Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE MEE 2013

Mbibi Chineke Bibiri Ndị Mmadụ Ọ̀ Na-egosi na Obi Tara Ya Mmiri?

Mbibi Chineke Bibiri Ndị Mmadụ Ọ̀ Na-egosi na Obi Tara Ya Mmiri?

IJI zaa ajụjụ a, ka anyị burugodị ụzọ leba anya ná mbibi abụọ Baịbụl gwara anyị na Chineke bibiri ụmụ mmadụ n’oge ochie. Nke mbụ anyị ga-eleba anya bụ mgbe Chineke ji iju mmiri bibie ndị mmadụ n’oge Noa, nke abụọ abụrụ mgbe o bibiri ndị Kenan.

IJU MMIRI OGE NOA

IHE ỤFỌDỤ NDỊ NA-EKWU: “Obi tara Chineke mmiri. Ọ bụ ya mere o ji jiri iju mmiri kpochapụ mmadụ niile, ma e wezụga Noa na ezinụlọ ya.”

IHE BAỊBỤL KWURU: “Ọnwụ onye ajọ omume adịghị atọ m ụtọ, kama ihe na-atọ m ụtọ bụ ka onye ajọ omume hapụ ụzọ ya ma dịrị ndụ.” (Ezikiel 33:11) Ihe a Chineke kwuru na Baịbụl na-egosi na mbibi o bibiri ndị ajọ omume n’oge Noa atọghị ya ụtọ. Gịnịzi mere o ji bibie ha?

Baịbụl kwuru na ihe mere Chineke ji bibie ndị ajọ omume n’oge gara aga bụ “ka ha ghọọrọ ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke n’ọdịnihu ihe atụ.” (2 Pita 2:5, 6) Olee otú mbibi Chineke bibiri ndị ajọ omume si bụụrụ anyị ihe atụ?

Nke mbụ bụ na ọ na-akụziri anyị na Chineke na-ahụ ihe ọjọọ niile ụmụ mmadụ na-eme. N’agbanyeghịkwa na ọ naghị atọ ya ụtọ ibibi ndị mmadụ, ọ ga-eme ka ndị ajọ omume jiri isi ha buru ihe ha metara. Oge na-abịa mgbe ọ ga-eme ka mmegbu na ahụhụ niile ụmụ mmadụ na-ata kwụsị.

Nke abụọ bụ na ọ na-akụziri anyị na Chineke hụrụ ụmụ mmadụ n’anya. Ọ bụ ya mere o ji ebu ụzọ adọ ndị ajọ omume aka ná ntị tupu ya ebibie ha. Noa kwusaara ndị mmadụ ozi ọma ka ha mewe ezi omume, ma ha kpọchiri ntị. Baịbụl kwuru na “ha amaghịkwa ruo mgbe iju mmiri ahụ bịara wee kpochapụ ha niile.”—Matiu 24:39.

Ọ̀ bụ mgbe ọ bụla ka Chineke na-ebu ụzọ adọ ndị mmadụ aka ná ntị tupu ya ebibie ha? Ee. Dị ka ihe atụ, ọ gwara ndị ya bụ́ ụmụ Izrel na ọ bụrụ na ha emewe ihe ọjọọ otú mba ndị bi ha nso na-eme, ọ ga-ahapụ ha ka ndị iro ha lụso ha agha, bibie isi obodo ha bụ́ Jeruselem ma dọrọ ha n’agha gaa mba ọzọ. Ma ụmụ Izrel egeghị Chineke ntị. Ha nupụụrụ Chineke isi nke na ha ji ụmụ ha na-achụrụ arụsị àjà. Jehova agbachighị ha nkịtị. Ma tupu Jehova emee ha ihe, o dunyere ndị amụma ya ọtụtụ ugboro ka ha zie ha ka ha kwụsị ihe ọjọọ ha na-eme. Baịbụl kwudịrị, sị: “Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova agaghị eme ihe ọ bụla ma ọ bụrụ na o bughị ụzọ kpugheere ndị ohu ya, bụ́ ndị amụma, ihe nzuzo ya.”—Emọs 3:7.

OTÚ IHE A BAỊBỤL KWURU SI GBASA GỊ: Otú ahụ Jehova si bibie ndị ajọ omume n’oge ochie na-eme ka  anyị nwee olileanya. Obi kwesịrị isi anyị ike na Chineke ga-ebibi ndị na-akpatara ndị mmadụ nsogbu. Baịbụl kwuru, sị: “A ga-ebipụ ndị na-eme ihe ọjọọ . . . Ma ndị dị umeala n’obi ga-enweta ụwa, ha ga-enwekwa obi ụtọ dị ukwuu n’ihi udo nke zuru ebe niile.” (Abụ Ọma 37:9-11) Ọ bụrụ na e bibiri ndị ajọ omume ka ndị ezi omume kuru ume ndụ, ị̀ ga-asị na obi tara onye bibiri ha mmiri, ka ị̀ ga-asị na ọ bụ onye obi ebere?

MBIBI CHINEKE BIBIRI NDỊ KENAN

IHE ỤFỌDỤ NDỊ NA-EKWU: “Otú e si lụso ndị Kenan agha n’oge ochie ma gbukpọọ ha jọgburu onwe ya. O yiri otú e si egbukpọ agbụrụ ụfọdụ n’oge a.”

IHE BAỊBỤL KWURU: ‘Ụzọ Chineke niile bụ ikpe ziri ezi. Ọ bụ Chineke nke kwesịrị ntụkwasị obi, onye ikpe na-ezighị ezi na-adịghị n’ebe ọ nọ.’ (Diuterọnọmi 32:4) Anyị ekwesịghị iji mbibi Chineke bibiri ndị Kenan tụnyere agha ụmụ mmadụ na-alụ. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na Chineke na-enyocha obi, ma ụmụ mmadụ enweghị ike inyocha obi.

Dị ka ihe atụ, mgbe Chineke mara ndị bi n’obodo Sọdọm na Gọmọra ikpe ma kpebie na ya ga-ebibi ha, Ebreham chọrọ ka o doo ya anya na ihe a Chineke kpebiri ime ziri ezi. Ọ nọ na-eche otú Chineke, bụ́ onye na-ekpe ikpe ziri ezi, ga-esi “ekpochapụkọta ndị ezi omume na ndị ajọ omume.” Ma Chineke nweere Ebreham ndidi mgbe ya na ya na-ekwu okwu. Ọ gwara Ebreham na ọ bụrụ na ya ahụ ndị ezi omume iri na Sọdọm, na ọ gaghị ebibi ya n’ihi ndị ezi omume ahụ. (Jenesis 18:20-33) O doro anya na Chineke nyochara obi ndị bi na Sọdọm na Gọmọra ma hụ na ha agaghị agbanweli.—1 Ihe E Mere 28:9.

Chineke hụkwara na ndị Kenan bụ ndị ajọ omume, ọ bụ ya mere o ji nye iwu ka e bibie ha. A ma ndị Kenan ama na ha bụ ndị obi tara mmiri. Otu n’ime ihe ọjọọ ndị ha na-eme bụ isure ụmụaka ha n’ọkụ ná ndụ. Ha na-eji ụmụaka ahụ achụrụ chi ha àjà. * (2 Ndị Eze 16:3) Ndị Kenan ma na Jehova nyere ụmụ Izrel iwu ka ha weghara ala ha dum. Onye ọ bụla kpọrọ ekwo nkụ jụ isi n’ala ahụ pụọ ma na-alụso ụmụ Izrel agha na-ama ụmụ Izrel na Jehova aka, n’agbanyeghị na Jehova egosila na ya nọnyeere ụmụ Izrel.

Ihe ọzọkwa bụ na Jehova meere ndị Kenan hapụrụ ihe ọjọọ ha na-eme ma fewe ya ebere. Dị ka ihe atụ, e bibighị Rehab, bụ́ nwaanyị Kenan na-agba akwụna, nakwa ndị ezinụlọ ya. Mgbe ndị Gibiọn bụ́ obodo dị na Kenan rịọkwara ụmụ Izrel ka ha meere ha ebere, a hapụrụ ma ha ma ụmụ ha niile ndụ.—Jọshụa 6:25; 9:3, 24-26.

OTÚ IHE A BAỊBỤL KWURU SI GBASA GỊ: O nwere ihe dị mkpa anyị ga-amụta ná mbibi Chineke bibiri ndị Kenan. “Ụbọchị ikpe na ụbọchị mbibi nke ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke” ji ọsọ na-abịa. (2 Pita 3:7) Ọ bụrụ na anyị hụrụ Jehova n’anya, anyị ga-erite uru mgbe Jehova ga-ebibi ndị niile jụrụ ọchịchị ezi omume ya n’ihi na nke a ga-eme ka ahụhụ ụmụ mmadụ na-ata kwụsị.

A ma ndị Kenan ama na ha bụ ndị obi tara mmiri, ha kpachakwaara anya na-ama ụmụ Izrel na Chineke aka

Jehova hụrụ anyị n’anya. Ọ bụ ya mere o ji mee ka anyị mata na ihe ọ bụla ndị nne na nna mere ga-emetụta ụmụ ha. Baịbụl kwuru, sị: “Ị ga-ahọrọkwa ndụ ka i wee dịrị ndụ, gị na ụmụ gị, site n’ịhụ Jehova bụ́ Chineke gị n’anya, site n’ige ntị n’olu ya na site n’ịrapara ya n’ahụ́.” (Diuterọnọmi 30:19, 20) Ihe a Chineke kwuru ọ̀ dị gị ka ihe onye obi tara mmiri ga-ekwu? Í cheghị na onye kwuru ya hụrụ ụmụ mmadụ n’anya ma chọọ ka ha mee ihe dị mma?

^ para. 15 Ndị na-amụ banyere ihe ndị mgbe ochie egwupụtala ihe na-egosi na ndị Kenan na-esure ụmụ ha n’ọkụ ma ha fewe chi ha.