Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE SEPTEMBA 2013

 AKỤKỌ NDỤ

Anyị Ji Ofufe Chineke Kpọrọ Ihe n’Agbanyeghị na Anyị Dara Ogbenye

Anyị Ji Ofufe Chineke Kpọrọ Ihe n’Agbanyeghị na Anyị Dara Ogbenye

Nna m na nna m ochie biri n’otu ụlọ a na-arụchabeghị arụcha nke dị n’obodo a na-akpọ Kotiujeni. Obodo a dị n’ebe ugwu mba Moldova, ọtụtụ ndị bi na ya bụkwa ndị ogbenye. Ọ bụ n’obodo a ka a mụrụ m na Disemba 1939. Mgbe ọ na-erula afọ 1934, nna m na nna m ochie aghọọla Ndịàmà Jehova. Mama m ghọkwara Onyeàmà Jehova mgbe o mechara doo ya anya na nna m ochie ka pastọ ndị obodo anyị mara Baịbụl.

Mgbe m dị afọ atọ, ndị ọchịchị buuru nna m, nwanne ya nwoke nke ọ tọrọ, na nna m ochie gaa n’ebe a manyere ha ka ha na-arụ ọrụ ike. Ihe mere e ji buru ha gaa ebe ahụ bụ maka na ha achọghị itinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Ọ bụ naanị nna m bụ onye na-anwụghị. Mgbe a lụchara Agha Ụwa nke Abụọ n’afọ 1947, ọ lọtara. Ma n’oge ahụ, o merụọla ahụ́ n’azụ. N’agbanyeghị na ahụ́ esizighị ya ike, okwukwe ya ka siri ike.

OTÚ IHE SI GBANWEE NÁ NDỤ ANYỊ

Mgbe m dị afọ itoolu, e buuru ezinụlọ anyị na ọtụtụ ezinụlọ ndị ọzọ bụ́ Ndịàmà Jehova si na Moldova gaa Saịberịa. N’abalị isii n’ọnwa Julaị afọ 1949, e buuru anyị n’ụgbọ okporo ígwè e ji ebu ehi gawa. Anyị nọrọ n’ụgbọ ahụ abalị iri na abụọ. Mgbe anyị gbara ihe karịrị puku kilomita isii na narị kilomita anọ, anyị rutere n’ọdụ okporo ígwè dị n’obodo Lebyaze. Ndị uwe ojii nọ ebe ahụ na-eche anyị eche. E kewara anyị n’ìgwè n’ìgwè, a kpọrọ ndị nke a gaa ebe a, a kpọrọ ndị nke ọzọ gaa ebe ọzọ. Ebe a kpọsara ìgwè nke anyị bụ n’ụlọ akwụkwọ ọ na-enweghị ndị nọ na ya. Ike gwụchara onye ọ bụla n’ime anyị, obi jọkwara anyị njọ. E nwere otu agadi nwaanyị anyị na ya nọ n’ebe ahụ. Nwaanyị a bidoro ịbụ abụ Ndịàmà Jehova dere n’oge a na-alụ Agha Ụwa nke Abụọ. O teghị aka mmadụ niile esoro ya bụwa abụ ahụ. Ihe abụ ahụ kwuru bụ:

“A chụpụrụ ọtụtụ ụmụnna n’obodo ha, chụga ha n’ebe dị anya.

A kpọgara ha n’ebe ugwu na n’ebe ọwụwa anyanwụ.

A mara ha ikpe ka ha tagbuo onwe ha n’ahụhụ n’ihi na ha na-arụ ọrụ Chineke. N’ebe ahụ, ha diri ọnwụnwa ọjọọ dị iche iche.”

Ka oge na-aga, anyị malitere ịga ọmụmụ ihe kwa ụbọchị Sọnde n’ebe dị ihe dị ka kilomita iri na atọ ma e si ebe anyị bi gawa ya. Anyị na-apụkarị n’isi ụtụtụ mgbe ezigbo oyi na-atụ ma gaa ije n’elu snoo nke nwere ike iru mmadụ n’úkwù. Anyị na-akpụju n’obere ụlọ anyị na-anọ amụ ihe. Anyị niile na-eru mmadụ iri ise ma ọ bụ karịa. Ihe mbụ anyị na-eme ma anyị rute bụ ịbụ otu abụ ma ọ bụ abụọ ma ọ bụkwanụ atọ. Anyị bụchaa, anyị ekpee ekpere. E kpechaa ekpere, a na-eji Baịbụl aza ajụjụ ndị mmadụ jụrụ. Nke a na-ewe ihe dị ka otu awa. Anyị na-abụkwu abụ ma zakwuo ajụjụ ndị ọzọ ndị mmadụ jụrụ. Nnọkọ ahụ na-eme ka okwukwe anyị sie ezigbo ike.

NSOGBU NDỊ ỌZỌ BỊAARA ANYỊ

Mgbe ọ na-erula afọ 1960, ndị ọchịchị hapụrụ Ndịàmà Jehova ahụ a kpọgara ná mba ọzọ ka ha mewe ihe ụfọdụ a na-ekwebughị ka ha na-eme. N’agbanyeghị na anyị dara ogbenye, m gara Moldova. Ọ bụ n’ebe ahụ ka m hụrụ Nina. Mama ya na papa ya na nne na nna ya ochie bụcha Ndịàmà Jehova. O teghị aka mụ na ya alụọ ma laghachi Saịberịa. Ọ bụ na Saịberịa ka anyị nọ mụọ nwa anyị nwaanyị aha ya bụ Dina n’afọ 1964. Anyị mechara mụọ nwa anyị nwoke aha ya bụ Viktor n’afọ 1966. Mgbe afọ abụọ gachara, anyị kwagara Yukren. Anyị bi n’obere ụlọ dị n’obodo Jenkọi. Obodo a dị ihe dị ka otu narị kilomita  na iri isii ma e si n’obodo Yalta gawa ya. Yalta dị n’ebe a na-akpọ Krimia.

A machibidoro ọrụ Ndịàmà Jehova iwu na Krimia otú a machibidoro ya n’ebe niile na Sọviet Yuniọn. Ma, a naghị enyekarị anyị nsogbu. A na-ekwetụ ka anyị na-aga ozi ọma na ọmụmụ ihe nakwa ka anyị na-eme ihe ndị ọzọ. Nke a meziri ka ụfọdụ ụmụnna anyị kwụsịzie iji ofufe Chineke kpọrọ ihe. Ha chere na ebe ọ bụ na ha ataala ezigbo ahụhụ mgbe ha nọ na Saịberịa, ugbu a bụzi oge ha ga-eji kpaa ego.

IHE ỌMA NDỊ MEERE ANYỊ

N’abalị iri abụọ na asaa n’ọnwa Mach afọ 1991, gọọmenti Sọviet Yuniọn nyere Ndịàmà Jehova ikike ikpe okpukpe ha. Ozugbo ahụ, anyị bidoro ịkwadebe mgbakọ abalị abụọ pụrụ iche a ga-enwe n’ebe asaa na Sọviet Yuniọn. E kwuru na anyị ga-enwe mgbakọ nke anyị n’ebe a na-akpọ Odesa nke dị na Yukren. E kwuru na mgbakọ a ga-amalite n’abalị iri abụọ na anọ n’ọnwa Ọgọst. M rutere n’ebe a ga-enwe mgbakọ a otu ọnwa tupu ụbọchị mgbakọ ahụ eruo ka m nwee ike nye aka kwadebe ebe a ga-anọ enwe ya, ya bụ, n’otu nnukwu ámá egwuregwu a na-anọ agba bọl.

O nwere ndị mụ na ha so gaa ịrụ ọrụ ahụ. Anyị na-arụgide ọrụ ruo mgbe chi jiri. Ọtụtụ mgbe, anyị na-ehi ụra n’oche ndị dị n’ámá egwuregwu ahụ ruo mgbe chi bọrọ. Ụfọdụ ụmụ nwaanyị bụ́ Ndịàmà Jehova nọ na-ekpochasị ma na-azachasị ogige ámá egwuregwu ahụ. Unyi ndị a zapụtara ma kpofuo juru ihe karịrị gwongworo atọ. Ụmụnna ndị na-ahụ maka inweta ụlọ obibi gara n’ebe dị iche iche n’obodo ahụ na-achọ ebe a ga-enwetara puku mmadụ iri na ise a na-atụ anya ha ụlọ. Ka nke a na-eme, anyị nụrụ ozi wụrụ onye ọ bụla akpata oyi n’ahụ́.

N’abalị iri na itoolu n’ọnwa Ọgọst, mgbe ọ fọrọ naanị abalị ise ka mgbakọ ahụ bido, e kweghị ka onyeisi ala mba Sọviet Yuniọn n’oge ahụ, bụ́ Mikhail Gorbachev, pụta èzí n’ebe ọ gara ezumike n’ebe dị nso n’obodo Yalta. Ebe ahụ adịghị anya n’ebe anyị nọ na-akwadebe mgbakọ ahụ. A kagburu ikike e nyere anyị inwe mgbakọ ahụ. Ndị chọrọ ịbịa mgbakọ ahụ bidoro ịkpọ na fon ma na-ajụ ihe ha ga-eme ebe ọ bụ na ha agbaala tiketi bọs na ụgbọ okporo ígwè ga-ebu ha abịa. Ndị na-ahazi mgbakọ ahụ kpesiri ekpere ike ma gwazie ndị ahụ na-akpọ na fon ka ha bịawa.

Ụmụnna anyị nọgidere na-akwadebe mgbakọ ahụ ma na-ekpesikwa ekpere ike. Ụmụnna ndị na-ahụ maka otú a ga-esi bute ndị mmadụ ná mgbakọ ahụ nọ na-agakwuru ndị si ebe dị iche iche na Sọviet Yuniọn bịa mgbakọ ahụ ma buru ha na-aga ebe e nweteere ha ụlọ. Kwa ụtụtụ, ndị so na Kọmitii Na-ahụ Maka Mgbakọ ahụ na-aga ahụ ndị isi obodo ka ha mara ma à ga-ekwe anyị nwee mgbakọ ahụ. Ha gachaa, o nweghị akụkọ ọma ha na-eji alọta.

OTÚ E SI ZAA EKPERE ANYỊ

Na Tọzdee, abalị iri abụọ na abụọ n’ọnwa Ọgọst, bụ́ mgbe ọ fọrọ naanị ụbọchị abụọ ka mgbakọ ahụ malite, ndị so na Kọmitii Na-ahụ Maka Mgbakọ ahụ ji ozi na-eme obi ụtọ lọta. Ha kwuru na e nyela anyị ikike inwe mgbakọ ahụ. Mgbe anyị bụrụ abụ mmeghe ma kpee ekpere ná mgbakọ ahụ, ọṅụ juru onye ọ bụla obi. Mgbe ihe omume ehihie Satọdee gwụrụ, anyị alaghị ruo mgbe chi jiwere n’ihi na anyị na ụmụnna anyị nọ na-akparịta ụka. Okwukwe ụmụnna anyị ndị a siri ezigbo ike. Ọ bụ ya mere ha ji die ọtụtụ ọnwụnwa ndị bịaara ha n’oge ndị gara aga.

Kemgbe afọ iri abụọ na abụọ e mechara mgbakọ ahụ, Jehova agọzikwuola ozi anyị na-ejere ya. E wuola ọtụtụ Ụlọ Nzukọ Alaeze n’ebe dị iche iche na Yukren. Ndịàmà Jehova adịkwuola ọtụtụ. N’afọ 1991, anyị dị puku mmadụ iri abụọ na puku ise. Ma ugbu a, anyị akarịala otu narị puku mmadụ na puku iri ise.

OTÚ JEHOVA SI GỌZIKWUO ANYỊ

Ndị ezinụlọ anyị ka bi n’otu ụlọ ahụ dị na Jenkọi. Ihe dị ka puku mmadụ iri anọ bi na Jenkọi ugbu a. Ọ bụ eziokwu na ezinụlọ ndị bụ́ Ndịàmà Jehova dị ole na ole mgbe anyị si Saịberịa kwafeta ebe a n’afọ 1968, e nweela ọgbakọ isii ugbu a na Jenkọi.

Ndị ezinụlọ m adịkwala ọtụtụ ugbu a. Ụmụ m amụọla ụmụ nke ha, ụmụ ha amụọkwa ụmụ nke ha. Anyị niile na-efe Jehova.