Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE JENỤWARỊ 2014

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

Olee otú ndị mmadụ si enye onyinye n’ụlọ nsọ mgbe Jizọs nọ n’ụwa?

Ọ bụ n’ebe a na-akpọ Ogige Ụmụ Nwaanyị ka e nwere ebe ndị mmadụ na-atụnye ego ma ọ bụ onyinye ha chọrọ inye n’ụlọ nsọ. Otu akwụkwọ sịrị: ‘Veranda gbara ebe ahụ gburugburu. O nwere mgbidi n’otu akụkụ. Ọ bụ n’akụkụ mgbidi ahụ ka e nwere igbe ma ọ bụ opi iri na atọ ndị mmadụ na-atụnye onyinye ha.’—Akwụkwọ bụ́ The Temple—Its Ministry and Services.

Ihe mere e ji kpọọ igbe ndị ahụ opi bụ na ha pịrị ọnụ n’elu ma saa mbara n’ala ka opi. N’elu igbe nke ọ bụla, e dere ụdị onyinye a ga-atụnye na ya. Ego e nwetara na nke ọ bụla nwere ihe dị iche e ji ya eme. Ọ bụ n’Ogige Ụmụ Nwaanyị ahụ ka Jizọs nọ mgbe ọ hụrụ ka ọtụtụ ndị na-atụnye ego n’igbe, hụkwa otu nwaanyị di ya nwụrụ mgbe ọ na-atụnye onyinye ya.—Luk 21:1, 2.

Igbe abụọ n’ime igbe ndị ahụ bụ maka ụtụ isi ndị mmadụ na-atụ kwa afọ maka ụlọ nsọ. Ha na-atụnye nke otu afọ n’otu igbe, na-atụnyekwa nke afọ bu ya ụzọ n’igbe nke ọzọ. Ego ndị mmadụ na-atụnye n’igbe nke atọ bụ ego e ji azụta nduru, ebe nke anọ bụ nke e ji azụta kpalakwukwu, nke ise abụrụ maka osisi, nke isii abụrụ maka ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ, ebe nke asaa bụ maka ịzụta efere ndị e ji ọlaedo mee. Ọ bụrụ na mmadụ achụchaa àjà mmehie, ego amafọrọ ya, ọ na-atụnye ya n’igbe nke asatọ. Ọ bụrụ na ego amafọrọ mmadụ ma ọ chụchaa àjà ikpe ọmụma, ọ na-atụnye ya n’igbe nke itoolu. Ọ bụrụkwa na ego amafọrọ mmadụ ma ọ chụchaa ụmụ nnụnụ n’àjà, ọ na-atụnye ya n’igbe nke iri. Ndị Naziraịt na-atụnye onyinye ha n’igbe nke iri na otu, ebe ndị ekpenta e mere ka ha dị ọcha na-atụnye onyinye ha n’igbe nke iri na abụọ. Igbe nke iri na atọ bụ ebe ndị mmadụ na-atụnye onyinye si ha n’obi.

Ihe niile Luk dere na Baịbụl hà bụ eziokwu?

Ọ bụ Luk dere akwụkwọ Luk, deekwa akwụkwọ Ọrụ Ndịozi. Luk kwuru na ya si “ná mmalite nyochaa ihe niile n’ụzọ ziri ezi.” Ma, ụfọdụ ndị ọkachamara na-ekwu na ihe o dere abụchaghị eziokwu. (Luk 1:3) Ajụjụ bụzi, Ihe niile Luk dere hà bụ eziokwu?

Ihe Luk dere na Baịbụl bụ ihe mere eme ndị mmadụ nwere ike iji aka ha chọpụta na ha bụ eziokwu. Dị ka ihe atụ, aha o turu ndị ọchịchị Rom bụ aha kwesịrị ekwesị a na-etu ha n’oge ahụ n’agbanyeghị na ọtụtụ ndị amachaghị utu aha ndị ahụ. Ọ kpọrọ ndị ọchịchị Rom nọ na Filipaị “ndị nduzi obodo,” kpọọ ndị nke nọ na Tesalọnaịka “ndị na-achị obodo,” kpọọkwa ndị nke nọ n’Efesọs “ndị isi ememme na egwuregwu.” (Ọrụ Ndịozi 16:20; 17:6; 19:31) Luk kpọrọ Herọd Antipas “onye na-achị ógbè,” kpọọkwa Sajiọs Pọlọs “onye na-achị ógbè” Saịprọs.—Ọrụ Ndịozi 13:1, 7.

Aha ndị ahụ Luk kpọrọ ha gosiri na anya ruru ya ala. Ihe gosiri na nke a bụ eziokwu bụ na ọ bụrụ na ndị Rom weere obodo nọ n’okpuru ha ka obodo ndị ohu, ha nwere ike imecha mee ka ndị obodo ahụ nwere onwe ha. Ọ bụrụ na ha enwere onwe ha, aha a na-etu onye na-achị obodo ha na-agbanwe. Ọ bụ ya mere Bruce Metzger, onye bụ́ ọkà mmụta n’ihe gbasara Baịbụl, ji kwuo na “utu aha ndị ahụ Luk dere n’ebe dị iche iche n’Ọrụ Ndịozi bụ aha a na-etu ndị ahụ n’oge ahụ.” Otu ọkà mmụta aha ya bụ William Ramsay sịrị na Luk bụ “ọkaibe n’ịkọ akụkọ ihe mere eme.”