Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE NỌVEMBA 2013

 ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | GỊNỊ MERE O JI ESIRI ỤFỌDỤ NDỊ IKE ỊHỤ CHINEKE N’ANYA?

Ụgha nke Atọ: Obi Fere Chineke Azụ

Ụgha nke Atọ: Obi Fere Chineke Azụ

IHE ỌTỤTỤ NDỊ KWEERE

‘Ozugbo ndị niile mere njọ ogbugbu nwụrụ, mkpụrụ obi ha na-aga na hel, bụ́ ebe ọkụ ga na-agba ha ebeebe.’ (Katkizim Chọọchị Katọlik) Ụfọdụ ndị isi okpukpe kwuru na ọ bụrụ na mmadụ agaa na hel, o nwekwaghị ihe jikọrọ ya na Chineke.

IHE BAỊBỤL KWURU

“Mkpụrụ obi ọ bụla nke na-emehie, ọ bụ ya ga-anwụ.” (Ezikiel 18:4) “Ndị nwụrụ anwụ amaghị ihe ọ bụla ma ọlị.” (Ekliziastis 9:5) Ọ bụrụ na mkpụrụ obi na-anwụ anwụ, ya abụrụkwa na o nweghị ihe ọ bụla ọ ma mgbe ọ nwụrụ, olee otú ọ ga-esi mara na ọkụ “na-agba ya ebeebe” ma ọ bụkwanụ ya ana-ewute ya na o nwekwaghị ihe jikọrọ ya na Chineke ruo mgbe ebighị ebi?

Na Baịbụl, ihe okwu Hibru na okwu Grik a sụgharịrị “hel” pụtara bụ ili. Dị ka ihe atụ, mgbe Job nọ na-arịa ajọ ọrịa, o kpere ekpere, sị: “Ọ dị m ka ya bụrụ na ị ga-ezobe m n’ili [“n’ime hel,” Douay-Rheims Version].” (Job 14:13, Holy Bible—Easy-to-Read Version) Job chọrọ ịga zuru ike n’ili, ọ bụghị ịga n’ebe ọ ga-ata ahụhụ ma ọ bụ n’ebe ọ na-enwekwaghị ihe ga-ejikọta ya na Chineke.

IHE MERE IHE A BAỊBỤL KWURU JI DỊ MKPA

Ọ bụrụ na anyị kweere na obi fere Chineke azụ, anyị agaghị achọ ka anyị na ya dịrị ná mma, kama anyị ga na-eze ya eze. Otu nwaanyị bi na Meksiko, onye aha ya bụ Rocío, sịrị: “Malite mgbe m dị obere, a na-akụziri m na Chineke na-ata ndị mmadụ ahụhụ n’ọkụ ala mmụọ. Ihe a a kụziiri m mere ka ụjọ jide m nke na m chere na Chineke enweghị àgwà ọma ọ bụla. M chere na Chineke bụ onye iwe, bụrụkwa eze onye agwala m.”

Mgbe Rocío ghọtara ihe Baịbụl kwuru gbasara otú Chineke sirila meso ndị ajọ omume ihe na ihe na-eme ndị mmadụ ma ha nwụọ, ọ kwụsịrị iwere Chineke otú o sibu were ya. Rocío sịrị: “Ahụ́ ruru m ala, ya adị m ka e bupụrụ ibu na-anyịgbu m. Obi maliteziri isi m ike na Chineke chọrọ ka ihe dịrị anyị ná mma, na ọ hụrụ anyị n’anya, nakwa na m nwere ike ịhụ ya n’anya. Chineke dị ka nna nke se ụmụ ya n’aka, nke chọkwara ka ihe gaziere ha.”—Aịzaya 41:13.

Ọtụtụ ndị agbalịala ka ha na-eme ezi omume maka na ha na-atụ ụjọ ịga ọkụ ala mmụọ. Ma, Chineke achọghị ka ị na-efe ya maka na ị na-atụ ya ụjọ. Kama nke ahụ, ihe Jizọs kwuru bụ: “Hụ Jehova bụ́ Chineke gị n’anya.” (Mak 12:29, 30) Ihe ọzọ bụ na ọ bụrụ na anyị aghọta na Chineke anaghị ekpe ikpe na-ezighị ezi, obi ga-esi anyị ike na ihe ọ ga-eme n’ọdịnihu ziri ezi. Obi ga-esikwa anyị ike ikwu ihe enyi Job, bụ́ Elaịhu, kwuru. Ọ sịrị: “Ya bụrụ Chineke ihe arụ ime ihe ọjọọ, ya bụrụ Onye Pụrụ Ime Ihe Niile ihe arụ ime ihe n’ụzọ na-ezighị ezi.”—Job 34:10.