Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE 2008-11-01

 Ihe Ndị Na-eme Ka E Nwee Obi Ụtọ n’Ezinụlọ

Ime Ka Obi Gị Dum Dịgide n’Ebe Nwunye Gị Ma Ọ Bụ Di Gị Nọ

Ime Ka Obi Gị Dum Dịgide n’Ebe Nwunye Gị Ma Ọ Bụ Di Gị Nọ

Nwunye ya sịrị: “M chọpụtara na kemgbe oge na-adịbeghị anya na obi di m, bụ́ Michael, adịkwaghị n’ebe m nọ, ọ naghị emesapụkwara mụ na ụmụ anyị ihu. * Omume ya gbanwere ozugbo anyị malitere inweta Ịntanet na kọmputa anyị, m wee chee na ọ ga-abụ na ọ na-ekiri ihe na-akpali agụụ mmekọahụ na kọmputa ahụ. N’otu abalị, mgbe ụmụ anyị lakpurula ụra, m jụrụ ya, o wee gwa m na ya na-ekiri ihe na-akpali agụụ mmekọahụ n’Ịntanet. O wutere m nke ukwuu. O siiri m ike ikweta na ụdị ihe a ga-eme m. Enweghịzi m ntụkwasị obi n’ebe ọ nọ. Nke ka njọ bụ na otu nwoke mụ na ya na-arụkọ ọrụ malitere ịchụ m.”

Di ya sịrị: “N’oge na-adịbeghị anya, nwunye m, bụ́ Maria, hụrụ foto m tinyere na kọmputa anyị wee jụọ m ihe m ji ya eme. Mgbe m gwara ya na m na-agakarị n’ebe a na-ekiri ihe na-akpali agụụ mmekọahụ n’Ịntanet, iwe were ya nke ukwuu. Ihere onwe m mere m, obi m makwara m ikpe. M chere na ihe a ga-etisa mụ na nwunye m.”

GỊNỊ ka i chere mere alụmdi na nwunye Michael na Maria? I nwere ike iche na nsogbu kachanụ Michael nwere bụ ikiri ihe na-akpali agụụ mmekọahụ. Ma, Michael ghọtara na nke ahụ bụ naanị ihe àmà na-egosi na ha nwere nsogbu ka ukwuu, ya bụ, na obi ha dum adịkwaghị n’alụmdi na nwunye ha. * Mgbe Michael na Maria lụrụ, ha tụrụ anya na ha ga-ahụ ibe ha n’anya ma na-emekọ ihe ọnụ. Ma, dị ka o merela ọtụtụ di na nwunye, obi ha ji nke nta nke nta pụọ n’ebe ibe ha nọ, ịhụnanya ha nwere n’ebe ibe ha nọ wee jụọ oyi.

Ọ̀ dị gị ka gị na nwunye gị ma ọ bụ di gị ahụkwaghị onwe unu n’anya otú unu hụrụ onwe unu mgbe unu lụrụ? Ị̀ ga-achọ ka unu dịghachi ná mma otú unu dịbu? Ọ bụrụ otú ahụ, i kwesịrị ịmata azịza nke ajụjụ atọ a: Gịnị ka obi mmadụ ịdịgide n’ebe nwunye ya ma ọ bụ di ya nọ pụtara? Gịnị nwere ike ime ka obi mmadụ pụọ n’ebe nwunye ya ma ọ bụ di ya nọ? Gịnị ka i nwere ike ime iji mee ka obi gị dum dịgide n’ebe nwunye gị ma ọ bụ di gị nọ?

Gịnị Ka Obi Mmadụ Ịdịgide n’Ebe Nwunye Ya Ma Ọ Bụ Di Ya Nọ Pụtara?

Gịnị ka ị ga-aza ma à jụọ gị ihe mere obi mmadụ kwesịrị iji dịgide n’ebe nwunye ya ma ọ bụ di ya nọ? Ọtụtụ ndị ga-asị na ọ bụ iji mezuo iwu. Dị ka ihe atụ, di na nwunye nwere ike nọgide na-ebi n’ihi ụmụ ha ma ọ bụkwanụ n’ihi na ha  achọghị ịkpasu Chineke iwe, bụ́ Onye malitere alụmdi na nwunye. (Jenesis 2:22-24) N’ezie, ihe abụọ a dịcha mma, ha ga-enyekwara di na nwunye aka mgbe nsogbu bịara n’alụmdi na nwunye ha. Ma, ọ bụrụ na di na nwunye chọrọ inwe obi ụtọ, ịnọgide na-ebi naanị iji mezuo iwu ezughị.

Jehova bụ́ Chineke mere alụmdi na nwunye ka ọ na-enye di na nwunye ezigbo ọṅụ na obi ụtọ. Chineke chọrọ ka nwoke ‘ṅụrịa ọṅụ n’ihi nwunye’ ya nakwa ka nwaanyị hụ di ya n’anya. Ọ chọkwara ka nwoke mee ka nwunye ya ghọta na ya hụrụ ya n’anya otú ọ hụrụ onwe ya. (Ilu 5:18; Ndị Efesọs 5:28) Ọ bụrụ na di na nwunye ga-enwe ụdị ịhụnanya a n’ebe ibe ha nọ, ha aghaghị ịtụkwasị ibe ha obi. Ihe ọzọ dịkwa oké mkpa bụ na ha kwesịrị ịbụ ezigbo enyi n’oge niile ha dị ndụ. Ọ bụrụ na di agbalịsie ike mee ka nwunye ya tụkwasị ya obi, nwunye ya emeekwa otú ahụ, ọ bụrụkwa na ha agbalịa bụrụ ezigbo enyi, obi ha dum ga-adịgide n’ebe ibe ha nọ. Ha ga na-akpachi anya nke na ha abụọ ga-aghọ “otu anụ ahụ́” dị ka Baịbụl kwuru.—Matiu 19:5.

Ya mere, obi di na nwunye ịdịgide n’ebe ibe ha nọ yiri simenti e ji edo blọk nke na-eme ka ụlọ sie ike. Tupu e jiri simenti doo blọk, a na-agwa ya ájá na mmiri. N’otu aka ahụ, e nwere ihe ndị ọzọ dị mkpa ga-eme ka obi mmadụ dịrị n’ebe nwunye ya ma ọ bụ di ya nọ, ihe ndị dị ka di na nwunye ịtụkwasị ibe ha obi, ịbụ enyi ibe ha na onye nke ọ bụla ịrụ ọrụ o kwesịrị ịrụ. Olee ihe nwere ike imebi adịm ná mma di na nwunye?

Olee Ihe Ndị Nwere Ike Ime Ka O Siere Ha Ike?

Ihe ndị dị mkpa ga-eme ka obi di na nwunye dịgide n’ebe ibe ha nọ bụ mgbalị siri ike na ịhapụ ịchọ ọdịmma onwe onye naanị. Ihe nke a chọrọ n’aka gị bụ iji obi dum na-eleghara ihe masịrị gị anya iji mee ka obi dị nwunye gị ma ọ bụ di gị mma. Otú ọ dị, ndị mmadụ anaghịzi achọ ime ihe ga-adị ndị ọzọ mma, ya bụ, imere ndị ọzọ ihe ọma n’enwetaghị ihe ọ bụla n’aka ha. Ma, jụọ onwe gị, sị, ‘Mmadụ ole n’ime ndị na-achọ ọdịmma onwe ha ka m̀ maara alụmdi na nwunye ha na-agazi agazi?’ Azịza ya bụ na ha dị ole na ole, ma ọ bụrụkwa na e nwere. Ọ̀ bụ n’ihi gịnị? N’ihi na obi onye na-achọ ọdịmma onwe ya naanị agaghị adịgide n’ebe nwunye ya ma ọ bụ di ya nọ ma ọ bụrụ na o nwere ihe ọ ga-efu ya, nke ka nke, ma ọ bụrụ na o nweghị uru ọ ga-erite ozugbo n’obere ihe ụfọdụ o meere nwunye ya ma ọ bụ di ya. Ọ bụrụ na obi mmadụ adịghị n’ebe nwunye ya ma ọ bụ di ya nọ, alụmdi na nwunye ha ga-agbụ ya, n’agbanyeghị otú ha si hụ onwe ha n’anya ná mmalite.

Baịbụl kwuru hoo haa na alụmdi na nwunye chọrọ mgbalị siri ike. Ọ sịrị na “onye lụrụ nwaanyị na-echegbu onwe ya maka ihe nke ụwa, otú ọ pụrụ isi mee ihe dị nwunye ya mma,” sịkwa na “nwaanyị lụrụ di na-echegbu onwe ya maka ihe nke ụwa, otú ọ pụrụ isi mee ihe dị di ya mma.” (1 Ndị Kọrịnt 7:33, 34) Ọ dị mwute na ọbụna di ma ọ bụ nwunye na-anaghị achọkarị ọdịmma onwe ya naanị anaghị aghọta mgbe niile na e nwere ihe na-enye nwunye ya ma ọ bụ di ya nsogbu ma ọ bụ ghọta ihe nwunye ya ma ọ bụ di ya na-emere ya. Ọ bụrụ na di na nwunye anaghị egosi ibe ha obi ekele, o doro anya na ha ga na-enwekwu “mkpagbu n’anụ ahụ́ ha.”—1 Ndị Kọrịnt 7:28.

Ọ bụrụ na ị chọrọ ka gị na nwunye gị ma ọ bụ di gị nọgide na-ebi n’oge nsogbu ma na-enwe obi ụtọ n’oge ihe dị mma, i kwesịrị iwere alụmdi na nwunye gị dị ka ihe na-agaghị ebi ebi. Olee otú i nwere ike isi na-ele alụmdi na nwunye gị anya otú ahụ? Oleekwa otú ị ga-esi gbaa nwunye gị ma ọ bụ di gị ume ka obi ya dum dịgide n’ebe ị nọ?

Otú Ị Ga-esi Mee Ka Obi Gị Dum Dịgide n’Ebe Nwunye Gị Ma Ọ Bụ Di Gị Nọ

Otu ihe dị mkpa bụ iji obi umeala na-etinye ndụmọdụ dị n’Okwu Chineke, bụ́ Baịbụl, n’ọrụ. Ọ bụrụ na i mee otú ahụ, ‘ọ ga-abara gị uru,’ baakwara nwunye gị ma ọ bụ di gị. (Aịzaya 48:17) Tụlee naanị ụzọ ihe abụọ i nwere ike ime.

Na-ewepụta oge gị na nwunye gị ma ọ bụ di gị ga-eji na-anọrị

1. Jiri alụmdi na nwunye gị kpọrọ ihe.

Pọl onyeozi dere, sị, “Chọpụta ihe ndị ka mkpa.” (Ndị Filipaị 1:10) Otú di na nwunye si emeso ibe ha ihe dị mkpa nke ukwuu n’anya Chineke. Ọ bụrụ na nwoke na-akwanyere nwunye ya ùgwù, Chineke ga-akwanyere ya ùgwù. Nwaanyị  nke na-asọpụrụ di ya “bara uru nke ukwuu n’anya Chineke.”—1 Pita 3:1-4, 7.

Olee otú alụmdi na nwunye gị dịruru gị ná mkpa? Ọ bụrụ na ihe dị mmadụ mkpa, onye ahụ na-ewepụta oge dị ukwuu maka ya. Jụọ onwe gị, sị: ‘Kemgbe ọnwa ole na ole, olee otú oge m wepụtarala ka mụ na nwunye m ma ọ bụ di m nọrịa hà? Olee kpọmkwem ihe ndị m merela iji mee ka obi sie nwunye m ma ọ bụ di m ike na mụ na ya ka bụ ezigbo enyi?’ Ọ bụrụ na ị naghị ewepụta oge iji na-elebara nwunye gị ma ọ bụ di gị anya, ọ ga-esiri ya ike ikwere na obi gị dị n’ebe ọ nọ.

Nwunye gị ma ọ bụ di gị ò chere na obi gị dị n’ebe ọ nọ? Olee otú ị ga-esi chọpụta?

LEE MA Ị̀ GA-EME IHE A: Dee ihe ise ndị a ná mpempe akwụkwọ: ego, ọrụ, alụmdi na nwunye, ntụrụndụ, na ndị enyi. Dee ha n’usoro. Bute ndị nke i chere kacha nwunye gị ma ọ bụ di gị mkpa ụzọ. Gwa nwunye gị ma ọ bụ di gị ka o deekwa banyere gị. Mgbe unu dechara, were ihe i dere nye nwunye gị ma ọ bụ di gị, ya werekwa nke o dere nye gị. Ọ bụrụ na nwunye gị ma ọ bụ di gị chere na oge ị na-ewepụta maka alụmdi na nwunye unu ebughị ibu ma ọ bụ na mgbalị ị na-eme ezughị, gị na ya kwurịta mgbanwe unu kwesịrị ime iji mee ka obi unu dịrị n’ebe ibe unu nọ. Jụọkwa onwe gị, sị, ‘Olee ihe m nwere ike ime iji nwekwuo mmasị n’ihe ndị dị nwunye m ma ọ bụ di m mkpa?’

Ịkpa n’èzí na-amalite n’obi

2. Zere ịkpa n’èzí.

Jizọs Kraịst sịrị: “Onye ọ bụla nke na-ele nwaanyị anya, o wee gụọ ya agụụ ka ya na ya nwee mmekọahụ, ọ kwasowo ya iko n’obi ya.” (Matiu 5:28) Ọ bụrụ na di ma ọ bụ nwunye na onye ọzọ enwee mmekọahụ, o mebiela alụmdi na nwunye ha, bụ́ nke Baịbụl kwuru nwere ike ime ka di na nwunye gbaa alụkwaghịm. (Matiu 5:32) Ma, ihe Jizọs kwuru nke e dere n’amaokwu a na-egosi na ọchịchọ na-ezighị ezi nwere ike ịdị mmadụ n’obi ruo ogologo oge tupu onye ahụ na nwaanyị ọzọ ma ọ bụ nwoke ọzọ akwaa iko. Inwe ụdị ọchịchọ a na-ezighị ezi bụ mmadụ imejọ nwunye ya ma ọ bụ di ya.

Iji mee ka obi gị dịgide n’ebe nwunye gị ma ọ bụ di gị nọ, kpebisie ike na ị gaghị ekiri ihe na-akpali agụụ mmekọahụ. N’agbanyeghị ihe ndị mmadụ na-ekwu, mmadụ ikiri ihe na-akpali agụụ mmekọahụ bụ imebi alụmdi na nwunye ya. Lee ihe otu nwaanyị kwuru banyere ihe di ya chere banyere ikiri ihe na-akpali agụụ mmekọahụ: “Di m sịrị na ikiri ihe na-akpali agụụ mmekọahụ na-eme ka mmekọahụ mụ na ya tọkwuo ụtọ. Ma, ihe ọ na-eme m bụ ime ka m chee na mụ abaghị uru, na mụ ezughịrị ya. M na-ebegide ákwá ruo mgbe ụra buuru m ma o kiriwe ya.” Ị̀ ga-asị na nwoke a na-eme ka obi ya dịgidesie ike n’ebe nwunye ya nọ, ka ị̀ ga-asị na ọ na-emebi  alụmdi na nwunye ha? Ì chere na ọ na-eme ka ọ dịrị nwunye ya mfe itinyesi obi ya ike n’ebe ọ nọ? Omume ya ò gosiri na nwunye ya bụ ezigbo enyi ya?

Nwoke kwesịrị ntụkwasị obi bụ́ Job gosiri na obi ya dị n’ebe nwunye ya nọ nakwa n’ebe Chineke nọ site n’ime ka ‘ya na anya ya gbaa ndụ.’ O kpebisiri ike na ya agaghị enwe “mmasị n’ebe nwa agbọghọ na-amaghị nwoke nọ.” (Job 31:1) Olee otú i nwere ike isi ṅomie Job?

E wezụga izere ikiri ihe na-akpali agụụ mmekọahụ, i kwesịrị iche obi gị nche ka ị ghara inwe mmasị na-ekwesịghị ekwesị n’ebe nwaanyị ọzọ ma ọ bụ nwoke ọzọ nọ. N’eziokwu, ọtụtụ ndị chere na di ma ọ bụ nwunye na onye na-abụghị nwoke ibe ya ma ọ bụ nwaanyị ibe ya ịkpa enweghị ihe ọ na-eme alụmdi na nwunye. Ma, Okwu Chineke dọrọ anyị aka ná ntị, sị: “Obi dị aghụghọ karịa ihe ọ bụla ọzọ, o sikwara ike njite. Ònye pụrụ ịmara ya?” (Jeremaya 17:9) Obi gị ọ̀ na-aghọ gị aghụghọ? Jụọ onwe gị, sị: ‘Olee onye m ka nwee mmasị n’ebe ọ nọ? Ọ̀ bụ nwunye m ma ọ bụ di m, ka ọ̀ bụ nwaanyị ọzọ ma ọ bụ nwoke ọzọ? Olee onye m na-ebu ụzọ akọrọ ozi ọma m nụrụ? Ọ̀ bụ nwunye m ma ọ bụ di m, ka ọ̀ bụ onye ọzọ? Ọ bụrụ na nwunye m ma ọ bụ di m agwa m ka m kwụsị otú mụ na onye na-abụghị nwoke ibe m ma ọ bụ nwaanyị ibe m si akpa, olee ihe m ga-eme? Iwe ọ̀ ga-eju m obi, ka m̀ ga-eme mgbanwe ahụ ọ chọrọ ka m mee?’

LEE MA Ị̀ GA-EME IHE A: Ọ bụrụ na ị chọpụta na ị na-enwe mmasị n’ebe nwaanyị ọzọ ma ọ bụ nwoke ọzọ nọ, ka mkpakọrịta gị na onye ahụ bụrụ naanị mgbe ọ dị ezigbo mkpa. E lekwasịla anya n’ihe ndị i chere onye ahụ ji kara nwunye gị ma ọ bụ di gị mma. Kama nke ahụ, lekwasị anya n’àgwà ndị dị mma nwunye gị ma ọ bụ di gị nwere. (Ilu 31:29) Na-echeta ihe mere i ji malite ịhụ nwunye gị ma ọ bụ di gị n’anya. Jụọ onwe gị, sị, ‘Ọ̀ bụ eziokwu na nwunye m ma ọ bụ di m enwekwaghị àgwà ndị ahụ, ka ọ̀ ga-abụ na mụ anakwaghị ahụ ha?’

Bute Ụzọ n’Idozi Alụmdi na Nwunye Gị

Michael na Maria, bụ́ ndị e dere ihe ha kwuru ná mmalite isiokwu a, kpebiri ịnata ndụmọdụ ga-enyere ha aka idozi nsogbu ha. Ma, ịnata ndụmọdụ ka bụ naanị mmalite. Kama ịgbara nsogbu ha ọsọ, Michael na Maria rịọrọ ka e nyere ha aka wee si otú a gosi na obi ha ka dị n’ebe ibe ha nọ, na ha dị njikere ịrụsi ọrụ ike iji mee ka alụmdi na nwunye ha gazie agazi.

Ma alụmdi na nwunye gị ọ̀ na-agazi agazi ma ọ̀ na-enwe nsogbu, ọ dị mkpa ka i gosi nwunye gị ma ọ bụ di gị na obi gị dị n’ebe ọ nọ nakwa na ị chọrọ ime ka alụmdi na nwunye unu na-agazi agazi. Mee ihe niile kwesịrị ekwesị iji mee ka obi sie nwunye gị ma ọ bụ di gị ike na nke ahụ bụ eziokwu. Ị̀ dị njikere ime ya?

^ para. 3 A gbanwere aha ha.

^ para. 5 Ọ bụ ezie na onye a nke kiriri ihe na-akpali agụụ mmekọahụ bụ nwoke, nwaanyị nke kiriri ụdị ihe a na-egosikwa na obi ya dum adịkwaghị n’ebe di ya nọ.

JỤỌ ONWE GỊ, SỊ . . .

  • Olee ihe ụfọdụ m nwere ike ịkwụsịlata iji nwekwuo oge mụ na nwunye m ma ọ bụ di m ga-eji na-anọrị?

  • Olee ihe m nwere ike ime iji mee ka obi sie nwunye m ma ọ bụ di m ike na obi m dị n’ebe ọ nọ?

GỤKWUO GBASARA YA

Gịnị Ga-eme Ka Obi Na-adị Ezinụlọ Ụtọ?

Jehova bụ onye obi ụtọ. Ọ chọrọ ka ezinụlọ na-enwe obi ụtọ. Gụọ ihe Baịbụl gwara ndị bụ́ di, ndị bụ́ nwunye, ndị nne na nna na ụmụaka.