Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE 2010-05-01

 Ihe Ndị Na-eme Ka E Nwee Obi Ụtọ n’Ezinụlọ

Ịzụlite Ụmụaka Ịrụ Ọrụ Dịịrị Ha

Ịzụlite Ụmụaka Ịrụ Ọrụ Dịịrị Ha

Jọọjị: * “Kwa mgbede otu ihe a na-eme. Nwa m nwoke dị afọ anọ bụ́ Maịkel na-aghasasị ihe o ji egwuri egwu n’ebe niile n’ụlọ. M na-agbalị ka ọ kpakọọ ha ọnụ tupu ya alakpuo ụra. Ma, iwe na-eju Maịkel obi, ya ana-ebe ákwá ma na-enye nsogbu. Mgbe ụfọdụ, ike ya na-agwụ m nke na m na-abara ya mba, ma, naanị ihe nke ahụ na-eme bụ ime ka obi jọọ anyị abụọ njọ. Achọrọ m ka anyị na-eji obi ụtọ alakpu ụra. N’ihi ya, m kwụsịrị ịmanye ya ịkpakọ ihe ọnụ ma na-eji nnọọ aka m eme ya.”

mili: “Nsogbu malitere mgbe o siiri Jeni, nwa m nwaanyị dị afọ iri na atọ, ike ịghọta ihe onye nkụzi ya chọrọ ka o mee n’ihe omume o nyere ya ka o mee n’ụlọ. Jeni bere ákwá otu awa mgbe ọ lọtara akwụkwọ. M gbara ya ume ka ọ rịọ onye nkụzi ya ka o nyere ya aka, ma Jeni nọgidere na-agwa m na obi fere onye nkụzi ya azụ, n’ihi ya, ọ gwalighị ya okwu. Ọ dị m nnọọ ka ọ̀ bụ m jiri ụkwụ m gaa n’ụlọ akwụkwọ ha ma gwa onye nkụzi ahụ otú ọ dị m n’obi. M chere na o nweghị onye kwesịrị ịkpasu nwa m iwe otú ahụ.”

ỤDỊ ihe ahụ mere Jọọjị na Emili ò metụla gị? Dị ka nne na nna ahụ, ọ na-esiri ọtụtụ ndị ike ịnọ na-ele nwa ha n’anya n’anya ka ya na nsogbu na-alụ ma ọ bụ ka obi na-ajọ ya njọ. O nweghị ihe ọjọọ dị ná nne na nna ịchọ ichebe ụmụ ha. Ma, ọnọdụ abụọ ahụ e kwuru banyere ha n’elu nyere nne na nna ahụ ohere ịkụziri nwa ha ihe dị mkpa banyere mmadụ ịrụ ọrụ dịịrị ya. N’ezie, ihe nwata dị afọ iri na atọ ga-amụtali dị iche n’ihe nwata dị afọ anọ ga-amụta.

Ma, nke bụ́ eziokwu bụ na ọ bụghị mgbe niile ka ị ga-anọ ya igbochiri nwa gị nsogbu ọ ga-enweta ná ndụ. E mechaa, nwatakịrị ga-ahapụ nne ya na nna ya ma ‘buru ibu ọrụ nke ya.’ (Ndị Galeshia 6:5; Jenesis 2:24) Iji nyere ụmụaka aka inwe ike ilekọta onwe ha, ndị mụrụ ụmụ kwesịrị ilekwasị anya n’ịkụziri  ụmụ ha otú ha ga-esi ghọọ ndị na-anaghị achọ ọdịmma onwe ha, ndị na-ahụ ndị ọzọ n’anya, na ndị na-arụ ọrụ dịịrị ha mgbe ha toro. Nke ahụ abụghị obere ọrụ!

Ọ dị mma ịmara na Jizọs setịpụụrụ ndị nne na nna ihe nlereanya magburu onwe ya n’otú o si mesoo ndị na-eso ụzọ ya ihe. Jizọs amụtaghị nwa. Ma ihe o bu n’obi họrọ ndị na-eso ụzọ ya ma zụọ ha bụ inyere ha aka inwe ike ịrụrụ ọrụ ahụ gawa n’ihu, ọbụna mgbe ọ nwụchara. (Matiu 28:19, 20) Ihe Jizọs rụzuru yiri ihe nne ma ọ bụ nna ọ bụla na-atụ anya ịrụzu n’ịzụ ụmụ ya ịrụ ọrụ dịịrị ha. Ka anyị tụlee naanị ụzọ ebe atọ Jizọs bụụrụ ndị nne na nna ihe nlereanya.

‘Na-enye Nwa Gị Ihe Nlereanya’

Mgbe ọ fọrọ obere ka Jizọs nwụọ, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “M na-enye unu ihe nlereanya, ka unu meekwa otú ahụ, dị nnọọ ka m meere unu.” (Jọn 13:15) N’otu aka ahụ, ọ dị mkpa ka ndị mụrụ ụmụ kọwaara ụmụ ha ihe mmadụ ịrụ ọrụ dịịrị ya pụtara ma gosikwa ha ya n’omume.

Jụọ onwe gị, sị: ‘M̀ na-ekwu okwu ọma mgbe niile banyere ịrụ ọrụ dịịrị m? M̀ na-ekwu okwu banyere obi ụtọ m na-enweta n’ịrụsi ọrụ ike maka ndị ọzọ? Ka m̀ na-emekarị mkpesa ma na-eji onwe m atụnyere ndị o yiri ka ụwa ọ̀ kaara mfe?’

N’eziokwu, o nweghị onye zuru okè. Ọ na-adị anyị niile mgbe ụfọdụ ka ibu anyị bu ọ̀ karịrị anyị akarị. Ma, ihe nlereanya gị nwere ike ịbụ ihe ga-akacha enyere nwa gị aka ịhụ na ịrụ ọrụ dịịrị ya dị mkpa ma baa uru.

MEGODỊ IHE A: Ọ bụrụ na ọ ga-ekwe omume, na-akpọ nwa gị aga ọrụ mgbe ụfọdụ ma na-egosi ya ihe ị na-arụ iji kpaa afọ ezinụlọ unu. Na-akpọ nwa gị mgbe ị na-aga inyere mmadụ aka. E mechaa, kọọrọ ya obi ụtọ i nwetara n’ịrụ ọrụ ahụ.—Ọrụ 20:35.

Atụla Anya Ka Nwa Gị Mee Ihe Ọ Na-agaghị Emeli

Jizọs matara na ọ ga-ewe oge tupu ndị na-eso ụzọ ya adị njikere ịrụ ọrụ ọ tụrụ anya ka ha rụọ. Ọ dị mgbe ọ gwara ha, sị: “M ka nwere ọtụtụ ihe m ga-agwa unu, ma unu apụghị ịghọta ha ugbu a.” (Jọn 16:12) Jizọs agwaghị ndị na-eso ụzọ ya ozugbo ka ha rụọ ọrụ n’onwe ha. Kama nke ahụ, o wepụtara oge dị ukwuu kụziere ha ọtụtụ ihe. Ọ bụ naanị mgbe Jizọs chere na ndị na-eso ụzọ ya adịla njikere ka o zipụrụ naanị ha.

N’otu aka ahụ, ọ dịghị mma ka ndị nne na nna gwa ụmụ ha ka ha rụwa ọrụ ndị toro eto mgbe ha na-erubeghị ịrụ ya. N’agbanyeghị nke ahụ, ka ụmụaka na-etolite, nne na nna kwesịrị ikpebi ụdị ọrụ kwesịịrị ha. Dị ka ihe atụ, nne na nna kwesịrị ịkụziri ụmụaka idebe onwe ha ọcha, idebe ọnụ ụlọ ha ọcha, ime ihe n’oge, na ijizi ego ejizi. Mgbe nwatakịrị malitere ịga akwụkwọ, nne ya na nna ya kwesịrị ịtụ anya ka nwatakịrị ahụ lee ihe omume ndị a na-enye n’ụlọ akwụkwọ anya dị ka ọrụ dị mkpa ọ ga-arụrịrị.

Ihe ndị nne na nna kwesịrị ime abụghị naanị inye nwa ha ọrụ ọ ga-arụ. Ha aghaghịkwa ịkwado mgbalị ndị nwa ahụ na-eme ịrụta ya. Jọọjị, bụ́ nna ahụ e kwuru okwu ya mbụ, ghọtara na ihe so na-eme ka Maịkel na-ewe iwe mgbe a sịrị ya kpakọọ ihe ndị o ji egwuri egwu ọnụ bụ na ọrụ ahụ na-eyi ya ihe karịrị ya akarị. Jọọjị kwuru, sị: “Kama ịbara Maịkel mba ka ọ kpakọọ ihe ndị o ji egwuri egwu ọnụ, amalitere m ịkụziri ya otú ọ ga-esi na-eme ya.”

Olee kpọmkwem ihe o mere? Jọọjị kwuru, sị: “Nke mbụ, m nyere ya oge ọ ga-eji na-akpakọ ihe ndị ahụ ọnụ kwa abalị. M na-esozi Maịkel arụ ọrụ ahụ, anyị mechaa otu akụkụ ọnụ ụlọ ya, anyị agafee n’ọzọ. Emere m ka ọrụ ahụ ghọọ egwuregwu, ọbụna gwa ya na anyị ga-ama onye ga-ebu ụzọ arụcha. N’oge na-adịghị anya, ọrụ ahụ ghọrọ ihe anyị na-arụ tupu anyị alaba ụra. Ekwere m Maịkel nkwa na ọ bụrụ na ọ rụọ ọrụ ahụ ngwa ngwa, m ga-agụkwuru ya akụkọ o ji alaba ụra. Ma, ọ bụrụ na o gbuo oge na ya, m ga-egbubilata akụkọ m na-agụrụ ya.”

 MEGODỊ IHE A: Chọpụta ihe nwa gị nke ọ bụla ga-emeli iji mee ka ihe na-aga nke ọma n’ezinụlọ unu. Jụọ onwe gị, sị, ‘Ọ̀ dị ihe ndị m ka na-emere ụmụ m bụ́ ndị ha ga-emeliri onwe ha?’ Ya bụrụ otú ahụ, gị na ụmụ gị rụwa ọrụ ahụ ruo mgbe i ji n’aka na ha ga-arụli ya naanị ha. Mee ka o doo ha anya na otú ha si rụọ ọrụ e nyere ha ga-ekpebi ma ị̀ ga-emere ha ihe ọma ka ị̀ ga-ata ha ahụhụ. Hụzie na i meere ha ihe ọma ma ọ bụrụ na ha rụtara ọrụ ahụ, hụkwa na ị tara ha ahụhụ ma ọ bụrụ na ha arụtaghị ya.

Nye Ya Ntụziaka Doro Anya

Dị ka ezi onye nkụzi ọ bụla, Jizọs maara na ụzọ kacha mma isi mụta ihe bụ ime ya eme. Dị ka ihe atụ, mgbe Jizọs chere na ndị na-eso ụzọ ya adịla njikere, o zipụrụ ha “abụọ abụọ ka ha buru ya ụzọ gaa n’obodo nakwa n’ebe ọ bụla ya onwe ya ga-abịa.” (Luk 10:1) Ma, ọ hapụghị ha ka ha rụọ ya otú masịrị ha. Tupu ya ezipụ ha, ọ gwara ha kpọmkwem ihe ha ga-eme. (Luk 10:2-12) Mgbe ndị na-eso ụzọ Jizọs lọtara ma kọọ otú ihe si gaziere ha, ọ jara ha mma ma gbaa ha ume. (Luk 10:17-24) O kwuru ihe gosiri na ọ tụkwasịrị ha obi ịrụta ọrụ ahụ nakwa na ihe ha rụrụ masịrị ya.

Mgbe ụmụ gị nwere ọrụ ndị tara akpụ ịrụ, olee ihe ị na-eme? Ị̀ na-agbalị ikpuchi ụmụ gị ka ihe ha na-atụ ụjọ ha ghara ime ha, igbochi ha ka ihe ga-ewute ha ghara ime ha ma ọ bụ ka ha ghara imejọ ihe? Ihe mbụ nwere ike ịgbata gị n’obi bụ “ịzọ” nwa gị ma ọ bụ ibunara ya ibu ahụ.

Ma, tụlee nke a: Mgbe ọ bụla ị gbatara ma “zọọ” ụmụ gị, olee ihe ị na-akụziri ha? Ị̀ na-egosi na ị tụkwasịrị ha obi nakwa na ị maara ihe ha ga-emeli? Ka ị̀ na-agwa ha na i chere na ha ka bụ obere ụmụaka na-agaghị emeliri onwe ha ihe ọ bụla, bụ́ ndị ị na-aghaghị imere ihe niile?

Dị ka ihe atụ, olee otú Emili, bụ́ onye e kwuru banyere ya na mbụ, si merie nsogbu ahụ nwa ya nwaanyị na-enwe? Kama ịgakwuru onye nkụzi ahụ, o kpebiri ịhapụ Jeni ka ọ gakwuru onye nkụzi ya n’onwe ya. Emili na Jeni depụtasịrị ajụjụ ndị Jeni ga-eji gaa ụlọ akwụkwọ. Ha kwurịtaziri mgbe ọ ga-agakwuru onye nkụzi ya. Ha mụgharịdịrị otú mkparịta ụka ahụ nwere ike isi gaa. Emili kwuru, sị: “Jeni katara obi gakwuru onye nkụzi ya, onye nkụzi ya ajaakwa ya mma maka ịbịakwute ya. Obi tọrọ nnọọ Jeni ụtọ maka ihe ahụ o mere, obi tọkwara m ụtọ.”

MEGODỊ IHE A: Detuo otu nsogbu nwa gị na-enwe ugbu a. N’akụkụ nsogbu ahụ, dee ihe i nwere ike ime iji nyere nwa gị aka imeri nsogbu ahụ ‘n’azọghị’ ya. Gị na nwa gị mụgharịa ihe ndị o kwesịrị ime iji merie nsogbu ahụ. Gwa nwa gị na obi siri gị ike na ọ ga-emeli ya.

Ọ bụrụ na ị nọgide na-ekpuchi ụmụ gị mgbe ihe isi ike bịaara ha, i nwere nnọọ ike ime ka ha ghara ịmụta imeri nsogbu ndị na-adị ná ndụ. Kama nke ahụ, gbaa ụmụ gị ume site n’ịzụ ha ịrụ ọrụ dịịrị ha. Ime otú ahụ ga-abụ onyinye kacha oké ọnụ ahịa ị ga-enye ha.

^ para. 3 Aha a kpọrọ ndị mmadụ n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.

JỤỌ ONWE GỊ, SỊ . . .

  • Ihe m na-atụ anya ka ụmụ m mee ọ̀ bụ ihe ha ga-emeli?

  • Àna m agwa ha ma na-egosi ha otú ha ga-esi merie nsogbu?

  • Olee mgbe ikpeazụ m gbara nwa m ume ma ọ bụ jaa ya mma?