Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE EPREL 2014

 BAỊBỤL NA-AGBANWE NDỤ NDỊ MMADỤ

Ha Ji Baịbụl Zaa Ajụjụ Niile M Jụrụ Ha

Ha Ji Baịbụl Zaa Ajụjụ Niile M Jụrụ Ha
  • A MỤRỤ M N’AFỌ: 1950

  • ABỤ M ONYE: SPEN

  • NDỤ M BIRI: ABỤBU M SISTA NA CHỌỌCHỊ KATỌLIK

NDỤ M BIRI NA MBỤ:

A mụrụ m n’otu ime obodo dị na Galishia, ná mba Spen. Papa m na mama m nwere obere ugbo n’ebe ahụ. Abụ m nwa nke anọ n’ime ụmụ asatọ ha mụrụ. Anyị na-enwekwa obi ụtọ n’ezinụlọ anyị. Ihe ọtụtụ ndị na-eme na Spen n’oge ahụ bụ ịkpọga otu nwa ha n’ebe a na-azụ ndị ụkọchukwu ma ọ bụ n’ebe ndị sista na-ebi. Ụfọdụ na-akpọgakwa ihe karịrị otu nwa ha n’ebe ndị ahụ. N’ezinụlọ anyị, mụ na nwanne m nwaanyị gara n’ebe ndị sista na-ebi, nwanne m nwoke agaa ebe a na-azụ ndị ụkọchukwu.

Mgbe m gbara afọ iri na atọ, agara m biri n’ebe ndị sista na-ebi na Madrid, bụ́ ebe nwanne m nwaanyị bi. Onye ọ bụla na-agara onwe ya n’ebe ahụ. Iwu karịrị akarị, a naghịkwa ekwe anyị megharịa ahụ́. Ihe anyị na-emekarị bụ ikpe ekpere. N’isi ụtụtụ, anyị na-ezukọta n’ụlọ ụka ka anyị chebara ihe a na-akụziri anyị echiche. Ma ọtụtụ mgbe, o nweghị ihe na-abata m n’isi. Ihe ọzọ anyị na-eme bụ ịbụ abụ. Anyị bụchaa abụ, e doo mas. Anyị na-eji asụsụ Latịn eme ihe niile ahụ. Ma, nke bụ́ eziokwu bụ na o nweghị ihe m na-aghọta, ọ na-adịkwa m ka o nweghị ihe jikọrọ mụ na Chineke. Ọ bụ naanị m na-anọ, e nweghịkwa ndị mụ na ha na-ekwurịta okwu. Ọ bụrụgodị na mụ na nwanne m nwaanyị ezute, naanị ihe anyị na-agwa ibe anyị bụ: ‘Ekele Marịa dị asọ.’ Ọ na-abụ anyị richaa nri, ndị sista na-enye anyị naanị nkeji iri atọ ka anyị na ibe anyị kparịta ụka. Anaghị m enwe obi ụtọ otú m na-enwe n’ụlọ anyị. Owu na-amakarị m, ana m ebekwa ákwá ọtụtụ mgbe.

E chiri m sista mgbe m gbara afọ iri na asaa n’agbanyeghị na mgbe ahụ, ọ dịghị m ka mụ na Chineke ànyị dị ná mma. N’eziokwu, ihe niile m mere bụ ka m mezuo iwu. Ma n’oge na-adịghị anya, amalitere m ịjụ onwe m ma ọ̀ bụ ọrụ a ka Chineke chọrọ ka m rụọ. Ndị sista na-ekwukarị na ndị na-eche ụdị ihe a ga-aga ọkụ mmụọ. Ma, ihe ahụ ha na-ekwu emeghị ka m kwụsị inwe obi abụọ. Ihe doro m anya bụ na mgbe Jizọs Kraịst nọ n’ụwa, ọ naghị anọpụrụ onwe ya iche. Kama, ọ na-aga akụziri ndị mmadụ gbasara Chineke ma na-enyere ha aka. (Matiu 4:23-25) Mgbe m gbara afọ iri abụọ, o doro m anya na e nweghị uru ịnọ ebe ahụ baara m. M gara gwa onyeisi anyị na amaghị m ihe m ga-eme eme. Ihe ọ gwara m tụrụ m n’anya. Ọ gwara m na ọ bụrụ na ịbụ sista na-eme m obi abụọ na ọ kara m mma ịlawa ozugbo. Echere m na ihe mere o ji gwa m otú ahụ bụ na egwu na-atụ ya na m nwere ike ime ka ndị ọzọ nwewe obi abụọ. M lawara ozugbo.

 Mgbe m lọtara n’ụlọ anyị, papa m na mama m nabatara m nke ọma. Ma, ebe ọ bụ na ọrụ adịghị n’obodo anyị, akwagara m Jamanị bụ́ ebe otu nwanne m nwoke bi. Nwanne m nwoke a nọ n’òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị na-akwado ọchịchị Kọmunist. Ndị nọ n’òtù a bụ ndị Spen bi na Jamanị. Obi ruru m ala na mụ na ụdị ndị a na-akpa n’ihi na ha na-agba mbọ ka a na-enye ma ndị ọrụ ma ụmụ nwaanyị ihe ndị ruuru ha. Ọ bụ ya mere m ji banye n’òtù a. Emechakwara m lụọ onye nọ n’òtù a. N’oge ahụ, ana m eso ndị òtù anyị na-ekesa akwụkwọ anyị bipụtara, sorokwa ha na-eme ngagharị iwe. Echere m na ihe ndị ahụ m na-eme bara uru.

Ma mgbe obere oge gafere, obi bidokwara ịjọ m njọ. Ihe kpatara ya bụ na ndị Kọmunist anaghị emecha ihe ndị ha na-akụziri ndị mmadụ. Ihe mere n’afọ 1971 mere ka ike iso ha gwụ m. N’afọ ahụ, ụfọdụ ndị ntorobịa nọ n’òtù a gara gbaa ụlọ ọrụ ndị Spen dị n’obodo Frankfọt ọkụ. Ụlọ ọrụ a na-ahụ maka ndị Spen bi na Jamanị. Ihe mere ha ji gbaa ya ọkụ bụ ka ha gosi ndị na-achị Spen na iwe na-ewe ha na ha na-achịgbu ndị Spen achịgbu. Ma, echeghị m na ọ bụ otú ahụ ka ha kwesịrị isi gosi na obi adịghị ha mma.

Mgbe m mụrụ nwa mbụ m, agwara m di m na agaghịzi m aga nnọkọ ndị Kọmunist. Owu mara m n’oge ahụ n’ihi na o nweghị ndị enyi m bụ́ ndị Kọmunist bịara leta mụ na nwa m. N’oge ahụ, m nọ na-eche ma è nwedịrị uru ndụ mmadụ dị bara. Ihe ọzọ m nọ na-eche bụ ma mmadụ ịgbawa mbọ ka ihe dị mma n’obodo ọ̀ badịrị uru.

OTÚ BAỊBỤL SI GBANWEE NDỤ M:

N’afọ 1976, Ndịàmà Jehova abụọ bụ́ ndị Spen bịara n’ụlọ m. Ha nyere m ụfọdụ akwụkwọ e ji amụ Baịbụl. Mgbe ha bịara ọzọ, ajụkasịrị m ha ajụjụ ahụ́. Ajụrụ m ha ihe mere mmadụ ji ata ahụhụ, ihe mere ihe ji agaziri ụfọdụ ndị ma ọ naghị agaziri ndị ọzọ nakwa ihe mere ndị mmadụ ji emegbu ibe ha. Otú ha si jiri Baịbụl zaa ajụjụ niile m jụrụ ha juru m anya. Ekwetaziri m ka ha mụwara m Baịbụl.

Mgbe ha malitere ịmụrụ m Baịbụl, ihe bụ́ mkpa m agwụla ihe ọhụrụ m na-amụta n’aka ha. Ma, ife Chineke gụwaziri m agụụ mgbe mụ na di m na ụmụ anyị abụọ malitere ịga ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova. Ọ na-abụ ụbọchị ọmụmụ ihe ruo, ha abịa kpọrọ anyị gaa. Ha na-enyekwara anyị aka elekọta ụmụ anyị n’ọmụmụ ihe. Ọ bụ mgbe ahụ ka m malitere hụwa Ndịàmà Jehova n’anya.

N’agbanyeghị ihe niile a, ihe ụfọdụ ka na-agbagwoju m anya. Ekpebiri m na m ga-aga Spen hụ ndị ụlọ anyị. Mgbe m ruru, nwanne papa m bụ́ ụkọchukwu gbalịrị ka o mee ka m kwụsị ige Ndịàmà Jehova ntị, ma Ndịàmà Jehova nọ n’ebe ahụ nyeere m ezigbo aka. Ha ji Baịbụl zaa ajụjụ ndị m jụrụ ha otú ahụ Ndịàmà Jehova nọ na Jamanị mere. Ekpebiziri m na m laghachi Jamanị, mụ na Ndịàmà Jehova ga-amalitekwa ịmụ Baịbụl. Mgbe m laghachiri, amaliteghachiri m ịmụ Baịbụl n’agbanyeghị na di m kpebiri na ya agaghịzi amụ Baịbụl. N’afọ 1978, e mere m baptizim, mụ aghọọ Onyeàmà Jehova.

URU NDỊ M RITERELA:

Ihe ndị m mụtara na Baịbụl emeela ka ndụ m baa ezigbo uru. Dị ka ihe atụ, 1 Pita 3:1-4 gwara ụmụ nwaanyị lụrụ di ka ha ‘na-edo onwe ha n’okpuru ndị di ha,’ ‘na-akwanyekwara ha ùgwù dị ukwuu’ ma nwee ‘mmụọ dị nwayọọ nke bara uru nke ukwuu n’anya Chineke.’ Ihe ndị a na ihe ndị ọzọ Baịbụl kwuru emeela ka m na-eleta di m na ụmụ m anya nke ọma.

Ihe dị ka afọ iri atọ na ise agafeela kemgbe m ghọrọ Onyeàmà Jehova. Obi dị m ụtọ na m so Ndịàmà Jehova nọ n’ụwa niile na-efe Chineke. Obi dịkwa m ụtọ na n’ime ụmụ ise m mụrụ, anọ n’ime ha so m na-efe Chineke.