Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE NỌVEMBA 2013

 ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | GỊNỊ MERE O JI ESIRI ỤFỌDỤ NDỊ IKE ỊHỤ CHINEKE N’ANYA?

Ụgha nke Abụọ: Ụmụ Mmadụ Agaghị Amatali Onye Chineke Bụ

Ụgha nke Abụọ: Ụmụ Mmadụ Agaghị Amatali Onye Chineke Bụ

IHE ỌTỤTỤ NDỊ KWEERE

“E nwere okpukpe atọ Ndị Kraịst na-ekpekarị, ya bụ, Chọọchị Katọlik, Chọọchị Ọtọdọks, na nke Protestant. Ha niile na-ekwu na e nwere Pesịn atọ n’otu Chukwu, ya bụ, Chukwu Nna, Chukwu Nwa, na Chukwu Mmụọ Nsọ. Ndị na-akụzi gbasara okpukpe Ndị Kraịst na-ekwu na pesịn atọ a abụghị chi atọ, kama na ha atọ bụ otu.”—The New Encyclopædia Britannica.

IHE BAỊBỤL KWURU

O nweghị mgbe Ọkpara Chineke, bụ́ Jizọs, kwuru na ya na Chineke hà ma ọ bụ na ya na Nna ya bụ otu onye. Kama, ọ sịrị: “M na-alakwuru Nna m, n’ihi na Nna m ka m ukwuu.” (Jọn 14:28) Ọ gwadịrị otu n’ime ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ana m arịgokwuru Nna m na Nna unu nakwa Chineke m na Chineke unu.”—Jọn 20:17.

O nweghị onye dị adị a na-akpọ mmụọ nsọ. Baịbụl kwuru na Ndị Kraịst oge mbụ ‘jupụtara na mmụọ nsọ.’ Jehova kwukwara na ya ‘ga-awụkwasị mmụọ ya n’ahụ́ ụdị anụ ahụ́ ọ bụla.’ (Ọrụ Ndịozi 2:1-4, 17) Ebe ọ bụ na mmụọ nsọ abụghị onye, o nweghị otú ọ ga-esi mezuo Jizọs na Chineke atọ. Mmụọ nsọ bụ ike Chineke nke na-arụ ọrụ mgbe niile.

IHE MERE IHE A BAỊBỤL KWURU JI DỊ MKPA

Karl Rahner na Herbert Vorgrimler, bụ́ ndị ọkachamara n’ihe gbasara okpukpe Katọlik, kwuru gbasara nkụzi Atọ n’Ime Otu, sị: “Mmadụ enweghị ike ịghọta ya ma ọ bụrụ na e kpughereghị ya onye ahụ, e kpughegodịrị ya onye ahụ, ọ gaghị aghọtacha ya.” Ọ bụrụ na ị matalighị onye mmadụ bụ ma ọ bụ ghọta onye ọ bụ, ị̀ ga-ahụli ya n’anya? N’ihi ya, nkụzi Atọ n’Ime Otu emeela ka ndị mmadụ ghara ịmata onye Chineke bụ, meekwa ka ha ghara ịhụ ya n’anya.

Marco, bụ́ onye anyị kwuru okwu ya n’isiokwu bu nke a ụzọ, chọpụtara na nkụzi Atọ n’Ime Otu mere ka ọ ghara ịmata onye Chineke bụ. Ọ sịrị: “Echere m na Chineke achọghị ka m mata onye ọ bụ. Nke a mekwara ka m chee na Chineke nọ n’ebe dị anya n’ebe m nọ nakwa na ọ dị omimi nke na ya na ụmụ mmadụ agaghị adịli ná mma.” Ma nke bụ́ eziokwu bụ na Chineke ‘anọghị n’ebe dị anya n’ebe onye ọ bụla n’ime anyị nọ.’ (Ọrụ Ndịozi 17:27) Ọ naghị ezoro anyị onwe ya ezo. Ọ chọrọ ka anyị mata onye ọ bụ. Jizọs sịrị: “Anyị na-efe ihe anyị maara.”—Jọn 4:22.

Marco sịrị: “Mgbe m matara na Chineke abụghị Atọ n’Ime Otu, mụ na ya dịwaziri ná mma.” Ọ bụrụ na anyị ewere Jehova ka onye dị adị, kama iwere ya ka onye dị omimi nke anyị na ya na-agaghị adịli ná mma, ọ ga-adịrị anyị ezigbo mfe ịhụ ya n’anya. Baịbụl sịrị: “Onye na-enweghị ịhụnanya amaghị Chineke, n’ihi na Chineke bụ ịhụnanya.”—1 Jọn 4:8.