Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE ỌGỌST 2013

 BỊARUO CHINEKE NSO

“Àgwà Ya Ndị A Na-apụghị Ịhụ Anya Ka A Na-ahụ nke Ọma”

“Àgwà Ya Ndị A Na-apụghị Ịhụ Anya Ka A Na-ahụ nke Ọma”

Ì kweere na Chineke dị? Ọ bụrụ na i kweere, olee ihe ị ga-egosi mmadụ mere i ji kwere na ọ dị? Nke bụ́ eziokwu bụ na e nwere ọtụtụ ihe anyị na-ahụ anya bụ́ ndị na-egosi na e nwere Onye ma ihe, nke dị ike, kere ihe niile. Olee ihe ndị na-egosi anyị na e nwere Onye kere ihe niile? Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmata azịza nke ajụjụ a, lebagodị anya n’ihe Pọl onyeozi kwuru n’akwụkwọ ozi o degaara Ndị Kraịst nọ na Rom.

Pọl sịrị: “Àgwà [Chineke] ndị a na-apụghị ịhụ anya ka a na-ahụ nke ọma malite mgbe e kere ụwa gaa n’ihu, n’ihi na a na-aghọta ha site n’ihe ndị e kere eke, ya bụ, ike ebighị ebi ya na ịbụ Chineke ya, nke mere na ha enweghị ihe ngọpụ.” (Ndị Rom 1:20) Pọl gosiri na Onye kere anyị ji ihe ndị o kere eke mee ka anyị mata Onye ọ bụ. Ka anyị leba anya n’ihe Pọl kwuru.

Pọl kwuru na e bidoro ịhụ àgwà Chineke “malite mgbe e kere ụwa gaa n’ihu.” Ihe Pọl na-ekwu okwu ya gosiri na okwu Grik a sụgharịrị “ụwa” n’amaokwu a abụghị elu ala anyị bi n’ime ya. Kama, ọ bụ ụmụ mmadụ. * N’ihi ya, ihe Pọl na-ekwu bụ na malite mgbe e kere ụmụ mmadụ, ihe ndị Chineke kere nwere ike ime ka ha mata àgwà ndị Chineke nwere.

Ihe ndị na-egosi na Chineke dị juru ebe niile. ‘A na-ahụ ha nke ọma’ n’ihe ndị e kere eke. Ihe niile e kere eke, ma ndị ukwu ma ndị nta, na-egosi na e nwere Onye kere ha, nakwa na Onye ahụ nwere àgwà ndị magburu onwe ha. Ọ̀ bụ na otú ihe ndị e kere eke si mma mma egosighị na Chineke nwere amamihe? Ọ̀ bụ na kpakpando ndị dị n’eluigwe na ebili mmiri anaghị egosi na Chineke nwere ike dị ukwuu? Ọ̀ bụ na ihe oriri dị iche iche ndị na-atọ anyị ụtọ na otú anyanwụ si ama mma mgbe ọ na-awa nakwa mgbe ọ na-ada anaghị egosi na Chineke hụrụ ụmụ mmadụ n’anya?—Abụ Ọma 104:24; Aịzaya 40:26.

Ọ̀ ga-esiri mmadụ ike ịhụ ihe ndị na-egosi na Chineke dị? Ihe ndị na-egosi na Chineke dị juru ebe niile nke na ndị na-anaghị ahụ ha ma ọ bụ ndị na-achọghị ikweta na Chineke dị “enweghị ihe ngọpụ.” Otu ọkà mmụta mere otu ihe atụ gosiri otú e kwesịrị isi ghọta ihe ahụ Pọl kwuru. Ọ sịrị na ọkwọ ụgbọala nwere ike ịhụ ihe e dere n’okporo ụzọ nke kwuru ka ndị ọkwọ ụgbọala tụgharịa si ụzọ ọzọ. Ma ọkwọ ụgbọala ahụ nwere ike ịhapụ ihe ahụ e dere gawa ebe ọ na-aga. Ọ bụrụ na ndị uwe ojii ahụ ya, ha ga-akwụsị ya ma rie ya iwu. Ma ọkwọ ụgbọala ahụ nwere ike ịgwa ha na ya ahụghị ihe ahụ e dere n’ụzọ. Ihe ọ sọkwara ya kwuo, ọ dara iwu maka na ihe ahụ ọ sịrị na ya ahụghị dị n’ebe onye ọ bụla na-akwọ ụgbọala ga-ahụ ya. Ihe ọzọkwa bụ na anya anaghị enye ya nsogbu. Ebe ọ bụ na ọ na-akwọ ụgbọala, o kwesịrị ịhụ ihe ndị e dere n’okporo ụzọ ma mee ha. Otú ahụ ka ọ dị ihe ndị na-egosi na Chineke dị. Ha juru ebe niile. Onye ọ bụla na-eche echiche kwesịrị ịhụ ha. E kwesịghị inwe onye ga-ekwu na ya ahụghị ha.

Onye kere anyị ji ihe ndị o kere eke eme ka anyị mata Onye ọ bụ

N’eziokwu, ihe ndị e kere eke na-akụziri anyị ọtụtụ ihe banyere Onye kere anyị. Ma, e nwere akwụkwọ na-eme ka anyị ghọtakwuo banyere Onye kere anyị. Akwụkwọ ahụ bụ Baịbụl. Ihe ndị e dere na ya nwere ike ime ka anyị mata azịza nke ajụjụ a dị mkpa, ya bụ, Gịnị ka Chineke bu n’obi kee ụwa na ụmụ mmadụ bi na ya? Ọ bụrụ na ị mata azịza nke ajụjụ a, o nwere ike inyere gị aka ịbịarukwu Chineke nso, bụ́ Onye àgwà ya ndị a na-apụghị ịhụ anya ka a na-ahụ nke ọma” n’ihe ndị e kere eke anyị na-ahụ anya.

Ebe Anyị Na-atụ Aro Ka Ị Gụọ na Baịbụl n’Ọnwa Ọgọst

Ndị Rom 1-16

^ para. 5 Baịbụl kwukwara banyere mmehie nke “ụwa,” kwuokwa na ọ dị mkpa ka e nwee onye ga-azọpụta ụwa. Nke a pụtara na mgbe Baịbụl kwuru banyere ụwa n’ebe ụfọdụ, ihe ọ pụtara bụ mmadụ, ọ bụghị ụwa anyị bi n’ime ya.—Jọn 1:29; 4:42; 12:47.