Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE 2008-12-01

 Kụziere Ụmụ Gị Ihe

Ihe Mere na Devid Atụghị Egwu

Ihe Mere na Devid Atụghị Egwu

È NWERE mgbe egwu na-atụ gị?— * Ọtụtụ n’ime anyị na-atụ egwu mgbe ụfọdụ. Ọ bụrụ na egwu atụọ gị, gịnị ka i nwere ike ime?— I nwere ike ịgbakwuru onye tọrọ gị ma ọ bụ onye ka gị ike. O nwere ike mama gị ma ọ bụ papa gị enyere gị aka. Anyị nwere ọtụtụ ihe anyị ga-amụta n’aka Devid nke ga-eme ka anyị mata onye anyị ga-agakwuru ka o nyere anyị aka. Ọ bụkuru Chineke abụ, sị: “Mụ onwe m ga-atụkwasị gị obi. . . . Ọ bụ Chineke ka m tụkwasịrị obi; m gaghị atụ egwu.”—Abụ Ọma 56:3, 4.

Olee onye i chere Devid si n’aka ya mụta inwe obi ike? Ọ̀ bụ n’aka mama ya na papa ya?— Ọ ga-abụ n’aka ha ka o si mụta ya. Papa ya, bụ́ Jesi, kwesịrị ntụkwasị obi. Jesi bụkwa nna nna Jizọs Kraịst, onye Chineke kwere ná nkwa na ọ ga-abụ “Onyeisi Udo.” (Aịzaya 9:6; 11:1-3, 10) Obed bụ nna nna Devid, bụrụkwa papa Jesi. A kpọrọ otu akwụkwọ dị na Baịbụl aha mama Obed. Ị̀ ma aha mama Obed?— Ọ bụ Rut. Rut bụ ezigbo nwaanyị. Aha di ya bụ Boaz.—Rut 4:21, 22.

Rut na Boaz anwụọlarị kemgbe, tupu a mụọ Devid. O nwere ike ịbụ na ị ma aha mama Boaz, bụ́ nne nne Devid. O biri na Jeriko. O zoro ndị Izrel gara iledo Jeriko ka a ghara igbu ha. Mgbe a chọrọ ịkwatu mgbidi Jeriko, o kegidere eriri na-acha uhie uhie na windo ya, bụ́ nke mere ka e chebe ezinụlọ ya. Gịnị bụ aha ya?— Aha ya bụ Rehab. Ọ ghọrọ onye na-efe Jehova. Ọ bụ onye Ndị Kraịst kwesịrị iṅomi obi ike ya.—Jọshụa 2:1-21; 6:22-25; Ndị Hibru 11:30, 31.

Ọ ga-abụrịrị na mama Devid na papa ya kụziiri ya banyere ndị ohu Jehova ndị ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, n’ihi na e nyere ndị mụrụ ụmụ iwu ka ha na-akụziri ụmụ ha ụdị ihe ndị ahụ. (Diuterọnọmi 6:4-9) Ka oge na-aga, a gwara Samuel onye amụma ka ọ gaa họpụta Devid, bụ́ nwa nwoke ikpeazụ Jesi mụrụ, ka ọ bụrụ eze ga-achị Izrel n’ọdịnihu.—1 Samuel 16:4-13.

Otu ụbọchị, Jesi ziri Devid ka ọ gaa bugara ụmụnne ya atọ ndị tọrọ ya nri, bụ́ ndị ha na ndị iro Chineke, bụ́ ndị Filistia, na-alụ agha. Mgbe Devid ruru  n’ebe ahụ, ọ gbagara n’ọgbọ agha wee nụ ka otu dike, aha ya bụ Golayat, nọ ‘na-ama ndị agha nke Chineke dị ndụ aka.’ Ọ dịghị onye egwu kwere ka ọ pụta lụso Golayat agha. Mgbe Eze Sọl nụrụ na Devid chọrọ ịga, o ziri ozi ka a kpọọrọ ya Devid. Mgbe Sọl hụrụ Devid, ọ sịrị: “Ị ka bụ nwata.”

Devid gwara Sọl na o nwere mgbe ya gburu otu ọdụm na otu bea bịara iburu atụrụ ha. Devid wee sị na Golayat “ga-adị ka otu n’ime ha.” Sọl wee sị ya: ‘Gawa, ka Jehova nọnyere gị.’ Devid wee họrọ nkume ise kwọrọ mụrụmụrụ, wụnye ha n’akpa o ji azụ atụrụ, were èbè ya gawa ka ya na dike ahụ lụọ agha. Mgbe Golayat hụrụ ka nwatakịrị na-abịakwute ya, o tiri mkpu, sị: “Bịa m nso, m ga-ewere anụ gị nye [nnụnụ].” Ma, Devid sịrị ya: “M ji aha Jehova . . . na-abịa izute gị.” O tikwara mkpu, sị: “M ga-egbukwa gị.”

Devid wee gbara ọsọ gawa n’ebe Golayat guzo, were otu nkume n’akpa ya, tinye ya n’èbè ya ma gbaa ya Golayat n’egedege ihu. Mgbe ndị Filistia hụrụ na dike ha anwụọla, ụjọ tụrụ ha, ha amalite ịgba ọsọ. Ndị Izrel wee chụwa ha ọsọ, wee merie ha. Biko, gị na ezinụlọ gị gụọ akụkọ a dum, nke dị na 1 Samuel 17:12-54.

Mgbe ụfọdụ, egwu nwere ike ime ka ị ghara ịchọ ime ihe Chineke nyere n’iwu maka na ị ka bụ nwata. Jeremaya tụrụ egwu mgbe ọ bụ nwata, ma, Chineke gwara ya, sị: ‘Atụla ụjọ, n’ihi na anọnyeere m gị.’ Jeremaya nwere obi ike wee kwuo ihe Chineke gwara ya ka o kwuo. Ọ bụrụ na ị tụkwasị Jehova obi dị ka Devid na Jeremaya mere, gị onwe gị agaghị na-atụ egwu.—Jeremaya 1:6-8.

^ para. 3 Ọ bụrụ ụmụaka ka ị na-agụrụ akụkọ a, akara ùhiè ndị dị n’isiokwu a na-echetara gị ka ị kwụsịtụ ma jụọ ha ajụjụ ndị ahụ.