Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE 2009-02-01

 Ihe Ndị Na-eme Ka E Nwee Obi Ụtọ n’Ezinụlọ

Ịdọ Ụmụaka Aka ná Ntị

Ịdọ Ụmụaka Aka ná Ntị

John: * Tupu ndị mụrụ m enye m ahụhụ ma m mee ihe ọjọọ, ha na-agbalịsi ike ịghọta ihe m bu n’obi mee ihe ahụ na ihe niile kpatara ya. M na-agbalị isi otú ahụ agbazi ụmụ m ndị nwaanyị. Ma, ọ bụghị otú ahụ ka e si zụọ Alison nwunye m. Nne na nna ya anaghị enwecha ndidi otú ahụ. O yiri ka hà na-enye ụmụ ha ahụhụ ozugbo ha mejọrọ, n’ebughị ụzọ chee echiche ihe kpatara ha ji mee ya. Mgbe ụfọdụ, ọ na-adị m ka nwunye m ọ̀ na-eji aka ike enye ụmụ anyị ahụhụ otú ahụ ndị mụrụ ya mere.

Carol: Papa m gbahapụrụ ezinụlọ anyị mgbe m dị naanị afọ ise. Ọ chọghịdị ịma otú mụ na ụmụnne m atọ mere. Mama m rụsiri ọrụ ike igboro anyị mkpa anyị, m gbasikwara mbọ ike ilekọta ụmụnne m ndị nwaanyị atọ m tọrọ. Ọ dịghịrị m mfe ịnọ na nwata rụwa ọrụ nne na-arụ. Ruokwa taa, egwuregwu anaghị adịcha m mma. Mgbe ọ bụla ụmụ m mere ihe na-adịghị mma, mara na mụ abaala n’ụlọ echiche. Ana m achọ ịma ihe mere ha ji mee ihe ha mere na ihe ha bu n’obi mee ya. Ma, di m Mark anaghị echegbuwe onwe ya ma ihe mee. Nna ya hụrụ ya n’anya, lekọtakwa nne ya nke ọma, ma, ọ naghị ahapụ Mark ka o mee ihe ọ bụla sọrọ ya. Ọ naghị esiri di m ike idozi nsogbu ụmụ anyị ndị nwaanyị nwere. Ọ na-abụ ya lebara nsogbu ha anya, ya edozie ya, chefuokwa ya.

IHE a John na Carol kwuru gosiri na otú i si adọ ụmụ gị aka ná ntị ugbu a nwere ike ịbụ n’ihi otú e si zụlite gị. Ọ bụrụ na otú e si zụlite di dị iche n’otú e si zụọ nwunye ya, o yiri ka otú ọ ga-achọ ka ha si zụọ ụmụ ha ọ̀ ga-adị iche n’otú nwunye ya chọrọ. Nke a na-esere di na nwunye okwu mgbe ụfọdụ.

Ike ọgwụgwụ nwekwara ike ime ka esemokwu ka njọ. Mgbe di na nwunye mụrụ nwa mbụ ha, ọ naghị adị anya ha achọpụta na ịzụ ụmụaka bụ ọrụ na-agwụ ike ma na-ewe oge. Joan, onye ya na di ya bụ́ Darren zụrụ ụmụ ha ndị nwaanyị abụọ, kwuru, sị: “Ahụrụ m ụmụ m n’anya, ma, ha anaghị achọkarị ịlakpu ụra mgbe m chọrọ ka ha lakpuo. Ha na-eteta mgbe ha kwesịrị ịnọ na-ehi ụra. Ha na-anara m  okwu n’ọnụ. Ha na-achịsa akpụkpọ ụkwụ ha, uwe ha, na ihe ndị ha ji egwuri egwu n’èzí, ha anaghịkwa edozi nri ha rifọrọ edozi.”

Jack, onye ọrịa uche rịara nwunye ya mgbe ọ mụchara nwa ha nke abụọ, sịrị: “Ike na-agwụkarị m ma m lọta ọrụ, ma, m na-ebili n’etiti abalị mụrụ anya na-elekọta nwa ọhụrụ anyị. Nke a mere ka ọ na-esiri anyị ike ịgbazi nwa anyị nwaanyị nke tọrọ ya. Obi anaghị adị ya mma na anyị na-ahapụ ya mgbe ụfọdụ na-elekọta nwanne ya.”

Ọ bụrụ na nne na nna ike gwụrụ enweghị otu olu n’otú ha si azụ nwa ha, obere nghọtahie nwere ike isere ha ezigbo okwu. Esemokwu a na-edozighị edozi nwere ike ime ka di na nwunye ghara ịdị n’otu, nwa ha ahụzie ụzọ ọ ga-esi jiri otu onye n’ime ha nweta ihe ọ chọrọ. Olee ihe ndị Baịbụl kwuru bụ́ ndị nwere ike inyere di na nwunye aka ịnọgide na-adị n’otu ka ha na-azụ ụmụ ha nke ọma?

Na-ewepụtanụ Oge Unu Ga-eji Na-anọrị

Chineke bu n’obi ka di na nwunye biri ebiri tupu ha amụọ ụmụ nakwa ka ha nọgide na-ebi mgbe ụmụ ha toro hapụ ụlọ. Baịbụl kwuru banyere alụmdi na nwunye, sị: “Ihe Chineke kekọtara, mmadụ ọ bụla atọsala ya.” (Matiu 19:6) Amaokwu bu ya ụzọ kwuru na Chineke bu n’obi na nwatakịrị ga-emecha ‘hapụ nna ya na nne ya.’ (Matiu 19:5) N’eziokwu, isi ihe mere nwoke na nwaanyị ji alụ abụghị ịzụ ụmụ, ịzụ ụmụ bụ naanị otu n’ime ihe ha na-eme. O doro anya na ndị mụrụ ụmụ kwesịrị iwepụta oge zụọ ụmụ ha, ma ha kwesịrị icheta na ihe ga-akacha eme ka ha zụta ụmụ ha bụ ha abụọ ịdị n’ezigbo mma.

Olee otu ụzọ di na nwunye ga-esi mee ka ha dịrị n’ezigbo mma n’oge ha na-azụ ụmụ ha? Ọ bụrụ na ọ ga-ekwe unu omume, wepụtanụ oge unu ga-eji na-anọrị naanị unu. Nke a ga-eme ka unu na-akparịta ihe ndị dị mkpa n’ezinụlọ unu, na-anọrịkwa. N’eziokwu, ọ naghị adịrị di na nwunye mfe iwepụta oge nọrịa. Alison, onye anyị kwuburu okwu ya, sịrị, “Ozugbo o yiri ka mụ na di m ò nwetala oge anyị ga-eji nọrịa, nwa anyị nwaanyị nke obere enyewe nsogbu ma ọ bụkwanụ nke dị afọ isii enyewe nsogbu nke ya. O nwere ike chọwa chọọkụ ya.”

Otú Joan na Darren, bụ́ ndị anyị kwuburu okwu ha, si enweta oge ha ji anọrị bụ na ha na-ahụ na ụmụ ha lakpuru ụra n’oge ha kwuru ha ga-eji na-alakpu ụra. Joan, sịrị, “E nwere oge anyị gwara ụmụ anyị ka ọ bụrụ mgbe ha ga na-edinara ala ma dị njikere ịgbanyụ ọkụ. Ha lakpuo, mụ na Darren na-enwezi oge nọrịa ma kparịta ụka.”

Ọ bụrụ na di na nwunye enwee oge ha gwara ụmụ ha ka ha na-alakpu ụra, ha ga-enwe oge ha ga na-anọrị, sikwa otú ahụ nyere nwa ha aka “ka ọ ghara iche banyere onwe ya karịa ka o kwesịrị iche.” (Ndị Rom 12:3) Ụmụaka ndị a zụrụ ka ha na-alakpu n’oge a gwara ha na-aghọta na ndị ọzọ dịkwa mkpa n’ezinụlọ otú hanwa dị. Ha na-aghọtakwa na ha kwesịrị ime ihe e kpebiri n’ezinụlọ, ọ bụghị ndị ezinụlọ ha ime ihe hanwa bụ́ ụmụaka chọrọ.

LEE MA Ị̀ GA-EME IHE A: Gwa nwa gị oge ọ ga na-alakpu ụra, hụkwa na ọ na-alakpu mgbe niile n’oge ahụ. Ọ bụrụ na nwa gị ekwuo na o nwere ihe mere ọ ga-eji nọtụkwuo tupu ya alakpuo, ma eleghị anya, sị na ya chọrọ ịṅụ mmiri, i nwere ike ikweta imere ya naanị otu ihe. Ma, ọ bụrụ na ọ na-abụ nwa gị rịọ nke a, ya arịọ nke ọzọ, maka na ọ chọghị ịlakpu ụra n’oge o kwesịrị ịlakpu, ekwela. Ọ bụrụ na ọ chọrọ ịnọkwu nkeji ise, gị achọọ ịhapụ ya, leere ya klọọkụ. Nkeji ise ahụ zuhaala, gwa ya ka ọ gaa dinara ala. Emerela ya ihe ọ bụla ọzọ ọ rịọrọ. Ka ‘Ee i kwuru bụrụ Ee, ka Ee e i kwuru bụrụ Ee e.’—Matiu 5:37.

Nweenụ Otu Olu Mgbe Unu Na-adọ Ụmụ Unu Aka ná Ntị

Otu ilu onye maara ihe tụrụ sịrị, “Nwa m, ṅaa ntị n’ịdọ aka ná ntị nna gị, ahapụkwala iwu nne gị.” (Ilu 1:8) Amaokwu Baịbụl a  na-egosi na ma nne ma nna nwechara ikike ịtụrụ ụmụ ha ihe ha ga-eme. Ma, ọ bụrụgodị na otú e si zụlite di bụkwa otú e si zụlite nwunye ya, o nwere ike ha agaghị enwe otu olu n’ụdị ahụhụ ha kwesịrị inye nwa ha ma o mejọọ ma ọ bụkwanụ iwu ezinụlọ ha ha ga-eso ma ihe ụfọdụ mee. Olee ihe ndị nne na nna nwere ike ime ma ha nwee ụdị nsogbu a?

John, onye anyị kwuburu okwu ya, sịrị, “Echere m na ọ dị mkpa ka di na nwunye ghara ịnọ n’ihu ụmụ ha rụwa ụka.” Ma, o kwetara na ọ naghị adị mfe inwe otu olu mgbe niile. John sịrị, “Ụmụaka na-aghọta ihe ngwa ngwa. Ọ bụrụgodị na anyị egosighị na anyị na-ese okwu, nwa anyị nwaanyị na-aghọta ihe na-aganụ.”

Olee otú John na Alison si merie nsogbu a? Alison sịrị: “Ọ bụrụ na ahụhụ di m na-enye nwa m nwaanyị adịghị m mma, ana m echere ruo mgbe nwa m nọ n’ebe ọ na-agaghị anụ ihe anyị na-ekwu, tupu mụ agwa di m otú obi dị m. Achọghị m ka o chee na ya nwere ike ikewa anyị, a hapụzie inye ya ahụhụ. Ọ bụrụ na ọ chọpụta na anyị enweghị otu olu, ana m agwa ya na onye ọ bụla nọ n’ezinụlọ anyị ga-esorịrị ndokwa Jehova, ana m agwakwa ya na m ji obi m dum doo onwe m n’okpuru nna ya otú yanwa kwesịkwara ido onwe ya n’okpuru anyị.” (1 Ndị Kọrịnt 11:3; Ndị Efesọs 6:1-3) John sịrị: “Mgbe anyị niile nọkọrọ, ọ bụ m na-adọ ụmụ anyị aka ná ntị. Ma, ọ bụrụ na ihe merenụ doro Alison anya karịa, m na-ahapụ ya ka ọ dọọ ha aka ná ntị, mụ akwadozie ya. Ọ bụrụ na otú o si mee ya adịghị m mma, mụ na ya na-ekwurịta ya ma e mechaa.”

Ọ bụrụ na otú nwunye gị ma ọ bụ di gị si adọ nwa unu aka ná ntị adịghị gị mma, olee ihe unu ga-eme ka unu ghara ibuwere ibe unu iwe n’obi, ya emee ka ụmụ unu ghara ịna-akwanyere unu ùgwù?

LEE MA Ị̀ GA-EME IHE A: Kwa izu, wepụtanụ oge unu ga-eji kparịta otú unu si na-azụ ụmụ unu. Ọ bụrụ na o nwere ihe seere unu okwu, kwurịtanụ ya. Gbalịa ghọta ihe nwunye gị ma ọ bụ di gị na-ekwu, ghọtakwa na nwunye gị ma ọ bụ di gị so nwere nwa ahụ.

Ka Ọrụ Ịzụ Ụmụ Mee Ka Unu Matakwuo Onwe Unu

O doro anya na ịzụ ụmụ abụghị obere ọrụ. Mgbe ụfọdụ, o nwere ike ịdị gị ka ọrụ a ọ̀ na-ewepụ gị ihe n’ahụ́. Ma, e mechaa, ụmụ unu ga-eto hapụ ụlọ, ya afọzie naanị unu abụọ. Otú unu si zụọ ụmụ unu ọ̀ ga-eme ka gị na nwunye gị ma ọ bụ di gị dịkwuo ná mma, ka ọ̀ ga-akpatara unu esemokwu? Ihe ga-ekpebi ya bụ ma ùnu na-emeta ihe e dere n’Ekliziastis 4:9, 10, nke na-asị: “Abụọ dị mma karịa otu, n’ihi na ha nwere ezi ụgwọ ọrụ maka ịrụsi ọrụ ike ha. N’ihi na ọ bụrụ na otu n’ime ha adaa, onye nke ọzọ pụrụ ikulite ibe ya.”

Ọ bụrụ na nne na nna ana-arụkọ ọrụ ọnụ, ọ na-arụpụta ihe bara ezigbo uru. Carol, onye anyị kwuburu okwu ya, kwuru otú obi dị ya, sị: “Ama m na di m nwere ọtụtụ àgwà ọma, ma ụmụ anyị anyị zụkọrọ ọnụ emeela ka m hụkwuo ọtụtụ àgwà ọma ndị ọzọ o nwere. Otú o si jiri ịhụnanya na-elekọta ụmụ anyị mere ka m na-akwanyekwuru ya ùgwù, hụkwuokwa ya n’anya.” John kwuru banyere Alison, sị, “Ịhụ otú nwunye m sirila ghọọ ezigbo nne emeela ka m hụkwuo ya n’anya, meekwa ka m na-asọpụkwuru ya.”

Ọ bụrụ na ị na-ewepụta oge ka gị na nwunye gị ma ọ bụ di gị na-anọrị, gị na ya agbakọọkwa aka na-azụ ụmụ unu, unu ga-adịkwu nnọọ ná mma ka ụmụ unu na-etolite. Ọ̀ dị ihe nlereanya ka nke ahụ mma unu nwere ike isetịpụrụ ụmụ unu?

^ para. 3 Aha a a kpọrọ ha abụghị ezigbo aha ha.

JỤỌ ONWE GỊ, SỊ . . .

  • Olee otú oge ị na-ewepụta ka gị na naanị nwunye gị ma ọ bụ di gị na-anọrị hà?

  • Olee otú m si akwado nwunye m ma ọ bụ di m ma ọ dọọ ụmụ anyị aka ná ntị?

GỤKWUO GBASARA YA

Gịnị Ga-eme Ka Obi Na-adị Ezinụlọ Ụtọ?

Jehova bụ onye obi ụtọ. Ọ chọrọ ka ezinụlọ na-enwe obi ụtọ. Gụọ ihe Baịbụl gwara ndị bụ́ di, ndị bụ́ nwunye, ndị nne na nna na ụmụaka.