Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE JUN 2013

Olee Mgbe Ịkpọasị Na-agaghị Adịkwa n’Ụwa?

Olee Mgbe Ịkpọasị Na-agaghị Adịkwa n’Ụwa?

AFỌ iri ise gara aga, ya bụ, n’abalị iri abụọ na asatọ n’ọnwa Ọgọst n’afọ 1963, otu onye Amerịka a ma ama nke aha ya bụ Martin Luther King nke Nta, gwara ọhaneze okwu isiokwu ya bụ, “O Nwere Ihe M Na-atụ Anya Ya.” O ji isiokwu ahụ tọrọ ndị mmadụ ụtọ mee ka ha mara na ya nwere olileanya na otu ụbọchị, o nwekwaghị onye a ga-akpọ asị n’ihi agbụrụ o si. N’agbanyeghị na ọ bụ ndị Amerịka ka ọ gwara okwu ahụ, ọtụtụ ndị nọ ná mba dị iche iche chọkwara ka ihe ahụ o kwuru mee ná mba ha.

Mgbe Martin Luther King nke Nta na-agwa ọhaneze okwu

Ọnwa atọ nwoke a kwuchara ihe ahụ, ya bụ, n’abalị iri abụọ n’ọnwa Novemba n’afọ 1963, ihe karịrị otu narị mba so n’Òtù Mba Ụwa kwetara na ha ga-eme ka asị a na-akpọ ndị mmadụ n’ihi agbụrụ ha si kwụsị. Mgbe ọtụtụ iri afọ gachara, e nwekwara ihe ndị ọzọ mba dị iche iche kwetara na ha ga-eme ka ịkpọasị kwụsị. Ebe ọ bụ na a gbaala ezigbo mbọ ka ịkpọ ndị mmadụ asị n’ihi agbụrụ ha si kwụsị, ọtụtụ ndị na-ajụzi, ‘Kemgbe a gbawara mbọ a, olee ihe si na ya pụta?’

N’abalị iri abụọ na otu n’ọnwa Mach n’afọ 2012, onyeisi Òtù Mba Ụwa bụ́ Ban Ki-moon kwuru, sị: “E nweela ọtụtụ akwụkwọ a bịanyerela aka na ha na ọtụtụ ihe e kwekọrịtara na a ga-eme ka a kwụsị ịkpa ókè na asị a na-akpọ ndị mmadụ n’ihi agbụrụ ha, mba ha, ma ọ bụ ihe ndị yiri ha. N’agbanyeghị ihe niile a e merela, ihe na-ebe ka na-ebe. Ọtụtụ nde mmadụ ka na-ata ahụhụ n’ihi asị a kpọrọ ha na agbụrụ ha si.”

N’eziokwu, e nweela mba ụfọdụ a ga-asị na ịkpọasị akwụsịlatala na ha, ma ajụjụ a ka na-ajụ ná mba ndị ahụ bụ: Ndị mmadụ hà ewepụla ịkpọasị n’obi ha n’eziokwu, ka hà na-eme ihu abụọ, ka a ghara ịma na ha ka kpọrọ ndị ọzọ asị? Ụfọdụ ndị chere na naanị uru a na-erite ná mbọ a na-agba ná mba ndị ahụ bụ na ọ na-eme ka ịkpa ókè kwụsịlata, ma ọ gaghị eme ka ịkpọasị kwụsị. Gịnị mere ha ji chee otú ahụ? Ihe mere ya bụ na ọ bụrụ na mmadụ na-akpa ókè ma ọ bụ na-emegbu ndị ọzọ, ndị ọzọ ga na-ahụ ya, ndị ọchịchị nwekwara ike ịta ya ahụhụ. Ma, ọ bụrụ na mmadụ kpọrọ onye ọzọ asị n’obi ya, o nwere ike isiri ndị ọzọ ike ịmata ma ọ bụ ime ya ihe ọ bụla n’ihi na o nweghị onye ma ihe dị ya n’obi.

Nke a na-egosi na ihe ga-eme ka ịkpọasị kwụsị abụghị naanị ime ka ndị mmadụ kwụsị ịkpa ókè, kama a ga-emekwa ka ha kwụsị ihe ọjọọ ha na-eche banyere ndị agbụrụ ọzọ ma kwụsị ile ha anya ọjọọ. Nke a ọ̀ ga-emeli eme? Ọ bụrụ na ọ ga-emeli, olee otú ọ ga-esi eme? Ka anyị lebagodị anya n’ihe ụfọdụ ndị kwuru. Ọ ga-eme ka anyị mata na ndị mmadụ nwere ike ịgbanwe otú ha si ele ndị ọzọ anya, matakwa na o nwere ihe ga-enyere ha aka ime otú ahụ.

BAỊBỤL MERE KA HA KWỤSỊ ỊKPỌ NDỊ ỌZỌ ASỊ

“Akwụsịla m ịkpọ ndị ọzọ asị.”—Linda

Linda: A mụrụ m na Saụt Afrịka. Ọ bụrụ na mụ ahụ ndị Saụt Afrịka na-abụghị ndị ọcha, m na-ewere ha ka ndị ime ọhịa, ndị na-agaghị akwụkwọ, ndị na-anaghị akwụwa aka ọtọ, na ndị na-agbara ndị ọcha ohu. Asị m kpọrọ ha abụghị obere, amakwanụghị m na m kpọrọ ha asị. Ma, m gbanwere otú m si ele ha anya mgbe m bidoro ịmụ Baịbụl. Amụtara m na “Chineke adịghị ele mmadụ anya n’ihu” nakwa na ihe dị Chineke mkpa bụ obi mmadụ, ọ bụghị otú mmadụ na-acha na asụsụ onye ahụ na-asụ. (Ọrụ Ndịozi 10:34, 35; Ilu 17:3) Ihe Baịbụl kwuru ná Ndị Filipaị 2:3 mere ka m mata na ọ bụrụ na mụ ewere ndị ọzọ ka ndị ka m mma, m ga-akwụsị  ịkpọ ha asị. Ime ihe ndị Baịbụl kwuru emeela ka m hụ ndị ọzọ n’anya n’agbanyeghị otú ha na-acha. Ugbu a, akwụsịla m ịkpọ ndị ọzọ asị.

“M mụtara otú Chineke si ele ndị mmadụ anya.”—Michael

Michael: Ebe m no too ná mba Ọstrelia bụ ebe ọtụtụ ndị ọcha bi. Nke a mere ka m kpọọ ndị si Eshia asị, karịchaa, ndị Chaịna. Mgbe ọ bụla m kwọ ụgbọala hụ onye yiri onye Eshia, m na-agbatulata windo ụgbọala m kpọọ onye ahụ iyi. Ihe m na-agwa onye ahụ bụ “Onye Eshia, ó rubeghị mgbe ị ga-ala obodo gị?” ma ọ bụkwanụ mụ agwa ya ihe yiri ya. Mgbe m mechara mụwa Baịbụl, m mụtara otú Chineke si ele ndị mmadụ anya. Chineke hụrụ mmadụ niile n’anya, n’agbanyeghị ebe ha si ma ọ bụkwanụ otú ha dị n’anya. Nke a metụrụ m n’obi, mụ amalite ịhụ ndị mmadụ n’anya ma kwụsị ịkpọ ha asị. Mgbanwe a m mere tụrụ m n’anya n’ihi na amaghị m na m ga-akwụsịli ịkpọ ndị ọzọ asị. Ọ na-atọ m ụtọ ugbu a iso ndị si mba dị iche iche na agbụrụ dị iche iche na-akpakọrịta. Nke a emeela ka m mụtakwuo ọtụtụ ihe, meekwa ka obi na-atọ m ụtọ.

‘M gbanwere otú m si ele ndị ezinụlọ papa m anya, ma mee ka mụ na ha kpezie.’—Sandra

Sandra: Mama m bụ onye Umunede nke dị na Delta Steeti, Naịjirịa. Ma, papa m bụ onye Edo Steeti. Ọ na-asụkwa asụsụ Esan. Ebe ọ bụ na papa m na mama m esighị n’otu obodo, ndị ezinụlọ papa m kpọrọ mama m asị ruo mgbe mama m nwụrụ. N’ihi ya, efooro m ntutu taa na o nweghị ihe ga-ejikọtakwa mụ na onye ọ bụla na-asụ asụsụ Esan. Ekpebikwara m na emekataghị m lụọ onye Edo Steeti. Ma mgbe m malitere ịmụ Baịbụl, m bidoro ịgbanwe obi m. Ebe Baịbụl kwuru na Chineke anaghị ele mmadụ anya n’ihu, nakwa na ọ na-anabata onye ọ bụla na-atụ egwu ya, m ghọtara na ekwesịghị m ịkpọ ndị mmadụ asị n’ihi agbụrụ ha si ma ọ bụ asụsụ ha na-asụ. Nke a mere ka m gbanwee otú m si ele ndị ezinụlọ papa m anya, ma mee ka mụ na ha kpezie. Ime ihe Baịbụl kwuru emeela ka m nwee obi ụtọ, meekwa ka obi ruo m ala. O meekwala ka mụ na ndị ọzọ na-akpa n’agbanyeghị agbụrụ ha, asụsụ ha, ma ọ bụ mba ha. Emechara m lụọ di. Ma, ị̀ ma obodo di m si? Ọ bụ onye Edo Steeti, ọ na-asụkwa Esan!

 Gịnị mere ka Baịbụl nyere ndị a na ọtụtụ ndị ọzọ aka ka ha kwụsị ịkpọ ndị ọzọ asị? Ọ bụ n’ihi na Baịbụl bụ Okwu Chineke. O nwere ike ime ka mmadụ kwụsị ile ndị ọzọ anya ọjọọ. Ihe ọzọkwa bụ na Baịbụl gwara anyị ihe ndị ọzọ a ga-eme ka ịkpọasị niile kwụsị.

ALAEZE CHINEKE GA-AKWỤSỊCHA ỊKPỌASỊ

N’agbanyeghị na Baịbụl na-enyere ndị mmadụ aka ịkwụsị ịkpọ ndị ọzọ asị, a ka nwere ụzọ ihe abụọ a ga-eme ka ịkpọasị kwụsịchaa. Nke mbụ bụ na a ga-ewepụ mmehie na ezughị okè. Baịbụl kwuru hoo haa, sị: “Ọ dịghị mmadụ ọ bụla nke na-adịghị eme mmehie.” (1 Ndị Eze 8:46) N’ihi ya, n’agbanyeghị mbọ niile anyị na-agba ka anyị kwụsị ịkpọ ndị ọzọ asị, e nwere ihe na-enye anyị nsogbu nke nyekwara Pọl onyeozi nsogbu. Pọl dere, sị: “Mgbe m chọrọ ime ihe ziri ezi, ọ bụ ihe ọjọọ na-adị n’ebe m nọ.” (Ndị Rom 7:21) Ọ bụ ya mere “echiche ọjọọ” na-eji abatakarị n’obi anyị na-ezughị okè ma na-eme ka anyị kpọọ ndị ọzọ asị.—Mak 7:21.

Ihe nke abụọ bụ na a ga-eme ka Setan bụ́ Ekwensu kwụsị iduhie ụmụ mmadụ. Baịbụl kpọrọ ya “ogbu mmadụ,” kwuokwa na ọ “na-eduhie elu ụwa dum mmadụ bi.” (Jọn 8:44; Mkpughe 12:9) Ihe a Baịbụl kwuru na-eme ka anyị ghọta ihe mere ịkpọasị ji zuo ebe niile, ọ bụkwa ya mere na ụmụ mmadụ enweghị ike ịkwụsịli ịkpa ókè, igbukpọ agbụrụ dị iche iche, na ihe ndị yiri ya.

N’ihi ya, a ga-ewepụrịrị mmehie, ezughị okè, na Setan bụ́ Ekwensu tupu ịkpọasị akwụsịchaa. Baịbụl kwuru na Alaeze Chineke ga-eme nke a.

Jizọs Kraịst kụziiri ndị na-eso ụzọ ya ka ha na-ekpe ekpere, sị: “Ka alaeze gị bịa. Ka uche gị meekwa n’ụwa, dị ka ọ na-eme n’eluigwe.” (Matiu 6:10) Ọ bụ naanị Alaeze Chineke ga-ewepụcha mmegbu n’ụwa, wepụkwa ịkpọasị na ịkpa ókè.

Mgbe Alaeze Chineke ga-amalite ịchị ụwa, a ga-eke Setan “agbụ,” ya bụ, mee ka ọ kwụsị ịkpa ike, ka “o wee ghara iduhie mba niile ọzọ.” (Mkpughe 20:2, 3) Ọ bụzi mgbe ahụ ka a ga-enwe “ụwa ọhụrụ” nke ‘ezi omume ga-ebi n’ime’ ya. *2 Pita 3:13.

A ga-eme ka ndị ga-ebi n’ụwa ọhụrụ ezi omume ahụ zuo okè, ya bụ, ka ha gharazie inwe mmehie. (Ndị Rom 8:21) Ndị ahụ Alaeze Chineke ga na-achị “agaghị emerụ ihe ọ bụla ahụ́, ha agaghịkwa emebi ihe ọ bụla.” Ọ̀ bụ n’ihi gịnị? Ọ bụ “n’ihi na ihe ọmụma Jehova ga-ejupụta ụwa dị ka mmiri si kpuchie oké osimiri.” (Aịzaya 11:9) N’oge ahụ, mmadụ niile ga-amụta ụzọ Jehova Chineke ma na-akpa àgwà ka ya. Ihe nke a pụtara bụ na ịkpọasị ga-akwụsịcha “n’ihi na Chineke adịghị ele mmadụ anya n’ihu.”—Ndị Rom 2:11.

^ para. 17 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu banyere Alaeze Chineke na ihe ndị ọ ga-eme n’oge na-adịghị anya, gụọ isi nke 3, nke 8, na nke 9 n’akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya.

GỤKWUO GBASARA YA

Gịnị Ga-eme Ka Udo Dịrị n’Ụwa?

Chọpụta otú Chineke ga-esi eme ka Alaeze ya weta udo n’ụwa.

Gịnị Ka Baịbụl Kwuru Ịkpa Ókè Agbụrụ?

È nwere agbụrụ ka ibe ya? È nwere mgbe a ga-akwụsị ịkpa ókè agbụrụ?