Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE 2009-02-01

Anyị Ji Obi Ụtọ Na-akpọ Gị Òkù

Anyị Ji Obi Ụtọ Na-akpọ Gị Òkù

IKEKWE o nweela mgbe ị gafere Ụlọ Nzukọ Alaeze Ndịàmà Jehova nke dị n’obodo unu, gị ana-eche ihe a na-eme n’ebe ahụ. Ị̀ maara na onye ọ bụla nwere ike ịbịa ọmụmụ ihe ha na-enwe kwa izu? Ha na-eji obi ụtọ anabata ndị ọzọ.

Ma, o nwere ike ịbụ na o nwere ajụjụ ụfọdụ dị gị n’obi. Dị ka ihe atụ, Gịnị mere Ndịàmà Jehova ji ezukọta n’ụlọ nzukọ ha? Gịnị ka ha na-eme ná nzukọ ha? Oleekwa ihe ndị na-abụghị Ndịàmà Jehova, ndị gatụrụla nzukọ ndị ahụ, kwuru banyere ha?

“Kpọkọta Ụmụ Izrel”

O teela ndị mmadụ zukọtawara ife Chineke na ịmụ banyere ya. Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ puku afọ atọ na narị afọ ise gara aga, a gwara ụmụ Izrel, sị: “Kpọkọta ụmụ Izrel, ndị ikom na ndị inyom na ụmụntakịrị na onye mbịarambịa nke nọ n’ime obodo gị, ka ha wee gee ntị, ka ha mụtakwa ihe, ka ha tụọ egwu Jehova bụ́ Chineke unu ma lezie anya idebe ihe niile e kwuru n’iwu a.” (Diuterọnọmi 31:12) Ihe ọ pụtara bụ na a kụziiri ma ụmụaka ma ndị toro eto n’Izrel ka ha na-efe Jehova bụ́ Chineke ma na-erubere ya isi.

Ka ọtụtụ narị afọ gafere, mgbe ọgbakọ Ndị Kraịst malitere ịdị, otu ihe dị mkpa ndị na-efe Chineke ezi ofufe ka nọ na-eme bụ izukọta ọnụ. Pọl onyeozi dere, sị: “Ka anyị na-echebakwara ibe anyị echiche iji kpalie ịhụnanya na ịrụ ezi ọrụ, ka anyị ghara ịhapụ nzukọ anyị, dị ka ụfọdụ ndị na-emekarị, kama ka anyị na-agbarịta ibe anyị ume.” (Ndị Hibru 10:24, 25) Otú ahụ ọ na-abụ ndị ezinụlọ na-anọkọ, ha ana-adịkwu ná mma, ọ bụ otú ahụ ka ọ na-abụ Ndị Kraịst na-ezukọ ife Chineke ha ana-ahụkwu onwe ha n’anya.

N’ihi ihe a Akwụkwọ Nsọ kwuru, Ndịàmà Jehova na-ezukọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ha ugboro abụọ n’izu. Nzukọ ndị ahụ na-enyere ndị bịaranụ aka ịghọta ihe Baịbụl kwuru na ime ya eme. Nzukọ Ndịàmà Jehova na-abụ otu n’ebe niile n’ụwa, ọ gwụla ma o nwere ihe mere ọ ga-eji dị iche n’ebe ụfọdụ. Nzukọ nke ọ bụla nwere ihe ọ na-akụziri ndị bịara ya. Ndị bịara nzukọ ndị ahụ na-akparịta ụka tupu a malite nakwa mgbe a gbasara, si otú ahụ ‘na-agbarịta ibe ha ume.’ (Ndị Rom 1:12) Olee ihe ha na-amụ ná nzukọ ndị ahụ?

Okwu Baịbụl A Na-agwa Ọha na Eze

Nzukọ ọtụtụ ndị na-ebu ụzọ abịa bụ okwu Baịbụl a na-agwa ọha na eze, nke a na-enwekarị ná ngwụsị izu. Ọtụtụ mgbe, Jizọs Kraịst kwuru okwu Chineke n’ihu ọha. Otu n’ime ha bụ Ozizi Elu Ugwu ahụ a ma ama. (Matiu 5:1; 7:28, 29) Pọl onyeozi gwara ndị Atens okwu. (Ọrụ 17:22-34) Ebe Ndịàmà Jehova na-eṅomi Jizọs na Pọl, ha nwere okwu a na-agwa ọha na eze ná nzukọ ha, ụfọdụ ndị na-abịa ya bụ ndị na-abịatụbeghị nzukọ ha.

A na-eji abụ si n’akwụkwọ abụ bụ́ Sing Praises to Jehovah * amalite nzukọ ahụ. Onye ọ bụla chọrọnụ nwere ike ibili ọtọ soro bụọ ya. E kpechaa ekpere na-adịghị ogologo, ọkà okwu ruru eru na-ekwu okwu na-ewe nkeji iri atọ. (Gụọ igbe nke isiokwu ya bụ “ Okwu Kwesịrị Ekwesị Maka Ọha na Eze.”) Ihe ọ na-ekwu bụ ihe si na Baịbụl. Ọkà okwu ahụ na-agwakarị ndị na-ege ya ntị ka ha sapeta amaokwu Akwụkwọ Nsọ ndị ọ chọrọ ịgụ ma legide nke ha anya mgbe ọ na-agụ ha. N’ihi ya, i nwere ike iji Baịbụl nke gị bịa, ma ọ bụkwanụ gwa otu n’ime Ndịàmà Jehova ka o nye gị otu Baịbụl tupu nzukọ ahụ amalite.

 Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche

N’ọtụtụ ọgbakọ Ndịàmà Jehova, e kwuchaa okwu ahụ a na-agwa ọha na eze, a na-enwe Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche nke na-ewe otu awa. N’ọmụmụ ihe a, a na-atụle isiokwu Baịbụl n’ụdị ajụjụ na azịza, a na-agbakwa ndị bịara ya ume ka ha mee ihe ndị Beria mere n’oge Pọl, bụ́ ndị ji “ịnụ ọkụ n’obi nabata okwu Chineke, na-enyocha Akwụkwọ Nsọ nke ọma.”—Ọrụ 17:11.

A na-eji abụ amalite Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche. Ihe a na-amụ na ya na ajụjụ onye na-eduzi ya na-ajụ na-esi n’Ụlọ Nche nke a na-amụ amụ. I nwere ike ịnata Onyeàmà Jehova Ụlọ Nche a na-amụ amụ. Ụfọdụ isiokwu ndị a mụrụ n’oge na-adịbeghị anya bụ: “Ndị Nne na Nna—Jirinụ Ịhụnanya Na-azụ Ụmụ Unu,” “Unu Ejila Ihe Ọjọọ Akwụghachi Onye Ọ Bụla n’Ọnọdụ Ihe Ọjọọ,” na “Ihe Mere Ahụhụ Nile Ga-eji Kwụsị n’Isi Nso.” Ọ bụ eziokwu na a na-eduzi ọmụmụ ihe ahụ n’ụdị ajụjụ na azịza, a naghị amanye mmadụ amanye ka ọ zaa ajụjụ. Ndị na-azakarị ajụjụ bụ ndị gụrụla isiokwu ahụ a na-amụ, chebakwara ya na amaokwu Akwụkwọ Nsọ ndị e dere na ya echiche tupu ha abịa. A na-eji abụ na ekpere emechi ọmụmụ ihe ahụ.—Matiu 26:30; Ndị Efesọs 5:19.

Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ

Otu mgbede kwa izu, Ndịàmà Jehova na-ezukọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ha maka ọmụmụ ihe nwere nkebi atọ nke na-ewe otu awa na nkeji iri anọ na ise. Nke mbụ bụ Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ, nke na-ewe nkeji iri abụọ na ise. Ọ na-enyere ndị bịara ya aka ịghọtakwu Baịbụl, ịgbanwe otú ha si eche echiche, otú ha si akpa àgwà na ịghọkwu ezigbo ndị na-eso ụzọ Kraịst. (2 Timoti 3:16, 17) Ná nzukọ a, a na-atụle isiokwu Baịbụl n’ụdị ajụjụ na azịza otú ahụ  a na-eme n’Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche. A naghị amanye mmadụ amanye ịza ajụjụ. Ọ na-abụkarị akwụkwọ ma ọ bụ broshuọ Ndịàmà Jehova bipụtara ka a na-eji amụ Baịbụl n’ọmụmụ ihe a.

Gịnị mere e ji eji akwụkwọ dabeere na Baịbụl amụ ihe ná nzukọ a? N’oge Baịbụl, ihe a na-eme abụghị naanị ịgụ Okwu Chineke. ‘A na-akọwa ya, na-emekwa ka o doo anya; a nọkwa na-eme ka a ghọta ihe a na-agụpụta.’ (Nehemaya 8:8) N’afọ ndị na-adịchabeghị anya, akwụkwọ ndị kọwara amụma Aịzaya, Daniel na Mkpughe nyeere ndị bịara ọmụmụ ihe a aka ịghọta akwụkwọ Baịbụl ndị a.

Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke

Ozugbo a mụchara Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ, a na-enwe Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke. Nzukọ a na-ewe nkeji iri atọ, ọ na-akụzikwara Ndị Kraịst otú ha ga-esi nwee “nkà izi ihe.” (2 Timoti 4:2) Dị ka ihe atụ, ò nwetụla mgbe nwa gị ma ọ bụ enyi gị jụrụ gị ajụjụ banyere Chineke ma ọ bụ Baịbụl, ya esiere gị ike ịza ya nke ọma? Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke nwere ike ịkụziri gị otú ị ga-esi jiri Baịbụl zaa mmadụ ajụjụ siri ike, ya edoo ya anya. N’ihi ya, anyị nwere ike ikwu ihe Aịzaya onye amụma kwuru, nke bụ́: “Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova enyewo m ire nke ndị a kụziiri ihe, ka m wee mata otú m ga-esi zaa onye ike gwụrụ okwu.”—Aịzaya 50:4.

Okwu mbụ a na-ekwu n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke na-esi n’ebe a gwaburu ndị bịaranụ ka ha gụọ na Baịbụl n’izu bu nke ahụ ụzọ. Onye na-ekwu ya kwuchaa, ya agwa ndị na-ege ntị ka ha kwuo ná nkenke ihe ha mụtara n’ebe e kwuru ka a gụọ. E mechaa nke ahụ, ndị denyere aha ha n’ụlọ akwụkwọ ahụ ga-abịa mee ihe omume e nyere ha ka ha mee.

A na-ekenye ndị e denyere aha ha n’ụlọ akwụkwọ ahụ ihe omume ha ga-eme. O nwere ike ịbụ ịnọ n’ikpo okwu gụpụta otu ebe na Baịbụl ma ọ bụkwanụ igosi otú ha ga-esi kọwaara mmadụ ihe dị n’Akwụkwọ Nsọ. Onye nke ọ bụla mechaa ihe omume ya, onye na-eduzi ụlọ akwụkwọ ahụ na-eji ihe e dere n’akwụkwọ bụ́ Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ  Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke aja onye ahụ mma n’ebe o meziri emezi. E mechaa, o nwere ike kpọpụta ya iche, gwa ya ihe ndị ga-enyekwuru ya aka.

Ihe mere e ji enwe ihe omume ndị ahụ na-anaghị ewe oge bụ iji nyere ma onye mere ihe omume ma ndị bịaranụ aka ịmụtakwu otú e sị agụ ihe, otú e si ekwu okwu, na otú e si ezi ihe. Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke gachaa, a na-eji abụ dabeere na Baịbụl amalite Nzukọ Ije Ozi.

Nzukọ Ije Ozi

Nke ikpeazụ a na-enwe n’ụbọchị ahụ bụ Nzukọ Ije Ozi. Okwu a na-ekwu, ihe ngosi a na-eme, ajụjụ ọnụ a na-agba ndị mmadụ na azịza ndị na-ege ntị na-aza na-enyere ndị bịaranụ aka ịmụta otú e si akụzi Baịbụl nke ọma. Tupu Jizọs ezipụ ndị na-eso ụzọ ya ka ha gaa kwusaa ozi ọma, ọ kpọkọtara ha ma gwa ha ihe ndị doro anya ha ga-eme. (Luk 10:1-16) Mgbe Jizọs kwadochara ha maka ikwusa ozi ọma, ozi ha gara tọrọ ha ụtọ. Mgbe ndị na-eso ụzọ Jizọs lọtara, ha kọọrọ ya otú ha si gaa. (Luk 10:17) Ọtụtụ mgbe, ndị na-eso ụzọ Jizọs kọọrọ ibe ha otú ozi ha si gaa.—Ọrụ 4:23; 15:4.

Ihe a na-amụ ná Nzukọ Ije Ozi nke na-ewe nkeji iri atọ na ise, na-esi n’obere akwụkwọ a na-ebipụta kwa ọnwa nke a na-akpọ Ozi Alaeze Anyị. Ụfọdụ isiokwu ndị a mụrụ ná nso nso a bụ: “Ifekọ Jehova Ọnụ Dị Ka Ezinụlọ,” “Ihe Mere Anyị Ji Agaghachi Ugboro Ugboro,” na “Na-agbaso Ihe Nlereanya Kraịst Setịpụrụ n’Ihe Banyere Ikwusa Ozi Ọma.” A na-eji abụ emechi nzukọ a, kpọọkwa otu onye n’ọgbakọ ahụ ka o kpee ekpere mmechi.

Ihe Ndị Bịarala Nzukọ Ndị ahụ Kwuru

Ọgbakọ ọ bụla na-agbalị ime ka ahụ́ ruo ndị bịara nzukọ ndị ahụ ala. Dị ka ihe atụ, Andrew nụrụ ọtụtụ akụkọ na-adịghị mma banyere Ndịàmà Jehova. Ma, otú e si nabata ya n’ụbọchị mbụ ọ bịara nzukọ ha tụrụ ya n’anya. Andrew kwuru, sị: “Ebe ahụ dị mma ọgịga. Otú ha si nabata m nke ọma na otú ha si nwee mmasị n’ebe m nọ tụrụ m nnọọ n’anya.” Otu onye na-eto eto bi na Canada nke aha ya bụ Ashel kwetara ihe Andrew kwuru. O kwuru, sị: “Nzukọ ahụ tọrọ m ezigbo ụtọ! O sighịrị m ike ịghọta ihe a na-ekwu.”

Ihe e ji mara José n’ebe o bi na Brazil bụ ime ihe ike. N’agbanyeghị ya, a kpọrọ ya ka ọ bịa nzukọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze dị n’obodo ha. O kwuru, sị: “Ndị m hụrụ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ji obi ụtọ nabata m, n’agbanyeghị na ha ma ụdị ndụ m na-ebibu.” Atsushi, bụ́ onye bi na Japan, chetara ihe mere n’ụbọchị ọ gara. Ọ sịrị: “Ka m kwuo eziokwu, ụbọchị mbụ m gara nzukọ Ndịàmà Jehova, ahụ́ eruchaghị m ala. Ma, achọpụtara m na ọ dịghị ihe dị njọ n’ebe ha nọ. Ha gbalịrị nnọọ ime ka ahụ́ ruo m ala.”

Anyị Na-akpọ Gị Òkù Ka Ị Bịa

Ihe ahụ ndị mmadụ kwuru gosiri na ịbịa nzukọ Ndịàmà Jehova na-enwe n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ga-abara gị ezigbo uru. Ị ga-amụta ọtụtụ ihe banyere Chineke, Jehova Chineke ga-ejikwa ihe ndị si na Baịbụl a ga-akụziri gị n’ebe ahụ mee ka ị “baara onwe gị uru.”—Aịzaya 48:17.

Nzukọ Ndịàmà Jehova bụ n’efu, a naghịkwa agwa ndị mmadụ ka ha tụọ ego. Ị̀ ga-achọ ịga nzukọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ha nke dị n’ebe i bi? Anyị ji obi ụtọ na-akpọ gị ka ị bịa.

^ para. 10 Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara akwụkwọ niile e kwuru okwu ha n’isiokwu a.