Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE JULAỊ 2013

À Na-ekwukarị Okwu Ego na Chọọchị Ị Na-aga?

À Na-ekwukarị Okwu Ego na Chọọchị Ị Na-aga?

Estelle * na-agakarị chọọchị, ọ na-akpọkwa ụmụ ya aga. O kwuru, sị: “M gwara pastọ chọọchị anyị na m chọrọ ịmụ Baịbụl.” Ma, o kweghị akụziri ya Baịbụl. Estelle mechara kwụsị ịga chọọchị. Estelle kwuru, sị: “Ndị isi chọọchị anyị detaara m akwụkwọ ozi. Ha kwuru na ọ bụghị iwu na m ga-abịa chọọchị, na ihe ka mkpa bụ ka m na-atụrụ ha ụtụ. Ihe a ha kwuru mere ka m kwuo n’obi m na ‘ha achọdịghị ịma ma m̀ bịara chọọchị ma ọ bụ na mụ abịaghị, naanị ihe ha chọrọ bụ ka m na-atụrụ ha ụtụ.’”

Angelina anaghị eji chọọchị ya egwuri egwu. O kwuru, sị: “A na-ebugharị efere ugboro atọ tupu anyị agbasaa chọọchị, a na-achọkwa ka onye ọ bụla tinye ego n’efere ahụ mgbe ọ bụla a na-ebugharị ya. Chọọchị anyị na-ekwukarị okwu ego. M kwuru n’obi m, sị, ‘Ha enweghị mmụọ nsọ Chineke.’”

Chọọchị ma ọ bụ okpukpe ndị e nwere n’ebe i bi hà na-eji aghụghọ ma ọ bụ ire ụtọ anapụta ndị mmadụ ego? Ihe a ha na-eme ọ̀ bụ ihe Baịbụl kwuru?

GỊNỊ KA BAỊBỤL NA-AKỤZI?

Jizọs, bụ́ onye malitere okpukpe Ndị Kraịst, sịrị: “Unu natara n’efu, na-enyenụ n’efu.” (Matiu 10:8) Ihe ndị e dere na Baịbụl bara ezigbo uru, o nweghị onye ga-azụtali ya. E kwesịrị ịkụziri ya ndị niile chọrọ ya n’efu.

Olee otú ndị mbụ soro ụzọ Jizọs si nweta ego ha ji gboo mkpa ndị ha nwere n’ọgbakọ ha?

Onye nke ọ bụla n’ime ha nyere “dị ka o kpebiri n’obi ya, ọ bụghị ná mwute ma ọ bụ ná mmanye, n’ihi na Chineke hụrụ onye na-eji obi ụtọ enye ihe n’anya.” (2 Ndị Kọrịnt 9:7) Pọl onyeozi kwuru, sị: ‘Ọ bụ site n’ịrụ ọrụ abalị na ehihie ka anyị kwusaara unu ozi ọma, ka anyị wee ghara ibo onye ọ bụla n’ime unu oké ibu arọ.’ (1 Ndị Tesalonaịka 2:9) Pọl na-akpa ákwà ụlọikwuu. Ọ bụ ya ka o ji akpa afọ ya mgbe ọ na-ekwusa ozi ọma.—Ọrụ Ndịozi 18:2, 3.

OLEEKWANỤ MAKA NDỊÀMÀ JEHOVA?

Ndịàmà Jehova na-amụ ihe n’ebe ha na-akpọ Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ha anaghị achọ Ụlọ Nzukọ ha oké mma. Oleekwanụ otú ha si enweta ego ha ji egbo mkpa ha nwere n’ọgbakọ ha? Ha anaghị ebugharị efere ka ndị mmadụ tinye ego na ya. Ha anaghịkwa eke ndị mmadụ envelopu na-arịọ ha ego. Otú ha si enweta ego bụ na onye ọ bụla bịara ọmụmụ ihe ha ma chọọ inye onyinye na-aga etinye onyinye ya n’igbe e nwere n’Ụlọ Nzukọ Alaeze.

Olee otú e kwesịrị isi na-enweta ego a ga-eji na-arụ ọrụ na chọọchị?

A na-eji ego ebipụta Ụlọ Nche a ị na-agụ, ọ na-efukwa ego iji buru ya gaa n’ebe a ga-ekesa ya. N’agbanyeghị nke ahụ, Ndịàmà Jehova anaghị akpọsa akwụkwọ ha n’ụlọ ọrụ na-agbasa ozi, ha anaghịkwa arịọ ndị mmadụ ego. Ihe ka Ndịàmà Jehova mkpa bụ ịkụziri ndị mmadụ eziokwu dị na Baịbụl.

Otú a Ndịàmà Jehova si enweta ego ọ́ dabaghị n’ihe Jizọs kwuru ka ha na-eme nakwa n’otú ndị mbụ soro ụzọ Kraịst si nweta ego?

^ para. 2 Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.