Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE 2008-08-01

 Ihe Ndị Na-eme Ka E Nwee Obi Ụtọ n’Ezinụlọ

Ndị Nne na Nna na Ụmụ Ha Na-eto Eto Ikwurịta Okwu nke Ọma

Ndị Nne na Nna na Ụmụ Ha Na-eto Eto Ikwurịta Okwu nke Ọma

“Na mbụ, mụ na nwa m nwoke na-ekwurịta okwu nke ọma. Ma, ugbu a ọ dị afọ iri na isii, ọ na-esiri mụ na di m ike ịma ihe dị ya n’obi. Ọ na-anọ naanị ya n’ime ụlọ ya, ọ na-esikwa ike tupu ya atụpụrụ anyị ọnụ!”—MIRIAM, MEXICO.

“O nwere mgbe ọ na-amasị ụmụ m nke ukwuu ka m kọwara ha akụkọ. Ha na-egekwa m ntị! Ma, ugbu a ha bụ okorobịa na agbọghọbịa, ha na-eche na amaghị m nke a na-akọ.”—SCOTT, AUSTRALIA.

Ọ BỤRỤ na nwa gị ka na-eto eto, ị ga-aghọta otú obi dị nwoke na nwaanyị a e dere ihe ha kwuru n’elu. N’oge gara aga, mkparịta ụka gị na nwa gị nwere ike na-aga were were dị ka ụgbọala si aga n’okporo ụzọ awara awara. Ugbu a, o yiri ka ụzọ ahụ akpọchiela. Otu nwaanyị Italy aha ya bụ Angela kwuru, sị: “Mgbe nwa m nwoke dị obere, ọ na-ajụ m ọtụtụ ajụjụ. Ma, ugbu a ọ bụ m na-amalite mkparịta ụka mụ na ya. Ọ bụrụ na m emeghị otú ahụ, anyị nwere ike ịnọ ọtụtụ ụbọchị n’akparịtaghị ezigbo ụka.”

Dị ka Angela chọpụtara, ikekwe ị chọpụtala na nwa gị ọ na-anaghị esiri ike ikwu okwu mgbe ọ bụ nwata, bụzi nwa agbọghọ ma ọ bụ nwa okorobịa na-anaghị atụpụrụ mmadụ ọnụ. O nweghị ezigbo ihe ọ na-ekwu n’agbanyeghị mgbalị niile ị na-eme ka gị na ya kparịta ụka. Ọ bụrụ na ị jụọ nwa gị nwoke, sị, “Olee otú ihe si gaa taa?” Ya azaa gị ngwa ngwa, sị, “Ọ dị mma.” Ọ bụrụ na ị jụọ nwa gị nwaanyị, sị, “Gịnị mere n’ụlọ akwụkwọ unu taa?” Ya adụọ n’ubu, sị, “O nweghị.” Ọ bụrụ na ị nwaa anwaa chọọ ka o kwutụkwuo okwu wee sị ya, “kọọrọnụ m ihe merenụ,” ọ gaghịzi atụpụrụ gị ọnụ.

O doro anya na ọ naghị esiri ụfọdụ ndị na-eto eto ike ịgwa ndị mụrụ ha okwu. Ma, ihe ha na-ekwu abụghị ihe ndị mụrụ ha chọrọ ịnụ. Otu nwaanyị onye Nigeria nke aha ya bụ Edna kwuru, sị: “Mgbe ọ bụla m gwara nwa m nwaanyị ihe ọ ga-eme, ihe ọ na-ekwukarị bụ, ‘Hapụ m aka.’” Ramón, onye Mexico, kwuru ihe yiri nke ahụ banyere nwa ya nwoke nke dị afọ iri na isii. Ọ sịrị: “Ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ụbọchị niile ka mụ na ya na-ese okwu. Mgbe ọ bụla m gwara ya ihe ọ ga-eme, ọ na-agwa m ihe mere ọ na-agaghị eji mee ya.”

Ike nwere ike ịgwụ nne ma ọ bụ nna nke na-agbalị ka ya na nwa ya na-akparịta ụka nke ọma, ma ọ bụrụ na nwa ahụ anaghị atụpụrụ ya ọnụ. Baịbụl kwuru na “atụmatụ na-aghasasị ma ọ bụrụ na a gbaghị izu.” (Ilu 15:22) Otu nwaanyị Russia nke aha ya bụ Anna, onye naanị ya na-azụ ụmụ ya, kwuru, sị: “Ọ bụrụ na amaghị m ihe dị nwa m nwoke n’obi, iwe na-ewe m nke na ọ na-adị m ka mụ baara ya mba.” Gịnị mere o ji adị ka ndị mụrụ ụmụ na ụmụ ha na-eto eto hà na-akwụsị ikwurịta okwu nke ọma mgbe ikwurịta okwu kacha dịrị mkpa?

Ịmata Ihe Na-egbochi Ezi Nkwurịta Okwu

Ikwurịta okwu nke ọma abụghị naanị mmadụ ịtụpụrụ mmadụ ibe ya ọnụ. Jizọs sịrị na ‘ọ bụ ihe  jupụtara mmadụ n’obi ka ọnụ ya na-ekwu.’ (Luk 6:45) Ya mere, ezi nkwurịta okwu na-eme ka anyị mụta ihe n’aka ndị ọzọ, na-emekwa ka ndị ọzọ mata ihe ụfọdụ banyere anyị. Ọ na-esiri ndị na-eto eto ike ikwe ka ndị ọzọ mara ihe ụfọdụ banyere ha, n’ihi na nwatakịrị ọ na-anaghị esiri ike ikwu okwu nwere ike ghọọ onye na-anaghị atụpụrụ mmadụ ọnụ ozugbo ọ malitere ito. Ndị ọkachamara na-ekwu na ndị na-eto eto na-echekarị na ndị mmadụ na-ekiri ha ma na-ahụ ihe niile ha na-eme. Kama ikwe ka a na-ahụ ihe niile ha na-eme, ndị na-eto eto ndị ihere na-eme nwere ike ịnọrọ onwe ha ma zochiere ndị mụrụ ha ihe ha na-eme.

Ihe ọzọ nwere ike igbochi ezi nkwurịta okwu bụ na ọ na-amasị ndị na-eto eto inwere onwe ha. Nke bụ́ eziokwu bụ na nwa gị ka na-eto eto, otu n’ime ihe na-egosi na ọ ka na-eto eto bụ na ọ ga na-achọ ịnọrọ onwe ya. Ma, nke a apụtaghị na nwa gị na-eto eto eruola ibiri onwe ya. N’ọtụtụ ụzọ, enyemaka gị dị ya mkpa ugbu a karịa mgbe ọ bụla ọzọ. Ma, ọtụtụ afọ tupu ya ebiri onwe ya, ọ na-eji nwayọọ nwayọọ malite inwere onwe ya. Ọ na-amasị ọtụtụ ndị na-eto eto ibu ụzọ chee ihe ha chọrọ ime echee tupu ha emee ka ndị ọzọ mara ya. Nke a bụ otu n’ime ihe na-egosi na ha amalitela ito.

Ma, ndị na-eto eto anaghị ezoro ndị ọgbọ ha ihe dị ha n’obi. Otu nwaanyị Mexico nke aha ya bụ Jessica chọpụtara na nke a bụ eziokwu. Ọ sịrị: “Mgbe nwa m nwaanyị bụ nwa, ọ na-abịakwute m mgbe ọ bụla o nwere nsogbu. Ma ugbu a, ọ na-agakwuruzi ndị enyi ya.” Ọ bụrụ na nwa gị na-eto eto na-eme otú ahụ, echela na ọ jụla gị. Otú ọ dị, nnyocha ndị e merela na-egosi na ọ bụrụgodị na ndị na-eto eto ekwetaghị na ndụmọdụ ndị mụrụ ha ka mma, ha na-eji ya akpọrọ ihe karịa ndụmọdụ ndị enyi ha. Ma, olee ihe ị ga-eme ka gị na nwa gị na-eto eto nọgide na-ekwurịta okwu nke ọma?

Wepụ Ihe Mgbochi Ahụ, Iji Nwee Ihe Ịga nke Ọma

Ka e were ya na ị nya ụgbọala na-aga n’okporo ụzọ awara awara dị anya, nke na-agbagọghị agbagọ. Ị gbaala ọtụtụ kilomita, ma, ọ bụ naanị ugboro ole na ole ka ị hịgharịtụrụ ihu ụgbọala gị. Na mberede, gị erute n’ebe ụzọ ahụ gbagọrọ agbagọ. Ị ghaghị ịhịgharị ihu ụgbọala gị ka o wee ghara ịmaba n’ọhịa. Ọ bụ otú a ka ọ dị nwa gị mgbe ọ malitere ito. O nwere ike ịbụ na gị na nwa gị na-ekwurịta okwu nke ọma kemgbe ọtụtụ afọ. Ma, ka ọ dị ugbu a, ndụ nwa gị agbanweela nke ukwuu, ị ghaghị ‘ịhịgharị ya ihu ka ọ ghara ịmaba n’ọhịa’ site n’ịgbanwe otú gị na ya si ekwurịta okwu. Jụọ onwe gị ajụjụ ndị a.

‘Mgbe nwa m nwoke ma ọ bụ nwa m nwaanyị chọrọ ka mụ na ya kwuo okwu, m na-enwe mmasị mgbe ahụ?’ Baịbụl kwuru, sị: “Dị ka mkpụrụ osisi apụl ọlaedo nke dị n’ime ihe e ji ọlaọcha tụọ, otú ahụ ka okwu e kwuru n’oge kwesịrị ya dị.” (Ilu 25:11) Amaokwu a mere ka o doo anya na ime ihe n’oge kwesịrị ekwesị dị oké mkpa. Dị ka ihe atụ: Onye ọrụ ubi enweghị ike ime ka oge iwe ihe ubi bịa ngwa ngwa tupu oge ya, o nweghịkwa ike ime ka ọ ghara ịbịa mgbe oge ya ruru. Naanị ihe ọ ga-eme bụ iwe ihe ubi ya mgbe oge ya ruru. Nwa gị na-eto eto nwere ike inwe oge na-amasị ya ikwu okwu. Ekwela ka oge ahụ gafenahụ gị. Otu nwaanyị Australia naanị ya na-azụ ụmụ ya, onye aha ya bụ Frances, kwuru, sị: “Ọtụtụ mgbe, nwa m nwaanyị na-abata n’ụlọ m n’abalị, ọ na-anọru otu awa mgbe ụfọdụ. Ọ naghị amasị m ịmụ anya n’abalị, ya mere, ọ naghị adịrị m mfe. N’agbanyeghị nke ahụ, anyị na-ekwu ọtụtụ ihe n’ime abalị ndị ahụ.”

LEE MA Ị̀ GA-EME IHE A: Ọ bụrụ na nwa gị na-eto eto achọghị ka gị na ya kwurịta okwu, gị na ya mekọọ ihe ọnụ—gị na ya soro gagharịa, bugharịa ya n’ụgbọala, gị na ya zụọ okwe, ma ọ bụ rụkọọ ọrụ dị n’ụlọ ọnụ. Ọtụtụ mgbe, imekọ ihe ọnụ otú a na-eme ka ndị na-eto eto nwekwuo mmasị ikwu okwu.

‘M̀ na-esi n’ihe ọ na-ekwu na-aghọta otú obi dị ya?’ Job 12:11 kwuru, sị: “Ntị ọ̀ dịghị anwale okwu dị ka okpo ọnụ si anụ ụtọ ihe oriri?” Karịa mgbe ọ bụla ọzọ, ọ bụ ugbu a ka i kwesịrị ‘ịnwale’ ihe nwa gị nwoke ma ọ bụ nwa gị nwaanyị na-ekwu. Ndị na-eto eto na-ekwukarị okwu dị ka à ga-asị na ihe ha na-ekwu bụ eziokwu. Dị ka ihe atụ, nwa gị nwoke ma ọ bụ nwa gị nwaanyị nwere ike ịsị, “Ị na-emekarị m ka m̀ bụ nwata!” ma ọ bụ “Ọ dịghị mgbe ị na-ege ntị n’ihe m na-ekwu!” Kama gị na ya ịrụwa ụka n’ihe ahụ  ọ na-ekwetaghị, ghọta na ikekwe otú ahụ o si kwuo ya abụchaghị otú ọ dị ya n’obi. Dị ka ihe atụ, “Ị na-emekarị m ka m̀ bụ nwata” nwere ike ịbụ “Ọ dị m ka ị tụkwasịghị m obi.” “Ọ dịghị mgbe ị na-ege ntị n’ihe m na-ekwu” nwere ike ịbụ “M chọrọ ịgwa gị otú obi dị m.” Gbaa mbọ ka i si n’ihe ọ na-ekwu ghọta otú obi dị ya.

LEE MA Ị̀ GA-EME IHE A: Ọ bụrụ na nwa gị na-eto eto ekwuo okwu na-egosi na iwe ji ya, i nwere ike ịgwa ya, sị: “M chọpụtara na iwe ji gị, gwa m ihe na-ewe gị iwe. Gwa m ihe mere i ji kwuo na m na-eme gị ka ị̀ bụ nwata.” Mgbe ahụ gee ya ntị, anapụkwala ya okwu n’ọnụ.

‘Mgbe m na-amanye nwa m ka o kwuo okwu, ọ̀ ga-abụ na m na-emebi mkparịta ụka mụ na ya n’amaghị ama?’ Baịbụl kwuru, sị: ‘A na-agha mkpụrụ nke ezi omume n’ebe udo dị maka ndị na-eme udo.’ (Jems 3:18) Jiri okwu ọnụ gị na omume gị mee ka “udo” dịrị, ka obi wee ruo nwa gị na-eto eto ala ikwu okwu. Cheta na ị dị ka ọkàiwu na-ekpechitere nwa gị ọnụ ya. Mgbe gị na ya na-ekwu okwu, agwala ya okwu dị ka à ga-asị na ị bụ ọkàiwu na-ekpechite ọnụ onye ya na ya nwere okwu n’ụlọikpe. Otu nna bụ́ onye Korea nke aha ya bụ Ahn kwuru, sị: “Nne ma ọ bụ nna maara ihe anaghị asị nwa ya, ‘Olee mgbe ị ga-akwụsị ime ka nwata?’ ma ọ bụ, ‘Ugboro ole ka m gwarala gị ihe a,’ ma ọ bụ ihe yiri ihe ndị a. Mgbe m gwara ụmụ m ụdị okwu a ọtụtụ ugboro, m chọpụtara na otú m si gwa ha ya na ihe m gwara ha were ha iwe.”

LEE MA Ị̀ GA-EME IHE A: Ọ bụrụ na nwa gị na-eto eto atụpụrụghị gị ọnụ mgbe ị jụrụ ya ajụjụ, lee ma ị̀ ga-esi ụzọ ọzọ gwa ya ihe ị chọrọ ịgwa ya. Dị ka ihe atụ, kama ịjụ nwa gị nwaanyị otú ụbọchị si gaa, gwa ya otú ụbọchị nke gị si gaa, ka i wee mara ma ọ̀ ga-etinye ọnụ. Ma, ọ bụkwanụ, ọ bụrụ na ị chọrọ ịmara ihe bụ echiche nwa gị n’ihe ụfọdụ, jụọ ya ajụjụ na-agbasaghị kpọmkwem ihe ị chọrọ ịmata. Jụọ ya ihe bụ echiche enyi ya n’ihe ahụ. Ọ bụrụ na ọ gwa gị, jụọ ya ndụmọdụ o nwere ike inye enyi ya ahụ.

Gị na ụmụ gị na-eto eto ikwurịta okwu nke ọma abụghị ihe ị na-agaghị emeli. Gbanwee otú gị na ha si ekwurịta okwu, ma ọ bụrụ na ọ dị mkpa. Jụọ ndị nne na nna ha na ụmụ ha na-ekwurịta okwu nke ọma otú o si agaziri ha. (Ilu 11:14) Mgbe gị na nwa gị na-ekwurịta okwu, bụrụ “onye na-anụ ihe ngwa ngwa, onye na-adịghị ekwu okwu ngwa ngwa, onye na-adịghị ewe iwe ngwa ngwa.” (Jems 1:19) Nke kacha nke, akwụsịla mbọ ị na-agba ịzụlite ụmụ gị na-eto eto “n’ọzụzụ na nduzi echiche nke si n’aka Jehova.”—Ndị Efesọs 6:4..

JỤỌ ONWE GỊ, SỊ . . .

  • Olee ihe ndị gbanwerela ná ndụ nwa m kemgbe ọ ghọrọ okorobịa ma ọ bụ agbọghọbịa?

  • Olee ihe ndị m ga-eme ka otú mụ na nwa m si ekwurịta okwu dịkwuo mma?