Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE 2009-05-01

Betel Brooklyn Agbaala Otu Narị Afọ

Betel Brooklyn Agbaala Otu Narị Afọ

Ebe Obibi Betel 122-124 Columbia Heights

13-17 Hicks Street (1909-1918)

AFỌ 1909 bụ afọ dị mkpa na New York City. E mepere Àkwà Mmiri Queensboro, bụ́ nke jikọrọ obodo Queens na obodo Manhattan, e mepekwara Àkwà Mmiri Manhattan, bụ́ nke jikọrọ obodo Manhattan na Brooklyn.

Ọ bụkwa afọ dị Ndịàmà Jehova mkpa. Tupu mgbe ahụ, Charles Taze Russell, onyeisi oche nke Watch Tower Bible and Tract Society, bụ́ ụlọ ọrụ iwu kwadoro nke Ndịàmà Jehova ji arụ ọrụ, ahụla na e nwere ike ịgbasa ọrụ ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke. (Matiu 24:14) O kweere na isi na Pittsburgh, Pennsylvania, bufee isi ụlọ ọrụ Society na Brooklyn, New York, ga-enye ezigbo aka n’ime nke ahụ. Na 1908, a malitere ịkwabede maka ibufe ya ebe ahụ, e mechakwara bufee ya n’afọ sochiri ya.

Olee Ihe Mere Anyị Ji Kwafee Brooklyn?

Ndị na-eduzi ozi ọma anyị na-ekwusa n’oge ahụ maara na ibipụta okwu Baịbụl ndị anyị na-ekwu n’akwụkwọ akụkọ bụ ụzọ magburu onwe ya isi gbasaa eziokwu Baịbụl. N’ezie, ka ọ na-erule n’afọ 1908, okwu  Baịbụl Russell na-ekwu kwa izu apụtawala n’akwụkwọ akụkọ iri na otu, ndị na-agụkwa ya dị narị puku mmadụ anọ na puku abụọ.

N’agbanyeghị nke ahụ, Russell dere, sị: “Ụmụnna anyị ndị maara banyere akwụkwọ akụkọ . . . mesiri anyị obi ike na ọ bụrụ na e bipụtawa okwu Baịbụl anyị na-ekwu kwa izu [n’obodo ebe e nwere ọtụtụ mmadụ] o nwere ike ime ka okwu ahụ gazuo United States dum; na n’ime otu afọ e nwere ike inwe ọtụtụ narị akwụkwọ akụkọ ndị ga na-ebipụtachi ya anya.” N’ihi ya, a malitere ịchọ ebe kacha mma a ga-anọ gbasaa ọrụ ikwusa ozi ọma ahụ.

Okwu Russell ndị e bipụtara n’akwụkwọ akụkọ

Olee ihe mere e ji họrọ Brooklyn? Russell kwuru, sị: “Mgbe anyị kpechara ekpere, anyị niile kpebiri na Brooklyn, N.Y., bụ́ ebe e nwere ọtụtụ mmadụ . . . na ebe a na-akpọ ‘Obodo Chọọchị Juru,’ ga-abụ ebe kacha mma ịnọ rụọ ọrụ owuwe ihe ubi ahụ n’ihi ihe ndị a.” Ihe ndị a rụpụtarala gosiri na ihe ahụ o kwuru bụ eziokwu. N’ime obere oge, puku akwụkwọ akụkọ abụọ nọ na-ebipụta okwu Russell.

E nwere ihe ọzọ mere e ji họrọ New York. Ka ọ na-erule 1909, e mepeela alaka ụlọ ọrụ anyị na Great Britain, Germany, nakwa n’Australia, ka na-akwadokwa imepe ya n’ebe ndị ọzọ. N’ihi ya, ọ bụ ihe amamihe inwe isi ụlọ ọrụ ụwa niile anyị n’obodo nwere ọdụ ụgbọ mmiri na ọtụtụ okporo ụzọ na ụzọ ụgbọ okporo ígwè.

Olee Ihe Mere E Ji Kpọọ Ya Betel?

18 Concord Street (1922-1927)

117 Adams Street (1927 ruo taa)

E mepere isi ụlọ ọrụ mbụ nke Watch Tower Bible and Tract Society mgbe afọ 1880 gachara, n’Allegheny (ebe dịzi na Pittsburgh), Pennsylvania. N’oge ahụ, a na-akpọ ya Ụlọ Baịbụl. Ka ọ na-erule afọ 1896, e nwere mmadụ iri na abụọ na-arụ ọrụ n’ụlọ ahụ.

Ma, mgbe e bufere isi ụlọ ọrụ anyị na Brooklyn n’afọ 1909, a malitere ịkpọ ebe  obibi ọhụrụ nke ndị na-arụ ọrụ n’isi ụlọ ọrụ ahụ Betel. * Olee ihe mere e ji kpọwa ya Betel? Onye nwebu ụlọ Watch Tower Society zụrụ na 13-17 Hicks Street bụ ụkọchukwu a ma ama bụ́ Henry Ward Beecher, a na-akpọkwa ụlọ ya ahụ Betel Beecher. Anyị zụkwara ụlọ ebe Beecher bibu, nke dị na 124 Columbia Heights. Ụlọ Nche (Bekee) nke March 1, 1909, kọrọ, sị: “Ọ bụ nnọọ ihe ịtụnanya na anyị zụtara ebe bụ́bu Betel Beecher, zụtakwa ụlọ ebe o bibu. . . . Anyị ga-akpọ ebe obibi ọhụrụ ahụ ‘Betel,’ kpọọkwa ọfịs na ụlọ ezumezu ọhụrụ ahụ, ‘Ụlọikwuu Brooklyn’; a ga-eji aha ndị a dochie aha mbụ ahụ bụ́ ‘Ụlọ Baịbụl.’”

Taa, a na-akpọ ụlọ ndị e wusarala nke ukwuu dị na Brooklyn na n’ebe abụọ ọzọ dị na New York State, bụ́ Wallkill na Patterson, ma ụlọ obibi, ụlọ obibi akwụkwọ, na ọfịs ndị dị na ha, Betel. N’ezie, e nweela ebe obibi Betel n’otu narị mba na iri na atọ n’ụwa. Ndị na-arụ ọrụ na ha bụ ihe karịrị puku ndị ozi iri na itoolu bụ́ ndị na-enye aka n’ikesa ozi Baịbụl.

35 Myrtle Avenue (1920-1922)

Anyị Na-eji Obi Ụtọ Anabata Ndị Ọbịa

E nyefere Jehova ụlọ ndị ahụ e wuru na January 31, 1909. Monday, September 6, 1909, bụ Ụbọchị Nnabata Ndị Ọbịa na Betel. Ọtụtụ narị Ndị Mmụta Baịbụl, bụ́ aha a na-akpọ Ndịàmà Jehova mgbe ahụ, bịara gagharịa n’ụlọ ahụ. Ọtụtụ n’ime ha si ná mgbakọ Ndị Kraịst ha nwere na Saratoga Springs bịa, bụ́ ebe dị ihe dị ka narị kilomita atọ na iri abụọ n’ebe ugwu New York City. Charles Taze Russell ji aka ya nabata ndị ọbịa ahụ ma kelee ha. *

A ka na-anabata ndị ọbịa na Betel. N’ezie, ihe karịrị iri puku mmadụ anọ na-abịa eleta Betel Brooklyn kwa afọ. Betel Brooklyn ka na-arụ ọrụ dị mkpa n’ime ka ihe ndị metụtara Alaeze Jehova na-aga n’ihu, bụ́ nke na-ewetara ọtụtụ nde mmadụ ngọzi.

Ebe obibi akwụkwọ dị na Wallkill

Ogige Ụlọ Akwụkwọ Patterson

^ para. 11 Okwu Hibru bụ́ “Betel” pụtara “Ụlọ Chineke.” Na Baịbụl, Betel bụ obodo a ma ama dị n’Izrel. Ọ bụ naanị Jeruselem bụ obodo a kpọrọ aha karịa ya na Baịbụl.

^ para. 14 Ị chọọ ịghọtakwu akụkọ banyere Ndịàmà Jehova, gụọ akwụkwọ bụ́ Jehovah’s Witnesses—Proclaimers of God’s Kingdom, peeji nke 718-723, bụ́ nke Ndịàmà Jehova bipụtara.