Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE EPREL 2014

I Nwere Ike Imeri Ọnwụnwa

I Nwere Ike Imeri Ọnwụnwa

“Ebughị m n’obi ile ndị gba ọtọ. Ma mgbe m gara n’Ịntanet, e nwere otu ozi pụtaranụ. Tupu mụ amara ihe na-emenụ, apịala m ya, ya ebupụta ndị gba ọtọ.”—CHRIS. *

“Otu ọmarịcha nwa agbọghọ mụ na ya na-arụkọ ọrụ bidoro kpawa m nso. Otu ụbọchị, ọ gwara m ka mụ na ya gaa na họtel gwuritụ egwu. N’eziokwu, ama m ihe ọ na-achọ.”—DAN.

ENWERE ndị ụdị ọnwụnwa a na-abụrụghị nsogbu n’ihi na ime ihe ọjọọ na-atọ ha ụtọ. Ma, e nwere ndị na-agbalịsi ike ka ha merie ọnwụnwa ọ bụla bịaara ha n’ihi na ha achọghị ka ọnwụnwa mata ha n’ọnyà. Olee ihe gịnwa chere? Ọ bụrụ na ọnwụnwa abịara gị, ì kwesịrị ikwe ka o merie gị, ka ì kwesịrị ịgbalị merie ya?

Ọ bụrụ na mmadụ ekwe ka ọnwụnwa merie ya, karịchaa ọnwụnwa ịkwa iko, o nwere ike ịkpatara ya nsogbu karịrị akarị. Ọ bụ ya mere Baịbụl ji sị na ‘onye ọ bụla na-akwa iko enweghị uche nakwa na onye ahụ na-ala mkpụrụ obi ya n’iyi.’—Ilu 6:32, 33.

Ọ bụrụ na ọnwụnwa ịkwa iko abịara gị, gịnị ka i kwesịrị ime? Baịbụl kwuru, sị: “Ihe Chineke chọrọ bụ ka e doo unu nsọ, ka unu zere ịkwa iko; ka onye ọ bụla n’ime unu mara otú ọ ga-esi jide arịa nke ya [ma ọ bụ, jide onwe ya] n’ịdị nsọ na nsọpụrụ.” (1 Ndị Tesalonaịka 4:3, 4) Olee ihe ga-enyere gị aka ka i jide onwe gị ma ọnwụnwa bịara gị? Ka anyị leba anya n’ụzọ ihe atọ nwere ike inyere gị aka.

Nke Mbụ: Ekwela Ka Anya Gị Na-ele Ihe Na-adịghị Mma

Ọ bụrụ na anyị ana-ekiri ihe na-adịghị mma, ọ ga-eme ka ihe ọjọọ gụwa anyị agụụ. Jizọs ma na nke a bụ eziokwu. Ọ bụ ya mere o ji sị na “onye ọ bụla nke na-ele nwaanyị anya, o wee gụọ ya agụụ ka ya na ya nwee mmekọahụ, ọ kwasowo ya iko n’obi ya.” O kwuziri na ‘ọ bụrụ na anya aka nri gị na-eme ka ị sụọ ngọngọ, ghụpụ ya tụfuo.’ (Matiu 5:28, 29) Gịnị ka Jizọs ji ihe a o kwuru na-akụziri anyị? Ọ na-akụziri anyị na ọ bụrụ na anyị ahụ ihe nwere ike ịnwa anyị ọnwụnwa, anyị kwesịrị iwepụ anya anyị ozugbo kama ịnọ kiriwe ya.

Ọ bụrụ na ị hụ ihe nwere ike ime ka agụụ ịkwa iko gụwa gị, wepụ anya gị ozugbo

Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na mmadụ chagidere gị ọkụ ụgbọala n’ihu, ị̀ ga-elegide ọkụ ahụ anya? Mbanụ!  Ị ga-ewepụ anya gị ozugbo ma ọ bụkwanụ were ihe kpuchie anya gị. Otú ahụ ka anyị kwesịkwara ime ma anyị hụ ihe nwere ike ime ka agụụ ịkwa iko gụwa anyị. Anyị kwesịrị iwepụ anya anyị ozugbo, ma ànyị hụrụ ya n’akwụkwọ ma ọ bụ na tiivi ma ọ bụkwanụ n’ìhè. Ekwela ka ihe ọjọọ gbaa mgbọrọgwụ n’obi gị. E nwere otu nwoke aha ya bụ John. Ọ na-ekiribu ndị gba ọtọ. O kwuru, sị: “Ọ na-abụ m hụ nwaanyị mara mma, anya m na-atọ n’ebe ọ nọ. Ana m ejisi ike wepụ anya m. Ihe na-agbatazi m n’obi bụ ikpegara Jehova ekpere ozugbo. Ọ na-abụ m kpechaa ekpere, ahụ́ adajụọ m.”—Matiu 6:9, 13; 1 Ndị Kọrịnt 10:13.

Nwoke ezi omume aha ya bụ Job kwuru, sị: “Mụ na anya m agbawo ndụ. Oleezi otú m ga-esi nwee mmasị n’ebe nwa agbọghọ na-amaghị nwoke nọ?” (Job 31:1) Ọ ga-adị mma ka i kpebie ime ihe ahụ o mere.

Megodị ihe a: Ọ bụrụ na ị hụpere ihe ga-eme ka ịkwa iko gụwa gị agụụ, wepụ anya gị ozugbo. Mee ihe otu onye so dee Baịbụl mere. O kpere ekpere, sị: “Mee ka anya m ghara ịhụ ihe na-abaghị uru.”—Abụ Ọma 119:37.

Nke Abụọ: Ekwela Ka Uche Gị Na-aga n’Ihe Ọjọọ

Ihe ọjọọ na-abata anyị niile n’obi mgbe ụfọdụ n’ihi na anyị ezughị okè. Baịbụl kwuru, sị: “A na-anwa onye ọ bụla mgbe ọchịchọ nke aka ya rapụtara ya wee rafuo ya. Mgbe ọchịchọ ahụ tụụrụ ime, ọ na-amụpụta mmehie.” (Jems 1:14, 15) Olee ihe i nwere ike ime ka ihe e kwuru n’amaokwu a ghara ime gị?

Ọ bụrụ na echiche ọjọọ abata gị n’obi, kpee ekpere ozugbo

Ọ bụrụ na ihe ọjọọ abata gị n’obi, cheta na ọ bụ gị ga-ekpebi ma ị̀ ga-eme ihe ọjọọ ahụ ma ọ bụ na ị gaghị eme ya. Enyela ya ohere. Gbaa mbọ ka i wepụ ya n’obi gị. Ekwela ka obi gị dịrị n’ihe ga-eme ka agụụ ịkwa iko na-agụ gị. O nwere otu nwoke aha ya bụ Titus. Ile ndị gba ọtọ n’Ịntanet riburu ya ahụ́. Ọ sịrị: “Ihe nyeere m aka iwepụ echiche ọjọọ n’obi m bụ na agbalịrị m ka ihe m na-eche n’echiche bụrụ ezigbo ihe. Ma, ọ dịghịrị m mfe. O nwere mgbe ọ na-abụ m gakata ihu mụ agawa azụ. Ma, emechara m mụta otú m ga-esi na-eme ka uche m hapụ ịna-aga n’ihe ọjọọ.” Otu nwaanyị aha ya bụ Elsa kwuru na ọnwụnwa bịaara ya mgbe ọ bụ agbọghọ bụ na agụụ ịkwa iko na-agụkarị ya. O kwuru na ihe nyeere ya aka  iwepụ echiche ọjọọ n’obi ya bụ na ‘ọ na-ekpegara Jehova ekpere, ọ naghịkwa anọ nkịtị.’

Megodị ihe a: Mgbe ọ bụla echiche ọjọọ batara gị n’obi, kpee ekpere ozugbo. Wepụ echiche ọjọọ ahụ n’obi gị. Otú ị ga-esi eme ya bụ ịgbalị ka ihe ị na-eche bụrụ ‘ihe bụ́ eziokwu, ihe dị mkpa, ihe ziri ezi, ihe dị ọcha, ihe na-akpali ịhụnanya, ihe a na-ekwu okwu ọma banyere ya, omume ọma na ihe kwesịrị otuto.’—Ndị Filipaị 4:8.

Nke Atọ: Kpachara Anya Ka Ị Ghara Itinye Onwe Gị ná Nsogbu

Mmadụ nwere ike ịdaba ná nsogbu ma ọnwụnwa bịara ya mgbe agụụ ime ihe ọjọọ na-agụ ya. (Ilu 7:6-23) Gịnị ka ị ga-eme ka ị ghara ịda ma ọnwụnwa bịara gị?

‘Ọ bụ naanị mgbe ndị ọzọ nọ n’ụlọ ka m na-aga n’Ịntanet’

Baịbụl kwuru, sị: “Onye maara ihe bụ onye hụrụ ọdachi gaa zoo, ma ndị na-amaghị ihe nọ na-aga, ha ga-atakwa ahụhụ ga-esi na ya pụta.” (Ilu 22:3) N’ihi ya, kpachara anya ka ị ghara ime ihe ga-etinye gị ná nsogbu. Chọpụta ihe ndị nwere ike ịkpatara gị ọnwụnwa ma zere ha. (Ilu 7:25) E nwere otu nwoke na-ekiribu ndị gba ọtọ. Aha ya bụ Filipe. O kwuru na ihe nyeere ya aka ịkwụsị ya bụ na ọ dọsara kọmputa ha n’ebe ndị ọzọ ga na-ahụ ya. Ihe ọzọ o mere bụ na o tinyere ihe ga na-agwa ya mgbe ihe na-adịghị mma chọrọ ịpụta na kọmputa ahụ. Ọ sịkwara na ọ bụ naanị mgbe ndị ọzọ nọ n’ụlọ ka ọ na-aga n’Ịntanet. Onye anyị kwuburu okwu ya aha ya bụ Titus mekwara ihe yiri nke ahụ. Ọ sịrị: “M kwụsịrị ile fim a na-eme ihe iberiibe na ya, m kwụsịkwara iso ndị na-ekwukarị okwu iberiibe n’ihi na achọghị m ịkpatara onwe m nsogbu.”

Megodị ihe a: Chọpụta ihe ndị na-eme ka echiche ọjọọ na-abata gị n’obi. Ị chọpụtachaa ha, kpebizie ihe ị ga-eme ka ọnwụnwa ghara ịbịara gị na mberede.—Matiu 6:13.

OBI ADALA GỊ MBÀ

Gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na ị daba ná nsogbu n’agbanyeghị mbọ niile ị na-agba ka i merie ọnwụnwa? Ekwela ka obi daa gị mbà. Baịbụl kwuru, sị: “Onye ezi omume nwere ike ịda ọbụna ugboro asaa, ma ọ ga-ebilicha.” (Ilu 24:16) Nna anyị bi n’eluigwe na-agba anyị ume ka anyị bilie ma ọ bụrụ na anyị adaa. Ị̀ ga-anabata aka a ọ chọrọ inyere gị? Ya bụrụ otú ahụ, ike agwụla gị ikpegara ya ekpere. Na-agụ Okwu ya bụ́ Baịbụl ka okwukwe gị na-esikwu ike. Na-aga ọmụmụ ihe Ndị Kraịst n’ihi na ọ ga-eme ka ike ghara ịgwụ gị. Chineke kwere nkwa, sị: “M ga-eme ka ị dị ike. M ga-enyere gị aka.” (Aịzaya 41:10) Ka ihe a o kwuru kasie gị obi.

Chris, onye anyị kwuru okwu ya ná mmalite isiokwu a, sịrị: “O siiri m ezigbo ike ịkwụsị ile ndị gba ọtọ. M kpebichaa na m ga-akwụsị ya, tupu mụ amara ihe na-emenụ, mụ elewekwa ya. Ma, Chineke nyeere m aka ka m kwụsị ya.” Onye anyị kwuburu okwu ya aha ya bụ Dan kwuru, sị: “Mụ na nwa agbọghọ ahụ mụ na ya na-arụ ọrụ gaara akwa iko. Ma, ekpebisiri m ike na agaghị m akwa iko. N’ihi ya, m sịrị ya mba. Obi dị m ụtọ na akọnuche m dị ọcha. Ma, ihe kacha mee m obi ụtọ bụ na m mere ihe dị Jehova mma.”

Ọ bụrụ na ị gbasie ụkwụ n’ala ike ma merie ọnwụnwa, obi ga-adị Chineke ụtọ.—Ilu 27:11.

^ para. 2 Aha a kpọrọ ndị mmadụ n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.

GỤKWUO GBASARA YA

Olee Otú Iwu Chineke Si Abara Anyị Uru?

Jizọs kọwara ihe mere o ji dị mma ka Chineke na-eduzi anyị, kwuokwa banyere iwu abụọ kacha mkpa.