Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE ỌKTOBA 2013

I Nwere Ike Idi Nsogbu Na-abịara Ndị Gbara Alụkwaghịm

I Nwere Ike Idi Nsogbu Na-abịara Ndị Gbara Alụkwaghịm

“Ihe ahụ merenụ gbawara m obi. Ihe na-agara m siriri werere, ma na mberede, ihe niile funahụrụ m.”—MAK. * Ya na nwunye ya gbara alụkwaghịm kemgbe otu afọ.

“Di m na otu nwa agbọghọ ya na ada anyị bụ ọgbọ kwara iko. Mgbe anyị gbara alụkwaghịm, ahụ́ bịara ruo m ala maka na ọ gaghịzi na-ewesa m iwe ọkụ ọ na-ewe. Ma, ihe a merenụ mechuru m ihu ma mee ka ọ dị m ka ọ̀ bụ na mụ abaghị uru.”—ESTA. Ya na di ya gbara alụkwaghịm kemgbe afọ iri na asaa.

Ihe mere e ji gbaa ụfọdụ ụmụ nwaanyị alụkwaghịm * bụ na di ha chere na ihe ga-akara ha mma ma ha gbaa ha alụkwaghịm. E nwekwara ụfọdụ ụmụ nwaanyị ji aka ha gbaa di ha alụkwaghịm. Ma, ọtụtụ ndị gbara di ha ma ọ bụ nwunye ha alụkwaghịm na-achọpụtakarị na ihe na-adịrị ha njọ karịa otú ha tụrụ anya ya. Ọ bụrụ na di gị gbara gị alụkwaghịm n’oge na-adịbeghị anya, ị ga-achọpụta na ihe a so n’ihe kacha njọ metụrụla gị. N’ihi ya, ọ ga-adị mma ka anyị leba anya n’ụfọdụ ndụmọdụ Baịbụl nyere, bụ́ ndị nwere ike inyere gị aka idi nsogbu ndị na-abịara ndị gbara alụkwaghịm.

NSOGBU NKE MBỤ: OBI ỌJỌỌ GA NA-EME GỊ.

E nwere ọtụtụ ihe na-enye nwaanyị di ya gbara alụkwaghịm nsogbu n’obi. Ụfọdụ n’ime ha bụ otú ọ ga-esi na-akpata ego ga-ezuru ya, otú naanị ya ga-esi azụ ụmụ ha, na otú naanị ya ga-esizi nọrọ. O nwere ike ihe ndị a agaghị apụ ya n’obi ngwa ngwa. Otu ọkachamara nwụrụla anwụ aha ya bụ Judith Wallerstein chọpụtara na ụfọdụ ụmụ nwaanyị ndị di ha gbara alụkwaghịm ka na-eche  na a ghọgburu ha aghọgbu ma ọ bụ na a jụrụ ha ajụ n’agbanyeghị na o nwere ike ịbụ na ọtụtụ afọ agafeela kemgbe a gbara ha alụkwaghịm. Ha na-eche na “ụwa nke ha dị iche, nakwa na a hụghị ha n’anya.”

IHE I NWERE IKE IME

  • Bee ákwá ma ọ bụrụ na ákwá agụọ gị. O nwere ike ịbụ na obi gị ka dị n’ebe di gị ahụ nọ. Ọ bụrụgodị na ọ na-emesi gị ike mgbe ahụ unu bi, ị ka nwekwara ike ibe ákwá maka na ọ bụghị ihe ị tụrụ anya ya ka ị hụrụ. (Ilu 5:18) Ihere emela gị ibe ákwá n’oge a bụ́ “oge ịkwa ákwá.”—Ekliziastis 3:1, 4.

  • Anọla naanị gị mgbe niile. Ọ bụ eziokwu na i kwesịrị ịnọ naanị gị mgbe ụfọdụ bee ákwá, ma onye ma ihe agaghị anọ naanị ya ruo ogologo oge. (Ilu 18:1) Mgbe gị na ndị enyi gị na-akparịta ụka, na-ekwu ihe ga-agba ha ume n’ihi na ọ bụrụ na ị na-emekarị mkpesa banyere di gị, ndị mmadụ nwere ike gbawara gị ọsọ, a sịgodị na ihe ị na-ekwu bụ eziokwu. Ọ bụrụ na e nwere mkpebi ndị dị mkpa ị ga-eme obere oge di gị gbachara gị alụkwaghịm, bụrụ ụzọ kọsara ya onye ị tụkwasịrị obi, bụ́ onye na-agaghị agwa gị naanị ihe ị chọrọ ịnụ.

  • Lebara onwe gị anya nke ọma. Oké echiche ndị di ha gbara alụkwaghịm na-eche nwere ike ịkpatara ha nsogbu ndị dị ka ọbara mgbali elu na oké isi ọwụwa. N’ihi ya, ọ ga-adị mma ka ị na-eriju afọ, na-emega ahụ́ ma na-ehi ụra nke ọma.—Ndị Efesọs 5:29.

  • Wepụsịa ihe ndị na-echetara gị ihe ọjọọ di gị mere gị. I nwekwara ike iwepụsị ihe ndị na-adịzighị gị mkpa, ma etufula akwụkwọ ndị baara gị uru. Ọ bụrụ na iwe na-ewe gị ma ị hụ foto agbamakwụkwọ unu ma ọ bụ ihe yiri ya, tinye ya n’ime igbe ma dowere ya ụmụ gị.

  • Gbalịa ka ị kwụsị ịna-eche ihe ga-eme ka obi jọọ gị njọ. O nwere otu nwaanyị gbara di ya alụkwaghịm maka na di ya kwara iko. Aha nwaanyị a bụ Olga. Olga sịrị na ya na-ajụkarị onwe ya, sị, “Gịnị ka nwaanyị a ya na di m kwara iko nwere m na-enweghị?” Ma Olga mechara chọpụta na ichewe ụdị ihe a nwere ike ime ka ‘obi daa ya mbà.’—Ilu 18:14.

    Ọtụtụ ndị achọpụtala na ide ihe ndị na-enye ha nsogbu n’obi ede na-eme ka ha kwụsị ichegbu onwe ha. Ọ bụrụ na i dee ihe ndị na-enye gị nsogbu, gbalịa ka i cheta ezigbo ihe ndị ị ga na-eche n’echiche. (Ndị Efesọs 4:23) Leba ihe atụ abụọ a anya:

    Ihe na-enye m nsogbu n’obi: Ọ bụ m mere ka di m gaa kwaa iko.

    Ihe m ga na-echeta: Di m ekwesịghị ịga kwaa iko maka na mụ ezughị okè.

    Ihe na-enye m nsogbu n’obi: Oge niile mụ na ya biri lara m n’iyi.

    Ihe m ga na-echeta: Obi ga-aka adị m ụtọ ma m hapụ ihe ndị merela eme lekwasị anya n’ọdịnihu.

  • Etinyela obi gị n’ihe na-akpasu iwe ndị mmadụ na-ekwu. Ndị enyi gị na ndị ikwu gị, bụ́ ndị hụrụ gị n’anya, nwere ike ikwu ihe ụfọdụ ga-ewute gị ma ọ bụdị ihe ndị na-abụghị eziokwu gbasara gị. Dị ka ihe atụ, ha nwere ike ịsị: ‘Ọ bụdịghị ụdị onye ahụ kwesịrị ịlụ gị’ ma ọ bụkwanụ ‘Chineke kpọrọ ịgba alụkwaghịm asị.’ * Ọ bụ ya mere Baịbụl ji nye anyị ndụmọdụ a: “Etinyekwala obi gị n’okwu niile ndị mmadụ pụrụ ikwu.” (Ekliziastis 7:21) Martina, bụ́ onye di ya gbara alụkwaghịm kemgbe afọ abụọ, sịrị: “Kama ichegbuwe onwe m n’ihi ihe na-akpasu iwe ndị mmadụ na-ekwu, m na-agbalị ka m na-ele ihe anya otú Chineke si ele ya. Otú o si eche echiche dị elu karịa otú anyị si eche.”—Aịzaya 55:8, 9.

  • Kpegara Chineke Ekpere. Chineke gwara ndị na-efe ya ka ha ‘na-atụkwasị ya nchegbu ha niile,’ nke ka nke, ma ọ bụrụ na e nwere ihe na-enye ha oké nsogbu.—1 Pita 5:7.

MEGODỊ IHE A: Dee amaokwu Baịbụl ndị ga-enyere gị aka ma mapawa ha n’ebe ị ga na-ahụkarị ha. E wezụga amaokwu Baịbụl ndị anyị kwurula okwu ha n’isiokwu a, ndị nke a abaarala ọtụtụ ndị di ha gbara alụkwaghịm uru: Abụ Ọma 27:10; 34:18; Aịzaya 41:10; Ndị Rom 8:38, 39.

Kwe ka Okwu Chineke nyere gị aka idi nsogbu bịaara gị

 NSOGBU NKE ABỤỌ: Ị MAGHỊ OTÚ Ị GA-ESIZI NA-EMESO ONYE AHỤ BỤ́BU DI GỊ.

Otu nwaanyị a na-akpọ Juliana, bụ́ onye ya na di ya biri afọ iri na otu, sịrị: “M rịọrọ di m ka ọ ghara ịhapụ m. Ma mgbe ọ hapụrụ m, m bidoro na-ewesa ya na nwaanyị ọ lakwuuru iwe.” Ọtụtụ ndị ha na di ha gbara alụkwaghịm na-eburu di ha iwe n’obi ruo ọtụtụ afọ. Ma, ụfọdụ n’ime ha na di ha ka ga na-ekwurịta okwu, ma hà chọrọ ya ma ọ bụ na ha achọghị ya, karịchaa, ma ọ bụrụ na ha mụrụ ụmụ.

IHE I NWERE IKE IME

  • Ekwela ka gị na onye ahụ bụ́bu di gị kpachiwe anya. Ka ihe gị na ya ga-ekwu bụrụ naanị ihe dị mkpa, kwuokwa ya ná nkenke. Ọtụtụ ndị achọpụtala na ime otú a na-eme ka udo dị.—Ndị Rom 12:18.

  • Ejila iwe agwa ya okwu. Baịbụl sịrị: “Onye ọ bụla nke na-adịghị ekwu ọtụtụ okwu maara ihe.” (Ilu 17:27) Ihe a Baịbụl kwuru bara uru, nke ka nke, ma ọ bụrụ na ọ dị gị ka ọ̀ na-agwa gị ihe ị na-achọghị ịnụ. Ọ bụrụ na o nweghị otú ị ga-esi eme ka ihe unu na-akpa ghara ịdara unu ọgụ, i nwere ike ịsị ya: “M chọrọ ichebara ihe i kwuru echiche, e mechaa anyị ekwuo.”

  • Ọ bụrụ na i nwere ike ime ya, gbalịa ka i wepụta ihe ndị bụ́ nke gị iche, dị ka akwụkwọ gbasara ahụ́ ike na ego.

MEGODỊ IHE A: Mgbe ọ bụla ọzọ gị na onye bụ́bu di gị na-akparịta ụka, lee ma ị̀ ga-ahụ ihe na-egosi na ị na-arụ ụka na-enweghị isi ma ọ bụ na-esi ọnwụ ma ọ bụkwanụ ma yanwa ọ̀ na-eme otú ahụ. Ọ bụrụ na ọ dị otú ahụ, gwa ya ka unu kwụsịtụ ma kwuchaa ya mgbe ọzọ. I nwekwara ike ịgwa ya ka unu jiri iimel kparịta ya.—Ilu 17:14.

NSOGBU NKE ATỌ: Ị MAGHỊ OTÚ Ị GA-ESI ENYERE NWA GỊ AKA KA O DIE IHE MERENỤ.

Otu nwaanyị aha ya bụ Maria chetara ihe mere mgbe ya na di ya gbachara alụkwaghịm. Ọ sịrị: “Nwa m nwaanyị nke nta nọ na-ebe naanị ákwá. O bidokwara ịba mamịrị n’ute. Nwa m nwaanyị nke tọrọ ya na-eme ka à ga-asị na o nweghị ihe merenụ, ma m chọpụtara na ihe ahụ kpakwara yanwa aka ọjọọ.” Ma, o nwere ike ịdị gị ka ọ̀ bụ na ị gaghị enweli ohere ma ọ bụ ume ị ga-eji nyere ụmụ gị aka mgbe ha chọrọ ka i nyere ha aka.

IHE I NWERE IKE IME

  • Gwa nwa gị ka ọ kọọrọ gị ihe na-echegbu ya, ọ bụrụgodị na ọ dị gị ka ihe ọ na-ekwu ọ̀ bụ “okwu nzuzu.”—Job 6:2, 3.

  • Enyela nwa gị ọrụ ọ na-ekwesịghị ịrụ. Ọ bụ eziokwu na o nwere ike ịbụ na ị chọrọ inweta onye ga na-akasi gị obi, ya abụrụkwa na ọ dị gị ka nwa gị ọ̀ chọrọ ịna-akasi gị obi, buru n’obi na ọ dịghị mma ka ị gwa nwatakịrị ka o mewere gị ihe onye torola eto kwesịrị imere gị. (1 Ndị Kọrịnt 13:11) Nwa gị ekwesịghị ịbụ onye ị ga na-akọsara ụwa gị ma ọ bụ onye ị ga na-ezi ozi ka o zie onye bụ́bu di gi ma ọ bụ onye ga na-ekpeziri gị na ya.

  • Ekwela ka ihe a merenụ ghasasịa ndụ nwa gị. Ọ bụrụ na unu ebiri ebe unu bibu ma na-eme ihe ndị unu na-emebu, ọ ga-enyere unu aka, karịchaa, ma ọ bụrụ ihe ndị gbasara ofufe Chineke, dị ka ịgụ Baịbụl na inwe ofufe ezinụlọ.—Diuterọnọmi 6:6-9.

MEGODỊ IHE A: Tupu izu a agwụ, gwa ụmụ gị na ị hụrụ ha n’anya nakwa na ọ bụghị ha kpatara gị na di gị ji gbaa alụkwaghịm. Zaa ha ajụjụ ha jụrụ, ma azala ha ya ka à ga-asị na ị na-ata di gị ụta.

I nwere ike idi nsogbu ndị na-abịara ndị di ha ma ọ bụ nwunye ha gbara alụkwaghịm. Otu nwaanyị aha ya bụ Melissa, onye ya na di ya biri afọ iri na isii, sịrị, “Mgbe anyị gbachara alụkwaghịm, m gwara onwe m, sị, ‘Ihe a abụghị otú m tụrụ anya na ndụ m ga-adị.’” Ma ugbu a, ọ na-enwe obi ụtọ n’agbanyeghị nsogbu ya. Ọ sịrị, “Ahụ́ bịara ruo m ala ozugbo m kwụsịrị ichegbu onwe m maka ihe ndị merela eme.”

^ para. 2 Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.

^ para. 4 Ọ bụ eziokwu na ndị a kacha kwuo okwu ha n’isiokwu a bụ ụmụ nwaanyị di ha gbara alụkwaghịm, ma ihe niile e kwuru gbasakwara ụmụ nwoke nwunye ha gbara alụkwaghịm.

^ para. 18 Mmadụ ịghọ di ya ma ọ bụ nwunye ya aghụghọ ma gbaa ya alụkwaghịm jọgburu onwe ya n’anya Chineke. Ma, ọ bụrụ na di ma ọ bụ nwunye akwaa iko, Chineke nyere onye nke aka ya dị ọcha ikike ikpebi ma ọ̀ ga-agba ya alụkwaghịm ka ọ̀ ga-ahapụ ịgba ya. (Malakaị 2:16; Matiu 19:9) Gụọ isiokwu bụ́, “Echiche nke Baịbụl—Ụdị Ịgba Alụkwaghịm Dị Aṅaa Ka Chineke Kpọrọ Asị?” Ọ gbara na Teta! May 8, 1994. Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya.

JỤỌ ONWE GỊ AJỤJỤ NDỊ A . . .

  • M̀ beela ákwá juru m obi kemgbe mụ na di m gbara alụkwaghịm?

  • Olee otú m nwere ike isi kwụsị iburu onye bụ́bu di m iwe n’obi?