Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE JUN 2013

Ọmarịcha Akwụkwọ A Chọwara Kemgbe Ọtụtụ Narị Afọ

Ọmarịcha Akwụkwọ A Chọwara Kemgbe Ọtụtụ Narị Afọ

E nwere iberibe akwụkwọ otu ọkà mmụta chọtara. Iberibe akwụkwọ a ọ chọtara tụrụ ya n’anya. O leruru ha anya ugboro ugboro. Aka akwụkwọ e ji dee ihe ndị e dere na ha nakwa asụsụ Jọjin e dere na ha mere ka o kwetasie ike na akwụkwọ a bụ Baịbụl kacha ochie a sụgharịrị n’asụsụ Jọjin.

A CHỌTARA ọmarịcha akwụkwọ a ná ngwụcha ọnwa Disemba n’afọ 1922, n’oge otu ọkachamara bụ́ onye Jọjia nọ na-eme nchọpụta banyere otú e si nweta mkpụrụ akwụkwọ asụsụ Jọjin. Aha ọkachamara ahụ bụ Ivané Javakhishvili. Akwụkwọ ahụ ọ hụrụ bụ akwụkwọ iwu ndị Juu a na-akpọ Talmud nke Jeruselem. Ka ọ na-agụ ihe e dere na ya, ọ chọpụtara na e debuola ihe n’akwụkwọ ahụ n’asụsụ Jọjin, hichaa ya ma dezie ya ihe n’asụsụ Hibru. *

Ihe e deburu n’akwụkwọ a ọ chọtara bụ ihe ụfọdụ e dere n’akwụkwọ Jeremaya. E dere ha n’ihe dị ka otu puku afọ na narị afọ ise gara aga. Tupu ya ahụ akwụkwọ a, Baịbụl kacha ochie ndị mmadụ na-agụ n’oge ahụ n’asụsụ Jọjin anọọla ihe dị ka otu puku afọ a sụgharịrị ya. Obere oge ọ chọtara akwụkwọ Baịbụl a, e bidoro chọtawa ndị nke nọrurula otu puku afọ na narị afọ ise ma ọ bụkwanụ ndị nke nọferela ya. Olee otú obi ga-adị gị ma ọ bụrụ na ị hụrụ akwụkwọ Baịbụl ndị e dere narị afọ ole na ole Jizọs na ndịozi ya dịchara ndụ n’ụwa?

Ma, ònye sụgharịrị akwụkwọ Baịbụl a? Ọ̀ bụ otu onye ka ọ̀ bụ ọtụtụ ndị nsụgharị? E nwebeghị ihe a chọpụtara nke gosiri onye ọ bụ ma ọ bụ mmadụ ole ọ bụ. Onye ọ sọkwara ya bụrụ, ihe anyị ma bụ na e nwere Baịbụl dum ma ọ bụkwanụ akwụkwọ Baịbụl ole na ole a sụgharịrị n’asụsụ Jọjin kemgbe ihe dị ka otu puku afọ na narị afọ isii gara aga, nakwa na Okwu Chineke ruru ndị Jọjia aka kemgbe ahụ n’asụsụ ha, ha ana-agụkwa ya.

Otu ihe gosiri na ndị Jọjia agụwala Baịbụl kemgbe ahụ bụ ihe e dere n’otu akwụkwọ aha ya bụ The Martyrdom of St. Shushanik the Queen. Ọ ga-abụ na e dere akwụkwọ a n’ihe dị ka otu puku afọ na narị afọ ise gara aga. Onye dere ya kọrọ otú Shushanik, bụ́ nwunye eze ndị Katli nke dị na Jọjia, si nwụchuo ọnwụ. Ọ kọkwara ihe ụfọdụ e dere n’akwụkwọ Abụ Ọma, n’Oziọma Matiu, Mak, Luk na Jọn, nakwa n’ebe ndị ọzọ na Baịbụl. O kwukwara na di Shushanik, bụ́ Vasken, kwụsịrị ịbụ Onye Kraịst ma kpewe okpukpe ndị Peshia ka iwe ghara iwe ndị ọchịchị Peshia n’ihi na ọ bụ ndị Peshia na-achị Jọjia mgbe ahụ. Akwụkwọ ahụ kwuru na Shushanik kwuru na ya emekataghị kwụsị ịbụ Onye Kraịst. Ihe kasiri ya obi ruo ụbọchị e gburu ya bụ ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ.

O doro anya na kemgbe otu puku afọ na narị afọ  ise gara aga, o nwebeghị mgbe a kwụsịrị ịsụgharị Baịbụl n’asụsụ Jọjin nakwa idepụtaghachi ndị nke a sụgharịrị asụgharị. Ihe gosiri na ọtụtụ ndị gbara mbọ ka ha sụgharịa ma depụtaghachi Baịbụl n’asụsụ Jọjin n’oge ochie bụ na e nwere ọtụtụ akwụkwọ Baịbụl n’asụsụ a. Ka anyị leba anya n’otú e si sụgharịa Baịbụl n’asụsụ a nakwa otú e si malite ibipụta ya.

OTÚ ỌTỤTỤ NDỊ SI MALITE ỊSỤGHARỊ BAỊBỤL

N’ihe dị ka narị afọ itoolu gara aga, otu onye Jọjia, bụ́ onye mọnk aha ya bụ Jọọji Mtatsmindeli, sịrị: “Mụnwa bụ́ Jọọji, onye mọnk nkịtị, agbaala mbọ si n’asụsụ Grik ọgbara ọhụrụ sụgharịa akwụkwọ Abụ Ọma n’asụsụ Jọjin. Anya ruru m ala mgbe m na-asụgharị ya.” Ebe ọ bụ na ndị Jọjia enweela Baịbụl n’asụsụ ha kemgbe ọtụtụ narị afọ, gịnịzi mere o ji dị mkpa ka a ka sụgharịwa Baịbụl n’asụsụ ha?

Mgbe ọtụtụ narị afọ gafere, Baịbụl ndị e ji aka dee n’asụsụ Jọjin fọziri ole na ole. Ụfọdụ akwụkwọ Baịbụl efunyụọla anya. Ihe ọzọkwa bụ na asụsụ Jọjin agbanwetụkwala, ya ana-esiziri ndị mmadụ ike ịghọta Baịbụl ndị nke ochie. Ọ bụ eziokwu na ọtụtụ ndị nsụgharị gbara mbọ ka e nwee Baịbụl ga-ekwe ndị mmadụ ọgụgụ n’asụsụ Jọjin, ma onye kacha gbaa mbọ n’ime ha bụ Jọọji. O leere anya na Baịbụl e nwere n’asụsụ Grik ma jiri ya chọpụta ebe ndị na-adịghịzi na Baịbụl Jọjin ma sizie na nke Grik ahụ sụgharịa ebe ndị ahụ na-adịghịzi na Baịbụl Jọjin. O mechadịrị si otú ahụ sụgharịchaa ụfọdụ akwụkwọ dị na Baịbụl. Ebe Jọọji bụ onyeisi n’ebe ndị mọnk bi, ọ na-eji ụtụtụ na ehihie arụ ọrụ ya n’ebe ahụ. O ruzie n’abalị, ya asụgharịwa Baịbụl.

E nwere otu onye ya na Jọọji dịkọrọ ndụ. Aha ya bụ Ifrem Mtsire. Nwoke a gbakwara mbọ otú Jọọji gbara. Ọ bụ ya wepụtara akwụkwọ ga-enyere ndị nsụgharị aka. Akwụkwọ ahụ kwuru otú ndị nsụgharị ga-esi na-arụ ọrụ ha. Dị ka ihe atụ, o kwuru ka ha na-esi n’asụsụ mbụ e dere ihe ha chọrọ ịsụgharị sụgharịa ya. O kwukwara na ha ekwesịghị ịhapụ ihe e dere n’asụsụ mbụ ahụ sụgharịwa ihe ọzọ, ma ha ga-agbalịkwa ka ha sụgharịa ya otú ndị na-asụ asụsụ ha na-asụgharị ga-aghọta ihe ha sụgharịrị nke ọma. Ifrem bụ onye mbụ sụgharịrị Baịbụl n’asụsụ Jọjin nke dere ihe n’ala ala peeji Baịbụl nakwa n’etiti peeji ya iji kọwaa ihe ihe ndị ọ sụgharịrị pụtara. Ifrem sụgharịrị ọtụtụ akwụkwọ Baịbụl n’onwe ya, ọ bụghị ịsụgharịtọpụ nke onye ọzọ sụgharịtụrụ. Baịbụl ndị ahụ Jọọji na Ifrem sụgharịrị mere ka ọ dịrị ndị ọzọ mechara sụgharịa ihe mfe ịsụgharị ha.

Mgbe otu narị afọ na-agafela, ibipụta akwụkwọ bịara na-ewu ewu na Jọjia. A bịara nwee ụlọ akwụkwọ n’obodo Gelati nakwa n’obodo Ikalto. Ọtụtụ ndị ọkà mmụta chere na ọ bụ ndị ọkà mmụta nọ n’obodo Gelati ma ọ bụ n’obodo Ikalto sụgharịrị Baịbụl a na-akpọ Gelati Bible. Baịbụl a dị ugbu a n’ọ̀bà akwụkwọ ebe ndị Jọjia na-edebe akwụkwọ ndị mgbe ochie.

Ọtụtụ Baịbụl ndị a a sụgharịrị hà baara ndị Jọjia uru? N’ihe dị ka narị afọ asatọ gara aga, otu onye Jọjia na-ede uri nke aha ya bụ Shota Rustaveli dere otu akwụkwọ nke wuru ewu ruo ọtụtụ narị afọ nke na  a kpọrọ ya Baịbụl nke abụọ ndị Jọjia nwere. Otu ọkà mmụta nke dịrị ndụ na Jọjia n’oge anyị a kwuru banyere uri e dere n’akwụkwọ ahụ. Aha ọkà mmụta ahụ bụ K. Kekelidze. O kwuru na o nwere ike ịbụ na Baịbụl ka Shota Rustaveli si nweta ihe o dere n’uri ahụ. Ma, otu ihe doro anya bụ na “ihe ụfọdụ o dere n’uri ahụ yiri ihe e dere n’ebe dị iche iche na Baịbụl.” Ọ bụ eziokwu na ihe ọ kacha dee n’uri ahụ bụ gbasara nwoke na nwaanyị ime enyi, ma o kwukwara ọtụtụ ugboro banyere otú mmadụ na ibe ya ga-esi dịrị na mma, mmadụ imesapụ aka, ịkwanyere ụmụ nwaanyị ùgwù, na imere ndị mbịarambịa ihe ọma. Kemgbe ọtụtụ narị afọ, ndị Jọjia weere àgwà ọma ndị e dere n’uri ahụ nakwa ndị nke e dere na Baịbụl ka àgwà ndị mmadụ kwesịrị ịna-akpa, ha ka wekwaara ha otú ahụ.

NDỊ EZE GBARA MBỌ KA E BIPỤTAWA BAỊBỤL

Malite n’ihe dị ka narị afọ atọ gara aga, ndị eze chịrị Jọjia nwewara mmasị ka e bipụtawa Baịbụl. Ọ bụ ya mere eze ha bụ́ Eze Vaktang nke Isii ji rụọ ebe a na-ebi akwụkwọ n’isi obodo ha bụ́ Tibilisi. Ma n’oge ahụ, a hụghị Baịbụl a ga-ebipụta n’asụsụ Jọjin. O yiri ka à ga-asị na Baịbụl ha emiela ala ọzọ. Naanị ihe e nwere mgbe ahụ bụ akwụkwọ Baịbụl ụfọdụ na-ezughị ezu, asụsụ Jọjin e jikwa dee ha abụghị nke ndị mmadụ na-asụzi. A gwaziri otu ọkachamara aha ya bụ Sulkan-Saba Obeliani ka ọ hụ na e dezigharịrị akwụkwọ Baịbụl ndị nke dị adị ma sụgharịa ndị nke na-adịghị.

Obeliani sara anya ná mmiri mgbe ọ na-arụ ọrụ ahụ. Ebe ọ bụ na ọ ma ọtụtụ asụsụ, ma Grik ma Latịn, o leere anya n’akwụkwọ dị iche iche e nwere n’oge ahụ, nakwa ná ndị nke dịbu adị n’asụsụ Jọjia. Otú ahụ o si saa anya ná mmiri na-asụgharị Baịbụl ahụ adịghị ndị isi Chọọchị Ọtọdọks nke Jọjia mma. Ha boro ya ebubo na ọ na-agba Chọọchị Ọtọdọks mgba okpuru. Ha mechakwara ghọgbute eze ha, ya akwụsị Obeliani ọrụ ahụ ọ na-arụ. Ụfọdụ akwụkwọ e nwere n’asụsụ Jọjin gosiri na ná nnọkọ ndị isi chọọchị ahụ nwere, ha manyere Obeliani ka ọ kpọọ akwụkwọ Baịbụl ndị ọ tara ahụhụ na-asụgharị kemgbe ọtụtụ afọ ọkụ.

Ọ dị mma ịmara na otu n’ime Baịbụl ahụ ka dị taa. Aha ọzọ a na-akpọ ya bụ Saba’s Bible (ya bụ, Baịbụl Saba). Na Baịbụl a, e nwere ihe ụfọdụ Obeliani ji aka ya dee na ya. Ụfọdụ echeghị na ọ bụ ya bụ Baịbụl ahụ ndị isi chọọchị na-achọghị iji anya ahụ. Ma o doro ha anya na ọ bụ Obeliani dere ihe niile dị n’azụ Baịbụl ahụ.

N’agbanyeghị nsogbu niile a, ụfọdụ ndị ezinụlọ eze ka chọkwara ka e bipụta Baịbụl n’asụsụ Jọjin. N’agbata afọ 1705 na afọ 1711, e bipụtara akwụkwọ ụfọdụ dị na Baịbụl. Ọ bụ mbọ Bakari na Vakushti, bụ́ ụmụ eze ndị Jọjia, gbara meziri ka e bipụta Baịbụl zuru ezu n’asụsụ Jọjin n’afọ 1743. Malitezie mgbe ahụ gawa, o nwekwaghị ihe ga-eme ka Baịbụl a mie ala.

^ para. 3 N’oge ochie, ihe e ji ede ihe na-adị ụkọ ma na-ada oké ọnụ. N’ihi ya, a na-ehichakarị ihe e deburu n’akwụkwọ ma dee ihe ọhụrụ na ya.

GỤKWUO GBASARA YA

Chineke Ò Nwere Aha?

A na-etu Chineke ọtụtụ aha ndị dị ka, Nna, Onye Okike, na Onyenwe anyị. Vidio a gosiri na aha Chineke gbara ihe karịrị ugboro puku asaa na Baịbụl.