Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE ỌKTOBA 2013

 ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | GỊNỊ KA BAỊBỤL NA-AKỤZIRI ANYỊ?

Olee Otú Anyị Si Malite Ịdị Ndụ n’Ụwa?

Olee Otú Anyị Si Malite Ịdị Ndụ n’Ụwa?

Baịbụl akọghị ogologo akụkọ banyere otú eluigwe na ụwa si malite. Naanị ihe ọ kọọrọ anyị na Jenesis, bụ́ akwụkwọ mbụ dị na Baịbụl, bụ: “Ná mmalite, Chineke kere eluigwe na ụwa.” (Jenesis 1:1) Mgbe Chineke kechara ahịhịa na ụmụ anụmanụ, o kere nwoke na nwaanyị mbụ bụ́ Adam na Iv. Ha dị iche n’ụmụ anụmanụ n’ihi na Chineke kere ha ka nwee àgwà ụfọdụ yanwa nwere. O kere ha ka ha na-ekpebiri onwe ha ihe ha chọrọ ime. Ọ bụ ya mere ha ga-eji aza ajụjụ ihe ọ bụla ha mere. Ọ bụrụ na ha erubere Chineke isi, ha ga-eso mezuo ihe Chineke bu n’obi kee ha, ya bụ, ka ha mụjuo ụwa, ha na ụmụ ha abụrụ ndị zuru okè ma biri n’udo ruo mgbe ebighị ebi.

Ma, otu mmụọ ozi ji ohere ahụ mee ka ụmụ mmadụ mewe ihe ga-adị yanwa mma. Ihe ahụ o mere mere ka ọ ghọọ Setan. Setan pụtara “Onye mmegide.” Setan ji agwọ duhie Iv. Ọ gwara ya na ihe ga-akara ya mma ma ọ hapụ ige Chineke ntị. Adam na Iv mere ihe Setan kwuru. Nke a mere ka ha na Chineke ghara ịdịkwa ná mma. Ihe a nne na nna anyị mbụ mere mere ka ndụ ebighị ebi kwaa ha, meekwa ka ha bufeere anyị niile mmehie na ezughị okè, meekwa ka anyị na-anwụ anwụ.

Ozugbo Adam na Iv mere mmehie, Chineke kwuru ihe ọ ga-eme ka ọ napụta ụmụ Adam ná nsogbu ahụ Adam buteere ha ma mee ka ha nwee olileanya ịdị ndụ ruo mgbe ebighị ebi. Chineke buru amụma na a ga-enwe “mkpụrụ,” ya bụ, onye pụrụ iche nke ga-emecha bibie Setan ma wepụ nsogbu niile Setan na Adam na Iv kpataara ụmụ mmadụ. (Jenesis 3:15) Onye ka “mkpụrụ” ahụ ga-abụ? E mechaa, anyị ga-amata.

Ma, Setan nọ na-agbalị ka ihe ọma Chineke bu n’obi kee mmadụ ghara imezu. O teghị aka, ya emee ka mmehie na ihe ọjọọ ju ebe niile. Chineke kpebiziri na ya ga-eji iju mmiri bibie ndị ajọ omume. Ọ gwara Noa, bụ́ nwoke ezi omume, ka ọ rụọ ụgbọ, ya bụ, nnukwu igbe ga na-ese n’elu mmiri. Ihe mere o ji gwa ya ka ọ rụọ ya bụ ka e jiri ya zọpụta ya na ezinụlọ ya na ụmụ anụmanụ ndị a gwara ya ka ọ chịba n’ụgbọ ahụ.

Otu afọ iju mmiri ahụ bidoro, Noa na ezinụlọ ya si n’ụgbọ ahụ pụta ma biri n’ụwa nke a na-enwekwaghị ndị ajọ omume na ya. Ma n’oge ahụ, “mkpụrụ” ahụ abịabeghị.

Ihe a kọrọ n’isiokwu a si na Jenesis 1-11; Jud 6, 14, 15; Mkpughe 12:9.