Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE SEPTEMBA 2013

 BỊARUO CHINEKE NSO

“Chineke Hụrụ Onye Na-eji Obi Ụtọ Enye Ihe n’Anya”

“Chineke Hụrụ Onye Na-eji Obi Ụtọ Enye Ihe n’Anya”

Ọ bụrụ na mmadụ enye gị onyinye, olee ihe ga-eme ka onyinye ahụ mee gị obi ụtọ? O doro anya na obi ga-atọ ọtụtụ n’ime anyị ụtọ ma ọ bụrụ na onye ahụ ji obi ya niile nye anyị onyinye ahụ maka na ọ hụrụ anyị n’anya. Ọ bụrụ na onye ahụ ejighị obi ya nye anyị ya, obi agaghị adị anyị ụtọ. Mgbe ọ bụla mmadụ nyere anyị onyinye, ihe na-akacha anyị mkpa bụ ma onye ahụ ò jikwa obi ya nye anyị ya. Otú ahụ ka ọ dịkwa Chineke. Ka anyị leba anya n’ihe Pọl onyeozi si n’ike mmụọ nsọ dee ná 2 Ndị Kọrịnt 9:7.

Gịnị mere Pọl ji dee ihe ahụ o dere n’amaokwu a? Ihe mere o ji dee ya bụ ka ọ gbaa Ndị Kraịst bi na Kọrịnt ume ka ha gbatara Ndị Kraịst ibe ha bi na Judia ọsọ enyemaka. Ma, Pọl ọ̀ manyere Ndị Kọrịnt amanye ka ha nye onyinye ahụ? N’ebeekwanụ? Kama ịmanye ha amanye, ọ gwara ha, sị: “Ka onye ọ bụla nye dị ka o kpebiri n’obi ya, ọ bụghị ná mwute ma ọ bụ ná mmanye, n’ihi na Chineke hụrụ onye na-eji obi ụtọ enye ihe n’anya.” Ka anyị lebakwuo anya n’ihe a Pọl kwuru.

“Dị ka o kpebiri n’obi ya.” Pọl kwuru na ezigbo Onye Kraịst na-enye onyinye maka na o burula ụzọ kpebie “n’obi ya” na ọ ga-enye ya. Tupu Onye Kraịst enye Ndị Kraịst ibe ya nọ ná mkpa onyinye, ọ na-ebu ụzọ chebara mkpa ha echiche. Otu ọkà mmụta kwuru na okwu Grik a sụgharịrị “kpebiri” n’amaokwu a “pụtara ihe mmadụ bu ụzọ chebara echiche.” N’ihi ya, Onye Kraịst na-ebu ụzọ echebara mkpa Ndị Kraịst ibe ya echiche ma jụọ onwe ya ihe o nwere ike ime iji gbooro ha mkpa ahụ.—1 Jọn 3:17.

“Ọ bụghị ná mwute ma ọ bụ ná mmanye.” Pọl kwuru ụdị onyinye abụọ Ndị Kraịst na-anaghị enye, ya bụ, nke e ji mwute enye na nke a manyere ha amanye ka ha nye. Otú Pọl si dee okwu Grik a sụgharịrị “mwute” n’amaokwu a bụ “n’obi ọjọọ ma ọ bụ n’iru uju.” Otu akwụkwọ kwuru na ọ bụrụ na mmadụ ji mwute na-enye onyinye, “obi ga na-ajọ ya njọ ma o cheta na ego ọ chọrọ inye ga-aghọzi nke onye ọzọ.” Ọ bụrụ na mmadụ enye onyinye ná mmanye, onyinye ahụ esighị ya n’obi. Ò nwere onye n’ime anyị ga-achọ ịnata onyinye nke na-esighị onye nyere onyinye ahụ n’obi?

“Chineke hụrụ onye na-eji obi ụtọ enye ihe n’anya.” Pọl kwuru na ọ bụrụ na Onye Kraịst ekpebie inye onyinye, o kwesịrị iji obi ụtọ ma ọ bụ ọṅụ nye ya. N’eziokwu, mmadụ ga-enwe obi ụtọ ma ọ bụrụ na onyinye o nyere si ya n’obi. (Ọrụ Ndịozi 20:35) Ọ bụrụ na mmadụ ji obi ụtọ nye mmadụ ihe, obi ụtọ ahụ na-apụta ya n’ihu. N’eziokwu, okwu bụ́ “obi ụtọ” na-egosi otú obi dị onye nyere onyinye ahụ nakwa otú ihu dị ya. Ọ bụrụ na mmadụ ji obi ụtọ nye anyị onyinye, obi na-atọ anyị ụtọ, Chineke na-enwekwa obi ụtọ. Lekwa otú Baịbụl ọzọ si sụgharịa ihe ahụ Pọl kwuru: “Chineke na-ahụ onye ji obi ụtọ enye onyinye n’anya.”—Baịbụl Nsọ: Nhazi Katọlik.

“Chineke hụrụ onye na-eji obi ụtọ na-enye ihe n’anya”

Mgbe Ndị Kraịst na-enye onyinye, ha anaghị echefu ihe ahụ Pọl onyeozi si n’ike mmụọ nsọ dee. Mgbe anyị chọrọ inyere ndị ọzọ aka ma ọ bụ iji oge anyị, ike anyị, ma ọ bụ ihe ndị anyị nwere meere ha ihe, anyị kwesịrị iji obi anyị niile mee ya, karịchaa ma ọ bụrụ ndị nọ ná mkpa ka anyị na-emere ya. Inye ndị mmadụ ụdị onyinye a ga-eme ka anyị nwee obi ụtọ, ọ ga-emekwa ka anyị na Chineke dị ná mma n’ihi na “Chineke hụrụ onye na-eji obi ụtọ na-enye ihe n’anya.”

Ebe anyị na-atụ aro ka ị gụọ na Baịbụl n’ọnwa Septemba

1 Ndị Kọrịnt na 2 Ndị Kọrịnt