-ekweta ihe o kwuru ma ọ gwa gị nke ga-eme echi. Ọ bụkwa otú ahụ ka ọ dị ma a bịa n’ihe Chineke kwuru. Ọ bụrụ na ị chọpụta na ihe ọ bụla o kwuru na-emezu, o doro anya na ị ga-ege ya ntị ma ọ gwa gị otú ihe ga-adịrị gị n’ọdịnihu.

Ebe a rụzigharịrị arụzi ná mgbidi Ninive dakasịrị adakasị

A GA-EBIBI NNUKWU OBODO:

Ọ bụrụ na e nwere nnukwu obodo nke kparala ike ọtụtụ narị afọ, o siri ike ịhụ onye ga-apụta kwuo na obodo ahụ ga-ada, ya emechaakwa daa. Chineke si n’ọnụ onye amụma ya kwuo  na ụdị ihe a ga-eme Ninive, ya bụ na a ga-ebibi ya. (Zefanaya 2:13-15) Gịnị ka ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme dere gbasara Ninive? Ha dere na n’afọ 632 Tupu Oge Ndị Kraịst, ya bụ, ihe dị ka afọ iri na ise Chineke buchara amụma ahụ, ndị Babịlọn na ndị Midia lụsoro Ninive agha ma merie ya. Chineke adịla mbụ kwuo na a ga-eme ka Ninive bụrụ ‘ebe tọgbọrọ n’efu nke dị ka ala ịkpa.’ Amụma a Chineke buru ò mezuru? Ee, o mezuru. Ọ bụ eziokwu na obodo ahụ na obodo nta ndị dị ya gburugburu buru ezigbo ibu, * ndị ahụ meriri ya ebichighị ya otú ọtụtụ ndị tụrụ anya na ha ga-eme. Kama, ha bibiri ya. È nwere onye ọkachamara ga-ekwuli ụdị ihe a gbasara ọchịchị, ya emee otú o kwuru ya?

A GA-AKPỌ ỌKPỤKPỤ NDỊ MMADỤ ỌKỤ:

Ò nwere onye obi ga-esi ike ịpụta kwuo na narị afọ atọ na-abịa abịa, otu nwoke ga-akpọ ọkpụkpụ ndị mmadụ ọkụ n’elu ebe ịchụàjà, kwuokwa obodo ebe ịchụàjà ahụ ga-adị nakwa ezinụlọ a ga-amụ nwoke ahụ? Ọ bụrụ na mmadụ ekwuo ụdị ihe a, ya emee, ọ ga-aghọ onye a ma ama. Otu onye amụma Chineke kwuru na ‘nwa nwoke a mụrụ n’ụlọ Devid, onye aha ya bụ Josaya ga-akpọ ọkpụkpụ ndị mmadụ ọkụ’ n’elu ebe ịchụàjà dị na Betel. (1 Ndị Eze 13:1, 2) Mgbe ihe dị ka narị afọ atọ gachara, a mụrụ otu eze n’ezinụlọ Devid ma gụọ ya Josaya n’agbanyeghị na e nwechaghị ndị na-aza aha ahụ n’oge a na-ede Baịbụl. Josaya mere ihe niile ahụ e kwuru na ọ ga-eme. O mere ka ‘a chịpụta ọkpụkpụ dị n’ili ma suo ha ọkụ n’elu ebe ịchụàjà’ dị na Betel. (2 Ndị Eze 23:14-16) Mmadụ ò nwere ike ibu amụma ahụ, ihe niile emezuchaa, ma ọ bụrụ na Chineke enyereghị ya aka?

Ndị amụma Chineke kwuru na Babịlọn ga-ada. Ihe ha kwuru mezuru

OBODO NA-ACHỊ ỤWA GA-ADA:

Ọ bụrụ na mmadụ apụta kwuo aha nwoke a na-amụbeghị amụ nke ga-emeri mba siri ezigbo ike na-achị ụwa, kwuokwa otú ọ ga-esi emeri mba ahụ, ọ ga-atụ ndị mmadụ n’anya ma ihe o kwuru mee. Chineke buru amụma na otu nwoke a na-akpọ Saịrọs ga-edu ndị agha ya gaa merie Babịlọn. O kwukwara na ọ ga-ahapụ ndị Juu e ji eji na Babịlọn ka ha laa nakwa na ọ ga-enyere ha aka ka ha rụgharịa ụlọ nsọ ha. Ihe ọzọ Chineke kwuru bụ otú Saịrọs ga-esi emeri Babịlọn. Ọ sịrị na ọ ga-eme ka osimiri Babịlọn taa nakwa na a gaghị emechi ọnụ ụzọ ámá ya emechi ka e nwee ike merie ya ngwa ngwa.  (Aịzaya 44:27–45:2) Ihe niile a Chineke buru n’amụma hà mezuru? Ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme kwuru na Saịrọs meriri Babịlọn n’eziokwu. Ndị agha Saịrọs mere ihe dị ezigbo ịtụnanya. Ha mere ka osimiri na-asọ n’ihu Babịlọn sọrọ gawa ebe ọzọ, ya emezie ka osimiri ahụ dị n’ihu Babịlọn taa. Ndị agha ahụ sikwa n’ọnụ ụzọ ámá Babịlọn bata n’ihi na ndị Babịlọn emechighị ọnụ ụzọ ámá ha emechi. Saịrọs mechara hapụ ndị Juu ka ha lawa, gwakwa ha na ha nwere ike ịrụzigharị ụlọ nsọ ha dị na Jeruselem. O nweghị onye tụrụ anya na Saịrọs ga-eme ihe a n’ihi na ọ naghị efe Chineke ndị Juu. (Ezra 1:1-3) E wezụga Chineke, ò nwere onye ga-ekwuli ihe niile a, ha emezuo?

Anyị elebala anya n’amụma atọ gosiri na ihe ọ bụla Chineke kwuru na-emecha mee. E nwekwara ọtụtụ ihe ndị ọzọ Chineke kwuru, ha emezuchaa. Onye ndú ndị Juu aha ya bụ Jọshụa gwara ndị Juu ibe ya ihe doro onye ukwu na onye nta n’ime ha anya. Ọ sịrị ha: ‘Unu ji obi unu dum na mkpụrụ obi unu dum mara nke ọma na ọ dịghị otu ihe n’ime ihe ọma niile Jehova bụ́ Chineke unu gwara unu nke na-emezughị. Ha niile emezuworo unu. Ọ dịghị otu ihe n’ime ha nke na-emezughị.’ (Jọshụa 23:1, 2, 14) Ndị Juu ahụ ma na Chineke na-emezu nkwa ọ bụla o kwere na amụma ọ bụla o buru. Ma, olee otú Chineke si emezu ihe niile o kwuru? Buru n’obi na otú Chineke si eme ihe dị ezigbo iche n’otú mmadụ si eme ihe. Ihe mere o ji dị mkpa ka i buru ihe a n’obi bụ na e nwere ihe dị ezigbo mkpa Chineke kwuru ga-eme n’oge na-adịghị anya. Ihe ahụ gbasakwara gị.

OTÚ IHE CHINEKE KWURU SI DỊ ICHE N’IHE MMADỤ KWURU

Ndị mmadụ na-esikarị n’ihe ndị ọkà mmụta sayensị chọpụtara ma ọ bụ n’ihe ndị merela eme ma ọ bụ ndị nke ka na-eme eme ekwu ihe ndị ha chere ga-eme n’ọdịnihu. Ụfọdụ na-ekwu ihe ga-eme n’ọdịnihu n’ihi ihe ha nụrụ n’ọnụ ndị sịrị na ha na-ahụ ma n’ìhè ma na nzuzo. Ha kwuchaa ihe ha chere, ha anọrọzie na-ele n’anya n’anya ka ha mara ihe ga-eme.—Ilu 27:1

Ma, Chineke anaghị eme ka mmadụ. Ọ ma otú ihe niile si aga, marakwa otú ụmụ mmadụ si akpa àgwà na otú ha si eche echiche. N’ihi ya, ọ bụrụ na ọ chọrọ ịma ihe ndị mmadụ ma ọ bụ mba dị iche iche ga-eme n’ọdịnihu, ọ ga-ama. Ma, Chineke nwekwara ike ịgbanwe otú ihe si aga ka ihe o kwuru nwee ike mezuo. Ọ sịrị: ‘Okwu m nke si n’ọnụ m pụta agaghị agba aka lọghachikwute m. Ọ ga-emezu ihe m zigara ya ka o mee.’ (Aịzaya 55:11) E nwere ike ikwu na mgbe Chineke buru amụma ụfọdụ, ihe ọ na-eme bụ ịmara anyị ọkwa ma ọ bụ ịgwa anyị ihe ụfọdụ yanwa ga-eme n’ọdịnihu. Chineke na-eme ka ihe o kwuru mezuo otú o kwuru ya.

OTÚ IHE GA-ADỊRỊ GỊ N’ỌDỊNIHU

È nwere amụma e buru ga-emezu n’ọdịnihu nke gbasara gị na ndị ị hụrụ n’anya? Ọ bụrụ na ị maara na ajọ ifufe ga-efe, ị ga-eme ihe ọ bụla i nwere ike ime ka ọ ghara ịta isi gị. Ọ bụkwa ụdị ihe a ka i kwesịrị ime ma a bịa n’amụma ndị e buru na Baịbụl. Chineke ekwuola na ya na-aga ịgbanwe ọtụtụ ihe n’ụwa n’oge na-adịghị anya. (Gụọ igbe isiokwu ya bụ: “ Ihe Chineke Kwuru na Ya Ga-eme n’Ọdịnihu.”) Ihe ndị ahụ Chineke kwuru dị ezigbo iche n’ihe ndị sịrị na ha bụ ndị ọkachamara na-ekwu.

Ihe anyị na-ekwu bụ na Baịbụl agwala anyị otú ihe ga-esi aga n’ụwa a. Ọ bụrụ na ị gụọ ya, ị ga-amata ihe ndị ga-emecha mee. Chineke kwuru na ya “na-anọ ná mmalite kwuo ihe ga-eme n’ikpeazụ.” O kwukwara na ‘ihe ya kpebiri ga-adịgide nakwa na ya ga-eme ihe niile dị ya ụtọ.’ (Aịzaya 46:10) N’eziokwu, ihe nwere ike ịdịrị gị na ndị ezinụlọ gị mma n’ọdịnihu. Jụọ Ndịàmà Jehova ka ha gwa gị ihe Baịbụl kwuru ga-eme n’oge na-adịghị anya. Ndịàmà Jehova anaghị agba afa, ha anaghịkwa ekwu na e nwere mmụọ na-agwa ha okwu. Ihe ọzọ bụ na ha enweghị ike pụrụ iche ha ji amata ihe ga-eme n’ọdịnihu. Kama, ha na-amụsi Baịbụl ike. N’ihi ya, ha nwere ike ịgwa gị ọtụtụ ihe ọma Chineke na-akwadebere gị ka ihe dịrị gị mma n’ọdịnihu.

^ para. 7 Obosara ya dị ihe dị ka narị kilomita ise na iri na asatọ.