Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE FEBỤWARỊ 2013

 IHE NDỊ NA-EME KA E NWEE OBI ỤTỌ N’EZINỤLỌ

Gịnị Ka Ị Ga-eme Ma Ọ Bụrụ na Nwa Gị Nwere Nkwarụ?

Gịnị Ka Ị Ga-eme Ma Ọ Bụrụ na Nwa Gị Nwere Nkwarụ?

CHARLES: * “Nwa anyị Angelo na-arịa ajọ ọrịa nke mere ka ụbụrụ ghara ịkpakọcha ya ọnụ, ya ana-eme iberiibe iberiibe. Ọrịa ya a ataala anyị ahụhụ. Ilekọta nwata ahụ́ dị mma adịghị mfe ma ya fọdụzie nke na-arịa ụdị ọrịa a Angelo na-arịa. Mgbe ụfọdụ, mụ na nwunye m anaghị elebara ibe anyị anya.”

MARTHA: “Ọ na-esi ezigbo ike tupu Angelo amụta obere ihe anyị na-akụziri ya. Mgbe ọ bụla ike gwụrụ m, ahụ́ na-amalite ịgbakasị m, obere ihe di m mere m, iwe ewewe m. Mgbe ụfọdụ, ihe na-ekwesịghị isere anyị okwu na-esere anyị okwu.”

Ì chetara ụbọchị ị mụrụ nwa? O doro anya na obi tọrọ gị ụtọ, gị achọọ ka e kunye gị ya ozugbo. Ma ndị nne na nna ọ dị otú ahụ ọ dị Charles na Martha enwechaghịzi obi ụtọ kemgbe a gwara ha na nwa ha bu ọrịa ọjọọ ma ọ bụ na o nwere nkwarụ.

Nwa gị ò nwere nkwarụ? Ò nwere ọrịa ọjọọ ọ na-arịa? Ya bụrụ otú ahụ, ị ga na-eche ma ị̀ ga-azụlikwa ya. Ọ bụrụ na ị na-eche otú ahụ, obi amapụla gị. E nweela ndị nne na nna zụrụla ụmụ ndị nwere ụdị nsogbu nwa gị nwere. Ka anyị leba anya ná nsogbu atọ ndị nwere ike ịbịara gị na otú Baịbụl nwere ike isi nyere gị aka.

NSOGBU NKE MBỤ: Ọ NA-ESIRI GỊ IKE IKWETA NA NWA GỊ NA-ARỊA ỌRỊA A CHỌPỤTARA NA Ọ NA-ARỊA.

Obi na-agbawa ọtụtụ ndị nne na nna mgbe ha matara na nwa ha bu ọrịa. Otu nwaanyị Meksiko aha ya bụ Juliana kwuru, sị: “Mgbe ndị dọkịta gwara m na ụbụrụ akpakọchaghị nwa anyị aha ya bụ Santiago ọnụ, ekwetaghị m na ọ bụ eziokwu. Ọ dị m ka ụwa m ọ̀ gwụla.”  Ọ na-adịkwa ndị ọzọ otú ọ dị otu nwaanyị Ịtali aha ya bụ Villana. Villana sịrị: “Ọ bụ eziokwu na ọ bụ m ji aka m kpebie na m ga-amụ nwa n’agbanyeghị na m ma na ụmụ nwaanyị ndị ruru afọ ole m dị na-enwekarị nsogbu ma ha mụọ nwa. Ugbu a m mụrụ nwa, ya abụrụ na ụbụrụ akpakọchaghị ya ọnụ, obi m na-ama m ikpe.”

Ọ bụrụ na obi gị na-ama gị ikpe maka na nwa gị na-arịa ọrịa, buru n’obi na ọ bụ otú ọ na-adịkwa ndị ọzọ n’ihi na Chineke ekeghị ụmụ mmadụ ka ha na-arịa ọrịa. (Jenesis 1:27, 28) O keghị ndị nne na nna ka obi na-atọ ha ụtọ ma ụdị ihe a mee ụmụ ha. N’ihi ya, ọ bụghị ihe ọjọọ ma obi jọọ gị njọ maka na nwa gị na-arịa ọrịa. Ọ ga-ewekwa gị oge tupu gị ewere ụwa gị otú i si hụ ya.

Gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na ọ na-adị gị ka ọ̀ bụ gị kpatara ọrịa nwa gị na-arịa? Cheta na o nweghị mmadụ macha ihe mere ụmụaka ji ebute ọrịa ma ọ bụ nkwarụ n’afọ. O nwere ike inwe ihe ndị ọzọ so akpata ya. Ma o nwekwara ike ịbụ na ị na-ata di gị ma ọ bụ nwunye gị ụta na ọ bụ ya kpatara ọrịa ahụ. Ọ bụrụ otú ahụ, emekwala ya. Ọ ga-akara unu mma ịgbakọta aka ọnụ zụọ nwa ahụ kama ịna-ata ibe unu ụta.—Ekliziastis 4:9, 10.

IHE I NWERE IKE IME: Gbalịa mara banyere ọrịa ahụ nwa gị na-arịa. Baịbụl kwuru, sị: “A ga-eji amamihe wulite ezinụlọ, a ga-ejikwa nghọta mee ka o guzosie ike.”—Ilu 24:3.

Ebe i nwere ike isi mata gbasara ọrịa ahụ bụ n’ọnụ ndị dọkịta nakwa n’akwụkwọ ndị na-akọ banyere ọrịa ahụ. I nwere ike iwere mgbalị a ị na-eme ka ị mụta banyere ọrịa nwa gị ka ebe ị na-amụ asụsụ ọhụrụ. Ọ gaghị adịrị gị mfe ná mmalite, ma ka oge na-aga, ị ga-amụta ya.

Charles na Martha, bụ́ ndị e kwuru okwu ha ná mmalite isiokwu a, gakwuuru dọkịta, gaakwa n’ụlọ ọrụ ma anya ụdị ọrịa nwa ha na-arịa ma jụta ha banyere ọrịa ahụ. Di na nwunye a kwuru, sị: “Ihe a anyị mere nyeere anyị aka ịmata nsogbu ọrịa ahụ nwere ike ịkpatara nwa anyị nakwa ihe nwa anyị ga-emeli. Anyị chọpụtara na nwa anyị nwekwara ike ịba uru ná ndụ. Ihe a ha gwara anyị kasiri anyị obi.”

MEGODỊ IHE A: Lekwasị anya n’ihe nwa gị ahụ ga-emeli. Gbalịa ka ezinụlọ unu na-emekọ ihe ọnụ. Ọ bụrụ na o nwee ihe nwa gị ahụ metere nke ọma, kelee ya ozugbo ahụ, sorokwa ya ṅụrịa mgbe ọ na-aṅụrị ọṅụ.

NSOGBU NKE ABỤỌ: ILEKỌTA NWA GỊ NA-AGWỤ GỊ IKE, Ọ NA-ADỊKWA GỊ KA O NWEGHỊ ONYE Ị GA-AKỌSARA ỤWA GỊ.

Ike nwere ike ịna-agwụcha gị maka na ị na-elekọta nwa gị na-arịa ọrịa. Otu nwaanyị Niu Ziland nke aha ya bụ Jenney kwuru, sị: “Malite mgbe a chọpụtara na nwa m na-arịa ọrịa mkpumkpu azụ, ike na-agwụkarị m ma m lekọtachaa ya, rụọkwa ọrụ ndị ọzọ dị n’ụlọ, m na-ebekarị ákwá.”

Nsogbu ọzọ bụ na o nwere ike ịna-adị gị ka o nweghị onye ị ga-akọsara ụwa gị. Otu nwoke aha ya bụ Ben nwere nwata nwoke ọrịa kpọnwụrụ ahụ́ ya. Ben sịrị: “Ọtụtụ ndị amaghị otú ụwa dị anyị.” O nwere ike ịna-agụ gị agụụ ka ị kọsara mmadụ otú ụwa dị gị. Ma i lee anya n’aka nri, lee anya n’aka ekpe, ọtụtụ ndị enyi gị nwechara ụmụaka ndị ahụ́ dị mma, ya emee ka o siere gị ike ịkọrọ ha ụwa gị.

IHE I NWERE IKE IME: Gwa ndị ọzọ ka ha nyere gị aka. Ọ bụrụkwa na ha achọọ inyere gị aka, hapụ ha ka ha mee otú ahụ. Juliana, bụ́ onye anyị kwuburu okwu ya sịrị, “Mgbe ụfọdụ, ọ na-eme mụ na di m ihere ịgwa ndị mmadụ ka ha nyetụrụ anyị aka. Ma, anyị amụtala na ọ na-abụ a nyụkọọ mamịrị ọnụ, ya agbọọ ụfụfụ. Ọ na-abụ ndị ọzọ nyere anyị aka, anyị amara na anyị abụghị ndị a jụrụ ajụ.” Ọ bụrụ na ezigbo enyi gị ma ọ bụ onye ezinụlọ gị agwa gị ka o lekọtara gị nwa gị n’ọmụmụ ihe Ndị Kraịst ma ọ bụ n’ebe ọzọ, hapụ ya ka o mee otú ahụ ma kelee ya. Baịbụl kwuru, sị: “Ezi enyi nwere ịhụnanya mgbe niile, ọ bụkwa nwanne a mụrụ maka oge nsogbu.”—Ilu 17:17.

Na-elekọta onwe gị nke ọma. Ụgbọala e ji ebu mmanụ ụgbọala na-agbarakwa mmanụ ụgbọala ka o nwee ike ibuga mmanụ ụgbọala n’ebe a chọrọ ya. Otú ahụ ka ọ dịkwa gịnwa. I kwesịrị ịna-elekọta onwe gị anya ka i nwee ike ilekọta nwa gị na-arịa ọrịa. Otu nwoke aha ya bụ Javier mụrụ nwata nwoke dara ngwọrọ. Javier kwuru, sị: “Ebe ọ bụ m na-akwagharị nwa m dara ngwọrọ, m kwesịrị ịna-eriju afọ.”

Olee otú ị ga-esi nweta ohere ị ga-eji na-elebara onwe gị anya? Ụfọdụ nne na nna na-eke ọrụ ilekọta nwa ha eke, onye a lekọta ya taa, onye nke ọzọ elekọta ya echi. Nke a na-eme ka ha nwee ohere ha ji ezu ike ma na-elebara ihe ndị ọzọ anya. Ihe ọzọkwa bụ na i kwesịrị ịkwụsịlata ihe ndị na-adịchaghị mkpa ị na-eme n’agbanyeghị na o nwere ike isitụrụ gị ike ime otú ahụ. Nke a ga-eme ka i were ohere ahụ na-elebara onwe gị anya. Otu nwaanyị bi n’India aha ya bụ Mayuri sịrị: “Ọ ga-emecha mara gị ahụ́ ma ị malite ya.”

Kọsara ezigbo enyi gị ihe na-enye gị nsogbu n’obi. Ndị enyi gị ndị na-enweghị ụmụaka na-arịa ọrịa nwedịrị ike ịkasi gị obi. I nwekwara ike ịkọrọ Jehova Chineke nsogbu gị n’ekpere. Ekpere ọ̀ ga-enyere gị aka? Otu nwaanyị aha ya bụ Yazmin nwere ụmụ abụọ na-arịa ajọ ọrịa. O kwuru, sị: “O nweela mgbe ike ụwa gwụchara m nke  na ọ dị m ka m̀ na-anwụ anwụ. Ihe m mere n’oge ndị ahụ bụ na m rịọrọ Jehova n’ekpere ka ọ gbatara m ọsọ enyemaka. Ekpere ndị ahụ m kpere mere ka m nweta ume.”—Abụ Ọma 145:18.

MEGODỊ IHE A: Leba anya n’ụdị nri ị na-eri, oge i ji emega ahụ́, nakwa awa ole ị na-ehi ụra. Chọpụta ihe i nwere ike ime ka ị kwụsịlata ihe ndị na-adịghị mkpa ị na-eme ma jiri ohere ahụ mewe ihe ndị ga-eme ka ahụ́ gbasikwuo gị ike. Mgbe ọ bụla ị chọpụtara na i kwesịrị ịgbanwe ihe ndị ị na-eme ka ahụ́ dịkwuo gị mma, gbanwee ha.

NSOGBU NKE ATỌ: ỌRỊA NWA GỊ MERE KA Ị GHARA ỊNA-ELEBACHARA NDỊ EZINỤLỌ GỊ NDỊ ỌZỌ ANYA.

Ọrịa nwa gị nwere ike ime ka ndị ezinụlọ unu ghara iri nri ụfọdụ ma ọ bụ ka unu ghara ịga ebe ụfọdụ. O nwekwara ike ime ka nne na nna ghara ilebachara ụmụ ha niile anya. Nke a nwere ike ime ka ọ dị ụmụ gị ndị ọzọ ka ùnu leghaara ha anya. Ihe ọzọkwa bụ na ọ bụrụ na di na nwunye ejiri oge niile ha nwere na-elekọta nwa ha ahụ́ na-adịghị, ọ ga-eme ka ha ghara inwe ohere ha ga-eji na-anọrị. Otu nwoke Laịberịa aha ya bụ Lionel kwuru, sị: “Mgbe ụfọdụ, nwunye m na-ekwu na ọ bụ naanị ya na-elekọta nwa anyị ahụ́ na-adịghị, na mụ achọdịghị inyere ya aka. M na-ewere ihe ahụ ọ na-ekwu ka mkparị. Mgbe ụfọdụ, m na-agwakwa ya ihe ga-ewute ya.”

IHE I NWERE IKE IME: Ọ bụrụ na ị chọrọ ka ụmụ gị niile ghọta na ị hụrụ ha n’anya, gbalịa ka gị na ha na-eme ihe na-amasị ha. Jenney, bụ́ onye anyị kwuburu okwu ya, sịrị: “Mgbe ụfọdụ, anyị na-emere ọkpara anyị ihe gosiri na anyị ejighị ya egwuri egwu. O nwere mgbe anyị na-akpọrọ ya aga atụ ndụ mmanụ n’ebe ọ bụla ọ chọrọ.”

Mee ka ụmụ gị niile mara na ị hụrụ ha n’anya

Ọ bụrụ na ị chọrọ ka gị na nwunye gị ma ọ bụ di gị dịrị ná mma, wepụta oge ka unu na-ekwurịta okwu ma na-ekpekọ ekpere ọnụ. E nwere otu nwoke bi n’India aha ya bụ Aseem. Nwa ya nwoke bụ onye akwụkwụ. Aseem sịrị: “N’agbanyeghị na e nwere mgbe ike na-agwụcha mụ na nwunye m, anyị na-ewepụta oge anyị ji anọdụ ala kwurịta okwu ma kpekọọ ekpere ọnụ. N’ụtụtụ ọ bụla, mgbe ụmụ anyị ka na-ehi ụra, anyị na-ebili gụọ otu amaokwu Baịbụl ma kwurịta ihe anyị mụtara na ya.” Di na nwunye ndị ọzọ na-akparịta ụka tupu ha alakpuo n’abalị. Ọ bụrụ na gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị ana-akparịta ihe dị unu n’obi ma na-ekpekọ ekpere ọnụ, ọ ga-eme ka unu bụrụ nnu na mmanụ n’agbanyeghị nsogbu zuru unu ahụ́. (Ilu 15:22) Otu di na nwunye kwuru, sị: “Oge anyị kacha mekọọ ihe ọnụ bụ oge ihe kacha siere anyị ike. Anyị anaghị echefu oge ahụ echefu.”

MEGODỊ IHE A: Kelee ụmụ gị ndị nke ọzọ maka otú ha si enyere nwanne ha ahụ́ na-adịghị aka. Na-eme ka ndị ezinụlọ gị mara na ị hụrụ ha n’anya nakwa na obi dị gị ụtọ maka mbọ ha na-agba.

NWEE OLILEANYA NA IHE GA-ADỊ MMA

Baịbụl kwuru na Chineke kwere nkwa na n’oge na-adịghị anya, ọ ga-ewepụ ọrịa niile na nkwarụ niile na-emesi ma onye ukwu ma onye nta ike. (Mkpughe 21:3, 4) N’oge ahụ, ọ dịghị onye dị ndụ “nke ga-asị: ‘Ana m arịa ọrịa.’” *Aịzaya 33:24.

Ka ọ dị ugbu a, ị ga-azụli nwa gị na-arịa ọrịa ma ọ bụ nke nwere nkwarụ. Charles na Martha kwuru, sị: “Ọ bụrụgodị na i chee na mbọ niile ị na-agba enweghị isi, obi adala gị mba. Lekwasị anya n’ihe ụfọdụ nwa gị ahụ na-emete nke ọma n’ihi na ha juru eju.”

^ para. 3 Aha a kpọrọ ndị mmadụ n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.

^ para. 29 Ị chọọ ịmatakwu banyere nkwa Chineke kwere nke bụ́ na ọrịa agaghịzi adị, gụọ isi nke 3 nke akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya.

JỤỌ ONWE GỊ AJỤJỤ NDỊ A:

  • Olee ihe m na-eme ka ahụ́ na-agbasi m ike, ka m ghara ịna-echegbu onwe m, nakwa ka mụ na Chineke na-adị ná mma?

  • Olee mgbe ikpeazụ m kelere ụmụ m ndị nke ọzọ maka otú ha si enyere nwanne ha ahụ́ na-adịghị aka?