Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE ỌGỌST 2013

 NDỊ NA-AGỤ AKWỤKWỌ ANYỊ NA-AJỤ, SỊ . . .

Gịnị Mere na Aha Ụfọdụ Ndị Baịbụl Kọrọ Akụkọ Ha Adịghị na Baịbụl?

Gịnị Mere na Aha Ụfọdụ Ndị Baịbụl Kọrọ Akụkọ Ha Adịghị na Baịbụl?

N’akwụkwọ Baịbụl a na-akpọ Rut, ihe a kpọrọ otu nwoke nke na-ekweghị eme ihe iwu Mozis kwuru bụ “nwoke m.” (Rut 4:1-12) Nke a ọ̀ pụtara na ndị niile Baịbụl kọrọ akụkọ ha ma ghara ịkpọ aha ha bụ ndị ọjọọ ma ọ bụ ndị ọ na-enweghị ihe e ji ha kpọrọ?

Mba. Lebagodị anya n’ihe Jizọs kwuru mgbe ọ chọrọ ka ndị na-eso ụzọ ya kwadebe Ememme Ngabiga ikpeazụ ọ gara. Ọ gwara ha ka ha ‘gaa n’ime obodo, n’ụlọ onye dị otú a’ ma kwadebe ihe ndị ha ga-eji mee ememme ahụ. (Matiu 26:18) Ànyị kwesịrị ikwu na nwoke ahụ a kpọrọ “onye dị otú a” n’amaokwu a bụ onye ọjọọ ma ọ bụkwanụ na o nweghị ihe e ji ya kpọrọ? Mba. Nwoke ahụ a na-akpọghị aha ya bụ onye na-eso ụzọ Jizọs. Ma, ihe mere na a kpọghị ya aha n’amaokwu ahụ bụ na e nweghị ihe e ji aha ya eme.

E nwekwara ọtụtụ ndị ọjọọ a kpọrọ aha na Baịbụl na ọtụtụ ndị ọma a na-akpọghị aha ha. Dị ka ihe atụ, ọtụtụ ndị ma aha nwaanyị mbụ bụ́ Iv. N’agbanyeghị na a kpọrọ ya aha na Baịbụl, o nupụụrụ Chineke isi n’ihi na ọ chọrọ ihe ga-abara naanị onwe ya uru. Ihe o mere so mee ka Adam mehie, meekwa ka anyị niile na-anwụ anwụ. (Ndị Rom 5:12) Ma, a kpọghị nwunye Noa aha na Baịbụl. N’agbanyeghị nke ahụ, otú o si kwado di ya n’ọrụ dị mkpa Chineke nyere ya na otú o si rube isi baara anyị uru. O doro anya na aha ya na-adịghị na Baịbụl apụtaghị na o nweghị ihe e ji ya kpọrọ ma ọ bụkwanụ na Chineke agọzighị ya.

E nwekwara ndị ọzọ a na-akpọghị aha na Baịbụl, ma ha so mee ka uche Jehova mezuo. Ì chetara otu nwata nwaanyị bụ́ onye Izrel, gbaara Neaman bụ́ onyeisi ndị agha Siria ohu? Ọ katara obi gwa nne ya ukwu, bụ́ nwunye Neaman, banyere onye amụma Jehova nọ n’Izrel. Ihe a o kwuru mere ka Chineke gwọọ Neaman ekpenta ya. (2 Ndị Eze 5:1-14) Ada otu onyeikpe Izrel a na-akpọ Jefta bụ onye e ji okwukwe ya ama atụ. O ji obi ya niile hapụ ịlụ di na ịmụ nwa ka o nwee ike mezuo nkwa nna ya kwere Jehova. (Ndị Ikpe 11:30-40) E nwere ndị so dee ihe karịrị abụ iri anọ n’akwụkwọ Abụ Ọma bụ́ ndị a na-edeghị aha ha na Baịbụl. E nwekwara ndị amụma jeere Chineke ozi dị ezigbo mkpa, ma a kpọghị aha ha na Baịbụl.—1 Ndị Eze 20:37-43.

Nke ka nke bụ na e nwere ọtụtụ narị nde ndị mmụọ ozi na-erubere Chineke isi. Ma, ọ bụ naanị abụọ n’ime ha ka a kpọrọ aha na Baịbụl. Ha bụ mmụọ ozi Gebriel na mmụọ ozi Maịkel. (Daniel 7:10; Luk 1:19; Jud 9) A kpọghị aha ndị ọzọ. Dị ka ihe atụ, mgbe nna Samsịn aha ya bụ Manoa jụrụ otu mmụọ ozi, sị: “Gịnị bụ aha gị, ka ọ ga-abụ mgbe okwu gị mezuru, anyị ga-asọpụrụ gị?” Mmụọ ozi ahụ sịrị Manoa, “Gịnị mere i ji ajụ m aha m?” Mmụọ ozi ahụ dị umeala n’obi. Ọ bụ ya mere na ọ chọghị ka e nye ya otuto e kwesịrị inye naanị Chineke.—Ndị Ikpe 13:17, 18.

Baịbụl agwaghị anyị ihe mere e ji kpọọ ụfọdụ ndị aha ma ghara ịkpọ ndị nke ọzọ. Ma anyị nwere ike ịmụta ọtụtụ ihe n’aka ndị fere Chineke n’oge gara aga, bụ́ ndị na-achọghị ka ha bụrụ ndị a ma ama.