Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE MACH 2014

Otú Okwu Chineke Si Ruo Ndị Mmadụ Aka na Spen n’Oge Ochie

Otú Okwu Chineke Si Ruo Ndị Mmadụ Aka na Spen n’Oge Ochie

“Mgbe ọ bụla m gawara Spen, enwekwara m olileanya ịhụ unu, nweekwa olileanya na unu ga-edupụtụ m, mgbe m bu ụzọ nwetatụ afọ ojuju n’ọnụnọ mụ na unu.”—Ndị Rom 15:24.

PỌL onyeozi kwuru ihe a n’akwụkwọ ozi o degaara Ndị Kraịst ibe ya bi na Rom n’ihe dị ka afọ 56. Baịbụl agwaghị anyị ma Pọl ò mechara gaa Spen. Ma ọ̀ gara ma ọ bụ na ọ gaghị, mbọ ya na Ndị Kraịst ndị ọzọ gbara mere ka Okwu Chineke, bụ́ Baịbụl, ruo Spen n’ihe dị ka otu puku afọ na narị afọ itoolu gara aga.

Mgbe obere oge gafere, e bidoro nwewe Ndị Kraịst n’ebe dị iche iche na Spen. N’oge ahụ, ọ bụ ndị Rom na-achị Spen. Asụsụ ọtụtụ ndị na-asụ n’ebe niile ndị Rom na-achị bụ Latịn. Ọ bụ ya mere o ji dị mkpa ka a sụgharịa Baịbụl n’asụsụ Latịn.

A SỤGHARỊRỊ BAỊBỤL N’ASỤSỤ LATỊN

Ndị mbụ ghọrọ Ndị Kraịst na Spen sụgharịrị Baịbụl dị iche iche n’asụsụ Latịn. Aha a kpọrọ Baịbụl ndị ahụ ha sụgharịrị bụ Vetus Latina Hispana. Baịbụl ndị ahụ ruru ebe niile na Spen ma nọọ ọtụtụ afọ tupu otu nwoke aha ya bụ Jerom asụgharịchaa Baịbụl nke ya n’asụsụ Latịn n’afọ 405. Aha Baịbụl ahụ Jerom sụgharịrị bụ Vulgate.

Jerom sụgharịchara Baịbụl ya ahụ na Betlehem. Baịbụl ahụ rutekwara Spen ngwa ngwa. Mgbe otu nwoke aha ya bụ Lusiniọs nụrụ na Jerom na-asụgharị Baịbụl n’asụsụ Latịn, ọ chọrọ inweta Baịbụl ahụ ngwa ngwa n’ihi na ịgụ Baịbụl na-atọ ya ụtọ, o nwekwara ego. Lusiniọs zipụrụ ndị odeakwụkwọ dị mmadụ isii ka ha gaa Betlehem depụta Baịbụl ahụ Jerom sụgharịrị ma wetara ya otu na Spen. Mgbe ọtụtụ afọ na-agafela, ndị mmadụ hapụziri ịgụ Baịbụl ndị ahụ a kpọrọ Vetus Latina Hispana gụwazie nke ahụ Jerom sụgharịrị. Baịbụl niile ahụ a sụgharịrị n’asụsụ Latịn mere ka ndị Spen nwee ike ịgụ Baịbụl ma ghọta ihe ọ na-ekwu. Ma mgbe ndị Rom kwụsịrị ịchị Spen, a malitere ịsụ asụsụ ndị ọzọ na Spen.

BAỊBỤL NDỊ E DERE NA SLEETI

N’ihe dị ka otu puku afọ na narị afọ isii gara aga, ndị Visigọt na ndị ha na ha so lụsoro ndị Spen agha ma merie ha. Ha webatara asụsụ ọhụrụ a na-akpọ Gọtik ná mba Spen. Ndị ahụ meriri Spen sị na ha bụ Ndị Kraịst. Ma, ihe ha na-eso bụ nkụzi Arayọs. Arayọs kụziiri ndị mmadụ na nkụzi Atọ n’Ime Otu abụghị eziokwu. Ha jikwa Baịbụl ha e dere n’asụsụ Gọtik bịa Spen. Onye sụgharịrị Baịbụl ahụ bụ Ọlfilas. A gụrụ Baịbụl a na Spen ruo n’ihe dị ka otu puku afọ na narị afọ anọ gara aga bụ́ mgbe eze ndị Visigọt aha ya bụ Rekared ghọrọ onye Katọlik ma kwuo na ọ chọkwaghị ka onye ọ bụla soro nkụzi Arayọs. O kpokọtara akwụkwọ niile Arayọs dere nakwa Baịbụl ahụ Ọlfilas sụgharịrị ma gbaa ha niile ọkụ. Ọ bụ ya mere na e nwekwaghị akwụkwọ e dere n’asụsụ Gọtik dị na Spen.

Sleeti e dere ihe si na Baịbụl na ya. Asụsụ e dere na ya bụ asụsụ si na Latịn. E dere ihe a kemgbe ihe dị ka otu puku afọ na narị afọ ise gara aga

N’agbanyeghị nke ahụ, Okwu Chineke nọ na-eru ebe dị iche iche na Spen n’oge ahụ. E wezụga asụsụ Gọtik, e nwere asụsụ ọzọ a na-asụ ebe niile na Spen n’oge ahụ. Asụsụ ahụ si n’asụsụ Latịn. Ọ bụkwa na ya ka e si nweta asụsụ ndị ọzọ a sụrụ na Spen. * Aha a na-akpọ ihe kacha ochie e dere n’asụsụ a bụ sleeti ndị Visigọt. Ihe mere e ji kpọọ ya sleeti ndị Visigọt bụ na ọ bụ na sleeti ka e dere ihe ndị ahụ. Ọ bụ n’ihe dị ka otu puku afọ na narị afọ ise gara aga ka e dere ihe ndị ahụ na sleeti, deekwa ụfọdụ n’ime ha n’ihe dị ka otu  puku afọ na narị afọ anọ gara aga. Ụfọdụ n’ime ihe ndị ahụ e dere si n’akwụkwọ Abụ Ọma nakwa n’akwụkwọ Matiu. E dechara ihe niile dị n’Abụ Ọma nke 16 n’otu n’ime sleeti ndị ahụ.

Amaokwu Baịbụl ndị ahụ e dere na sleeti gosiri na ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha gụrụ Okwu Chineke n’oge ahụ ma jiri aka ha depụta ha edepụta. O nwere ike ịbụ na ndị nkụzi dere amaokwu ndị ahụ ka ụmụ akwụkwọ jiri ya mụta otú e si agụ ihe na otú e si ede ihe. Inweta sleeti e ji ede ihe adịghị oké ọnụ ka inweta akpụkpọ anụ ndị mọnk ji dee Baịbụl ha e sere ihe na ha.

Ihe e sere na Baịbụl ahụ e dewere n’obodo Leyọn. Ọ bụ eziokwu na a chọrọ Baịbụl ahụ ezigbo mma, o nyecharaghị ndị mmadụ aka ịmụta ihe dị n’Okwu Chineke

Otu Baịbụl dị oké ọnụ nke e sere ihe na ya dị na chọọchị a kpọrọ chọọchị San Isidoro, nke dị n’obodo Leyọn, na Spen. E dere Baịbụl a n’afọ 960. O nwere otu puku peeji na iri abụọ na asatọ. O bukwara ezigbo ibu ma dị arọ. Baịbụl ọzọ dị ka ya dị ugbu a n’ọ́bá akwụkwọ dị na Vatikan. E dere Baịbụl a n’ihe dị ka afọ 1020. Aha a kpọrọ ya bụ Baịbụl Ripọl. O so na Baịbụl a kacha chọọ mma n’oge ahụ. Iji mee ka Baịbụl ahụ maa mma otú ahụ, o nwere ike iwe otu onye mọnk otu ụbọchị ịchọ otu mkpụrụ akwụkwọ mma ma ọ bụ ya ewee ya otu izu ide aha Baịbụl ahụ. Ọ bụ eziokwu na Baịbụl ndị ahụ mara mma, ma o nyecharaghị ndị mmadụ aka ịmụta ihe dị n’Okwu Chineke.

BAỊBỤL E DERE N’ASỤSỤ ARABIK

N’ihe dị ka otu puku afọ na narị afọ atọ gara aga, a malitere ịsụ asụsụ Arabik na Spen. Ihe mere e ji malite ịsụ ya bụ na ndị Alakụba lụsoro ndị Spen agha ma merie ha. N’ebe niile ndị Alakụba chịrị, asụsụ Arabik ghọziri asụsụ ndị mmadụ na-asụ karịa Latịn. O meziri ka ndị mmadụ chọwazie ịgụ Baịbụl n’asụsụ Arabik.

Malite n’ihe dị ka otu puku afọ na narị afọ isii gara aga ruo n’ihe dị ka otu puku afọ na narị afọ atọ gara aga, Baịbụl ndị a sụgharịrị n’asụsụ Latịn nakwa n’asụsụ Arabik nyeere ndị Spen aka ịgụ Okwu Chineke

O doro anya na Baịbụl ndị a sụgharịrị n’asụsụ Arabik, karịchaa akwụkwọ Matiu, Mak, Luk, na Jọn, ruru ọtụtụ ebe na Spen n’oge ochie. O nwere ike ịbụ otu nwoke aha ya bụ Jọn, onye bụ́ bishọp chọọchị dị na Sevil, sụgharịrị Baịbụl dum n’asụsụ Arabik n’ihe dị ka otu puku afọ na narị afọ atọ gara aga. Ma, ọ dị mwute na ọtụtụ Baịbụl ndị a sụgharịrị n’asụsụ Arabik adịghịzi. Akwụkwọ Matiu, Mak, Luk, na Jọn a sụgharịrị n’asụsụ Arabik n’ihe dị ka otu puku afọ na iri afọ ise gara aga dị n’otu nnukwu chọọchị dị na Leyọn, na Spen.

Akwụkwọ Matiu, Mak, Luk, na Jọn a sụgharịrị n’asụsụ Arabik n’ihe dị ka otu puku afọ na otu narị afọ gara aga

 BAỊBỤL NDỊ A SỤGHARỊRỊ N’ASỤSỤ SPANISH

Ka oge na-aga, a malitere ịsụ asụsụ Kastilian ma ọ bụ Spanish na Spen nakwa na Pọchugal. Asụsụ a mere ka Okwu Chineke ruo ndị mmadụ aka. * Ọ bụ n’otu akwụkwọ e dere n’ihe dị ka narị afọ asatọ gara aga ka e bu ụzọ sụgharịa akwụkwọ ụfọdụ dị na Baịbụl n’asụsụ Spanish. Akwụkwọ ahụ kọrọ otú otu onye si gaa n’ala Izrel. Ihe ụfọdụ e dere n’akwụkwọ Jenesis ruo Diuterọnọmi nakwa ihe e dere n’akwụkwọ ndị ọzọ dị n’Akwụkwọ Nsọ Hibru dị na ya. E dekwara ihe ndị si n’akwụkwọ Matiu, Mak, Luk, Jọn na ya nakwa ihe ndị si n’akwụkwọ ozi ndị Pọl dere.

Eze Alfọnso nke Iri nyere aka ka a sụgharịa Baịbụl n’asụsụ Spanish

Obi jọrọ ndị isi chọọchị njọ na a sụgharịrị akwụkwọ Baịbụl ndị ahụ n’asụsụ Spanish. Mgbe ha zukọrọ na Taragona n’afọ 1234, ha nyere iwu ka ndị mmadụ were akwụkwọ ọ bụla nwere amaokwu ma ọ bụ akwụkwọ Baịbụl a sụgharịrị n’asụsụ Spanish ma ọ bụ n’asụsụ ọzọ wegara ụkọchukwu ha ka ọ kpọọ ya ọkụ. Ma, iwu a ha nyere emeghị ka ndị mmadụ kwụsị ịsụgharị Baịbụl. Otu eze a na-akpọ Eze Alfọnso nke Iri chọrọ ka a sụgharịa Akwụkwọ Nsọ n’asụsụ Spanish, o nyekwara aka ka a hụ na a sụgharịrị ya. Eze a dịrị ndụ n’agbata afọ 1252 na afọ 1284. A sịrị na ọ bụ ya chepụtara otú e si ede Spanish. Ụfọdụ akwụkwọ a sụgharịrị n’asụsụ Spanish n’oge ahụ bụ Baịbụl a sụgharịrị tupu a sụgharịa nke a kpọrọ Baịbụl Alfọnso. Baịbụl Alfọnso bụ akwụkwọ kacha zuo ezuo a sụgharịtụrụla n’asụsụ Spanish n’oge ahụ.

Baịbụl dị n’aka nri bụ nke Alfọnso, nke dị n’aka ekpe abụrụ nke bu ya ụzọ. A sụgharịrị ha n’ihe dị ka narị afọ asatọ gara aga

Baịbụl abụọ ahụ mere ka ọtụtụ ndị mara asụsụ Spanish nke ọma n’oge ahụ. Otu ọkachamara aha ya bụ Thomas Montgomery kwuru na onye sụgharịrị Baịbụl ahụ a sụgharịrị tupu a sụgharịa Baịbụl Alfọnso sụgharịtara ya. Ọ sịrị na “a sụgharịrị ya otú ga-ekwe ndị mmadụ nghọta, ka ọ dịrị ndị na-amaghị asụsụ Latịn mfe ịgụ ya.”

Ọ bụ na Baịbụl ahụ Jerom sụgharịrị n’asụsụ Latịn, nke aha ya bụ Vulgate, ka e si sụgharịa Baịbụl ndị ahụ n’asụsụ Spanish kama isi n’Akwụkwọ Nsọ e dere n’asụsụ Hibru na Grik sụgharịa ha. N’ihe dị ka narị afọ asaa gara aga, ndị Juu malitere isi n’asụsụ Hibru na-asụgharị Akwụkwọ Nsọ Hibru n’asụsụ Spanish. N’oge ahụ, ọ bụ na Spen ka a kacha nwee ndị Juu na Yurop. Ọ dịkwaara ndị Juu nọ na Spen mfe inweta ezigbo Akwụkwọ Nsọ Hibru ha nwere ike isi na ya sụgharịa Baịbụl n’asụsụ Spanish. *

Otu n’ime Baịbụl ha si n’Akwụkwọ Nsọ Hibru sụgharịa n’asụsụ Spanish bụ Baịbụl a kpọrọ Baịbụl Alba. A sụgharịchara Baịbụl a n’ihe dị ka narị afọ isii gara aga. Ọ bụ nwoke Spen a na-akwanyere ùgwù aha ya bụ Luwis da Guzman gwara onye nkụzi ndị Juu aha ya bụ Mọises Arakel ka ọ sụgharịa Baịbụl ahụ n’ezigbo asụsụ Spanish. Luwis da Guzman kwuru ụzọ ihe abụọ mere o ji chọọ ka a sụgharịa Baịbụl ahụ n’asụsụ Spanish. Ihe mbụ o kwuru bụ na ‘asụsụ ndị si na Latịn e ji sụgharịa Baịbụl ndị ahụ n’oge ahụ adịghị mma.’ Ihe nke abụọ o kwuru bụ na ‘ha chọrọ ka e nwee Baịbụl e dere ihe n’akụkụ peeji ya nke ga na-akọwa amaokwu ndị siri ike nghọta.’ Ihe a o kwuru gosiri na ndị mmadụ n’oge ahụ nwere mmasị ịgụ Baịbụl na ịghọta ihe ha na-agụ. O gosikwara na ndị mmadụ na-agụ Baịbụl n’asụsụ Spanish n’ọtụtụ ebe na Spen.

Mbọ ndị nsụgharị na ndị bụ́ aka ochie n’ide ihe gbara n’oge ochie mere ka ọ dịtụrụ ndị ma otú e si agụ ihe  na Spen mfe ịgụ Baịbụl n’asụsụ ha. Ọ bụ ya mere onye na-akọ akụkọ ihe mere eme aha ya bụ Juan Orts González ji kwuo na “tupu oge Matịn Luta, ndị Spen ma Baịbụl nke ọma karịa ndị Jamanị ma ọ bụ ndị Ingland.”

“Tupu oge Matịn Luta, ndị Spen ma Baịbụl nke ọma karịa ndị Jamanị ma ọ bụ ndị Ingland.”—Ọ bụ ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Juan Orts González kwuru ihe a

Ma, ọ dị mwute na n’ihe dị ka narị afọ ise gara aga, ndị isi chọọchị Katọlik tiri iwu na Spen na ha achọkwaghị ka onye ọ bụla sụgharịa Baịbụl n’asụsụ Spanish ma ọ bụ ka onye ọ bụla nwee Baịbụl a sụgharịrị n’asụsụ Spanish ma ọ bụ n’asụsụ ọzọ. Ọ bụ otú ahụ ka e si machie ndị mmadụ ịgụ Baịbụl n’asụsụ ha na Spen. Narị afọ atọ gafere tupu ndị mmadụ amalitekwa ịgụ Baịbụl n’asụsụ ha. Ma, tupu a kagbuo iwu ahụ e tiri, e nwere ndị nsụgharị ole na ole katara obi nọrọ ná mba ọzọ sụgharịa Baịbụl n’asụsụ Spanish ma zoro ezo bubata ha na Spen. *

Ihe ndị a mere na Spen n’oge ochie gosiri na ndị iro Chineke emeela elu mee ala ka ndị mmadụ ghara ịgụ Okwu Chineke. Ma, ihe niile ha mere enweghị isi n’ihi na mmadụ agaghị emechili Chineke ọnụ.—Abụ Ọma 83:1; 94:20.

Mbọ ọtụtụ ndị ọkà mmụta gbara mere ka Baịbụl ruo ndị mmadụ aka na Spen n’oge ochie. Ndị nsụgharị e nwere n’oge a na-emekwa ka ndị ahụ sụgharịrị Baịbụl n’asụsụ Latịn, Gọtik, Arabik, nakwa n’asụsụ Spanish n’oge ochie. Ọ bụ ya mere ọtụtụ nde mmadụ ndị na-asụ Spanish taa ji agụ Okwu Chineke n’asụsụ na-eme ka ihe Chineke kwuru ruo ha n’obi.

^ para. 10 Ụfọdụ n’ime asụsụ ndị ahụ bụ Kastilian, Katalan, Galishian, na Pọchugiiz.

^ para. 17 Ihe dị ka narị nde mmadụ ise na nde iri anọ n’oge anyị a na-asụ Spanish. Ọ bụ ya bụ asụsụ ha kacha asụ ma na-aghọta.

^ para. 20 Gụọ isiokwu bụ́ “Alfonso de Zamora—Onye Chọrọ Ka A Sụgharịa Aha Chineke Otú O Kwesịrị.” Ọ gbara n’Ụlọ Nche Disemba 1, 2011.

^ para. 23 Gụọ isiokwu bụ́ Ọgụ Casiodoro De Reina Lụrụ Maka Bible Spanish. Ọ gbara n’Ụlọ Nche June 1, 1996.