Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE 2009-06-01

 Kụziere Ụmụ Gị Ihe

Nwa Nwanne Nwaanyị Pọl Zọrọ Pọl Ndụ

Nwa Nwanne Nwaanyị Pọl Zọrọ Pọl Ndụ

Ị̀ MAARA na Pọl onyeozi nwere ndị ikwu bụ́ ndị na-eso ụzọ Jizọs? *— Akwụkwọ Nsọ gosiri na nwanne ya nwaanyị na nwa nwanne ya nwaanyị bụ ndị na-eso ụzọ Jizọs. Nwa nwanne nwaanyị Pọl ahụ zọrọ Pọl ndụ! Anyị amaghị aha ya ma ọ bụkwanụ aha mama ya, ma, anyị maara ihe o mere. Ị̀ ga-achọ ịnụ akụkọ ihe ahụ o mere?—

Pọl ka si njem nke atọ ọ gara ná mba ọzọ ikwusa ozi ọma lọta ma nọrọ na Jeruselem. Ọ ga-abụ n’afọ 56 Oge Anyị. E ji Pọl eji, na-achọ ikpe ya ikpe. Ma, ndị iro Pọl achọghị ka e kpee ya ikpe. Ha chọrọ igbu ya! N’ihi ya, ha kpara nkata ka ihe dị ka ụmụ nwoke iri anọ chechie Pọl n’ụzọ gbuo ya.

Ma, e nwere otú nwa nwanne nwaanyị Pọl si nụ banyere nkata ahụ ha kpara. Ị̀ ma ihe o mere?— Ọ gakwuuru Pọl kọọrọ ya ihe ọ nụrụ. Ozugbo ahụ, Pọl gwara otu onye agha, sị: “Duru nwa okorobịa a gakwuru ọchịagha, n’ihi na o nwere ihe ọ ga-akọrọ ya.” Onye agha ahụ kpọọrọ ya gakwuru ọchịagha bụ́ Klọdiọs Laịsias ma gwa ya na nwa okorobịa a nwere ihe dị mkpa ọ chọrọ ịgwa ya. Klọdiọs kpọpụrụ nwa nwanne nwaanyị Pọl iche, nwa okorobịa ahụ akọọrọ ya ihe niile ahụ ọ nụrụ.

Klọdiọs dọrọ nwa nwanne nwaanyị Pọl aka ná ntị, sị: “Akọrọla onye ọ bụla na i mere ka m mata ihe ndị a.” Klọdiọs kpọziri ndị isi ndị agha abụọ ma gwa ha ka ha kwadebe narị ndị agha abụọ, iri mmadụ asaa ndị na-agba ịnyịnya, na narị ndị agha abụọ ji ube ka ha zọrọ ije gaa Sesaria. Mgbe ọ kụrụ elekere itoolu n’abalị ahụ, narị ndị ikom anọ na iri asaa ahụ zọọrọ ije gawa ma duga Pọl na nke onye Rom bụ́ Gọvanọ Filiks na Sesaria n’enweghị ihe mere ya. Klọdiọs dere akwụkwọ ozi wee kọwaara Filiks nkata a kpara igbu Pọl.

N’ihi ya, o nweghịzi ihe ọzọ ndị Juu ga-eme ma ọ́ bụghị ịga hụ Pọl n’ụlọikpe dị na Sesaria, nọrọ ebe ahụ kwuo ihe ha sịrị na o mere ha. Ma, o nweghịkwanụ ihe akaebe ọ bụla ha nwere na Pọl mere ihe ọjọọ ọ bụla. N’agbanyeghị nke ahụ, a kpọchiri Pọl n’ụlọ mkpọrọ ruo afọ abụọ, ọ bụ ezie na aka ya dị ọcha. N’ihi ya,  o kwuru na ya chọrọ ka e buga ikpe ya Rom, e zigazie ya Rom.—Ọrụ 23:16–24:27; 25:8-12.

Olee ihe anyị nwere ike ịmụta n’akụkọ a banyere nwa nwanne nwaanyị Pọl?— Anyị na-amụta na obi ike dị anyị mkpa iji kwuo ihe ziri ezi anyị kwesịrị ikwu, nakwa na ọ bụrụ na anyị emee otú ahụ, anyị nwere ike ịzọ ndị mmadụ ndụ. Ọbụna mgbe Jizọs maara na ndị iro ya “na-achọ igbu ya,” ọ nọgidere na-agwa ndị mmadụ banyere Alaeze Chineke. Jizọs gwara anyị ka anyị mee otu ihe ahụ. Ànyị ga-emenụ ya? Anyị ga-eme ya ma ọ bụrụ na anyị nwere ụdị obi ike ahụ nwa nwanne nwaanyị Pọl nwere.—Jọn 7:1; 15:13; Matiu 24:14; 28:18-20.

Pọl gbara enyi ya na-akatabeghị ahụ́ bụ́ Timoti ume, sị: “Na-elezi onwe gị na ozizi gị anya mgbe niile. Nọgide n’ihe ndị a, n’ihi na site n’ime otú a, ị ga-azọpụta onwe gị, zọpụtakwa ndị na-ege gị ntị.” (1 Timoti 4:16) O doro anya na nwa nwanne nwaanyị Pọl mere ihe a nwanne nne ya gbara ume ka e mee. Ị̀ ga-eme ya?

^ para. 3 Ọ bụrụ ụmụaka ka ị na-agụrụ akụkọ a, akara ùhiè ndị dị n’isiokwu a na-echetara gị ka ị kwụsị jụọ ha ajụjụ ndị ahụ.