Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE EPREL 2013

Jizọs Kụziiri Anyị Otú Ndụ Anyị Ga-esi Baa Uru

Jizọs Kụziiri Anyị Otú Ndụ Anyị Ga-esi Baa Uru

‘Bie ndụ dị ka Kraịst si bie.’—1 Jọn 2:6, Baịbụlụ Nsọ nke International Bible Society.

ANYỊ kwuru n’isiokwu bu nke a ụzọ na ndụ Jizọs biri n’ụwa bara ezigbo uru. N’ihi ya, ọ bụrụ na anyị chọrọ ka ndụ anyị baa uru, anyị kwesịrị ibi ndụ ka ya ma mee ihe o kwuru.

Jehova gwadịrị anyị n’amaokwu a dị n’elu ka anyị mee otú ahụ. Ibi ndụ dị ka Kraịst si bie ga-eme ka Chineke hụ anyị n’anya, ọ ga-emekwa ka ndụ anyị baa uru.

Jizọs kụziiri anyị ihe ndị ga-eme ka anyị bie ndụ otú o biri. Anyị ga-ahụ ọtụtụ n’ime ha n’ihe o kwuru mgbe ọ nọ n’elu ugwu na-akụziri ndị mmadụ ihe. Ka anyị lebagodị anya n’ụfọdụ n’ime ihe ndị ahụ ọ kụziri nakwa otú anyị nwere ike isi mee ha emee.

IHE JIZỌS KỤZIRI: “Obi ụtọ na-adịrị ndị maara mkpa ime mmụọ ha.”—Matiu 5:3.

OTÚ IHE A JIZỌS KỤZIRI GA-ESI EME KA NDỤ ANYỊ BAA URU:

Ihe a Jizọs kwuru gosiri na e kere anyị ka anyị mata onye Chineke bụ. Ọ na-agụ anyị agụụ ịmata azịza nke ajụjụ ndị a: Gịnị mere anyị ji nọrọ n’ụwa? Gịnị mere ụmụ mmadụ ji na-atagbu onwe ha n’ahụhụ? Chineke ọ̀ na-eche banyere anyị? Mmadụ ọ̀ na-ama ihe ma ọ nwụọ? Ọ bụrụ na anyị chọrọ ka ndụ anyị baa uru, anyị kwesịrị ịmata azịza nke ajụjụ ndị a. Jizọs ma na ọ bụ naanị n’Okwu Chineke ka anyị nwere ike isi nweta ezigbo azịza nke ajụjụ ndị ahụ. Mgbe Jizọs na-ekpegara Nna ya ekpere, ọ sịrị: “Okwu gị bụ eziokwu.” (Jọn 17:17) Okwu Chineke ò nwere ike inyere anyị aka ịmata onye Chineke bụ n’eziokwu?

AKỤKỌ MERE EME:

Otu nwoke aha ya bụ Esa na-agụrụ òtù egwú rọk egwú, ọ na-emekwa nke ọma n’òtù egwú ahụ. N’agbanyeghị nke ahụ, Esa enwechaghị obi ụtọ. O kwuru, sị: “Ọ bụ eziokwu na obi na-atọ m ụtọ na m nọ n’òtù egwú anyị a, ma ọ na-adị m ka ndụ m abachaghị uru.” Ka oge na-aga, ya na otu Onyeàmà Jehova hụrụ. Esa kwuru, sị: “M jụrụ ya ọtụtụ ajụjụ. Otú o si were Akwụkwọ Nsọ zaa m ajụjụ ndị ahụ nke ọma masịrị m. Nke a mere ka m kweta ka ọ kụziwere m Baịbụl.” Ihe Esa mụtara na Baịbụl ruru ya n’obi, ya emee ka o nyefee Jehova onwe ya. Esa kwuru, sị: “N’oge gara aga, m na-abanyekarị ná nsogbu. Ma ugbu a, ndụ m abaala ezigbo uru.” *

IHE JIZỌS KỤZIRI: “Obi ụtọ na-adịrị ndị na-eme ebere.”—Matiu 5:7.

OTÚ IHE A JIZỌS KỤZIRI GA-ESI EME KA NDỤ ANYỊ BAA URU:

A sị na mmadụ na-eme ebere, ọ pụtara na onye ahụ na-emere ndị ọzọ ọmịiko, na-emekwara ha ihe ọma. Jizọs meere ndị nọ ná mkpa ebere. Obi ebere ya mere ka o nyere ndị na-ata ahụhụ aka n’echeghị ka a gwa ya agwa. (Matiu 14:14; 20:30-34) Ọ bụrụ na anyị ana-emere ndị ọzọ ebere ka Jizọs, ndụ anyị ga-aba uru, n’ihi na ndị na-emere ndị ọzọ ebere na-enwe obi ụtọ. (Ọrụ Ndịozi 20:35) Otú anyị nwere ike isi na-emere ndị ọzọ ebere bụ iji obiọma na-agwa ha okwu na ịkpaso ha àgwà ọma. Ime otú ahụ ga-eme ka ahụhụ ha na-ata belata. Ọ̀ bụ eziokwu na imere ndị ọzọ ebere ga-eme ka anyị na-enwekwu obi ụtọ ná ndụ, ahụ́ agbasikwuokwa anyị ike?

Maria na Carlos

AKỤKỌ MERE EME:

Otu di na nwunye aha ha bụ Carlos na Maria na-emere ndị ọzọ ebere. Mama Maria anwụọla, ya afọdụzie papa ya. Papa ya na-arịa ọrịa nke na-anaghị ekwe ya bilie ebilie. Maria kpọọrọ papa ya ka ha na ya biri ka ha nwee ike ilekọta ya. Mgbe ụfọdụ, ọrịa shuga papa ya na-arịa na-echu ha ụra n’abalị. Ha na-akpọdị ya aga ụlọ ọgwụ ma ọrịa ahụ nyewe ya nsogbu n’abalị. Maria na di ya kwuru na ọ dị mgbe ike na-agwụcha ha. Ma ha na-enwe obi ụtọ otú ahụ Jizọs kwuru. Obi na-atọkwa ha ụtọ n’ihi na ha ma na ha na-elekọta papa Maria nke ọma.

 IHE JIZỌS KỤZIRI: “Obi ụtọ na-adịrị ndị na-eme udo.”—Matiu 5:9.

OTÚ IHE A JIZỌS KỤZIRI GA-ESI EME KA NDỤ ANYỊ BAA URU:

Ọ bụrụ na e kwuo na mmadụ “na-eme udo,” ọ pụtara na onye ahụ na-agbalị ka ya na ndị ọzọ na-adị ná mma. Olee otú mmadụ ịbụ onye na-eme udo ga-esi eme ka ndụ ya bakwuo uru? Ọ bụrụ na anyị na-eme udo, anyị na ndị ọzọ ga na-adịkwu ná mma. Ọ ga-abara anyị uru ma anyị mee ihe a Baịbụl kwuru, nke bụ́: “Ọ bụrụ na o kwere omume, ọ bụrụhaala na ọ dị unu n’aka, unu na mmadụ niile dịrị n’udo.” (Ndị Rom 12:18) Ndị ezinụlọ anyị na ndị anyị na ha na-anaghị ekpe otu okpukpe socha na “mmadụ niile” ahụ amaokwu a kwuru okwu ya. Ọ bụrụ na anyị na “mmadụ niile” adịrị n’udo, ò nwere ike ime ka ndụ anyị baa uru?

Nair

AKỤKỌ MERE EME:

E nwere otu nwaanyị aha ya bụ Nair. E nweela ọtụtụ ihe gaara eme ka ya na ndị ọzọ ghara ịdị na mma, karịsịa, n’ezinụlọ ya. Kemgbe afọ iri na ise di ya hapụrụ ya, ọ bụ naanị ya na-azụ ụmụ ha. Ọgwụ ọjọọ riri otu n’ime ụmụ ya ndị nwoke ahụ́. Nwa ya nwoke ahụ na-akpakwa àgwà mgbe niile ka onye isi na-adịghị mma, na-ekwukwa na ya ga-emesi mama ya na nwanne ya nwaanyị ike. Nair kwetara na ihe ya na-amụta na Baịbụl na-enyere ya aka ịna-eme udo mgbe niile, ma n’oge o siiri ya ike ime otú ahụ. Nair na-agbalị ka ya na nwa ya ahụ ghara ịna-abarịta mba ma ọ bụ lụọ ọgụ. Ọ na-agbalịkwa ka ọ na-emere ndị mmadụ ihe ọma, na-echebara ha echiche ma na-emekwara ha ọmịiko. (Ndị Efesọs 4:31, 32) Obi siri ya ike na ihe mere ya na ndị ezinụlọ ya na ndị ọzọ ji dịrị ná mma bụ maka na ya na-eme udo.

ECHEFULA IHE ỌMA NDỊ GA-EME N’ỌDỊNIHU

Ọ bụrụ na anyị emee ihe ndị Jizọs gwara anyị mee, anyị ga-enwe obi ụtọ ná ndụ. Ma ihe ọzọ ga-eme ka ndụ anyị baa ezigbo uru bụ anyị ịmata ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu. A sị ka e kwuwe, ò nwere ezigbo uru ndụ anyị ga-abara anyị ma ọ bụrụ na naanị ihe anyị ma bụ na anyị ga-emecha kaa nká, rịa ọrịa ma nwụọ? Ọ dị nwute na ọ bụ ihe ndị a ka anyị na-ahụ n’ụwa taa.

Ma, e nwere ihe ga-eme anyị obi ụtọ. Jehova akwadebela ọtụtụ ihe ọma ọ ga-emere ndị ‘na-ebi ndụ dị ka Kraịst si bie.’ O kwere anyị nkwa na n’oge na-adịghị anya, ọ ga-eme ka ụwa ghọọ paradaịs bụ́ ebe ndị ezi omume ga-ebi ruo mgbe ebighị ebi otú o bu n’obi mgbe o kere mmadụ. Ha agaghị arịa ọrịa ọ bụla mgbe ahụ. Okwu Chineke sịrị: “Lee! Ụlọikwuu nke Chineke dịnyeere mmadụ, ya na ha ga-ebikwa, ha ga-abụkwa ndị nke ya. Chineke n’onwe ya ga-anọnyekwara ha. Ọ ga-ehichapụkwa anya mmiri niile n’anya ha, ọnwụ agaghị adị ọzọ, iru uju ma ọ bụ mkpu ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịkwa adị ọzọ. Ihe mbụ niile agabigawo.”—Mkpughe 21:3, 4.

Maria, bụ́ nwaanyị ahụ dị afọ iri asatọ na anọ e kwuru okwu ya n’isiokwu nke mbụ n’Ụlọ Nche a, na-aṅụrị ọṅụ maka na o nwere olileanya ịhụ mgbe Chineke ga-emezu ihe a e kwuru ná Mkpughe. Gịnwakwanụ? Ị̀ ga-achọ ịmatakwu banyere “ndụ ahụ nke bụ́ ndụ n’ezie,” bụ́ ndụ ụmụ mmadụ ga-adị n’Alaeze Chineke? (1 Timoti 6:19) Ọ bụrụ na ị chọrọ, gwa Ndịàmà Jehova bi gị nso ka ha nyere gị aka ma ọ bụ gị edetara ndị na-ebipụta magazin a akwụkwọ. *

^ para. 8 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịgụcha akụkọ ndụ Esa, gaa na peeji nke 8 ruo na nke 9 n’Ụlọ Nche a.

^ para. 18 Akwụkwọ Ndịàmà Jehova bipụtara nke a na-akpọ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? enyerela ọtụtụ ndị aka ịmụ Baịbụl n’isiokwu n’isiokwu.

 

GỤKWUO GBASARA YA

Oleedị Ihe Chineke Bu n’Obi Kee Anyị?

Ò nwetụla mgbe ị jụrụ onwe gị ihe Chineke kere anyị ka anyị jiri ndụ anyị mee? Lee ihe Baịbụl zara.

Gịnị Ka Alaeze Chineke Ga-eme?

Chọpụta ihe Alaeze Chineke ga-emere ụmụ mmadụ ma ọ chịwa ụwa.