Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE 2009-11-01

Baịbụl—Akụkọ Dị Ịtụnanya nke Otú O Si Dịruo n’Oge Anyị

Baịbụl—Akụkọ Dị Ịtụnanya nke Otú O Si Dịruo n’Oge Anyị

BAỊBỤL bụ akwụkwọ a kacha kesaa n’ụwa, e kesaalarị ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ijeri ise n’ime ya. N’afọ 2007 naanị, e biri ya ihe karịrị nde iri isii na anọ na narị puku isii. Iji ghọta ihe nke ahụ pụtara, buru n’uche na mbipụta mbụ nke akwụkwọ akụkọ ifo kacha gaa ahịa n’afọ ahụ na United States dị nde iri na abụọ.

Tupu Baịbụl aghọọ akwụkwọ a kacha ebipụta n’ụwa, ọ lanahụrụ ọtụtụ mbọ ndị mmadụ gbara ibibi ya. Kemgbe ụwa, a machibidola ya iwu ma kpọọ ya ọkụ, a kpagbuokwala ma gbuo ndị sụgharịrị ya. Ma, otu n’ime nsogbu ndị kacha njọ gaara eme ka Baịbụl ghara ịdịkwa abụghị mkpagbu mberede kpụ ọkụ n’ọnụ, kama ọ bụ iji nwayọọ nwayọọ rekasịa. Olee ihe mere o ji dị otú ahụ?

E nwere obere akwụkwọ iri isii na isii dị n’ime Baịbụl, ọ bụkwa ndị Izrel dere ma ọ bụ chịkọta ndị kacha ochie n’ime ha ihe karịrị puku afọ atọ gara aga. Ndị dere ha na mbụ na ndị depụtaghachiri ha dere ozi ndị ahụ sitere n’ike mmụọ nsọ n’ihe ndị na-emebi emebi, dị ka papaịrọs na akpụkpọ anụ. A chọtabeghị nke ọ bụla n’ime ndị mbụ ahụ e dere. Ma e gwupụtala ọtụtụ puku mpaghara nke akwụkwọ ndị dị na Baịbụl bụ́ ndị e depụtaghachiri n’oge ochie, ma ndị buru ibu ma ndị dị obere. E depụtaghachiri iberibe otu n’ime akwụkwọ ndị ahụ, bụ́ Oziọma Jọn, n’ime iri afọ ole na ole Jọn onyeozi dechara nke mbụ ahụ o ji aka ya dee.

“E depụtaghachiri ihe odide Baịbụl Hibru [Agba Ochie] kpọmkwem otú ha dị na mbụ, o nweghịkwa ihe odide Grik na Latịn bịara ya nso.”—Prọfesọ Julio Trebolle Barrera

Olee ihe mere o ji bụrụ ihe ịtụnanya na e nwere Baịbụl ndị ochie ahụ ka fọrọnụ? Ihe ndị e dere na Baịbụl ndị nke oge a hà kwekọrọ nnọọ n’ihe ndị mbụ dere ya dere?

Olee Ihe Mere Ihe Odide Oge Ochie Ndị Ọzọ?

Ọ bụ ihe ịtụnanya na Baịbụl ka dị n’ihi ihe mere ihe odide nke mba ndị ha na Izrel biri n’otu oge. Dị ka ihe atụ, ndị Finishia na ndị Izrel gbara agbata obi na puku afọ nke mbụ Tupu Oge Anyị. Ndị a na-agba ahịa n’oké osimiri mere ka ihe odide ndị e ji aka akwụkwọ obodo ha dee gbasaa ná mba niile dị gburugburu Mediterenian. Ha ritekwara uru ná nnukwu ahịa papaịrọs ha na ndị Ijipt na ndị Gris zụrụ. N’agbanyeghị nke ahụ, magazin bụ́ National Geographic kwuru banyere ndị Finishia, sị: “Ihe odide ha, bụ́ ndị e dere ihe ka ọtụtụ n’ime ha na papaịrọs na-emebi emebi, rekasịrị—nke mere na ihe ka ukwuu n’ihe anyị maara banyere ndị Finishia sitere n’akụkọ na-abụchaghị eziokwu ndị iro ha kọrọ banyere ha. Ọ bụ ezie na e kwuru na ndị Finishia nwere ọtụtụ ihe odide ndị bụ́ ịgba, ha niile erekasịala kemgbe ọtụtụ afọ.”

Olee maka ihe odide ndị Ijipt oge ochie? A ma ụdị ihe odide ha na-adị ka ihe e sere ese bụ́ ndị ha tụrụ ma ọ bụ see n’ahụ́ ụlọ arụsị nakwa n’ebe ndị ọzọ nke ọma. A makwa ndị Ijipt ama dị ka ndị malitere iji papaịrọs ede ihe. N’agbanyeghị nke ahụ, ọkà n’ihe ọmụmụ banyere Ijipt oge ochie, bụ́ K. A. Kitchen, kwuru banyere ihe ndị Ijipt dere na papaịrọs, sị: “E kwuola na ihe fọrọ nnọọ nke nta ka ọ bụrụ ihe odide papaịrọs niile ha dere malite n’ihe dị ka afọ 3000 ruo n’oge ndị Gris na Rom chịrị ụwa mebichara kpamkpam.”

Olee maka ihe ndị Rom dere na papaịrọs?  Tụlee ihe atụ a. Akwụkwọ bụ́ Roman Military Records on Papyrus kwuru na ọ ga-abụ na a na-akwụ ndị agha Rom ụgwọ ugboro atọ n’afọ, deekwa ego a kwụrụ ha na papaịrọs. E kwuru na n’ime narị afọ atọ dị n’agbata oge Ọgọstọs (27 Tupu Oge Anyị–14 Oge Anyị) na oge Diocletian (284-305 Oge Anyị), e nwere ihe ndekọ dị narị nde abụọ na nde iri abụọ na ise e dere ụgwọ ndị ahụ a kwụrụ. Ole n’ime ha ka dị? Ọ bụ naanị abụọ ka a ka nwere ike ịgụta ihe e dere na ha n’ime ndị a chọtarala.

Olee ihe mere o ji bụrụ naanị ihe ole na ole e dere na papaịrọs n’oge ochie ka dị? Ihe ndị na-emebi emebi e ji ede ihe, dị ka papaịrọs na ihe ọzọ a na-ejikarị ede ihe n’oge ochie, bụ́ akpụkpọ anụ, na-emebi ngwa ngwa ma ha dịrị n’ebe e nwere udè. Akwụkwọ ọkọwa okwu Baịbụl bụ́ The Anchor Bible Dictionary kwuru, sị: “N’ihi otú ihu igwe na-adị n’ebe e dere ihe odide papaịrọs ndị e dere n’oge a [puku afọ mbụ Tupu Oge Anyị], o yiri ka naanị ebe a ga-edebeli ihe odide ndị ahụ ha aghara irekasị bụ n’ọzara kpọrọ nkụ nakwa n’ọgba ma ọ bụ n’ime ụlọ.”

Olee Maka Ihe Odide Baịbụl?

O doro anya na e dere akwụkwọ Baịbụl ndị mbụ n’ihe ndị na-emebi emebi ka ihe ndị ahụ ndị Finishia, ndị Ijipt, na ndị Rom ji dee ihe. Oleezi ihe mere ihe ndị e dere na Baịbụl ji ka dịrị ma ghọọ akwụkwọ a kacha ebipụta n’ụwa? Prọfesọ James L. Kugel kwuru otu ihe kpatara ya. O kwuru na e depụtaghachiri ihe odide ndị mbụ nke Baịbụl “ọtụtụ ugboro, ọbụna n’oge ahụ a ka na-ede Baịbụl ede.”

Ihe dị ná nsụgharị Baịbụl ndị e nwere n’oge a hà kwekọrọ n’ihe dị n’ihe odide Baịbụl oge ochie? Prọfesọ Julio Trebolle Barrera, bụ́ onye so n’òtù ndị ọkà mmụta e nyere ọrụ ịmụ na ibipụta ihe odide oge ochie a na-akpọ Akwụkwọ Mpịakọta Osimiri Nwụrụ Anwụ, kwuru, sị: “E depụtaghachiri ihe odide Baịbụl Hibru kpọmkwem otú ha dị na mbụ, o nweghịkwa ihe odide Grik na Latịn bịara ya nso.” Ọkà mmụta Baịbụl a na-akwanyere ùgwù bụ́ F. F. Bruce kwuru, sị: “Ihe akaebe ndị e nwere na-akwado ihe odide Agba Ọhụrụ anyị karịrị nnọọ ndị e nwere na-akwado ọtụtụ ihe odide oge ochie, bụ́ ndị ọ na-adịtụghị onye na-agbagha ihe e dere na ha.” O kwukwara, sị: “A sị na Agba Ọhụrụ abụghị akwụkwọ okpukpe, o nwetụdịghị onye gaara enwewe obi abụọ ma ihe e dere na ya ò ziri ezi.” N’ezie, Baịbụl bụ akwụkwọ pụrụ iche. Ị̀ na-ewepụta oge kwa ụbọchị iji gụọ ya?—1 Pita 1:24, 25.

A ka nwere ihe dị ka puku ihe odide isii nke Akwụkwọ Nsọ Hibru, ma ọ bụ Agba Ochie, e ji aka dee na ihe dị ka puku ise nke Akwụkwọ Nsọ Grik, ma ọ bụ Agba Ọhụrụ