Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE 2009-08-01

Okpukpe Niile Hà Dị Mma?

Okpukpe Niile Hà Dị Mma?

ANYỊ bi n’ụwa okpukpe dị iche iche juru. Otu nchọpụta e mere n’ụwa niile na nso nso a gosiri na e nwere okpukpe iri na itoolu a ma ama, nweekwa ihe dị ka iri puku ụmụ obere okpukpe ndị ọzọ. Nke a emeela ka ndị mmadụ nwee ọtụtụ okpukpe ha nwere ike isi na ha họrọ nke ha ga-ekpe karịa mgbe ọ bụla ọzọ. N’ihi ya, ò nwere nke ị họọrọ na-adịghị mma?

Ụfọdụ ndị na-ekwu na okpukpe dị iche iche dị ka ọtụtụ ụzọ e si arị otu ugwu. Obi ha bụ na ebe ọ bụ na ụzọ niile ahụ na-eduga n’otu ebe, ọ dịghị nke mmadụ si dị njọ. Ha na-eche na ebe ọ bụ na e nwere naanị otu Chineke Pụrụ Ime Ihe Niile, ọ pụtara na okpukpe niile ga na-amasị ya.

Ụzọ Niile Hà Na-eduga n’Ebe Chineke Nọ?

Olee ihe Jizọs Kraịst, bụ́ otu n’ime ndị nkụzi okpukpe a kacha akwanyere ùgwù n’ụwa, kwuru n’okwu a? Ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Sinụ n’ọnụ ụzọ dị warara baa.” N’ihi gịnị? “N’ihi na obosara ka ọnụ ụzọ ahụ dị, mbara ka ụzọ ahụ dịkwa, nke na-eduba n’ịla n’iyi, ọtụtụ ka ha dịkwa, bụ́ ndị na-esi na ya na-aba. N’ihi na warara ka ọnụ ụzọ ahụ dị, mkpagide ka ụzọ ahụ dịkwa, nke na-eduba ná ndụ, ole na ole ka ha dịkwa, bụ́ ndị na-achọta ya.”—Matiu 7:13, 14, Bible Nsọ nke Union Version. *

Ihe Jizọs na-ekwu ọ̀ bụ n’ezie na e nwere okpukpe ndị na-eduba “n’ịla n’iyi”? Ka ihe ọ na-ekwu ọ̀ bụ na ọ bụ naanị ndị na-ekweghị ekwe nọ n’ụzọ ahụ dị obosara, ndị kweere na Chineke anọrọ n’ụzọ ahụ na-eduba ná ndụ, n’agbanyeghị okpukpe ha na-ekpe?

Ozugbo Jizọs kwuchara na e nwere ụzọ abụọ, o kwuru, sị: “Kpachapụnụ anya! N’ihi na ndị amụma ụgha dị. Ha na-abịakwute unu n’ụdị atụrụ, ma ha bụ agụ.” (Matiu 7:15, Baịbụlụ Nsọ nke International Bible Society) O mechara kwuo, sị: “Ọ bụghị onye ọ bụla nke na-akpọ m ‘Dinwenụ, Dinwenụ ga-aba n’alaeze  eluigwe, kama ọ bụ onye na-eme uche nke Nna m bi n’igwe.” (Matiu 7:21, Baịbụl Nsọ Nhazi Katọlik) Ọ bụrụ na a kpọrọ mmadụ onye amụma ma ọ bụ na onye ahụ na-akpọ Jizọs “Dinwenụ,” ọ pụtara na ọ bụ onye ji okpukpe kpọrọ ihe, ọ bụghị onye na-ekweghị ekwe. N’ihi ya, o doro anya na ihe Jizọs na-ekwu bụ na ọ bụghị okpukpe niile dị mma nakwa na ọ bụghị onye ọ bụla na-akụzi banyere Chineke ka e kwesịrị ikwere ihe ọ na-akụzi.

Mmadụ Ò Nwere Ike Ịmata Ụzọ ahụ Dị Warara?

Baịbụl dị ka ezi map nwere ike inyere mmadụ aka ịchọta ezi okpukpe

Ebe ọ bụ na ọ bụghị ụzọ niile na-eduga n’ebe Chineke nọ, olee otú ị ga-esi amata nke bụ́ ụzọ ahụ dị warara na-eduba ná ndụ n’ime ọtụtụ puku ụzọ e nwere taa? Chebagodịrị ihe atụ a echiche: Ka e were ya na ị gara otu nnukwu obodo, fuo ụzọ. Gị achọọ ịjụta ụzọ. Onye mbụ ị jụrụ nke chere na ya maara ụzọ gwara gị si aka nri. Onye nke abụọ agwa gị si aka ekpe. Onye nke atọ agwa gị si ụzọ ọ bụla masịrị gị. N’ikpeazụ, onye bịara abịa otú ị bịara ewepụta otu ezigbo map, gosi gị ụzọ i kwesịrị isi. Ya enyezie gị map ahụ ka i nwee ike na-elere anya na-aga. Obi ọ́ gaghị esi gị ike na ị ga-eru ebe ị na-aga?

Ọ bụkwa otú ahụ ka ọ dị ma a bịa n’ịhọrọ ezi okpukpe. Anyị kwesịrị iji ezigbo map ihe atụ. È nwere ụdị map ahụ? Ee, e nwere. Map ahụ bụ Baịbụl, bụ́ akwụkwọ kwuru, sị: “Ihe nile ọ bụla e dere n’akwụkwọ nsọ bụ ihe si n’uche Chineke pụta. Ọ bakwara uru izi anyị ihe bụ eziokwu, na ime ka anyị mata ihe dị njọ na ndụ anyị. Ọ na-enyere anyị aka iguzozi nke ọma, na ime ihe dị mma.”—2 Timoti 3:16, Baịbụlụ Nsọ nke International Bible Society.

N’asụsụ Igbo, e nwere nsụgharị Baịbụl dị iche iche i nwere ike iji mere map ihe atụ. Ndị bipụtara magazin a, bụ́ Ndịàmà Jehova, na-ebipụta ezigbo nsụgharị Baịbụl a na-akpọ Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ. Ma, ọ bụrụ na ị bụghị Onyeàmà Jehova, i nwere ike iji nsụgharị Baịbụl ndị ọzọ mgbe ị na-achọ ịmata ezi okpukpe na okpukpe na-adịghị mma. N’ihi ya, e si ná nsụgharị Baịbụl dị iche iche okpukpe ndị ọzọ na-akwanyere ùgwù depụta amaokwu Baịbụl ndị dị n’isiokwu ndị a.

Ka ị na-agụ isiokwu ndị na-eso nke a, jiri ihe ndị ị mabụ tụnyere ihe Baịbụl kwuru. Buru n’obi ihe Jizọs kwuru banyere otú anyị ga-esi amata ezi okpukpe na okpukpe na-adịghị mma. O kwuru, sị: “Otú a ezi osisi ọ bụla na-amị mkpụrụ ọma; ma osisi na-abaghị n’ihe na-amị ajọ mkpụrụ. Ezi osisi apụghị ịmị ajọ mkpụrụ, osisi na-abaghị n’ihe apụghịkwa ịmị mkpụrụ ọma.” (Matiu 7:17, 18, Bible Nsọ nke Union Version) Ka anyị tụlee naanị ụzọ mkpụrụ ọma atọ n’ime mkpụrụ ọma ndị Baịbụl kwuru a ga-eji amata “ezi osisi.”