Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE EPREL 2013

 Bịaruo Chineke Nso

“Na-arịọnụ, A Ga-enye Unu”

“Na-arịọnụ, A Ga-enye Unu”

“Onyenwe anyị, kụziere anyị otú e si ekpe ekpere.” (Luk 11:1) Ọ bụ otu n’ime ndị na-eso ụzọ Jizọs rịọrọ ya arịrịọ a. Mgbe Jizọs na-akụziri ha ya, o mere ihe atụ abụọ o ji kụzie otú anyị ga-esi na-ekpe ekpere, Chineke anụ ya. Ọ bụrụ na o doghị gị anya ma Chineke ọ̀ na-anụ ekpere gị, ihe Jizọs kwuru ga-eme gị obi ụtọ.—Gụọ Luk 11:5-13.

Ihe atụ mbụ Jizọs mere bụ banyere onye na-ekpe ekpere. (Luk 11:5-8) N’ihe atụ ahụ, Jizọs kwuru na otu nwoke nwere onye ọbịa nke bịara n’ụlọ ya n’etiti abalị, ma o nweghị ihe oriri ọ ga-enye onye ọbịa ahụ. Nwoke ahụ onye ọbịa bịara na nke ya chọrọ otú ọ ga-esi enweta nri ozugbo ka o nye onye ọbịa ahụ. N’agbanyeghị na ọ bụ n’etiti abalị, ọ gara n’ụlọ enyi ya ka enyi ya gbazinye ya achịcha. Na mbụ, enyi ya ahụ achọghị ibili, n’ihi na ya na ndị ezinụlọ ya ehiela ụra. Ma ihere emeghị nwoke ahụ, kama, ọ nọgidere na-arịọ enyi ya ka ọ gbazinye ya achịcha ruo mgbe enyi ya ahụ biliri nye ya ihe ọ na-arịọ. *

Olee ihe ihe atụ a na-akụziri anyị banyere ekpere? Jizọs na-agwa anyị na anyị kwesịrị ịnọgidesi ike na-ekpe ekpere. O kwuru ka anyị na-arịọ, na-achọ, ma na-akụ aka. (Luk 11:9, 10) Gịnị mere o ji kwuo otú ahụ? Ihe Jizọs na-ekwu ọ̀ bụ na Chineke dị ka nwoke ahụ nke na-achọghị ibili nye enyi ya ihe ọ chọrọ, ya bụ, na Chineke achọghị inye anyị ihe anyị na-arịọ ya? Mbanụ. Ihe Jizọs na-ekwu bụ na Chineke adịghị ka nwoke ahụ na-achọghị ibili nye enyi ya ihe ọ chọrọ, kama Chineke na-achọ imere ndị ji okwukwe na-arịọ ya arịrịọ ihe ha na-arịọ ya. Anyị ga-egosi na anyị nwere ụdị okwukwe ahụ ma ọ bụrụ na anyị anọgide na-ekpe ekpere mgbe niile. Anyị ịnọgide na-ekpe ekpere gosiri na ihe anyị na-arịọ dị anyị ezigbo mkpa. Ọ na-egosikwa na anyị tụkwasịrị Chineke obi na ọ ga-emere anyị ihe ahụ anyị na-arịọ ya, ma ọ bụrụhaala uche ya.—Mak 11:24; 1 Jọn 5:14.

Ihe atụ nke abụọ Jizọs mere bụ banyere Jehova, bụ́ “Onye na-anụ ekpere.” (Abụ Ọma 65:2) Jizọs jụrụ, sị: “Olee nna ọ bụ n’ime unu nke nwa ya ga-arịọ azụ̀, ya enye ya agwọ kama inye ya azụ̀? Ma ọ bụ, ọ bụrụ na ọ rịọ ya àkwá, ya enye ya akpị?” Azịza nke ajụjụ ndị a doro anya. O nweghị nna hụrụ ụmụ ya n’anya nke ga-enye ha ihe ndị ga-emerụ ha ahụ́. Jizọs kọwara ihe ihe atụ ahụ pụtara: Ọ bụrụ na nna na-ezughị okè nwere ike inye ụmụ ya “ezi onyinye,” ‘lezienụ ka Nna anyị nke nọ n’eluigwe ga-esi nye ụmụ ya ndị nọ n’ụwa na-arịọ ya mmụọ nsọ karị.’ Mmụọ nsọ bụ onyinye kachanụ Chineke nwere ike inye ụmụ ya.—Luk 11:11-13; Matiu 7:11.

Chineke na-achọ imere ndị ji okwukwe na-arịọ ya arịrịọ ihe ha na-arịọ ya

Gịnị ka ihe atụ a na-akụziri anyị banyere Jehova, bụ́ “Onye na-anụ ekpere”? Jizọs na-agwa anyị ka anyị were Jehova ka Nna hụrụ umụ ya n’anya, bụ́ Onye ọ na-agụ agụụ igboro ụmụ ya mkpa ha. N’ihi ya, ndị na-efe Jehova nweere onwe ha ịkọrọ ya mkpa ha. Ebe ọ bụ na ha maara na Jehova ga-emere ha ihe ga-akacha baara ha uru, ihe ọ bụla Jehova zara ha n’ekpere, ha na-anabata ya, ọ sọgodị ya ya bụrụ na ihe ọ zara ha abụghị ihe ha tụrụ anya ya. *

Ebe anyị na-atụ aro ka ị gụọ na Baịbụl n’ọnwa Eprel

Luk 7-21

^ para. 4 Ihe atụ a Jizọs mere gosiri ihe ndị Juu na-eme n’oge ahụ. Ndị Juu ejighị ile ọbịa egwuri egwu. Ezinụlọ ọ bụla na-eme achịcha ha ga-ericha n’otu ụbọchị, n’ihi ya, ndị nke ha gwụrụ na-aga agbazite na nke ndị agbata obi ha. Ọ bụrụkwa na ezinụlọ enweghị ego, ha niile na-ehi n’otu ọnụ ụlọ.

^ para. 7 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu otú ị ga-esi ekpe ekpere Chineke anụ ya, gụọ isi nke 17 n’akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara akwụkwọ a.