Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE SEPTEMBA 2013

Gịnị Mere Ndị Mmadụ Ji Ata Ahụhụ?

Gịnị Mere Ndị Mmadụ Ji Ata Ahụhụ?

Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịmata ihe mere ndị mmadụ ji atagbu onwe ha n’ahụhụ na ihe mere mbọ ndị mmadụ na-agba ka ahụhụ kwụsị ji kụọ afọ n’ala, anyị ga-ebugodị ụzọ mata ihe ndị na-akpata ahụhụ niile ndị mmadụ na-ata. N’agbanyeghị na e nwere ọtụtụ ihe dị mgbagwoju anya na-akpata ahụhụ ndị mmadụ na-ata, obi dị anyị ụtọ na Baịbụl nwere ike inyere anyị aka ịghọta ha. N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’ihe ise kacha akpata ahụhụ ndị mmadụ na-ata. Anyị na-agba gị ume ka i leruo ihe ndị Baịbụl kwuru anya ma chọpụta otú o si enyere anyị aka ịghọta ihe mere ahụhụ ji ju ebe niile.—2 Timoti 3:16.

ỌCHỊCHỊ ỌJỌỌ

Baịbụl sịrị: “Mgbe onye ajọ omume ọ bụla na-achị, ndị mmadụ na-asụ ude.”—Ilu 29:2.

Kemgbe ụwa, ọtụtụ ndị ọchịchị aka ike achịala ndị mmadụ. Nke a emeela ka ndị ha na-achị tagbuo onwe ha n’ahụhụ. Ma, ọ bụghị ndị ọchịchị niile dị otú ahụ. O nwere ike ịbụ na ụfọdụ n’ime ha bu n’obi imere ndị ha na-achị ihe ọma. Ma, ozugbo ha banyere n’ọchịchị, ha na-achọpụtakarị na mbọ ha na-agba anaghị enwe isi n’ihi mgba okpuru ndị ibe ha na-agba ha nakwa n’ihi otú ha na ndị ọzọ si amarịta aka. Ihe ọzọ bụ na ha nwere ike iji ikike e nyere ha na-eme ihe ga-abara naanị onwe ha uru, ya emezie ka ndị ha na-achị na-atagbu onwe ha n’ahụhụ. Otu onye na-ahụbu maka mmekọrịta mba Amerịka na mba ndị ọzọ, bụ́ Henry Kissinger, sịrị: “Kemgbe ụwa, ọtụtụ mbọ ndị ọchịchị na-agba akụọla afọ n’ala, ihe ndị ha tụkwara anya na ha ga-emere ndị mmadụ enweghịkwa nke nwere isi.”

Baịbụl kwukwara na “ọ dịrịghị mmadụ nke na-eje ije ọbụna iduzi nzọụkwụ ya.” (Jeremaya 10:23) Ụmụ mmadụ enweghị ike ịchị onwe ha n’ihi na ha enweghị amamihe ha ga-eji achị onwe ha, ha amaghịkwa ihe echi ga-abụ. Ọ bụrụ na ndị mmadụ agaghị achịli onwe ha, ọ̀ bụzi mba ha ka ha ga-achịtali? Ị̀ hụla ihe mere na ndị ọchịchị enweghị ike ime ka ahụhụ ndị mmadụ na-ata kwụsị? Nke a na-egosi na ihe na-akpatakarị ahụhụ ndị mmadụ na-ata bụ ọchịchị ọjọọ.

OKPUKPE ỤGHA

Jizọs sịrị: “Mmadụ niile ga-eji nke a mara na unu bụ ndị na-eso ụzọ m, ma ọ bụrụ na unu enwee ịhụnanya n’etiti onwe unu.”—Jọn 13:35.

Ndị isi okpukpe dị iche iche na-agwa ndị mmadụ ka ha hụ ibe ha n’anya ma dịrị n’otu. Ma, ha anaghị akụziri ndị okpukpe ha otú ha ga-esi hụ ndị ọzọ n’anya nke na o nweghị onye ga-akpọ ibe ya asị. Okpukpe so n’ihe ndị na-eme ka ndị mmadụ na ibe ha kewaa ma kpọọ ibe ha asị kama ime ka ha hụ ibe ha n’anya. O sokwa eme ka ndị mmadụ na ibe ha nakwa mba dị iche iche na-ese okwu. Otu ọkà mmụta n’ihe banyere okpukpe, bụ́ Hans Küng, dere ná ngwụcha otu akwụkwọ ya, sị: “Agha kacha njọ ndị mmadụ lụtụrụla bụ ndị nke ha lụrụ n’ihi okpukpe ha ebe ọ bụ na okpukpe ha mere ka ha chee na ihe ha na-eme adịghị njọ.”

 Ihe ọzọkwa bụ na ọtụtụ ndị isi okpukpe ekwuola na nwoke na nwaanyị na-abụghị di na nwunye inwe mmekọahụ adịghị njọ nakwa na nwoke idina nwoke ibe ya na nwaanyị idina nwaanyị ibe ya abụghị ihe ọjọọ. Nke a emeela ka ọrịa ju ebe niile, meekwa ka ọtụtụ ndị na-atụrụ ime ọkwà ma na-ete ime. O meekwala ka ọtụtụ di na nwunye na ọtụtụ ezinụlọ tisaa. Ihe ndị a akpatarala ọtụtụ ndị obi mgbawa na nhụsianya.

ỤMỤ MMADỤ EZUGHỊ OKÈ, HA NA-ACHỌKWA IHE GA-ABARA NAANỊ HA URU

Baịbụl sịrị: “A na-anwa onye ọ bụla mgbe ọchịchọ nke aka ya rapụtara ya wee rafuo ya. Mgbe ọchịchọ ahụ tụụrụ ime, ọ na-amụpụta mmehie.”—Jems 1:14, 15.

Anyị niile na-eme mmehie n’ihi na anyị bụ ndị na-ezughị okè. Ọ bụ ya mere o ji dị mkpa ka anyị na-agba mbọ ka anyị ghara ime “ihe anụ ahụ́ anyị na echiche anyị chọrọ.” (Ndị Efesọs 2:3) Ma, ọ bụrụ na ime ihe ọjọọ dị anyị n’obi, ohere ime ya adapụtakwa ozugbo, ọ na-esiri anyị ezigbo ike ịhapụ ime ihe ọjọọ ahụ. Ọ bụrụ na anyị emee ihe na-adịghị mma, ọ ga-akpatara anyị nsogbu.

Otu nwoke aha ya bụ P. D. Mehta dere n’akwụkwọ ya na “ihe kacha akpata ahụhụ anyị na-ata bụ agụụ ihe ọjọọ, anyaukwu, oké ọchịchọ, na ndụ okomoko.” Ọchịchọ ọjọọ ndị mmadụ na-enwe na otú mmanya, ọgwụ ọjọọ, ịgba chaa chaa, inwe mmekọahụ na ihe ndị ọzọ si rie ha ahụ́ emeela ka ọtụtụ ndị a na-akwanyere ùgwù n’obodo ghọọ ndị iberiibe. Nke a emeekwala ka ndị ezinụlọ ha, ndị enyi ha, na ndị ọzọ taa ahụhụ. Otú a imi na anya dị ụmụ mmadụ maka na ha ezughị okè ga-eme ka anyị kweta na ihe Baịbụl kwuru bụ eziokwu, ya bụ, na “ihe niile e kere eke na-asụkọ ude ma na-anọkọ n’ihe mgbu ruo ugbu a.”—Ndị Rom 8:22.

IKE NDỊ MMỤỌ ỌJỌỌ NA-AKPA

Baịbụl gosiri na Setan bụ “chi nke usoro ihe a” nakwa na ndị mmụọ ọjọọ dị ike so ya arụ ọrụ.—2 Ndị Kọrịnt 4:4; Mkpughe 12:9.

Ndị mmụọ ọjọọ na-eme ka Setan. Ọrụ ha bụ ịchị ndị mmadụ na iduhie ha. Pọl onyeozi kwuru na ọ bụ ihe a ka ha na-eme. Ọ bụ ya mere o ji sị na “anyị nwere mgba, ọ bụghị megide ọbara na anụ ahụ́, kama megide ọchịchị, megide ikike, megide ndị na-achị ụwa nke ọchịchịrị a, megide ìgwè ndị mmụọ ọjọọ n’ebe ndị dị n’eluigwe.”—Ndị Efesọs 6:12.

N’agbanyeghị na ọ na-atọ ndị mmụọ ọjọọ ụtọ ịmaja ndị mmadụ, ma ọ bụchaghị ya bụ mkpa ha. Ihe ha chọrọ bụ ime ka ndị mmadụ kwụsị ife Onye Kasị Ihe Niile Elu, bụ́ Jehova Chineke. (Abụ Ọma 83:18) Ihe ndị mmụọ ọjọọ ji enweta ndị mmadụ ma na-eduhie ha bụ ihe ndị dị ka ịgụ kpakpando, ime anwansi, ịgba afa, na ịkọ ọdịnihu. Ọ bụ ya mere Jehova ji agwa anyị ka anyị gbaara ihe ndị a ọsọ. Ọ bụkwa ya mere o ji echebe ndị niile jụrụ ime ihe dị Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya mma.—Jems 4:7.

ANYỊ BI “N’OGE IKPEAZỤ”

Ihe dị ka puku afọ abụọ gara aga, Baịbụl buru amụma, sị: “Mara nke a, na n’oge ikpeazụ, a ga-enwe oge dị oké egwu, nke tara akpụ.”

Baịbụl kwuru ihe mere oge a ji bụrụ oge tara akpụ. Ọ sịrị na “ndị mmadụ ga-abụ ndị hụrụ naanị onwe ha n’anya, ndị hụrụ ego n’anya, ndị na-anya isi, ndị mpako, . . . ndị na-enweghị obi mmadụ, ndị na-adịghị achọ inwe nkwekọrịta ọ bụla, ndị nkwutọ, ndị na-adịghị ejide onwe ha, ndị na-eme ihe ike, ndị na-adịghị ahụ ezi ihe n’anya, ndị na-arara mmadụ nye, ndị isi ike, ndị nganga fụliri elu, ndị hụrụ ihe ụtọ n’anya kama ịbụ ndị hụrụ Chineke n’anya.” O doro anya na ihe kacha akpata ahụhụ ndị mmadụ na-ata bụ na anyị bi “n’oge ikpeazụ.”—2 Timoti 3:1-4.

Ugbu a anyị lebacharala anya n’ihe ndị na-akpatara ndị mmadụ ahụhụ, ọ̀ bụ na anyị aghọtabeghị ihe mere na ndị mmadụ enweghị ike ime ka ahụhụ kwụsị n’agbanyeghị na ha chọrọ ime otú ahụ? Ònyezi ka anyị ga-agakwuru ka o nyere anyị aka? Ọ bụ Onye kere anyị. O kwere nkwa na ‘ọ ga-ebibi ọrụ Ekwensu’ na ndị mmụọ ọjọọ ya. (1 Jọn 3:8) Isiokwu na-eso nke a ga-akọwa ihe Chineke ga-eme ka ahụhụ niile ndị mmadụ na-ata kwụsị.