Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE 2009-04-01

Jizọs Ọ̀ Bụ Chineke?

Jizọs Ọ̀ Bụ Chineke?

ỌTỤTỤ ndị kweere na Atọ n’Ime Otu bụ “ozizi dị mkpa n’okpukpe Ndị Kraịst.” Ozizi a na-ekwu na Nna, Ọkpara, na mmụọ nsọ bụ ndị atọ dị n’otu Chineke. Kadinal John O’Connor kwuru banyere Atọ n’Ime Otu, sị: “Anyị maara na ọ bụ oké ihe omimi, nke anyị na-enweghị ike ịghọta.” Olee ihe mere Atọ n’Ime Otu ji esi nnọọ ike nghọta?

Akwụkwọ bụ́ The Illustrated Bible Dictionary gwara anyị otu ihe mere o ji dị otú ahụ. Akwụkwọ a kwuru banyere Atọ n’Ime Otu, sị: “Ọ bụghị ozizi Baịbụl n’ihi na ọ dịghị ebe Baịbụl kọwara ya.” Ebe ọ bụ na Atọ n’Ime Otu ‘abụghị ozizi Baịbụl,’ ọ na-esiri ndị kweere n’Atọ n’Ime Otu ike ịchọta amaokwu Baịbụl ndị ha ga-eji akwado ozizi a ha na-ezi, ha na-akọwahiedị ụfọdụ amaokwu iji kwado ya.

Amaokwu A Ọ̀ Na-akụzi Atọ n’Ime Otu?

Otu n’ime amaokwu Baịbụl ndị a na-akọwahiekarị bụ Jọn 1:1. Na Bible Nsọ nke Union Version, amaokwu ahụ kwuru, sị: “Na mbụ ka Okwu ahụ dịrị, Okwu ahụ na Chineke [ya bụ, ton the·on′ n’asụsụ Grik] dịkwara, Okwu ahụ bụrụkwa Chineke [the·os′].” N’amaokwu a, e nwere ụzọ abụọ e si dee okwu Grik bụ́ the·os′ (chi). N’ihu nke mbụ, e dere okwu bụ́ ton (ahụ), bụ́ okwu Grik a na-etinye mgbe a na-ekwu banyere otu onye ma ọ bụ otu ihe kpọmkwem, ọ bụkwa Chineke Pụrụ Ime Ihe Niile ka the·on′ nke mbụ a na-ekwu maka ya. Ma na nke abụọ ya, e deghị okwu ahụ bụ́ ton (ahụ) n’ihu the·os′. È chefuru ya echefu?

Olee ihe mere ozizi Atọ n’Ime Otu ji esi nnọọ ike nghọta?

Asụsụ e ji dee Oziọma Jọn bụ asụsụ Koine, ma ọ bụ Grik ọha mmadụ na-asụ, bụ́ asụsụ nwere iwu ndị a kapịrị ọnụ na-achị otú e si ede ihe mgbe e nwere otu onye ma ọ bụ otu ihe kpọmkwem a na-ekwu okwu ya. Ọkà mmụta Baịbụl bụ́ A. T. Robertson kwuru na ọ bụrụ na e dere  ton (ahụ) n’ihu onye ma ọ bụ ihe nke mbụ a na-ekwu okwu ya, deekwa ya n’ihu onye ma ọ bụ ihe nke ọzọ, ihe ọ pụtara bụ na “ha abụọ bụ otu onye ma ọ bụ otu ihe.” Robertson ji Matiu 13:38 mee ihe atụ, bụ́ ebe kwuru, sị: “Ubi ahụ [ho a·gros′, n’asụsụ Grik] bụ ụwa [ho ko′smos, n’asụsụ Grik].” N’ihi iwu na-achị asụsụ Grik, n’ebe a, ụwa bụkwa ubi.

Ọ bụrụkwanụ na e dere ton (ahụ) n’ihu onye ma ọ bụ ihe mbụ a na-ekwu okwu ya, ma, e deghị ya n’ihu onye ma ọ bụ ihe nke ọzọ, dị ka ọ dị na Jọn 1:1? Ọkà mmụta bụ́ James Allen Hewett kwuru banyere amaokwu a, sị: “N’ụdị ahịrịokwu ahụ, onye mbụ e kwuru okwu ya na onye nke ọzọ abụghị otu onye, ha ahaghịkwa.”

Hewett ji 1 Jọn 1:5 mee ihe atụ, bụ́ ebe kwuru, sị: “Chineke bụ ìhè.” N’asụsụ Grik, otú e si dee “Chineke” bụ ho the·os′, n’ihi ya kwa, o nwere ihe na-egosi na ọ na-ekwu banyere otu onye kpọmkwem. Ma, e deghị okwu ọ bụla na-egosi na ọ dị otu ìhè a na-ekwu okwu ya n’ihu okwu bụ́ phos, ya bụ, “ìhè.” Hewett kwuru, sị: “Mmadụ nwere ike . . . ịsị na Chineke bụ ìhè; ma, mmadụ enweghị ike ịsị na ìhè bụ Chineke.” Ihe atụ yiri ya dị na Jọn 4:24, bụ́ ebe sịrị na “Chineke bụ Mmụọ,” nakwa na 1 Jọn 4:16, bụ́ ebe sịrị na “Chineke bụ ịhụnanya.” N’amaokwu abụọ a, e denyere ihe na-egosi na Chineke bụ otu onye kpọmkwem, ma, e denyeghị ya n’ihu okwu ndị bụ́ “Mmụọ” na “ịhụnanya.” N’ihi ya, mmadụ agaghị asị na onye a na-ekwu maka ya na ihe e kwuru maka ya bụ otu. Amaokwu ndị a emekataghị pụta “Mmụọ bụ Chineke” ma ọ bụ “ịhụnanya bụ Chineke.”

À Na-ekwu Banyere Onye “Okwu ahụ” Bụ?

Ọtụtụ ndị ọkà mmụta asụsụ Grik na ndị na-asụgharị Baịbụl kwetara na ihe Jọn 1:1 lekwasịrị anya abụghị onye “Okwu ahụ” bụ, kama ọ bụ otú ọ dị. Onye nsụgharị Baịbụl bụ́ William Barclay kwuru, sị: “Ebe ọ bụ na [Jọn onyeozi] etinyeghị okwu na-egosi na ọ na-ekwu banyere otu onye kpọmkwem n’ihu theos, ọ pụtara na o ji ya na-akọwa ihe . . . Ihe Jọn na-ekwu n’ebe a abụghị na Okwu ahụ bụ Chineke. N’igbu ya nkenke, o kwughị na Jizọs bụ Chineke.” Ọkà mmụta bụ́ Jason David BeDuhn kwukwara, sị: “N’asụsụ Grik, ọ bụrụ na i tinyeghị ton (ahụ) n’ihu theos n’ahịrịokwu dị ka nke ahụ dị na Jọn 1:1ch, ndị na-agụ ya ga-ewere ya na ihe ị na-ekwu bụ ‘chi.’ . . . Ebe ọ bụ na e tinyeghị ya, o mere ka theos dị nnọọ iche na ho theos, otú ahụ ‘chi’ si dị iche na ‘Chineke’ n’asụsụ Bekee.” BeDuhn kwukwara, sị: “Na Jọn 1:1, Okwu ahụ abụghị otu onye ahụ naanị ya bụ Chineke, kama, ọ bụ chi, ma ọ bụ onye yiri Chineke.” Ma ọ bụ, e kwuo ya otú Joseph Henry Thayer, bụ́ ọkà mmụta so rụọ ọrụ na Baịbụl bụ́ American Standard Version si kwuo ya: “Logos [ma ọ bụ, Okwu] ahụ bụ chi, ọ bụghị Chineke n’onwe ya.”

Jizọs mere ka o doo anya na ya na Nna ya dị iche

Ịmata onye Chineke bụ ò kwesịrị ịbụ “oké ihe omimi”? Jizọs echeghị otú ahụ. Mgbe Jizọs na-ekpegara Nna ya ekpere, o mere ka o doo anya na ya na Nna ya dị iche mgbe o kwuru, sị: “Iji nweta ndụ ebighị ebi, ọ dị ha mkpa ịmata gị nke ọma, onye naanị ya bụ ezi Chineke, matakwa onye i zitere, bụ́ Jizọs Kraịst.” (Jọn 17:3) Ọ bụrụ na anyị ekwere ihe ahụ Jizọs kwuru, ghọtakwa ozizi doro anya nke Baịbụl, anyị ga na-asọpụrụ Jizọs dị ka Ọkpara Chineke nke yiri Chineke. Anyị ga na-efekwa Jehova dị ka “onye naanị ya bụ ezi Chineke.”