Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE 2009-12-01

 Kụziere Ụmụ Gị Ihe

Jeremaya Akwụsịghị Ife Jehova

Jeremaya Akwụsịghị Ife Jehova

Ò NWERE mgbe obi na-ada gị mbà, ya adị gị ka ọ̀ bụ gị kwụsị ife Jehova? — * Ọ na-adị ọtụtụ ndị otú ahụ. Ọ dị Jeremaya otú ahụ mgbe ọ ka na-eto eto. Ma, o kweghị ka ihe ndị ọzọ kwuru ma ọ bụ ihe ha mere mee ka ọ kwụsị. Ka anyị tụlee otú Jeremaya si bụrụ onye pụrụ iche n’anya Chineke, ma n’agbanyeghị nke ahụ, ya enwee mgbe ọ dị ya ka ọ̀ bụ ya kwụsị ife Jehova.

Tupu a mụọ Jeremaya, ezi Chineke, bụ́ Jehova, họọrọ ya ka ọ bụrụ onye amụma nke ga-agwa ndị obodo ya na ihe ha na-eme adịghị Chineke mma. Ị̀ maara ihe Jeremaya gwara Jehova mgbe ọtụtụ afọ gachara?— “Amaghị m okwu ekwu, n’ihi na abụ m nwata.”

Olee ihe i chere Jehova zara Jeremaya?— O ji nwayọọ gwa ya hoo haa, sị: “Asịla, ‘Abụ m nwata.’ Kama, gakwuru ndị niile m ga-eziga gị ka ị gakwuru; kwuokwa ihe niile m ga-enye gị iwu ka i kwuo. Atụla ihu ha ụjọ.” N’ihi gịnị? Jehova gwara ya, sị: “Anọnyeere m gị ịnapụta gị.”—Jeremaya 1:4-8.

N’agbanyeghị nke ahụ, dị ka anyị kwurula, obi mechara daa Jeremaya mbà. Ọ bụ n’ihi na e ji ya na-eme ihe ọchị maka ijere Chineke ozi. O kwuru, sị: ‘Mmadụ niile na-achị m ọchị ma na-akwa m emo ogologo ụbọchị dum.’ N’ihi ya, o kpebiri ịkwụsị. “Agaghị m ekwu okwu banyere [Jehova], agakwaghị m ekwu okwu n’aha ya.” Ma, ọ̀ kwụsịrị?

Jeremaya kwuru, sị, ‘N’ime obi m, okwu Jehova dị ka ọkụ na-ere ere nke e mechibidoro ụzọ n’ime ọkpụkpụ m, ike wee gwụ m ịgbachi nkịtị.’ (Jeremaya 20:7-9) Ọ bụ ezie na ụjọ tụrụ Jeremaya mgbe ụfọdụ, ịhụnanya o nwere n’ebe Jehova nọ ekweghị ya kwụsị. Ka anyị hụ otú e si chebe Jeremaya n’ihi na ọ kwụsịghị.

Jehova gwara Jeremaya ka ọ dọọ ndị obodo ya aka ná ntị na a ga-ebibi Jeruselem ma ọ bụrụ na ha akwụsịghị ihe ọjọọ ha na-eme. Mgbe Jeremaya gwara ha ihe ahụ Jehova kwuru, iwe were ndị obodo ya, ha asịkwa: “E kwesịrị ịma  nwoke a ikpe ọnwụ.” Ma, Jeremaya rịọrọ ha ka ha ‘rube isi n’ihe Jehova kwuru.’ O kwuziri, sị: ‘Ya doo unu anya na ọ bụrụ na unu egbuo m, ọ bụ ọbara na-emeghị ihe ọjọọ ka unu na-eme ka ọ dịrị n’isi unu, n’ihi na n’eziokwu, ọ bụ Chineke ziri m ka m bịakwute unu.’ Ị̀ maara ihe mezirinụ?—

Baịbụl kwuru, sị: “Ndị isi na mmadụ niile wee gwa ndị nchụàjà na ndị amụma, sị: ‘E kwesịghị ịma nwoke a ikpe ọnwụ, n’ihi na ọ bụ n’aha Jehova bụ́ Chineke anyị ka ọ gwara anyị okwu.’” Ya mere, mgbe Jeremaya na-ekweghị ka ụjọ mee ka ọ kwụsị ife Jehova, Jehova chebere ya. Ka anyị hụ ihe mere Yuraịja, bụ́ onye amụma ọzọ nke Jehova nke na-emeghị nnọọ ka Jeremaya.

Baịbụl kwuru, sị: ‘Yuraịja nọ na-ebu amụma megide Jeruselem dị ka ihe niile Jeremaya kwuru si dị.’ Ma, mgbe Eze Jehoyakim wesara Yuraịja iwe, ị̀ maara ihe Yuraịja mere?— Ụjọ tụrụ ya, ya akwụsị ime uche Chineke ma gbaga Ijipt. N’ihi ya, eze ahụ zigara ndị mmadụ ka ha gaa chọta ya ma kpụta ya. Mgbe ha kpụtara ya, ị̀ maara ihe eze ọjọọ ahụ mere?— O ji mma agha gbuo Yuraịja!—Jeremaya 26:8-24.

Olee ihe ị ga-asị mere Jehova ji chebe Jeremaya ma ghara ichebe Yuraịja?— O nwere nnọọ ike ịbụ na ụjọ tụrụ Jeremaya otú ahụ ọ tụrụ Yuraịja, ma Jeremaya akwụsịghị ife Jehova ma gbaa ọsọ. Ọ kwụsịghị. Olee ihe ị ga-asị anyị mụtara n’ihe nlereanya Jeremaya?— Ihe anyị mụtara bụ na mgbe ụfọdụ o nwere ike isiri anyị ike ime ihe Chineke kwuru, ma anyị kwesịrị ịtụkwasị ya obi mgbe niile ma na-erubere ya isi.

^ para. 3 Ọ bụrụ nwatakịrị ka ị na-agụrụ akụkọ a, akara ùhiè ndị dị n’isiokwu a na-echetara gị ka ị kwụsịtụ gbaa ya ume ka ọ zaa ajụjụ ndị ahụ.