Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE 2009-08-01

 Ihe Ndị Na-eme Ka E Nwee Obi Ụtọ n’Ezinụlọ

Ijizi Ego Ejizi

Ijizi Ego Ejizi

Nke nwoke kwuru, sị: “M chere na nwunye m, Laura, * na-azụfusị ego anyị, ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, ọ na-eji ya azụ ihe ndị m chere na-adịghị anyị mkpa. O yiri ka ego anaghị anọta ya n’aka! Nke a na-akpatara anyị ezigbo nsogbu mgbe mkpa ego dapụtaara anyị na mberede. Ekwuola m ya ọtụtụ ugboro na ego bahaala nwunye m aka, ya azụfuo ya.”

Nwunye ya kwuru, sị: “O nwere ike ịbụ na amachaghị m otú e si edebe ego, ma di m amatụghị ihe ihe na-ada n’ahịa, ma ihe oriri, ihe ndị e ji achọ ụlọ mma, ma ụmụ irighiri ihe ndị dị anyị mkpa n’ụlọ, ọ bụkwanụ mụnwa na-aka anọ n’ụlọ. M maara ihe ndị dị anyị mkpa, m na-azụkwa ha, ọ bụrụgodị na ọ ga-akpatara anyị esemokwu.”

OKWU ego nwere ike iso n’ihe ndị kasị esiri di na nwunye ike iji olu ọma ekwurịta. Ka a sịkwa ihe mere o ji abụkarị ya kasị akpatara di na nwunye esemokwu.

Di na nwunye ndị na-adịghị ele ego anya otú kwesịrị ekwesị nwere ike inwe ahụ́ mgbakasị, esemokwu, na nchekasị, o nwedịrị ike imebi mmekọrịta ha na Chineke. (1 Timoti 6:9, 10) Ndị nne na nna na-edozilighị nsogbu ego ha nwere ike ịna-etinyekwu oge ha n’ọrụ, bụ́ nke ga-eme ka ha ghara inwe oge ha ga-eji na-anọnyere ibe ha na ụmụ ha ma na-enyere ibe ha aka ife Chineke. Ha na-akụzikwara ụmụ ha ile ego anya n’ụzọ na-ezighị ezi.

Baịbụl kwuru hoo haa, sị: “Ego bụ ihe nchebe.” (Ekliziastis 7:12) Ma, ego ga-echebe alụmdi na nwunye gị na ezinụlọ gị naanị ma ọ bụrụ na ị mụta ịchịkwa ya, mụtakwa otú ị ga-esi na-agwa di gị ma ọ bụ nwunye gị okwu banyere ya. * N’ezie, nkwurịta okwu banyere ego nwere nnọọ ike ime ka di na nwunye dịkwuo ná mma kama ịkpatara ha esemokwu.

Ma, olee ihe mere ego ji akpata ọtụtụ nsogbu n’alụmdi na nwunye? Oleekwa ihe ndị i nwere ike ime iji hụ na okwu ego na-abara ezinụlọ unu uru kama ịkpata esemokwu?

Olee Ihe Ndị Na-eme Ka O Sie Ike?

Mgbe mgbe, ihe na-akpatara di na nwunye esemokwu ego abụghị ego n’onwe ya, kama ọ bụ ụjọ na atụkwasịghị ibe ha obi. Dị ka ihe atụ, o nwere ike ịbụ na ihe di nke na-achọ ka nwunye ya gwa ya ihe o ji kobo ha nke ọ bụla mee na-ekwu bụ na ọ tụkwasịchaghị nwunye ya obi na ọ ga-ejizi ego ezinụlọ ha ejizi. O nwekwara ike ịbụ na ihe nwunye nke na-eme mkpesa na o nweghị ezigbo ego di ya na-edowe na-ekwu bụ na ụjọ na-atụ ya na ezinụlọ ha ga-adaba ná nsogbu ego n’ọdịnihu.

Ihe ọzọkwa na-eme ka o siere di na nwunye ike bụ otú e si zụlite ha. Matthew, bụ́ onye lụrụla nwaanyị afọ asatọ, kwuru, sị: “Nwunye m si n’ezinụlọ na-ejizi ego ejizi. Ihe metụtara ego anaghị atụ ya ụjọ otú o si atụ m. Nna m bụ onye aṅụrụma, ise sịga rikwara ya ahụ́, e nwekwara ọtụtụ oge ọ na-enweghị ihe ọ na-arụ. Anyị anaghị enwetakarị ihe ndị dị anyị mkpa, o mekwara ka m na-atụ nnọọ ụjọ ịba n’ụgwọ. Mgbe ụfọdụ, ụjọ a na-eme ka m na-enye nwunye m nsogbu  na-enweghị isi banyere ego.” N’agbanyeghị ihe na-akpatara unu nsogbu, olee ihe unu nwere ike ime iji hụ na ego unu na-enyere alụmdi na nwunye unu aka, ọ bụghị imebi ya?

Olee ihe ka gị mkpa—ọ̀ bụ ego ka ọ̀ bụ alụmdi na nwunye gị?

Ihe Anọ Ga-eme Ka Unu Nwee Ihe Ịga nke Ọma

Baịbụl abụghị akwụkwọ na-azi banyere ego. Ma, o nwere ezigbo ndụmọdụ ndị nwere ike inyere di na nwunye aka izere nsogbu ego. Ọ́ gaghị adị mma ka unu tụlee ndụmọdụ ndị dị na ya ma nwalee aro ndị na-esonụ a tụrụ?

1. Mụtanụ iji olu ọma ekwurịta banyere ego.

“Ndị na-agba izu na-enwe amamihe.” (Ilu 13:10) Otú e si zụlite gị nwere ike ime ka ọ na-esiri gị ike ịgwa ndị ọzọ okwu ego, karịsịa di gị ma ọ bụ nwunye gị. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ bụ ihe amamihe dị na ya unu ịmụta ikwurịta okwu a dị mkpa. Dị ka ihe atụ, ọ́ gaghị adị mma ka ị kọwaara di gị ma ọ bụ nwunye gị otú i chere otú nne na nna gị si ele ego anya si metụta gị? Gbalịakwa ka ị ghọta otú otú e si zụlite di gị ma ọ bụ nwunye gị sirila metụta otú o si ele ego anya.

Unu ekwesịghị ichere ruo mgbe nsogbu dapụtara tupu unu ekwurịta banyere ego. Otu onye so dee Baịbụl kwuru, sị: “Mmadụ abụọ hà ga-agakọ ije ma ọ bụrụ na ha eyighị agba wee zukọta?” (Emọs 3:3) Olee otú ụkpụrụ a si gbasa okwu ego? Ọ bụrụ na unu enwee oge unu ji ekwurịta banyere ego, ọ ga-eme ka nghọtahie unu gaara na-enwe banyere ego belata.

LEENỤ MA ÙNU GA-EME IHE A: Wepụtanụ otu oge unu ga-eji na-ekwurịta banyere ego ezinụlọ unu. Unu nwere ike ịna-ekwurịta ya n’ụbọchị mbụ n’ọnwa ma ọ bụ unu enwee otu ụbọchị unu ga na-ekwurịta ya n’izu. Gbuonụ ya nkenke, ikekwe naanị ihe dị ka nkeji iri na ise ma ọ bụ ihe na-erughị ya. Ka oge unu ga-ewepụta maka ya bụrụ mgbe ahụ́ ruru onye nke ọ bụla n’ime unu ala. Kwekọrịtanụ oge unu na-agaghị ekwu banyere ego, dị ka mgbe unu na-eri nri ma ọ bụ mgbe unu na ụmụ unu na-anọrị.

2. Kwekọrịtanụ otú unu ga-esi na-ele ego unu na-akpata anya.

“N’inye ibe unu nsọpụrụ, na-ebutenụ ụzọ.” (Ndị Rom 12:10) Ọ bụrụ naanị gị na-akpata ego, i nwere ike ịsọpụrụ di gị ma ọ bụ nwunye gị ma ọ bụrụ na i lee ego ị na-akpata anya dị ka ego ezinụlọ unu, ọ bụghị ego gị.—1 Timoti 5:8.

Ọ bụrụ na gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị na-akpatacha ego, unu nwere ike ịsọpụrụ ibe unu ma ọ bụrụ na unu ana-agwa ibe unu ego ole unu na-akpata na ego gbara ọkpụrụkpụ unu na-emefu. Ọ bụrụ na ị na-ezoro ya di gị ma ọ bụ nwunye gị, o nwere nnọọ ike ime ka ọ gharazie ịtụkwasị gị obi ma mebie mmekọrịta unu. Ọ pụtaghị na ị ga na-agwa di gị ma ọ bụ nwunye gị tupu gị emefuo kobo ọ bụla. Ma, ọ bụrụ na ị na-agwa ya ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ ị chọrọ ịzụ, ọ ga-egosi na i ji echiche ya kpọrọ ihe.

LEENỤ MA ÙNU GA-EME IHE A: Kpebienụ ego ole onye nke ọ bụla n’ime unu nwere ike imefu n’ebughị ụzọ gwa ibe ya, ma ọ̀ bụ naịra iri ise, puku naịra ise, ma ọ bụ ọnụ ego ọzọ. Hụ na ị na-agwa di gị ma ọ bụ nwunye gị mgbe ọ bụla ị chọrọ imefu ego karịrị nke ahụ.

3. Deenụ atụmatụ unu edee.

“Atụmatụ onye dị uchu aghaghị iweta uru.” (Ilu 21:5) Otu ụzọ unu ga-esi mee atụmatụ maka ọdịnihu ma zere imefusị ego unu tara ahụhụ kpata bụ ịhazi otú unu ga-esi na-emefu ego. Nina, bụ́ onye lụrụla di afọ ise, kwuru, sị: “Ide ego ole unu na-akpata na ego ole unu na-emefu n’akwụkwọ ga-emepe unu anya. O siri ike ịgbagha ihe e dere ede.”

Otú unu si hazie mmefu ego unu ekwesịghị ịdị mgbagwoju anya. Darren, bụ́ onye lụrụla nwaanyị afọ iri abụọ na isii ma mụta ụmụ nwoke abụọ, kwuru, sị: “Na mbụ, anyị na-eji envelopu ahazi otú anyị si emefu ego. Anyị na-etinye ego anyị ga-emefu n’izu n’envelopu dị iche iche. Dị ka ihe atụ, anyị nwere envelopu maka nri, ntụrụndụ, nakwa nke ịkpụ isi. Ọ bụrụ na ego anyị tinyere n’otu envelopu ezughị ihe anyị chọrọ iji ya eme, anyị na-agbazite ego n’envelopu ọzọ ma hụ na anyị tinyeghachiri ego ahụ n’envelopu anyị si weta ya ozugbo anyị nwetara ya.” Ọ bụrụ na unu anaghị ejikarị ego nkịtị akwụ ụgwọ mmefu unu na-eme, ya abụrụ kaadị  ndị ụlọ akụ̀ ka unu na-eji, ọ dị ezigbo mkpa ka unu hazie otú unu si emefu ego ahazie ma na-ede ya ede.

LEENỤ MA ÙNU GA-EME IHE A: Deenụ ego niile a kapịrị ọnụ unu na-emefu site n’oge ruo n’oge edee. Kwekọrịtanụ ego ole unu ga na-edebe n’ime ego unu na-akpata. Dezienụ mmefu ndị a na-akapịghị ọnụ unu na-eme, dị ka ego nri, ụgwọ ọkụ, na ụgwọ fon. Ihe ọzọ unu ga-eme bụ ide ego ole unu mefuru n’ime ọnwa ole na ole. Ọ bụrụ na ọ dị mkpa, belatanụ ego ole unu na-emefu iji ghara ịbanye n’ụgwọ.

4. Kwekọrịtanụ onye ga-eme nke ọ ga-eme.

“Mmadụ abụọ ka otu onye mma, n’ihina ha na-enweta ezigbo ụgwọọrụ maka ndọlị ha.” (Ekliziastis 4:9, 10, Baịbụl Nsọ Nhazi Katọlik) N’ezinụlọ ụfọdụ, ọ bụ di na-ahụ maka ego. Ná ndị ọzọ, ọ bụ nwunye na-arụ ọrụ a, rụzie ya arụzie. (Ilu 31:10-28) Ma, ọtụtụ di na nwunye na-ahọrọ ike ọrụ a eke. Mario, bụ́ onye lụrụla nwaanyị afọ iri abụọ na otu, kwuru, sị: “Nwunye m na-ahụ maka ịkwụ ụgwọ ndị dị ka ụgwọ ọkụ na obere ụgwọ ndị anyị na-akwụ. M na-ahụ maka ịkwụ ụtụ isi, ịkwụ ụgwọ ihe ndị anyị zụrụ, na ịkwụ ụgwọ ụlọ. Anyị na-agwa ibe anyị otú ihe si na-aga ma na-arụkọ ọrụ ọnụ.” N’agbanyeghị otú unu kpebiri isi na-eme ya, ihe dị mkpa bụ ka unu na-emekọ ihe ọnụ.

LEENỤ MA ÙNU GA-EME IHE A: Ebe unu maara ebe onye nke ọ bụla n’ime unu na-emeta nke ọma na ebe ọ na-anaghị emeta, kwurịtanụ onye ga-arụ nke ọ ga-arụ. Tụleghachinụ ya mgbe ọnwa ole na ole gasịrị. Dịnụ njikere ịgbanwe ihe ụfọdụ. Iji nyere gị aka ịghọta ọrụ di gị ma ọ bụ nwunye gị na-arụ, dị ka ịkwụ ụgwọ dị iche iche ma ọ bụ ịga ahịa, unu nwere ike ịgbanwerịta ọrụ unu mgbe ụfọdụ.

Uru Unu Kwesịrị Irite n’Ikwurịta Banyere Ego

Unu nwere ike ikwurịta banyere ego n’emebighị ịhụnanya unu. Leah, bụ́ onye lụrụla di afọ ise, chọpụtara na nke a bụ eziokwu. O kwuru, sị: “Mụ na di m amụtala ịgwa ibe anyị eziokwu banyere ego. N’ihi ya, anyị na-arụkọzi ọrụ ọnụ, anyị ahụkwuokwala onwe anyị n’anya.”

Mgbe di na nwunye na-ekwurịta ihe ha chọrọ iji ego ha eme, ha na-eme ka ibe ha mara ihe ha chọrọ maka ezinụlọ ha ma na-egosi na obi ha dị n’alụmdi na nwunye ha. Ọ bụrụ na ha ana-agwa ibe ha tupu ha azụọ ihe ọ bụla gbara ọkpụrụkpụ, ọ na-egosi na ha ji echiche ibe ha kpọrọ ihe. Ọ bụrụ na ha ekwe ka onye nke ọ bụla n’ime ha nwee ike imefu ego ụfọdụ n’ebughị ụzọ gwa onye nke ọzọ, ha na-egosi na ha tụkwasịrị ibe ha obi. Ihe ndị a na-eme ka di na nwunye na-ahụ onwe ha n’anya n’ezie. Ụdị mmekọrịta a dị nnọọ mkpa karịa ego, n’ihi ya, olee ihe mere unu ga-eji kwe ka ego sewere unu okwu?

^ para. 3 Aha a a kpọrọ ha abụghị ezigbo aha ha.

^ para. 7 Baịbụl kwuru na “di bụ isi nke nwunye ya.” N’ihi ya, ọ bụ ọrụ ya ikpebi ihe a ga-eji ego ezinụlọ ha eme na ịhụ na o ji ịhụnanya na-emeso nwunye ya ihe n’achọghị ọdịmma onwe ya naanị.—Ndị Efesọs 5:23, 25.

JỤỌ ONWE GỊ, SỊ . . .

  • Olee mgbe ikpeazụ mụ na di m ma ọ bụ nwunye m ji olu ọma kwurịta banyere ego?

  • Olee ihe m nwere ike ikwu ma ọ bụ mee iji gosi di m ma ọ bụ nwunye m na obi dị m ụtọ n’ihi otú o si na-enye aka n’ihe metụtara ego n’ezinụlọ anyị?

GỤKWUO GBASARA YA

Gịnị Ga-eme Ka Obi Na-adị Ezinụlọ Ụtọ?

Jehova bụ onye obi ụtọ. Ọ chọrọ ka ezinụlọ na-enwe obi ụtọ. Gụọ ihe Baịbụl gwara ndị bụ́ di, ndị bụ́ nwunye, ndị nne na nna na ụmụaka.