Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE JENỤWARỊ 2014

 ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | Ọ BỤRỤ NA MMADỤ ANWỤỌ, NKE YA Ọ̀ GAALA?

Ọ Bụrụ na Mmadụ Anwụọ, Ọ Pụtaghị na nke Ya Agaala

Ọ Bụrụ na Mmadụ Anwụọ, Ọ Pụtaghị na nke Ya Agaala

E nwere obere obodo a na-akpọ Betani. E si Jeruselem gawa ya, ọ dị kilomita atọ. (Jọn 11:18) Njinji jiri n’obodo a mgbe ọ fọrọ izu ole na ole ka Jizọs nwụọ. Enyi Jizọs aha ya bụ Lazarọs rịara ọrịa ma nwụọ.

Mgbe Jizọs nụrụ ihe ahụ merenụ, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya na Lazarọs na-arahụ ụra nakwa na ya na-aga ịkpọte ya. (Jọn 11:11) Ma, ndị na-eso ụzọ ya aghọtaghị ihe o kwuru. N’ihi ya, ọ gwara ha hoo haa na ‘Lazarọs anwụọla.’—Jọn 11:14.

Abalị anọ e lichara Lazarọs, Jizọs bịarutere Betani ma kasiwe nwanne Lazarọs, bụ́ Mata, obi. Mata gwara Jizọs, sị: “A sị na ị nọ n’ebe a, nwanne m nwoke agaraghị anwụ.” (Jọn 11:17, 21) Jizọs sịrị ya: “Abụ m mbilite n’ọnwụ na ndụ. Onye nwere okwukwe n’ebe m nọ, ọ bụrụgodị na ọ nwụọ, ọ ga-adị ndụ ọzọ.”—Jọn 11:25.

“Lazarọs, pụta!”

Jizọs mere ihe gosiri na ihe a o kwuru bụ eziokwu. O rutere ebe ahụ e liri Lazarọs ma tie mkpu, sị: “Lazarọs, pụta!” (Jọn 11:43) O juru ndị niile gbakọtara ebe ahụ anya mgbe ha hụrụ nwoke ahụ nwụrụ anwụ ka o si n’ili pụta.

E nweela ndị Jizọs kpọlitere n’ọnwụ tupu ya akpọlite Lazarọs. E nwere mgbe ọ kpọlitere ada otu nwoke a na-akpọ Jeirọs. Tupu Jizọs akpọlite nwata nwaanyị ahụ, Jizọs kwuru na nwata ahụ na-ehi ụra.—Luk 8:52.

Ihe Jizọs kwuru mgbe Lazarọs nwụrụ nakwa mgbe ada Jeirọs nwụrụ bụ na onye nke ọ bụla n’ime ha na-ehi ụra. Ihe a o kwuru dabara adaba n’ihi na ọ bụrụ na mmadụ na-ehi ụra, ọ naghị ama ihe na-emenụ, ọ naghịkwa echeta nsogbu niile o nwere. (Ekliziastis 9:5; gụọ igbe isiokwu ya bụ,  “Ọnwụ Yiri Ụra Miri Emi.”) Ndị mbụ soro ụzọ Jizọs ma ihe bụ́ eziokwu gbasara ndị nwụrụ anwụ. Otu akwụkwọ sịrị: ‘Ndị na-eso  ụzọ Jizọs weere ọnwụ ka ụra, ha wekwaara ili ka ebe ndị nwere okwukwe na Chineke na-aga ezuru ike.’ *—Akwụkwọ bụ́ Encyclopedia of Religion and Ethics.

Obi dị anyị ụtọ ịmara na ndị nwụrụ anwụ na-ehi ụra n’ili, ọ bụghị ahụhụ ka ha na-ata. N’ihi ya, anyị ekwesịghị ịtụ ọnwụ ụjọ ebe anyị ma ihe ọ bụ.

‘Ọ BỤRỤ NA MMADỤ ANWỤỌ, Ò NWERE IKE ỊDỊ NDỤ ỌZỌ?’

O doro anya na obi na-atọ anyị niile ụtọ ma anyị hie ezigbo ụra n’abalị. Ma, ò nwere onye ọ ga-adị mma ka o hiwe ụra ruo mgbe ebighị ebi? Olee ihe mere anyị ga-eji kweta na ndị nwụrụ anwụ ga-adị ndụ ọzọ otú ahụ Lazarọs na ada Jeirọs si malite ịdị ndụ mgbe Jizọs kpọlitere ha?

Job jụrụ ajụjụ yiri nke ahụ mgbe o chere na ọnwụ ya dị nso. Ọ jụrụ, sị: “Ọ bụrụ na mmadụ anwụọ, ọ̀ pụrụ ịdị ndụ ọzọ?”—Job 14:14.

Job zakwara ajụjụ ahụ. Ọ gwara Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Niile, sị: “Ị ga-akpọ òkù, mụ onwe m ga-azakwa gị. N’ihi na agụụ ọrụ aka gị ga-agụsi gị ike.” (Job 14:15) Obi siri Job ike na Jehova ga-akpọlite ya n’ọnwụ. Ọ̀ bụ nrọ ka Job na-arọ? Mbanụ!

Mkpọlite Jizọs kpọlitere ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ gosiri na Chineke nyere ya ike ọ ga-eji memilaa ọnwụ. Baịbụl kwudịrị na Jizọs chị “mkpịsị ugodi nke ọnwụ” ugbu a. (Mkpughe 1:18) Nke a na-egosi na Jizọs ga-akpọghe ili ka ndị nwụrụ anwụ pụta otú ahụ o nyere iwu ka Lazarọs si n’ili pụta.

Ọtụtụ ebe na Baịbụl kwuru na a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ. Otu mmụọ ozi gwara Daniel onye amụma, sị: “Ị ga-ezukwa ike, ma ị ga-ebili ka i nweta òkè gị mgbe ụbọchị ndị a gwụchara.” (Daniel 12:13) Jizọs gwara ndị Sadusii, bụ́ ndị na-ekwetaghị na a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ, sị: “Unu ehiewo ụzọ, n’ihi na unu amaghị Akwụkwọ Nsọ, unu amaghịkwa ike nke Chineke.” (Matiu 22:23, 29) Pọl onyeozi kwukwara, sị: ‘Enwere m olileanya n’ebe Chineke nọ, na a gaje inwe mbilite n’ọnwụ nke ma ndị ezi omume ma ndị ajọ omume.’—Ọrụ Ndịozi 24:15.

OLEE MGBE A GA-AKPỌLITE NDỊ NWỤRỤ ANWỤ N’ỌNWỤ?

Olee mgbe a ga-enwe mbilite n’ọnwụ nke ndị ezi omume na ndị ajọ omume? Mmụọ ozi ahụ gwara Daniel na ọ ga-ebili mgbe “ụbọchị ndị a gwụchara.” Mata kwetakwara na nwanne ya nwoke bụ́ Lazarọs ga-ebili “n’ọnwụ n’ụbọchị ikpeazụ.”—Jọn 11:24.

Baịbụl kwuru na ọ bụ “n’ụbọchị ikpeazụ” ka Alaeze Chineke nke Kraịst bụ eze ya ga-amalite ịchị. Pọl sịrị: ‘N’ihi na Kraịst aghaghị ịchị dị ka eze ruo mgbe Chineke debere ndị iro ya niile n’okpuru ụkwụ ya. Dị ka onye iro ikpeazụ, a ga-eme ka ọnwụ ghara ịdị irè.’ (1 Ndị Kọrịnt 15:25, 26) Ihe a so n’ihe dị mkpa mere anyị ga-eji na-ekpe ekpere ka Alaeze Chineke bịa nakwa ka uche ya mee n’ụwa. *

Chineke ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ otú Job kwuru. Mgbe oge ahụ ruru, ọnwụ ga-abụzi ihe akụkọ. O nweghịzi onye ga-ajụ, sị: ‘Mmadụ nwụọ, nke ya ọ̀ gaala?’

^ para. 8 Ihe ndị Grik na-akpọ “ebe a na-eli ozu” pụtara “ebe a na-ehi ụra.”

^ para. 18 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu gbasara Alaeze Chineke, gụọ isi nke 8 nke akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya.