Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE JULAỊ 2013

Ndị Chọọchị Unu Hà Na-akpa Àgwà Ọma?

Ndị Chọọchị Unu Hà Na-akpa Àgwà Ọma?

E nwere otu nwaanyị na-arụ ọrụ n’ebe a na-elekọta ndị agadi. Aha nwaanyị a bụ Sylvia. O kwuru, sị: “Mụ na ọtụtụ ụmụ akwụkwọ ndị na-eme ka hà bu chọọchị n’isi gakọrọ akwụkwọ. Ma, ha na-aghọ aghụghọ n’ule. Ha na-aṅụkwa ọgwụ ọjọọ. Chọọchị ha na-aga anaghị eme ka ha na-akpa àgwà ọma.”

Otu nwoke aha ya bụ Lionel kwuru, sị: “Ndị mụ na ha na-arụ ọrụ na-agha ụgha. Ha na-ekwu na ahụ́ adịghị ha mgbe ọ na-enweghị ihe na-eme ha maka na ha achọghị ịbịa ọrụ. Ha na-aga chọọchị ka a sịkwa na ha na-aga. Chọọchị ha na-aga enweghị isi.”

N’agbanyeghị na ọtụtụ ndị nwere okpukpe ma ọ bụ chọọchị ha na-aga, nke a anaghị eme ka ha na-akpa ezigbo àgwà. Ọtụtụ ndị taa “na-eme ka hà nwere nsọpụrụ Chineke ma na-agọnahụ ike ya.” (2 Timoti 3:5) Ndị isi chọọchị ha anaghị akpa àgwà ọma. Ha anaghịkwa akụziri ndị chọọchị ha àgwà ọma ndị Baịbụl kwuru ka Ndị Kraịst na-akpa. Ọ bụ ya mere ọtụtụ ndị ji eche na àgwà ha na-akpa agbasaghị Chineke.

GỊNỊ KA BAỊBỤL NA-AKỤZI?

Baịbụl gosiri na ihe ụmụ mmadụ na-eme nwere ike ịkpasu Chineke iwe ma ọ bụ mee ya obi ụtọ. Dị ka ihe atụ, mgbe ndị Izrel oge ochie nupụụrụ Chineke isi, Baịbụl kwuru na ha ‘kpasuru ya iwe.’ (Abụ Ọma 78:40) Ma, Baịbụl kwukwara na ‘a na-enwe ọṅụ dị ukwuu n’eluigwe’ mgbe otu onye mmehie chegharịrị. (Luk 15:7) Ọ bụrụ na mmadụ amụta banyere àgwà ọma ndị Chineke nwere, onye ahụ ga-ahụkwu Chineke n’anya. Nke a ga-eme ka onye ahụ hụ ihe Chineke hụrụ n’anya n’anya, ma kpọọ ihe Chineke kpọrọ asị asị.—Emọs 5:15.

OLEEKWANỤ MAKA NDỊÀMÀ JEHOVA?

Otu akwụkwọ akụkọ a na-ebipụta n’Amerịka kwuru banyere Ndịàmà Jehova, sị: “Ha na-eme ka ndị mmadụ na ndị ezinụlọ ha na-adị ná mma, ha na-emekwa ka ndị mmadụ bụrụ ezigbo ụmụ amaala na ndị na-akwụwa aka ọtọ.” Akwụkwọ ahụ kwukwara, sị: “Ha anaghị akpa àgwà otú o si masị ha. Ha kweere na mmadụ ịṅụ sịga, ịṅụbiga mmanya ókè, ịṅụ ọgwụ ọjọọ, ịgba chaa chaa, ịkwa iko nakwa nwoke na nwoke ma ọ bụ nwaanyị na nwaanyị inwe mmekọahụ ga-eme ka onye ahụ na Chineke ghara ịdị ná mma.”

Ndị isi chọọchị hà emeela ka ndị chọọchị ha na-akpa àgwà ọma?

Olee uru ịmụ banyere Chineke na-abara Ndịàmà Jehova? Sylvia, bụ́ onye a kpọrọ aha ná mmalite isiokwu a kwuru, sị: “Ndị mmadụ na-arụrụ aka n’ụlọ ọrụ anyị. Ọ dịịrị m mfe iso ha na-eme ihe ndị ha na-eme ma a sị na m chọrọ. Ma ihe nyeere m aka ime ihe ziri ezi bụ na amatara m otú obi ga-adị Jehova * ma m mee ihe ndị ahụ. Obi dị m ụtọ ugbu a, ahụ́ eruokwala m ala.” Sylvia kwetara na ime ihe ndị a na-akụziri ya n’ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova emeela ka àgwà ya ka mma.

^ para. 9 Baịbụl kwuru na aha Chineke bụ Jehova.