Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE ỌGỌST 2013

 ṄOMIE OKWUKWE HA | NOA

E Chebere “Ya na Mmadụ Asaa Ndị Ọzọ”

E Chebere “Ya na Mmadụ Asaa Ndị Ọzọ”

NOA na ndị ezinụlọ ya gbakọtara otu ebe ka mmiri malitere izo. Mmiri ahụ na-ezo ka ebe a na-awụpụ mmiri n’ite. Weregodị ya na ọkụ ha mụnyere mere ka ị na-ahụ otú ihu dị ha n’ime ụgbọ ahụ. Ị ga-ahụ otú ha kporopụrụ anya ka ha na-anụ mkpọtụ mmiri ahụ na-ezonụ na-eme. Mmiri ahụ na-awụ n’elu ụgbọ ahụ nakwa n’akụkụ ya. Mkpọtụ ọ na-eme dị egwu.

O doro anya na obi tọrọ Noa ezigbo ụtọ mgbe o lere ndị ezinụlọ ya anya n’ihu, ya bụ, nwunye ya, ụmụ ya atọ, na ndị nwunye ha. Ọ ga-abụ na ihe kasiri ya obi n’oge a bụ na ndị ezinụlọ ya ọ hụrụ n’anya so ya nọrọ n’ụgbọ ahụ. O nweghị ọkọ kọrọ ha. Ọ ga-abụkwa na Noa kpere ekpere kelee Chineke maka otú o si napụta ha. O weliri olu mgbe ọ na-ekpe ekpere ahụ ka ndị ezinụlọ ya nwee ike ịnụ ihe ọ na-ekwu maka na mmiri ahụ na-emesi ụzụ ike.

Noa bụ nwoke nwere ezigbo okwukwe. Ọ bụ okwukwe ya mere Chineke ya bụ́ Jehova ji chebe ya na ezinụlọ ya. (Ndị Hibru 11:7) Ma hà kwụsịrị inwe okwukwe na Chineke mgbe mmiri ahụ malitere izo? Ha akwụsịghị, n’ihi na okwukwe ha ka ga-abara ha uru n’ihi nsogbu ndị ka ga-abịara ha. Anyị kwesịkwara inwe okwukwe n’ihi na anyị bi n’oge tara akpụ. N’ihi ya, ka anyị leba anya n’ihe anyị nwere ike ịmụta n’okwukwe Noa.

“ỤBỌCHỊ IRI ANỌ, EHIHIE NA ABALỊ”

Mmiri ahụ zogidere n’elu ụwa ruo “ụbọchị iri anọ, ehihie na abalị.” (Jenesis 7:4, 11, 12) Mmiri ahụ nọkwa na-eto n’ike n’ike. Ka ọ na-eto, Noa ji anya ya hụ na Chineke ya, bụ́ Jehova, chebere ya na ezinụlọ ya maka na ha rubeere ya isi ma bibie ndị ọzọ maka na ha nupụụrụ ya isi.

Chineke ji iju mmiri ahụ mee ka arụ ndị mmụọ ozi nupụụrụ ya isi na-akpa n’ụwa kwụsị. Setan ratara ndị mmụọ ozi ahụ, ha achọwa ime ihe ga-abara naanị ha uru otú yanwa na-eme. Nke a mere ka ọtụtụ ndị mmụọ ozi hapụ “ebe obibi ha kwesịrị ekwesị” n’eluigwe bịa n’ụwa lụrụ ụmụ nwaanyị. Ha na ụmụ nwaanyị ndị ahụ mụtara ụmụ ndị gbara ajọ dimkpa, bụ́ ndị a na-akpọ ndị Nefilim. (Jud 6; Jenesis 6:4) O doro anya na obi tọrọ Setan ụtọ mgbe ọ hụrụ na ndị mmụọ ozi ahụ na-enupụrụ Chineke isi. Ihe mere obi ji tọọ ya ụtọ bụ na nnupụisi ahụ mere ka omume ụmụ mmadụ, bụ́ isi nke ihe niile Jehova kere n’ụwa, jọkwuo njọ n’anya Chineke.

Ka mmiri ahụ na-eto, ndị mmụọ ozi ahụ nwoghara ma laghachi n’eluigwe. Ma Chineke mere ka ha ghara inwekwa ike iyiri ahụ́ mmadụ ọzọ. Ha hapụrụ ma ndị nwunye ha ma ụmụ ha ka ha na ndị ọzọ na-enupụrụ Chineke isi nwụọ n’iju mmiri ahụ.

N’oge Inọk, ya bụ, ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ narị afọ asaa tupu oge Noa, Jehova si n’ọnụ Inọk gwa ụmụ mmadụ na ya ga-ebibi ndị ajọ omume ma ọ bụrụ na ha echegharịghị. (Jenesis 5:24; Jud 14, 15) Kemgbe ahụ, ihe ọjọọ ndị mmadụ na-eme nọ na-aka njọ. Ha na-emebi ụwa ma na-eme ihe ike. Ma ugbu a, Chineke ebibiwela ha. Obi ọ̀ tọrọ Noa na ndị ezinụlọ ya ụtọ na Chineke egbuwela ndị ọjọọ ahụ?

Mbanụ! Obi atọghịkwa Chineke ha ụtọ n’ihi na ọ bụ onye na-eme ebere. (Ezikiel 33:11) Jehova mere ihe niile o nwere ike ime ka ọ zọpụta ọtụtụ n’ime ha. O dunyere Inọk ka ọ dọọ ha aka ná ntị, gwakwa Noa ka o wuo ụgbọ. Noa na ezinụlọ ya wuru nnukwu ụgbọ ahụ ọtụtụ iri afọ. Ndị ajọ omume ahụ agaghịkwa asị na ha ahụghị mgbe ha na-ewu ya. Ihe ọzọkwa bụ na Jehova gwara Noa ka o zie ha ozi ọma, ya bụ, ka ọ bụrụ “onye na-ekwusa ezi omume.” (2 Pita 2:5) Noa  gwara ndị mmadụ na Chineke ga-ebibi ndị ajọ omume otú ahụ Inọk kwuru. Olee ihe ha mere mgbe ha nụrụ ozi Noa? Jizọs mechara kwuo ihe ha mere n’ihi na ọ nọ n’eluigwe n’oge ahụ na-ahụ ihe na-emenụ. Ọ sịrị na “ha amaghịkwa ruo mgbe iju mmiri ahụ bịara wee kpochapụ ha niile.”—Matiu 24:39.

Chegodị otú obi dị Noa na ezinụlọ ya n’oge Jehova mechiri ụgbọ ahụ, mmiri ahụ ezoo ụbọchị iri anọ. Ọ ga-abụ na mgbe mmiri ahụ nọ na-ezo kwa ụbọchị, Noa na ezinụlọ ya nọ na-arụ ọrụ n’ime ụgbọ ahụ. Ụfọdụ ọrụ ha nọ na-arụ bụ inyere ibe ha aka, idowe ụgbọ ahụ ọcha, na inye ụmụ anụmanụ ihe oriri. Ma, mmiri ahụ mechara nugharịa ụgbọ ahụ ma bulie ya elu, ụgbọ ahụ amalitezie ịkwọpụ. Ka mmiri ahụ na-eto n’ike n’ike, o buliri ụgbọ ahụ elu ruo mgbe naanị ya “na-ese n’elu mmiri n’ụwa.” (Jenesis 7:17) Ihe ahụ merenụ gosiri na Jehova, bụ́ Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Niile, nwere ike dị ukwuu.

Ọ ga-abụ na Noa kelere Jehova maka otú o si zọpụta ya na ezinụlọ ya. Ma, o kelekwara ya maka otú o si jiri ha dọọ ndị ahụ nwụrụnụ n’iju mmiri ahụ aka ná ntị. N’oge Noa na ndị ezinụlọ ya nọ na-adọ ndị mmadụ aka ná ntị, o nwere ike ịdị Noa na ndị ezinụlọ ya ka o nweghị uru ihe ha na-agwa ha bara. O nweghị onye kwere ege ha ntị. Chebagodịrị ihe a echiche: Ọ ga-abụ na tupu iju mmiri ahụ, Noa nwere ụmụnne ndị nwoke na ndị nwaanyị, ụmụnne ya ahụ enweekwa ụmụ nke ha. Ma o nweghị onye n’ime ha gere ya ntị ma e wezụga nwunye ya, ụmụ ya atọ, na ndị nwunye ha. (Jenesis 5:30) O doro anya na ihe kasiri Noa na ezinụlọ ya obi mgbe ha nọ n’ime ụgbọ ahụ bụ na ha chetara mbọ niile ha gbara ka ha nyere ndị ajọ omume ahụ aka.

Jehova agbanwebeghị kemgbe oge Noa. (Malakaị 3:6) Jizọs Kraịst kwukwara na oge anyị a ga-adị ka “ụbọchị Noa.” (Matiu 24:37) Anyị bi n’oge nsogbu. Nsogbu a ga-akwụsị n’oge Chineke ga-ebibi ụwa ajọ omume a. Ndị na-efe Chineke n’oge a na-agwakwa ndị niile chọrọ ige Chineke ntị ihe Chineke na-aga ime. Ị̀ ga-ege ntị n’ihe ha na-ekwu? Ọ bụrụ na ị malitela ige ntị n’ozi ọma na-enye ndụ ha na-ekwusa, ị̀ ga-eso ha na-ekwusara ya ndị ọzọ? Noa na ezinụlọ ya mere otú ahụ, anyị kwesịkwara iṅomi ha.

‘E BUURU HA GAFEE MMIRI AHỤ N’ENWEGHỊ IHE MERE HA’

Mgbe nnukwu mmiri ahụ bidoro ibugharị ụgbọ ahụ, o doro anya na Noa na ezinụlọ ya nụrụ mkpọtụ osisi ndị e ji rụọ ụgbọ ahụ na-eme. Noa ọ̀ chị obi n’aka  n’ihi otú ebili mmiri si na-akwagharị ụgbọ ahụ, na-eche na ụgbọ ahụ nwere ike ịnyakasị? Mbanụ! Ndị nwere ike ichewe otú ahụ bụ ndị na-enweghị okwukwe. Ma Noa atụghị ụjọ n’ihi na Baịbụl sịrị na ‘Noa ji okwukwe rụọ ụgbọ.’ (Ndị Hibru 11:7) Noa ò nwere okwukwe na gịnị ga-eme? Cheta na ya na Jehova gbara ndụ, Jehova agwa ya na ya ga-eme ka a ghara inwe ihe ga-eme ya na ezinụlọ ya n’iju mmiri ahụ. (Jenesis 6:18, 19) Ọ̀ bụ na Onye kere eluigwe na ụwa na ihe niile dị ndụ nọ n’ime ya enweghị ike ime ka ihe ọ bụla ghara ime ụgbọ ahụ? O doro anya na o nwere ike ime ya. Noa tụkwasịrị Jehova obi na ọ ga-emezu ihe o kwuru. Jehova mezukwara ihe o kwuru n’ihi na e buuru Noa na ezinụlọ ya “gafee mmiri ahụ n’enweghị ihe mere ha.”—1 Pita 3:20.

Mmiri ahụ mechara kwụsị mgbe o zochara ụbọchị iri anọ, ehihie na abalị. A gụọ ya na kalenda nke oge a, o nwere ike ịbụ n’ọnwa Disemba nke afọ 2370 Tupu Oge Ndị Kraịst ka ọ kwụsịrị izo. Ma, oge Noa na ezinụlọ ya ga-apụta n’ụgbọ ahụ eruwebeghị. Mmiri ahụ etochiela ugwu niile. Naanị ihe mmadụ ga-ahụ n’elu mmiri ahụ bụ ụgbọ ahụ ụmụ mmadụ na ụmụ anụmanụ nọ n’ime ya. (Jenesis 7:19, 20) Weregodị ya na ị na-ahụ Noa ka ọ na-ahazi ọrụ ya na Shem, Ham, na Jefet ga-arụ, ya bụ, inye ụmụ anụmanụ nri, ime ka ha dị ọcha, na ime ka ahụ́ gbasie ha ike. Ọrụ a tara akpụ karịa ọrụ ndị ọzọ. N’eziokwu, Chineke a, bụ́ Onye mere ka ụmụ anụmanụ si ebe dị iche iche bata n’ụgbọ ahụ ma nọrọ n’enweghị nke na-emerụ ibe ya ahụ́, mekwara ka ha nọrọ otú ahụ n’ime ụgbọ ahụ ruo mgbe mmiri ahụ tara. *

Ọ ga-abụ na Noa nọ n’ime ụgbọ ahụ dee otú ihe niile si mee na mgbe ha mere. O dere mgbe mmiri ahụ malitere na mgbe ọ kwụsịrị, deekwa na mmiri ahụ rikpuru ụwa niile ruo otu narị ụbọchị na ụbọchị iri ise. Mmiri ahụ mechara tawa. Otu ụbọchị, ụgbọ ahụ ji nwayọọ kwụsị “n’ugwu Ararat.” Ugwu Ararat a dị ná mba Tọki. Ọ ga-abụ n’ọnwa Eprel nke afọ 2369 Tupu Oge Ndị Kraịst ka ọ kwụsịrị n’ugwu ahụ. Ọ bụ mgbe ụbọchị iri asaa na atọ gachara, ya bụ, n’ọnwa Jun nke afọ ahụ, ka a hụwara elu ugwu dị iche iche. Mgbe ọnwa atọ gachara, ya bụ, n’ọnwa Septemba, Noa wepụrụ ihe ụfọdụ e ji kpuchie elu ụgbọ ahụ. Nke a mere ka ìhè na ikuku ndụ batawa n’ụgbọ ahụ. Noa mere ihe ndị nyeere ya aka ịmata ma mmiri ahụ ọ̀ tawala n’elu ụwa nakwa ma mbara ala ọ̀ dịla mma obibi. O zipụrụ ugoloọma n’èzí. Ugoloọma ahụ fere pụọ, ya efebata. O nwere ike ịbụ na ọ na-ebere n’elu ụgbọ ahụ ma o febata. Noa mechara zipụ nduru. Nduru ahụ lọghachikwutere ya ugboro ugboro ruo mgbe o mechara hụ ebe ọ ga-akpa akwụ́.—Jenesis 7:24–8:13.

O doro anya na Noa na-akpọkọta ndị ezinụlọ ya ka ha fee Chineke n’oge ha nọ n’ụgbọ

O doro anya na ihe gbasara ofufe Chineke dị Noa mkpa karịa ihe ọ bụla ọzọ ọ na-eme. Weregodị ya na ị na-ahụ ka ya na ezinụlọ ya na-ezukọ ekpe ekpere kwa ụbọchị ma na-ekwu gbasara Nna ha nke eluigwe, bụ́ onye mere ka ha dịrị ndụ. Mgbe ọ bụla Noa chọrọ ime ihe, ọ na-echere Jehova ka ọ gwa ya ihe ọ ga-eme. Noa emepedịghị ụgbọ ahụ ma duru ezinụlọ ya na anụmanụ pụta n’agbanyeghị na ọ matala na mmiri ahụ ataala, n’agbanyeghịkwa na ha anọọla ihe karịrị otu afọ n’ụgbọ ahụ. (Jenesis 8:14) Noa cheere ka Jehova gwa ya ihe ọ ga-eme.

E nwere ọtụtụ ihe ndị isi ezinụlọ ga-amụta n’aka Noa. Noa abụghị onye ghaa ghaa ghaa. Ọ dị ike ọrụ ma nwee ndidi. Ọ gbakwara mbọ ka ọ ghara inwe ihe ga-eme ndị ezinụlọ ya. Nke ka nke bụ na Noa na-ebu ụzọ amata ihe bụ́ uche Jehova Chineke tupu ya emee ihe ọ bụla ọ chọrọ ime. Ọ bụrụ na anyị eṅomie okwukwe Noa n’ihe niile ahụ o mere, ọ ga-abara ndị niile anyị hụrụ n’anya uru.

“SI N’ỤGBỌ AHỤ PỤTA”

Jehova mechara sị Noa: “Si n’ụgbọ ahụ pụta, gị na nwunye gị na ụmụ gị na ndị nwunye ụmụ gị.” Noa na ezinụlọ ya mere ihe Jehova kwuru. Ha pụtara, ụmụ anụmanụ esorokwa ha pụta. Olee otú ụmụ anụmanụ ahụ si pụta? Hà zọrọ ụzọ ụzọ ma ọ bụ kwatuo ibe ha mgbe ha na-apụta? Mbanụ! Baịbụl sịrị na “ha pụtara n’ụgbọ ahụ n’ụdị ha dị iche iche.” (Jenesis 8:15-19) Mgbe Noa na ezinụlọ ya si n’ụgbọ ahụ pụta, ha kuuru ikuku ndụ si n’ugwu Ararat na-ekusa ha. Ha nọkwa n’ugwu ahụ legharịa anya ma hụ na ihe ọjọọ na ime ihe ike adịkwaghị n’ụwa. Ma ndị Nefilim ahụ ma ndị mmụọ ozi ahụ nupụụrụ Chineke isi ma ndị niile ọzọ na-eme ihe ọjọọ n’ụwa anọkwaghị. * Noa na ezinụlọ ya nweziri ohere ịmalite ụwa n’isi.

 Noa ma ihe ọ ga-eme. Ihe mbụ o mere bụ ife Chineke. Ọ rụrụ ebe ịchụàjà ma jiri anụmanụ ụfọdụ Chineke weere ka ndị dị ọcha chụọrọ Jehova àjà nsure ọkụ. Anụmanụ ndị ahụ so ná ndị ha chịbara “asaa asaa” n’ụgbọ ahụ. (Jenesis 7:2; 8:20) Jehova ọ̀ nabatara àjà a ha chụụrụ ya?

Baịbụl zara ajụjụ a nke ọma. Ọ sịrị: “Jehova wee nụ ísì ụtọ.” Àjà a ha chụụrụ ya mere ya obi ụtọ. Obi tọkwara ya ụtọ mgbe ọ hụrụ Noa na ezinụlọ ya n’ụwa n’ihi na ha bụ ndị ezi omume, ha ekpebisiekwala ike ime uche ya. Nke a mere ka Jehova kwụsị iwe ọ na-ewe n’oge ahụ ihe ọjọọ juru n’ụwa. Ma, nke a apụtaghị na Jehova tụrụ anya na ha ga-aghọ ndị zuru okè. Amaokwu ahụ sịkwara: “Ọchịchọ obi mmadụ jọrọ njọ malite n’oge ọ bụ nwata gawa.” (Jenesis 8:21) Ka anyị leba anya n’otú Jehova si gosikwuo na ya na-enwere ụmụ mmadụ ndidi ma na-emere ha ebere.

Chineke kagbuziri ọnụ ọ bụrụ ala mgbe Adam na Iv nupụụrụ ya isi. Ọnụ ahụ ọ bụrụ ala mere ka ịrụ ọrụ ubi sie ezigbo ike n’oge ahụ. Ọ bụ nna Noa aha ya bụ Lemek gụrụ Noa aha. Ọ ga-abụkwa na ihe aha ahụ pụtara bụ “Ezumike,” ma ọ bụ “Nkasi obi.” Lemek kwuru na Noa ga-eme ihe ga-eme ka Jehova wepụ ọnụ ahụ ọ bụrụ ala ma mee ka ụmụ mmadụ zuru ike. Ọ ga-abụ na obi tọrọ Noa ezigbo ụtọ mgbe ọ matara na ihe ahụ Lemek kwuru ga-emezu ugbu a, nakwa na ala gazi na-eme nri ma ha kọọ ihe na ya. Nke a mere ka Noa malite ịrụ ọrụ ugbo ozugbo ha pụtachara n’ụgbọ ahụ.—Jenesis 3:17, 18; 5:28, 29; 9:20.

Noa na ndị ezinụlọ ya si n’ụgbọ pụta ma banye n’ụwa nke ihe ọjọọ na-adịkwaghị na ya

Jehova nyekwara Noa na ndị niile si n’ezinụlọ ya iwu ụfọdụ ga-enyere ha aka ná ndụ. Ụfọdụ n’ime ha bụ ka ha ghara igbu mmadụ nakwa ka ha ghara iri ọbara. Iwu ndị ahụ o nyere ha esighị ike n’ihi na ha ga-edebeli ha. Chineke na ụmụ mmadụ gbakwara ndụ. O kwere ha nkwa na ya agakwaghị eji mmiri ebibi ihe niile dị ndụ n’ụwa. Jehova mere ka e nwee ihe ga-eme ka obi sie ụmụ mmadụ ike na ya ga-emezu ihe a o kwuru. O mere ka otu ihe mmadụ na-ahụtụbeghị pụta na mbara ígwé, ya bụ, eke na egwurugwu. Eke na egwurugwu ọ bụla anyị hụrụ na-echetara anyị nkwa ahụ Jehova kwere, bụ́ nke gosiri na ọ hụrụ anyị n’anya.—Jenesis 9:1-17.

Ọ bụrụ na akụkọ Noa bụ akụkọ ifo, ọ gaara akwụsị mgbe e kwuchara na eke na egwurugwu pụtara na mbara ígwé. Ma Noa dịrị ndụ n’ụwa n’eziokwu. Ihe agakwaraghị ya siriri werere. Ebe ọ bụ na ndị mmadụ na-adite ndụ aka n’oge ahụ, Noa dịrị ndụ narị afọ atọ na iri ise ọzọ mgbe e nwechara iju mmiri ahụ. Ọtụtụ ihe mere n’oge ahụ kpataara ya obi ọjọọ. O nwere mgbe Noa gara ṅụrọọ anya. Ma, nwa nwa ya bụ́ Kenan meziri ihe ka njọ. Ihe a o mere kpataara ndị si n’ezinụlọ Kenan ezigbo nsogbu. Noa dịtere ndụ aka nke na ọ hụrụ mgbe ụmụ ụmụ ya malitere ikpere arụsị na ime ihe ike n’oge Nimrọd. Ma, ihe ọma meere Noa n’oge ahụ bụ na ọ hụrụ ka nwa ya Shem bịara nwee ezigbo okwukwe na Jehova ma mee ka ndị ezinụlọ ya nweekwa okwukwe.—Jenesis 9:21-28; 10:8-11; 11:1-11.

Anyị kwesịkwara ịna-eme uche Chineke otú ahụ Noa mere n’agbanyeghị nsogbu ndị nwere ike ịbịara anyị. Ọ bụrụ na ndị anyị na ha nọ enupụrụ Chineke isi ma ọ bụ kwụsị ife ya, anyị kwesịrị ịna-efe Chineke otú ahụ Noa mere. Obi ga-atọ Jehova ezigbo ụtọ ma anyị mee otú ahụ. Jizọs Kraịst kwuru na “ọ bụ onye tachiri obi ruo ọgwụgwụ ka a ga-azọpụta.”—Matiu 24:13.

^ para. 17 Ụfọdụ ndị na-ekwu na ọ ga-abụ na Chineke mere ka ụmụ anụmanụ nọ n’ụgbọ ahụ na-ehi ụra, ya emee ka agụụ ghara ịgụcha ha. Ma, ò mere otú ahụ ma ọ bụ na o meghị ya, ihe anyị ma bụ na o mezuru nkwa ya, ya bụ, o mere ka ọkọ ghara ịkọ ma mmadụ ma ụmụ anụmanụ niile nọ n’ụgbọ ahụ.

^ para. 22 Ogige Iden adịzighị mgbe e nwechara iju mmiri ahụ. Ọ ga-abụ na mmiri ahụ bibiri ya. Ya bụrụ otú ahụ, ihe ọ pụtara bụ na ọrụ iche ogige ahụ nche nke ndị cherọb rụrụ otu puku afọ na narị afọ isii gwụrụ n’iju mmiri ahụ, ha alaghachizie n’eluigwe.—Jenesis 3:22-24.