Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE DISEMBA 2013

‘Ị Ga Na-egwupụta Ọla Kọpa n’Ugwu’

‘Ị Ga Na-egwupụta Ọla Kọpa n’Ugwu’

Ndị na-amụ gbasara ihe ndị mgbe ochie gara na ndagwurugwu na ọgba ndị dị n’ala ịkpa Judia na-ele ma ò nwere ihe ha ga-achọta. Mgbe ụfọdụ n’ime ha rutere n’otu ọgba dị n’ugwu dị elu, ha bu n’obi na ha ga-ahụ ihe ndị bara uru n’ebe ahụ, dị ka ihe ndị e ji ụrọ kpụọ ma ọ bụ akwụkwọ ndị e dere n’oge ochie. Ma, o juru ha anya mgbe ha hụrụ ihe ndị dị oké ọnụ ahịa n’ebe ahụ. E mechara kpọwa ihe ndị ahụ “ihe ndị a chọtara na Nahal Mishma.”

Ọ BỤ n’ọnwa Mach afọ 1961 ka ha hụrụ ihe ndị ahụ n’ebe e zoro ha n’ugwu. E ji ute fụchie ha ma fanye ya n’ebe e nwere oghere n’ugwu. Ihe ndị dị n’ime ute ahụ karịrị narị anọ, e jikwa ọla kọpa kpụọ ọtụtụ n’ime ha. Ụfọdụ n’ime ha bụ okpueze, mkpara ndị eze, ngwá ọrụ, na ihe ndị ọzọ. Ndị na-agụ Baịbụl ga-achọ ịmata banyere ihe ndị a a chọtara n’ihi ihe e kwuru na Jenesis 4:22. Ebe ahụ kwuru na Tubal-ken “na-eji ọla kọpa na ígwè akpụ ụdị ngwá ọrụ ọ bụla.”

E nweela ọtụtụ ajụjụ ndị mmadụ jụrụla banyere ebe ihe ndị ahụ a chọtara si. Ma ó nweghị ihe ọzọ, ihe ndị ahụ na-egosi na ọ dịla ezigbo anya e gwuwere ọla kọpa, na-agbaze ya ma jiri ya na-akpụ ihe n’ebe ụfọdụ a kpọrọ aha na Baịbụl.

EBE NDỊ E GWURU ỌLA KỌPA N’ALA NKWA AHỤ

Mgbe ụmụ Izrel na-akwado ịbanye n’ala Chineke kwere ha ná nkwa, Mozis gwara ha, sị: ‘Ị ga na-egwupụta ọla kọpa n’ugwu.’ (Diuterọnọmi 8:7-9) Ndị na-amụ banyere ihe ndị mgbe ochie ahụla ọtụtụ ebe a na-egwu ọla kọpa ma na-agbaze ya n’Izrel nakwa na Jọdan n’oge ochie. Ụfọdụ ebe ndị ahụ bụ Feinan, Timna, na Kibat en-Nahas. Gịnị ka a chọpụtara n’ebe ndị ahụ?

E nwere ọtụtụ olulu na Feinan nakwa na Timna. E gwuru ọla kọpa n’ebe ndị ahụ ruo ihe karịrị puku afọ abụọ. Ọ bụrụ na mmadụ agaa ebe ndị ahụ taa, ọ ka ga-ahụ ọtụtụ okwute ndị e nwere ike isi na ha nweta irighiri ọla kọpa. Ndị na-egwu ọla kọpa n’oge ochie na-eji ngwá ọrụ ha e ji okwute rụọ na-etiwa nkume ndị dị n’elu elu ka ha nweta ọla kọpa ndị dị n’ebe ndị ahụ. Mgbe ndị nke dị n’elu elu gwụchara, ha na-ejizi ngwá ọrụ ha ndị e ji ígwè rụọ gwumie ebe ndị ahụ ka ha nwetakwuo ọla kọpa. Na Baịbụl, akwụkwọ Job kọwara otú e si egwupụta ọla kọpa n’oge ochie. (Job 28:2-11) Ọrụ a abụghị obere ọrụ. Malite n’ihe dị ka otu puku afọ na narị afọ asaa gara aga ruo n’ihe dị ka otu puku afọ na narị afọ ise gara aga, ndị Rom na-akpọrọ ndị omekome na ndị ọzọ a tụrụ mkpọrọ gaa n’ebe a na-egwupụta ọla kọpa n’obodo Feinan ka ha rụwa ọrụ n’ebe ahụ.

Ọ bụrụ na mmadụ agaa na Kibat en-Nahas, ọ ga-ahụ ebe e kpokọjuru ihe ndị a gbazepụtara n’ọla kọpa. Ihe ndị ahụ na-egosi na a na-agbaze ọla kọpa n’ebe ahụ n’oge ochie. Ndị ọkachamara  na-ekwu na a na-esi n’ebe ndị ọzọ dị nso a na-egwupụta ọla kọpa, dị ka Feinan na Timna, eburu ọla ndị ahụ bịa na Kibat en-Nahas ka a gbazee ha. N’ebe ahụ, a na-akwanye ezigbo ọkụ n’ọla ahụ e gwupụtara ma jiri ékò na-afụ ya ọkụ ruo ihe dị ka awa iri. Ọ gbazee, ha ewerezie ezigbo ọla kọpa ha ga-eji akpụ ihe.

IHE NDỊ E JI ỌLA KỌPA MEE N’IZREL OGE OCHIE

Mgbe ndị Izrel nọ n’Ugwu Saịnaị, Jehova Chineke nyere ha iwu ka ha were ọla kọpa rụọrọ ya ụlọikwuu. Ha mechakwara jiri ya rụọrọ ya ụlọ nsọ na Jeruselem. Ha rụrụ ya ka ọ dị ka ụlọikwuu ahụ ha rụburu. (Ọpụpụ isi nke 27) O nwere ike ịbụ na ụmụ Izrel mụtara otú e si agbaze ọla tupu ha agawa Ijipt ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na ha mụtara ya n’Ijipt. Obere oge ha si n’Ijipt pụta, ha ji ọla kpụọ nwa ehi. Nke a gosiri na iji ọla akpụ ihe edoola ha anya mgbe ahụ. Ha jikwa ọla kọpa kpụọ ọtụtụ ihe ndị ọzọ e ji ejere Chineke ozi n’ụlọikwuu. Ụfọdụ n’ime ha bụ nnukwu efere, ite, shọvel, na ndụdụ.—Ọpụpụ 32:4.

Mgbe ụmụ Izrel ka nọ n’ala ịkpa, ha bidoro ịtamu ntamu n’ihi mana Chineke nyere ha nakwa n’ihi na ha enweghị mmiri. Ọ ga-abụ na ebe ha nọ mgbe ahụ dị nso na Punọn, bụ́ ebe e nwejuru ọla kọpa enweju. O nwere ike ịbụ ebe ahụ ka a na-akpọ Feinan n’oge a. Jehova tara ha ahụhụ mgbe ahụ. O zitere agwọ ọjọọ, ya atagbuo ọtụtụ n’ime ha. Mgbe ụmụ Izrel chegharịrị, Mozis rịọchiteere ha arịrịọ, Jehova agwazie ya ka o were ọla kọpa kpụọ agwọ ma konye ya n’elu osisi. Baịbụl sịrị: ‘Ọ bụrụ na agwọ ataa mmadụ, onye ahụ elee agwọ ahụ e ji ọla kọpa kpụọ anya, onye ahụ ga-adị ndụ.’—Ọnụ Ọgụgụ 21:4-10; 33:43.

ỌLA KỌPA SỌLỌMỌN JI RỤỌ ỤLỌ NSỌ

E ji ọla kọpa rụọ ọtụtụ ihe n’ụlọ nsọ dị na Jeruselem

Eze Sọlọmọn ji ọla kọpa buru ezigbo ibu rụọ ihe ndị e tinyere n’ụlọ nsọ dị na Jeruselem. Ọ bụ Devid nna ya si na Siria nweta ọtụtụ n’ime kọpa ndị ahụ mgbe o merichara ndị Siria. (1 Ihe E Mere 18:6-8) E jikwa ọla kọpa wụọ nnukwu efere a na-akpọ “oké osimiri a wụrụ awụ.” Mmiri ruru puku galọn iri na asaa na narị ise ga-abacha n’ime ya. Nnukwu efere ahụ dị ezigbo arọ. Ndị nchụàjà na-esi na ya ekute mmiri ha ji asa ụkwụ na aka. (1 Ndị Eze 7:23-26, 44-46) E nwekwara nnukwu ogidi abụọ e ji ọla kọpa kpụọ. Ha dị n’ọnụ ụzọ ụlọ nsọ ahụ. Etiti ha ghe oghe, ma ọ fọrọ obere ka ha ruo mita abụọ n’obosara. Ha dịkwa mita asatọ n’ịdị elu. E jikwa ọla kọpa kpụọ ihe abụọ e ji chọọ elu ha mma. Ihe abụọ ahụ dị ihe dị ka mita abụọ n’ịdị elu. (1 Ndị Eze 7:15, 16; 2 Ihe E Mere 4:17) Ọla kọpa e ji kpụọ ihe niile a abụghị ihe e ji ọnụ ekwu.

Ndị mmadụ na-ejikwa ọla kọpa arụ ihe ndị ọzọ n’oge Baịbụl. Dị ka ihe atụ, Baịbụl kọọrọ anyị na e ji ọla kọpa rụọ ngwá ọgụ, agbụ ígwè, ngwá egwú, na ibo ụzọ. (1 Samuel 17:5, 6; 2 Ndị Eze 25:7; 1 Ihe E Mere 15:19; Abụ Ọma 107:16) Jizọs kwuru banyere ego e ji ọla kọpa mee, Pọl onyeozi ekwuokwa banyere “Alegzanda onye na-akpụ ọla kọpa.”—Matiu 10:9; 2 Timoti 4:14.

A ka nwere ọtụtụ ihe ndị na-amụ gbasara ihe ndị mgbe ochie na ndị na-akọ akụkọ ihe mere eme na-amatabeghị banyere ebe ndị e si enweta ọla kọpa n’oge Baịbụl nakwa banyere ihe ndị ahụ a chọtara na Nahal Mishma. Ma, nke bụ́ eziokwu bụ na Baịbụl gosiri na ala ahụ ụmụ Izrel nwetara bụ ‘ezi ala nke a na-egwupụta ọla kọpa n’ugwu ndị dị na ya.’—Diuterọnọmi 8:7-9.