Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE 2009-01-01

 Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Jụrụ

Gịnị Mere Chineke Anaghị Aza Ekpere Ụfọdụ?

Gịnị Mere Chineke Anaghị Aza Ekpere Ụfọdụ?

Ọ dị nnọọ mfe ịgwa Chineke okwu mgbe ọ bụla. Otú ahụ obi na-atọ nna nke hụrụ ụmụ ya n’anya ụtọ ma ụmụ ya na-agwa ya otú obi dị ha, ọ bụ otú ahụ ka obi na-atọ Jehova Chineke ụtọ ma anyị na-ekpeku ya ekpere. Ma, dị ka nna ọ bụla maara ihe na-eme, Chineke anaghị eme ihe niile a rịọrọ ya. E nwekwara ezigbo ihe kpatara ya. Ihe ndị mere ọ na-anaghị eme ihe niile a rịọrọ ya ọ̀ bụ ihe mmadụ na-agaghị amatali, ka ò kwuru ha na Baịbụl?

Jọn onyeozi kwuru isi ihe kpatara ya. Ọ sịrị: “Obi ike anyị nwere n’ebe ọ nọ bụ na ihe ọ bụla nke anyị rịọrọ ya dị ka uche ya si dị, ọ na-anụ olu anyị.” (1 Jọn 5:14) Tupu Chineke azaa ekpere anyị, arịrịọ anyị na uche ya ga-abụrịrị otu. Ụfọdụ ndị na-ekpe ekpere ka Chineke meere ha ihe o doro anya na ọ bụghị uche ya. Dị ka ihe atụ, ha na-arịọ ka ha merie na lọtrị ma ọ bụ ka ha rie ego ha na ndị ọzọ tiri n’aka. Ndị ọzọ na-ebu ihe na-adịghị mma n’obi ekpe ekpere. Jems, bụ́ onye na-eso ụzọ Jizọs, dọrọ anyị aka ná ntị ka anyị ghara ịna-ekpe ekpere otú ahụ, sị: “Unu na-arịọ, ma unu adịghị arịọta, n’ihi na ihe mere unu ji na-arịọ ezighị ezi, ka unu wee mefuo ya n’agụụ ihe ụtọ anụ ahụ́ nke na-agụ unu.”—Jems 4:3.

Weregodị ya na mba abụọ na-agba bọl. Mba nke ọ bụla n’ime ha ana-ekpe ekpere ka ha merie. Mmadụ ekwesịghị ịtụwa anya na Chineke ga-aza ekpere a na-ekpeku ya ka o meere otú ndị ihe ọma ma mejọọ ndị nke ọzọ. Ọ bụkwa otú ahụ ka ọ na-anaghị aza ekpere mba abụọ na-alụ agha n’oge a na-ekpe ka ha merie.

Chineke anaghị aza ekpere nke ndị na-eleda iwu ya anya. E nwere mgbe Jehova gwara ndị ji ihu abụọ na-efe ya ofufe, sị: “Ọ bụ ezie na unu na-ekpe ọtụtụ ekpere, adịghị m ege ntị; aka unu jupụtara n’ọbara.” (Aịzaya 1:15) Baịbụl kwuru, sị: “Onye na-ewepụ ntị ya ka ọ ghara ịnụ iwu—ọbụna ekpere ya bụ ihe arụ.”—Ilu 28:9.

Ma, Jehova na-ege ntị mgbe niile n’ekpere nke ndị ji ezi obi na-akpọku ya, bụ́ ndị ji ike ha dum na-efe ya ofufe otú ọ chọrọ. Ọ̀ pụtaziri na ọ ga na-emere ha ihe ọ bụla ha rịọrọ ya? Mba. Legodị ihe atụ ụfọdụ dị n’Akwụkwọ Nsọ.

Mozis na Chineke dị n’ezigbo mma; ma, tupu Chineke emeere ya ihe ọ rịọrọ, mara na ọ rịọrọ ya “dị ka uche [Chineke] si dị.” O nwere mgbe Mozis gwara Chineke ka o meere ya ihe na-abụghị nzube Chineke, ya bụ, ka o kwe ka ya banye n’ala Kenan. Ọ rịọrọ ya, sị: “Biko, ka m gafee hụ ezi ala ahụ nke dị n’ofe Jọdan.” Ma tupu mgbe ahụ, a gwara Mozis na ọ gaghị aba n’ala ahụ n’ihi mmehie o mere. Ya mere, kama imere Mozis ihe ọ rịọrọ, Jehova gwara ya, sị: “O zuworo gị! Agwakwala m okwu banyere ihe a ọzọ.”—Diuterọnọmi 3:25, 26; 32:51.

Pọl onyeozi kpere ekpere ka Chineke mee ka nsogbu ọ kpọrọ “ogwu n’anụ ahụ́” laa. (2 Ndị Kọrịnt 12:7) “Ogwu” a nwere ike ịbụ ọrịa anya na-anaghị ala ala ma ọ bụ nsogbu ndị mmegide na “ụmụ nna ụgha” na-enyekarị ya. (2 Ndị Kọrịnt 11:26; Ndị Galeshia 4:14, 15) Pọl dere, sị: “Ugboro atọ ka m rịọsiri Onyenwe anyị arịrịọ ike ka ihe a si n’ebe m nọ pụọ.” Ma, Chineke maara na ọ bụrụ na Pọl anọgide na-ekwusa ozi ọma n’agbanyeghị “ogwu n’anụ ahụ́” ahụ na-esogbu ya, ọ ga-edo anya na ọ bụ Chineke nyere ya ike nakwa na Pọl tụkwasịrị Ya obi kpamkpam. N’ihi ya, kama imere Pọl ihe ọ rịọrọ, Chineke gwara ya, sị: “A na-eme ka ike m zuo okè n’adịghị ike.”—2 Ndị Kọrịnt 12:8, 9.

N’eziokwu, Chineke ka anyị mara ma ọ̀ ga-akacha baara anyị uru ma o meere anyị ihe anyị rịọrọ ya. Jehova na-emere anyị ihe ga-abara anyị uru mgbe niile ma ọ bụrụ na arịrịọ anyị na nzube ya e dere na Baịbụl bụ otu.