Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE JENỤWARỊ 2013

 ISIOKWU ỤLỌ NCHE A: Ì KWESỊRỊ ỊTỤ ỌGWỤGWỤ ỤWA EGWU?

Ì Kwesịrị Ịtụ Ọgwụgwụ Ụwa Egwu?

Ì Kwesịrị Ịtụ Ọgwụgwụ Ụwa Egwu?

Olee otú obi na-adị gị ma i cheta abalị iri abụọ na otu nke ọnwa Disemba afọ 2012? Ọ bụ n’ụbọchị ahụ ka ọtụtụ ndị na-ekwu na ụwa ga-emebi. Ọ bụrụ na ụwa emebighị otú ahụ ha kwuru, o nwere ike iwute ụfọdụ ndị ma ọ bụkwanụ mee ka obi ruo ndị ọzọ ala. O nwekwara ike ime ka ụfọdụ ndị gharazie inwe mmasị n’okwu gbasara ọgwụgwụ ụwa. Ihe a ọtụtụ mmadụ na-ekwu banyere ọgwụgwụ ụwa ọ̀ bụ akụkọ ifo, ka ọ̀ ga-eme eme?

Oleekwanụ maka “ọgwụgwụ ụwa” nke e kwuru okwu ya na Baịbụl? (Matiu 24:3, Baịbụlụ Nsọ nke International Bible Society) Ụfọdụ na-atụ egwu na Chineke ga-eji ọkụ bibie ụwa. Ndị ọzọ na-achọsi ike ịma ihe ga-eme ma e bibichaa ụwa. Ọtụtụ ndị enwekwaghị mmasị ịnụ na a ga-ebibi ụwa n’ihi na ọ dịla anya ha nụwara ya, ma o nwebeghị ihe merenụ. Ma otú a obi na-adị ndị mmadụ ma ha nụ okwu gbasara ọgwụgwụ ụwa ọ̀ bụ otú o kwesịrị ịdị ha?

Ihe Baịbụl kwuru banyere ọgwụgwụ ụwa nwere ike iju gị anya. Baịbụl gwara anyị ihe ndị anyị ga-eji amata na ọgwụgwụ ụwa dị nso. Ọ gwakwara anyị na ụfọdụ ndị nwere ike ịda mbà n’obi n’ihi na ha chere na ọgwụgwụ ụwa ekweghị abịa abịa. Anyị chọrọ ka i leba anya n’otú Baịbụl si zaa ajụjụ ụfọdụ ndị mmadụ na-ajụkarị banyere ọgwụgwụ ụwa.

 À ga-eji ọkụ bibie ụwa?

IHE BAỊBỤL ZARA: [Chineke] tọrọ ntọala ụwa mee ka o sie ike; ọ gaghị ama jijiji ruo mgbe ebighị ebi, ma ọ bụ ruo mgbe niile ebighị ebi.”ABỤ ỌMA 104:5.

Chineke agaghị eji ọkụ ma ọ bụ ihe ọ bụla ọzọ bibie ụwa. Kama nke ahụ, Baịbụl gwara anyị na ụmụ mmadụ ga-ebi n’ụwa a ruo mgbe ebighị ebi. Abụ Ọma 37:29 kwuru, sị: “Ndị ezi omume ga-enweta ụwa, ha ga-ebikwa n’elu ya ruo mgbe ebighị ebi.”—Abụ Ọma 115:16; Aịzaya 45:18.

Mgbe Chineke kechara ụwa, o kwuru na ụwa “dị nnọọ mma.” Otú ahụ ka ọ ka dị ya n’obi. (Jenesis 1:31) Ihe Chineke chọrọ ime abụghị ibibi ụwa, kama o kwere nkwa na ya ‘ga-ebibi ndị na-ebibi ụwa,’ ọ gaghịkwa ekwe ka ụmụ mmadụ mebie ụwa otú a na-agakwaghị edozili ya.—Mkpughe 11:18.

Ma, i nwere ike ịna-eche na 2 Pita 3:7 kwuru na a ga-eji ọkụ bibie ụwa. Amaokwu ahụ, sịrị: “Eluigwe na ụwa dị ugbu a ka e debeere ọkụ.” Ọ̀ bụ na amaokwu a anaghị egosi na a ga-eji ọkụ bibie ụwa? Nke bụ́ eziokwu bụ na n’ebe ụfọdụ na Baịbụl, e ji “eluigwe,” “ụwa,” na “ọkụ” mee ihe atụ. Dị ka ihe atụ, Jenesis 11:1 kwuru, sị: “Ụwa niile wee na-asụ otu asụsụ.” “Ụwa” e kwuru okwu ya n’ebe a abụghị ụwa nkịtị, kama ọ bụ ụmụ mmadụ.

Ihe e kwuru n’amaokwu ndị bu 2 Pita 3:7 ụzọ gosiri na eluigwe na ụwa na ọkụ ahụ a kpọrọ aha ebe a bụcha ihe atụ. Amaokwu nke 5 na nke 6 ji ihe mere n’Iju Mmiri nke oge Noa tụnyere mbibi nke ga-abịa n’oge anyị a. N’oge Noa, e bibiri ụwa ochie ahụ, ma e bibighị eluigwe na ụwa anyị na-ahụ anya. Kama nke ahụ, “ụwa” nke Iju Mmiri ahụ bibiri bụ ndị ajọ mmadụ bi n’ụwa. “Eluigwe” ahụ e bibiri abụrụ ụmụ mmadụ na-achị ụwa n’oge ahụ. (Jenesis 6:11) N’ihi ya, eluigwe na ụwa e kwuru na 2 Pita 3:7 na a ga-ebibi bụ ndị ajọ omume bi n’ụwa na ọchịchị ọjọọ na-achị ha. A ga-ebibi ha kpamkpam dị ka à ga-asị na e ji ọkụ bibie ha.

Gịnị ga-eme ma e bibichaa ụwa?

IHE BAỊBỤL ZARA: “Ụwa na-agabiga, ọchịchọ ya na-agabigakwa, ma onye na-eme uche Chineke ga-anọgide ruo mgbe ebighị ebi.”1 JỌN 2:17.

“Ụwa” amaokwu a kwuru na ọ ga-agabiga abụghị ụwa nkịtị anyị bi na ya, kama, ọ bụ ụmụ mmadụ na-anaghị erubere Chineke isi. Otú ahụ dọkịta nwere ike isi wapụ mmadụ akpụ toro ya n’ahụ́ ka onye ahụ ghara ịnwụ, ọ bụkwa otú ahụ ka Chineke ga-esi  ‘ebipụ’ ndị ajọ omume ka ndị ezi omume nwee ike ikuru ume ndụ. (Abụ Ọma 37:9) Ọ bụrụ na anyị e si otú ahụ lee ya anya, anyị ga-ahụ na “ọgwụgwụ ụwa” abụghị ihe ọjọọ.

Otú e si sụgharịa “ọgwụgwụ ụwa” na Baịbụl ụfọdụ gosiri na ọgwụgwụ ụwa abụghị ihe ọjọọ. Ụfọdụ Baịbụl sụgharịrị ya “ọgwụgwụ usoro ihe a” ma ọ bụ “ọgwụgwụ nke oge a.” (Matiu 24:3; Bible Nsọ Ọhụụ) Ebe ọ bụ na a gaghị ebibi ndị ezi omume nakwa ụwa anyị a, ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị ịtụ anya na ndị ezi omume ga-anọgide na-adị ndụ mgbe a ga-eme ka ihe niile dị ọhụrụ? Ihe Baịbụl kwuru gosiri na nke a bụ eziokwu n’ihi na o kwuru banyere “usoro ihe na-abịanụ.”—Luk 18:30.

Jizọs kpọrọ oge ahụ a ga-enwe n’ọdịnihu oge “a ga-eme ka ihe dị ọhụrụ.” N’oge ahụ, Jizọs ga-eme ka ihe dịrị ụmụ mmadụ ná mma otú Chineke bu n’obi kee ha. (Matiu 19:28) Mgbe ahụ

  • Anyị ga-ebi na paradaịs, obi eruo anyị niile ala, anyị enweekwa ihe ga-ezuru anyị.—Aịzaya 35:1; Maịka 4:4.

  • Anyị ga na-arụ ezigbo ọrụ nke ga-eme ka obi na-atọ anyị ụtọ.—Aịzaya 65:21-23.

  • Anyị agaghị arịa ọrịa ọ bụla.—Aịzaya 33:24.

  • Ndị agadi ga-aghọghachi ụmụ okorobịa na ụmụ agbọghọbịa.—Job 33:25.

  • A ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ.—Jọn 5:28, 29.

Ọ bụrụ na anyị ‘ana-eme uche Chineke,’ ya bụ, na-eme ihe ndị ọ chọrọ ka anyị na-eme, anyị ekwesịghị ịtụ ọgwụgwụ ụwa egwu. Kama, anyị ga na-atụsi anya ya ike.

Ọgwụgwụ ụwa ọ̀ dịla nso n’eziokwu?

IHE BAỊBỤL ZARA: “Mgbe unu hụrụ ka ihe ndị a na-eme, maranụ na alaeze Chineke dị nso.”LUK 21:31.

Otu ọkachamara aha ya bụ Richard Kyle dere n’akwụkwọ ya na “otú ihe si na-agbanwe na mberede nakwa ọgba aghara ndị a na-enwe n’ụwa na-eme ka ndị mmadụ na-ekwukarị mgbe ha chere ụwa ga-agwụ,” nke ka nke, ma ọ bụrụ na o yie ka ò siiri ndị mmadụ ike ịkọwa ihe kpatara mgbanwe na ọgba aghara ndị ahụ.

Ma, ihe mere ndị amụma a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl ji buo amụma banyere ọgwụgwụ ụwa abụghị ka ha kọwaara ndị mmadụ ihe ndị na-eme n’oge ha, bụ́ ndị na-agbagwoju ndị mmadụ anya. Kama, ọ bụ ike mmụọ nsọ Chineke mere ka ha nwee ike ịkọwa ihe anyị ga-eji amata na ọgwụgwụ ụwa dị nso. Lebagodị anya n’amụma ụfọdụ ha buru ma jiri aka gị kpebie ma hà na-emezu n’oge anyị a ma ọ bụ na ha anaghị emezu.

  •   A ga-enwe agha, ụkọ nri, ala ọma jijiji, na ajọ ọrịa na-efe efe.—Matiu 24:7; Luk 21:11.

  • Mmebi iwu ga-abụ ụba.—Matiu 24:12.

  • Ụmụ mmadụ ga na-ebibi ụwa.—Mkpughe 11:18.

  • Ndị mmadụ ga na-ahụ naanị onwe ha n’anya, na-ahụ ego n’anya, na-ahụkwa ihe ụtọ n’anya kama ịhụ Chineke n’anya.—2 Timoti 3:2, 4.

  • Ezinụlọ ga na-etisasị.—2 Timoti 3:2, 3.

  • Ndị mmadụ agaghị achọ ịma ihe ndị na-egosi na ọgwụgwụ ụwa dị nso.—Matiu 24:37-39.

  • A ga na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke n’ụwa niile.Matiu 24:14.

Jizọs kwuru na mgbe anyị na-ahụ “ihe ndị a niile” ka ha na-eme, ka anyị mara na ọgwụgwụ ụwa dị nso. (Matiu 24:33) Ndịàmà Jehova kweere na ihe ndị na-emenụ na-egosi na ọgwụgwụ ụwa dị nso, ha na-akọkwara ya ndị mmadụ na narị ala abụọ na iri atọ na isii.

Ebe ọ bụ na e nweela mgbe ndị mmadụ kwuru na ụwa ga-emebi ma o mebighị, ọ̀ pụtara na ụwa agaghịzi emebi?

IHE BAỊBỤL ZARA: “Mgbe ọ bụla ha na-asị: ‘Udo na obi iru ala!’ mgbe ahụ ka mbibi mberede ga-abịakwasị ha n’otu ntabi anya dị nnọọ ka ihe mgbu nke na-abịakwasị nwaanyị dị ime; ha agaghịkwa agbanahụ ya ma ọlị.”1 NDỊ TESALONAỊKA 5:3.

Baịbụl ji mbibi ụwa tụnyere ime na-eme nwaanyị dị ime. Nwaanyị ime na-eme ga-enwerịrị ihe mgbu, ihe mgbu ahụ na-abịakwa na mberede. E nwekwara ike iji ihe ndị ga na-eme tupu e bibie ụwa tụnyere otú ime si eme nwaanyị ma oge ọ ga-amụ nwa ruwe. Otú ime si emesi ya ike na-egosi ya na oge ọ ga-amụ nwa eruola nso. Dọkịta ya nwere ike ịgwa ya ụbọchị ọ ga-atụ anya ịmụ nwa. Ọ bụrụgodị na ụbọchị ahụ eruo, ya abụrụ na ọ mụghị nwa, ọ ma na ya ka ga-amụ nwa ahụ n’oge na-adịghị anya. Otú ahụ ka ọ dịkwa ọgwụgwụ ụwa. Ọ bụrụgodị na e nwee mgbe ndị mmadụ tụrụ anya na ọgwụgwụ ga-abịa, ma ya aghara ịbịa mgbe ahụ, nke ahụ apụtaghị na ihe ndị na-eme ugbu a anaghị egosi na anyị bi “n’oge ikpeazụ.”—2 Timoti 3:1.

Ebe ọ bụ na ihe ndị na-eme ugbu a na-egosi na anyị bi n’oge ikpeazụ, i nwere ike ịjụ sị, ‘gịnị mere ọtụtụ ndị amaghị na ihe ndị a na-egosi na anyị bi n’oge ikpeazụ?’ Baịbụl kwuru na ka ọgwụgwụ ụwa na-eru nso, ọtụtụ ndị agaghị ekweta na ihe ndị  na-eme ugbu a na-egosi na anyị bi na mgbe ọgwụgwụ. Ha agaghịkwa ekweta na ụwa jọrọ njọ ugbu a karịa otú ọ dị na mbụ. Ha ga na-achị ndị kwetara na anyị bi n’oge ikpeazụ ọchị ma na-ekwu, sị: “Site n’ụbọchị nna nna anyị hà dara n’ụra ọnwụ, ihe niile ka dị kpọmkwem otú ha dị site ná mmalite okike.” (2 Pita 3: 3, 4) N’ihi ya, o doro anya na ihe ndị na-eme ugbu a na-egosi na anyị bi n’oge ikpeazụ, ma ọtụtụ ndị agaghị ekweta.—Matiu 24:38, 39.

N’isiokwu a, anyị amụtala ihe ụfọdụ Baịbụl kwuru na-egosi na ọgwụgwụ ụwa dị nso. * Ị̀ ga-achọ ịmatakwu ihe ndị ọzọ Baịbụl kwuru a ga-eji amata na anyị bi n’oge ikpeazụ? Ọ bụrụ na ị chọrọ, gwa Ndịàmà Jehova ka ha bịa mụwara gị Baịbụl n’efu. Gị na ha nwere ike ịmụ Baịbụl n’ụlọ gị ma ọ bụ n’ebe ọ bụla ga-akara gị mma. Ha nwekwara ike iji ekwentị mụwara gị Baịbụl. Naanị ihe ọ ga-ewe gị bụ oge gị. Uru ị ga-erite na ya enweghịkwa atụ.

^ para. 39 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu banyere ihe ndị a kọrọ n’isiokwu a, gụọ isi nke 9, bụ́ “Ànyị Na-ebi ‘n’Ụbọchị Ikpeazụ’?” n’akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya.

GỤKWUO GBASARA YA

Olee Otú Anyị na Ndị Mmadụ Si Amụ Baịbụl?

A ma Ndịàmà Jehova ama n’ụwa niile na ha na-amụrụ ndị mmadụ Baịbụl n’anaghị ha ego. Lee otú ha si eme ya.