Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE FEBỤWARỊ 2011

 Ihe Ndị Na-eme Ka e Nwee Obi Ụtọ n’Ezinụlọ

Kụziere Ụmụ Gị Omume Ọma

Kụziere Ụmụ Gị Omume Ọma

Loida, * otu nne bi na Meksiko, kwuru, sị: “A na-enye ndị nọ n’afọ iri na ụma okpu nna bụ enyí n’ụlọ akwụkwọ, n’ihi ya, ha na-eche na inwe mmekọahụ adịghị njọ—ma ọ bụrụhaala na ha ejiri okpu nna bụ enyí nwee ya.”

Nobuko, otu nne bi na Japan, kwuru, sị: “M jụrụ nwa m nwoke ihe ọ ga-eme ma ya na enyi ya nwaanyị nọrọ naanị ha. Ihe ọ zara m bụ, ‘Amaghị m.’”

MGBE nwa gị nwoke ma ọ bụ nwa gị nwaanyị na-amụ ije, ị̀ gbalịrị iwepụsị ihe ndị nwere ike imerụ ya ahụ́ n’ụlọ? Ikekwe, i mechisịrị ebe e nwere waya eletrik, wepụ ihe ndị na-aghọ nkọ, ma jiri ihe dochie steepụ unu. I mere ihe niile a ka ihe ọ bụla ghara ime nwa gị.

A sị nnọọ na ọ dịịrị gị mfe otú ahụ ime ka ihe ọ bụla ghara ime nwa gị dị afọ iri na ụma, ị gaara eme ya! E nwekwuola ihe ndị na-echegbu gị ugbu a, dị ka: ‘Nwa m nwoke ọ̀ na-ekiri ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ?’ ‘Nwa m nwaanyị ọ̀ na-eji ekwe ntị ezigara mmadụ foto ndị ọ gba ọtọ see?’ Ajụjụ ọzọ a na-eji ụjọ ajụ bụ, ‘Nwa m dị afọ iri na ụma ọ̀ na-enwe mmekọahụ?’

Nchebe Na-enweghị Isi

Ụfọdụ ndị mụrụ ụmụ na-agbalị ịma ihe niile ụmụ ha dị afọ iri na ụma na-eme n’ụbọchị ma na-esogharị ha. Ọtụtụ n’ime ha na-emecha chọpụta na naanị ihe ha isogharị nwa ha dị afọ iri na ụma n’azụ otú ahụ rụpụtara bụ ime ka ọ mụta izoro ha ihe ọ na-eme. Nwa ha nwoke ma ọ bụ nwa ha nwaanyị na-aghọ aka ochie n’izochi omume ahụ ndị mụrụ ya na-agbalị igbochi ya ime.

O doro anya na isogharị ha agaghị enye aka. Jehova Chineke anaghị esi otú ahụ eme ka ndị o kere eke na-erubere ya isi, i kwesịghịkwa ime otú ahụ dị ka nne ma ọ bụ nna. (Diuterọnọmi 30:19) N’ihi ya, olee otú i nwere ike isi nyere nwa gị dị afọ iri na ụma aka ime ezi mkpebi banyere ụdị omume ọ ga na-eme?—Ilu 27:11.

Otu ihe dị mkpa bụ gị na ụmụ gị ịna-ekwurịta okwu, ị ga-amalitekwa ya mgbe ha ka dị obere. * (Ilu 22:6) Mgbe ha ruru afọ iri na ụma, gị na ha nọgide na-ekwurịta okwu. Ebe ọ bụ gị mụrụ ha, o kwesịrị ịbụ n’aka gị ka ha ga-akacha esi na-amata  ihe ndị bụ́ eziokwu. Alicia, bụ́ nwa agbọghọ si Briten, kwuru, sị: “Ọtụtụ ndị chere na ọ na-akara anyị mma ịgwa ndị enyi anyị banyere mmekọahụ, ma ọ bụghị eziokwu. Anyị na-achọ ka ọ bụrụ ndị mụrụ anyị ga-agwa anyị banyere ya. Anyị ma na ha ga-agwa anyị eziokwu.”

Uru Ezigbo Iwu Bara

Ka ụmụaka na-eto, e kwesịrị ịkụzikwuru ha ihe ndị ọzọ banyere mmekọahụ, ọ bụghị naanị otú e si atụrụ ime na otú e si amụ nwa. Ha kwesịkwara ịzụ “ikike nghọta ha azụ, site n’iji ya eme ihe, ịmata ihe dị iche n’ihe ziri ezi na ihe na-ezighị ezi.” (Ndị Hibru 5:14) N’ezie, ọ dị ha mkpa inwe iwu ndị na-achị ndụ ha, ya bụ, ihe ndị ha kwenyesiri ike na ha banyere mmekọahụ ma na-erube isi n’iwu ndị ahụ. Olee otú i nwere ike isi mee ka nwa gị dị afọ iri na ụma mee nke a?

Ebe ị ga-amalite bụ ịtụle iwu ndị na-achị ndụ nke gị. Dị ka ihe atụ, o nwere ike ịbụ na i kwenyesiri ike na ịkwa iko, ya bụ, ndị na-abụghị di na nwunye inwe mmekọahụ, dị njọ. (1 Ndị Tesalonaịka 4:3) O nwere ike ịbụ na ụmụ gị maara ebe ị kwụ n’okwu a; ha nwedịrị ike ikwu ihe amaokwu Baịbụl dị iche iche kwuru bụ́ ndị kwadoro ihe ndị i kweere. Mgbe a jụrụ ha ajụjụ, ha nwere ike ịza ngwa ngwa na onye na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye inwe mmekọahụ dị njọ.

Ma, ọ bụghị ebe ahụ ka o biri. Akwụkwọ bụ́ Sex Smart kwuru na ụfọdụ ndị na-eto eto nwere ike ikwu n’elu ọnụ na ha kweere ihe ndị mụrụ ha kweere banyere mmekọahụ. Akwụkwọ ahụ kwuru, sị: “Obi anatụghị aka ha ikpebiri onwe ha ihe ha chọrọ. Mgbe ọnwụnwa bịaara ha na mberede, ya adịkwa mkpa ka ha kpebiere onwe ha ozugbo ihe ha ga-eme banyere mmekọahụ na ihe ha na-agaghị eme, ha na-anọ ná mgbagwoju anya, nọrọkwa n’ezigbo nsogbu.” Ọ bụ ya mere ha inwe iwu ndị na-achị ha ji dị oké mkpa. Olee otú ị ga-esi nyere nwa gị dị afọ iri na ụma aka inwe ha?

Mee ka iwu ndị na-achị gị doo anya.

Ì kweere na ọ bụ naanị ndị lụrụ di na nwunye kwesịrị inwe mmekọahụ? Na-agwa ya nwa gị dị afọ iri na ụma hoo haa mgbe niile. Akwụkwọ bụ́ Beyond the Big Talk kwuru na nchọnchọ ndị e mere na-egosi na “n’ezinụlọ ebe ndị mụrụ ụmụ mere ka o doo ụmụ ha ndị dị afọ iri na ụma anya na ha achọghị ka ha nwee mmekọahụ, o yiri ka ụmụ ha ndị ahụ agaghị amalite inwe mmekọahụ ngwa ngwa.”

N’ezie, dị ka e kwurula, naanị ikwupụta iwu ndị na-achị ndụ gị agaghị eme ka nwa gị nwoke ma ọ bụ nwa gị nwaanyị gbasowekwa ha. Ma, ezinụlọ inwe iwu ndị doro anya na-achị ha nwere ike inyere ụmụaka aka inwe iwu ndị nke ha na-agbaso. Nchọpụta ndị e mere egosikwala na ọtụtụ ụmụ okoro na ụmụ agbọghọ na-emecha agbaso iwu ndị mụrụ ha ma a sịgodị na o yie ka ha ejighị ha kpọrọ ihe mgbe ha dị afọ iri na ụma.

MEGODỊ IHE A: Jiri ihe a kọrọ n’akụkọ gwa nwa gị okwu banyere iwu ndị ị na-agbaso. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na e kwuru banyere onye e dinara n’ike, i nwere ike ikwu, sị: “Otú ụfọdụ ụmụ nwoke na-esi achọ idina ụmụ nwaanyị n’ike na-awụ m akpata oyi n’ahụ́. Olee ebe i chere ha si amụta ihe ndị ahụ?”

Kụziere ụmụ gị eziokwu niile banyere mmekọahụ.

Ịdọ aka ná ntị dị mkpa. (1 Ndị Kọrịnt 6:18; Jems 1:14, 15) Ma, ihe ka ọtụtụ n’ihe ndị Baịbụl kwuru banyere mmekọahụ gosiri na ọ bụ onyinye si n’aka Chineke, ọ bụghị ọnyà Setan. (Ilu 5:18, 19; Abụ Sọlọmọn 1:2) Ịgwa ụmụ gị dị afọ iri na ụma naanị banyere ihe ọjọọ ndị na-esi ná mmekọahụ apụta nwere ike ime ka ha nwee echiche na-ezighị ezi, nke na-ekwekọghịkwa n’Akwụkwọ Nsọ, banyere mmekọahụ. Otu nwaanyị bi na Frans nke aha ya bụ Corrina kwuru, sị: “Ndị mụrụ m na-ekwukarị okwu banyere ịkwa iko, nke ahụ mekwara ka m lewe mmekọahụ anya ọjọọ.”

Hụ na ị gwara ụmụ gị eziokwu niile banyere mmekọahụ. Otu nne bi na Meksiko nke aha ya bụ Nadia kwuru, sị: “Ihe m na-agbalị ịkụziri ụmụ m mgbe niile bụ na mmekọahụ bụ ihe dị mma na ihe Jehova Chineke nyere ụmụ mmadụ iji mee onwe ha obi ụtọ. Ma, ọ bụ naanị maka di na nwunye. O nwere ike ime anyị obi ụtọ ma ọ bụ kpatara anyị ahụhụ, dabere n’otú anyị si mee ya.”

 MEGODỊ IHE A: Mgbe ọzọ gị na nwa gị dị afọ iri na ụma na-ekwurịta banyere mmekọahụ, kwuo okwu ọma banyere mmekọahụ mgbe ị na-apịachi okwu gị. Ụjọ atụla gị ịkọwa mmekọahụ dị ka onyinye magburu onwe ya Chineke nyere ya nke ga-eme ya obi ụtọ n’ọdịnihu mgbe ọ lụrụ di ma ọ bụ nwunye. Mee ka nwa gị dị afọ iri na ụma mara na obi siri gị ike na ọ ga-erubere Chineke isi ruo mgbe ahụ.

Nyere nwa gị dị afọ iri na ụma aka ịtụle ihe ndị ga-esi n’omume ya pụta.

Ka ndị dị afọ iri na ụma nwee ike ime ezi mkpebi n’ihe ọ bụla ha na-eme ná ndụ, ọ dị mkpa ka ha mata ihe ndị ha nwere ike ime na uru na ọghọm dị na nke ọ bụla ha họọrọ. Echela na naanị ha ịma ihe dị mma na ihe dị njọ ezuola. Otu nwaanyị bụ́ Onye Kraịst bi n’Ọstrelia nke aha ya bụ Emma kwuru, sị: “Mgbe m chere echiche banyere ihe ndị m mejọrọ mgbe m ka na-eto eto, enwere m ike ikwu na naanị mmadụ ịmara iwu Chineke apụtaghị na o kweere na ha. Ọ dị gị ezigbo mkpa ịmata uru iwu ndị ahụ bara na ọghọm ga-esi n’ịghara ịgbaso ha pụta.”

Baịbụl nwere ike inye aka, n’ihi na, n’ọtụtụ ebe, o kwuru ihe ga-eme mmadụ ma ọ bụrụ na onye ahụ erubereghị iwu ya isi. Dị ka ihe atụ, Ilu 5:8, 9 gbara ụmụ okorobịa ume ka ha jụ ịkwa iko ‘ka ha wee ghara inye ndị ọzọ ùgwù ha.’ Amaokwu ndị ahụ gosiri na ndị nwere mmekọahụ tupu ha alụọ di ma ọ bụ nwunye na-emebi aha ọma ha, mmekọrịta ha na Chineke, na ùgwù ha. Nke ahụ ga-emekwa nnọọ ka ndị nwere àgwà ọma ndị ahụ ga-achọ ịlụ ha gbaara ha ọsọ. Nwa gị dị afọ iri na ụma iche echiche banyere otú inupụrụ iwu Chineke isi nwere ike isi kpatara ya nsogbu, nchekasị, ma mebie mmekọrịta ya na Chineke nwere ike ime ka o kpebisikwuo ike irubere ha isi. *

MEGODỊ IHE A: Jiri ihe atụ mee ka nwa gị dị afọ iri na ụma ghọta na amamihe dị n’iso iwu Chineke. Dị ka ihe atụ, i nwere ike ikwu, sị: “Ọkụ ekwú dị mma; ọkụ e tinyere n’oké ọhịa adịghị mma. Olee ihe dị iche na ha abụọ, oleekwa otú ihe ị zara si metụta iwu Chineke nyere banyere mmekọahụ?” Jiri ihe a kọrọ n’Ilu 5:3-14 nyere nwa gị dị afọ iri na ụma aka ịghọta nsogbu ịkwa iko na-akpata.

Takao, bụ́ onye dị afọ iri na asatọ bi na Japan, kwuru, sị, “Ama m na m kwesịrị ime ihe dị mma, ma, mụ na agụụ anụ ahụ́ na-alụ ọgụ mgbe niile.” Obi nwere ike iru ndị na-eto eto ọ dị otú ahụ ala ma ọ bụrụ na ha amata na ọ bụghị naanị ha ka ọ na-adị otú ahụ. Ọbụna Pọl onyeozi, bụ́ Onye Kraịst nwere okwukwe siri ike, kwetara, sị: “Mgbe m chọrọ ime ihe ziri ezi, ọ bụ ihe ọjọọ na-adị n’ebe m nọ.”—Ndị Rom 7:21.

Ndị dị afọ iri na ụma kwesịrị ịghọta na ọgụ dị otú ahụ adịghị njọ. O nwere ike ịkpali ha iche echiche banyere ụdị mmadụ ha chọrọ ịbụ. O nwere ike inyere ha aka ịjụ onwe ha ajụjụ bụ́, ‘Àchọrọ m iji aka m na-eduzi ndụ m, a matakwa m dị ka onye ihe ọ na-eme doro anya, ka ihe m chọrọ ọ̀ bụ ka a mara m ka onye ahụ́ ya na-atụrụ ụka?’ Nwa gị dị afọ iri na ụma inwe iwu ndị ọ na-agbaso ga-enyere ya aka iji amamihe zaa ajụjụ ahụ.

^ para. 3 Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.

^ para. 10 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịhụ ebe a tụrụ aro otú ị ga-esi malite ịgwa ụmụ gị okwu banyere mmekọahụ na otú ị ga-esi gwa ha ihe ndị nọ n’afọ ndụ ha kwesịrị ịma, gụọ Ụlọ Nche, Nọvemba 1, 2010, peeji nke 12-14.

^ para. 22 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu banyere ya, gụọ isiokwu bụ́ “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị . . . Inwe Mmekọahụ Ọ̀ Ga-eme Ka Anyị Dịkwuo ná Mma?” nke dị na Teta! Julaị–Septemba 2010 nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

JỤỌ ONWE GỊ, SỊ . . .

  • Olee ihe ndị na-egosi m na nwa m dị afọ iri na ụma nwere iwu ndị na-achị omume ya?

  • Mgbe m na-agwa nwa m dị afọ iri na ụma okwu banyere mmekọahụ, m̀ na-eme ka o lee ya anya karịsịa dị ka onyinye si n’aka Chineke ka ọ̀ bụ dị ka ọnyà Setan?