Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE MACH 2013

 NDỊ NA-AGỤ AKWỤKWỌ ANYỊ NA-AJỤ, SỊ . . .

Jizọs Ò Kwere Onye Ajọ Omume ahụ Nkwa na Ọ Ga-aga Eluigwe?

Jizọs Ò Kwere Onye Ajọ Omume ahụ Nkwa na Ọ Ga-aga Eluigwe?

Ihe mere ndị mmadụ ji ajụ ajụjụ a bụ n’ihi ihe Jizọs gwara onye ajọ omume a kpọgbukọrọ ya na ya. Jizọs gwara ya, sị: “N’ezie, ana m asị gị taa, Mụ na gị ga-anọ na Paradaịs.” (Luk 23:43) Ị̀ hụrụ na Jizọs ekwughị ebe Paradaịs ahụ ga-adị? Ma, ihe Jizọs gwara nwoke ahụ ọ̀ pụtara na ya na ya ga-eso laa eluigwe?

Ka anyị burugodị ụzọ chọpụta ma onye ajọ omume ahụ ò so ná ndị ga-aga eluigwe. A na-eji mmiri na mmụọ nsọ eme ndị nwere olileanya ịga eluigwe baptizim, ha aghọọ ndị na-eso ụzọ Jizọs e ji mmụọ nsọ mụọ. (Jọn 3:3, 5) Ihe ọzọ bụ na ndị ahụ ga-aga eluigwe ga na-akpa àgwà otú Chineke chọrọ. Dị ka ihe atụ, ha ga na-akwụwa aka ọtọ, ha ga-anọgide na-eme ezi ihe ma na-emere ndị mmadụ ebere. (1 Ndị Kọrịnt 6:9-11) Ha ga na-erubere Chineke na Kraịst isi ruo mgbe ha nwụrụ. (Luk 22:28-30; 2 Timoti 2:12) Ọ bụ naanị ndị mere ihe ndị a ka a ga-akpọlite n’ọnwụ, ọ bụkwa ha ga-aga eluigwe ka ha na Kraịst bụrụ ndị nchụàjà na ndị eze ndị ga-achị ụmụ mmadụ ruo otu puku afọ.—Mkpughe 20:6.

Ma a bịa n’ihe niile a Baịbụl kwuru, onye ahụ a kpọgbukọrọ ya na Jizọs achịtaghị ájá n’ihi na ọ bụ onye ajọ omume n’oge ọ dị ndụ, ruokwa mgbe ọ nwụrụ. (Luk 23:32, 39-41) N’eziokwu, ọ kwanyeere Jizọs ùgwù mgbe ọ gwara ya, sị: “Cheta m mgbe ị banyere n’alaeze gị.” (Luk 23:42) N’agbanyeghị nke ahụ, e meghị ya baptizim, ọ ghọkwanụghị onye na-eso ụzọ Jizọs e ji mmụọ nsọ mụọ, o jighịkwanụ ndụ ya mee ezi omume ma fee Chineke. Ì chere na Jizọs ga-ekwe onye ajọ omume ahụ nkwa na ya na ndị na-eso ụzọ Jizọs ndị ji ndụ ha niile fee Chineke ga-abụ eze n’eluigwe ebe yanwa na-enwekwanụghị mgbe o fere Chineke?—Ndị Rom 2:6, 7.

Dị ka ihe atụ: Weregodị ya na otu nwoke zuru gị ohi ma mechaa rịọ gị ka ị gbaghara ya, gị agbaghara ya ma kpebie na ị gaghị akpọrọ ya ndị uwe ojii. N’agbanyeghị na ị gbagharala ya, ị̀ ga-anwa anwa nyefee ya ahịa gị ka ọ zụwara gị ma ọ bụkwanụ gwa ya ka o lekọtawara gị ndị ezinụlọ gị? Ị gaghị eme otú ahụ. Ọ bụ naanị ndị ị tụkwasịrị obi ka ị ga-enye ụdị ọrụ a ka ha rụwara gị. Ọ bụ otú ahụ ka ọ dịkwa ndị ga-aga eluigwe. Ha ga-abụ ndị gosirila na mee elu mee ala, ha ga na-eme ihe Chineke chọrọ n’oge ha ga-achịwa ụmụ mmadụ. (Mkpughe 2:10) Ọ bụ eziokwu na onye ajọ omume ahụ ji obi ya niile rịọ Jizọs arịrịọ n’oge ọ na-aga ịnwụ, ma o nweghị ihe gosiri na mee elu mee ala, ọ ga na-eme uche Chineke.

Ma Jizọs ọ̀ gwara onye ajọ omume ahụ na ya na ya ga-anọ n’eluigwe n’ụbọchị ahụ ha nwụrụ? Ọ gwaghị ya otú ahụ n’ihi na Jizọs n’onwe ya agadịghị eluigwe n’ụbọchị ahụ. Kama nke ahụ, Jizọs nọrọ “n’ime ala,” ya bụ, n’ili, ruo ụbọchị atọ. (Matiu 12:40; Mak 10:34) Mgbe a kpọlitedịrị Jizọs n’ọnwụ, ọ nọrọ n’ụwa ruo ụbọchị iri anọ tupu ya alaa eluigwe. (Ọrụ Ndịozi 1:3, 9) Nke a na-egosi na onye ajọ omume ahụ na Jizọs agaghị eluigwe n’ụbọchị ahụ.

Ebe ọ dị otú ahụ, olee paradaịs onye ajọ omume ahụ ga-anọ na ya? A kpọlitechaa ya n’ọnwụ, ọ ga-anọ n’ụwa mgbe a ga-eme ka ụwa bụrụ paradaịs. Ọ ga-eso ná ndị Jizọs ga-achị. (Ọrụ Ndịozi 24:15; Mkpughe 21:3, 4) Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu banyere paradaịs ahụ na ihe Chineke chọrọ gị n’aka, gwa Onyeàmà Jehova ọ bụla.