Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE 2008-05-01

 Ihe Ndị Na-eme Ka E Nwee Obi Ụtọ n’Ezinụlọ

Idozi Nsogbu

Idozi Nsogbu

Di ya jụrụ, sị: “Olee ebe ụmụ anyị nwaanyị gara?”

Nwunye ya azaa, sị: “Ha gara ahịa ịzụrụ uwe ọhụrụ.”

Di ya asị: [N’iwe na n’oké olu] “Ị̀ sịrị gịnị, ‘na ha gara ịzụrụ uwe ọhụrụ’? Ha ka zụrụ uwe n’ọnwa gara aga!”

Nwunye ya asị: [N’iwe, iji zọrọ onwe ya ma gosi na ọ chọghị ụta a na-ata ya] “E nwere ebe a na-egbu ihe ná ntụ. Ha bukwa ụzọ gwa m, mụ asị ha gawa.”

Di ya asị: [O jidelighị mmụọ ya, ya abawa mba] “Ị ma na anaghị m achọ ka ụmụ anyị nwaanyị na-azụ ihe n’agwaghị m agwa! Gịnị mere i ji kpebie ngwa ngwa n’agwaghị m?”

OLEE nsogbu ndị i chere di na nwunye a kwesịrị idozi? O doro anya na di ahụ anaghị ejideli mmụọ ya. Ma, e wezụga nke ahụ, o yiri ka ha enweghị otu olu n’ihe ha ga na-ahapụ ụmụ ha ka ha na-eme. O yikwara ka ha anaghị ekwurịta okwu nke ọma.

Ọ dịghị alụmdi na nwunye zuru okè. Ọ dịghị di na nwunye na-anaghị enwetụ nsogbu. Ma ọ̀ bụ nnukwu nsogbu ma ọ̀ bụ obere nsogbu, ọ dị mkpa ka di na nwunye mụta otú ha ga-esi na-edozi ya. N’ihi gịnị?

N’ihi na ka oge na-aga, nsogbu a na-edozighị edozi nwere ike ime ka ha ghara ịdị na-ekwurịta okwu nke ọma. Eze Sọlọmọn bụ́ onye amamihe kwuru, sị: ‘E nwere esemokwu ndị dị ka ihe ntụchi ụlọ elu.’ (Ilu 18:19) Olee ihe i nwere ike ime ka unu wee na-ekwurịta okwu nke ọma mgbe unu nwere nsogbu?

Otú ahụ nkwurịta okwu si dị mkpa n’alụmdi na nwunye, ka ịhụnanya na nsọpụrụ dịkwa mkpa. (Ndị Efesọs 5:33) Mgbe a na-edozi nsogbu, ịhụnanya ga-akpali di na nwunye ileghara ihe ndị gara aga anya, ya bụ, ihe ndị e mere gị n’oge gara aga na mwute ha kpataara gị, ma lekwasị anya n’otú ha ga-esi dozie nsogbu ka dapụtaara ha. (1 Ndị Kọrịnt 13:4, 5; 1 Pita 4:8) Di na nwunye ndị na-akwanyere ibe ha ùgwù na-ekwe ka ibe ha kwuo ihe dị ha n’obi, ha na-agbalịkwa ịghọta ihe ha na-ekwu.

Ihe Anọ A Ga-eme Iji Dozie Nsogbu

Tụlee ihe anọ e dere n’ebe a, chọpụtakwa otú ihe ndị e dere na Baịbụl nwere ike isi nyere gị aka ka i jiri ịhụnanya na nkwanye ùgwù na-edozi nsogbu.

1. Wepụtanụ oge unu ga-eji kwurịta nsogbu unu nwere.

“E nwere oge a kara aka maka ihe ọ bụla, . . . oge ịgbachi nkịtị na oge ikwu okwu.” (Ekliziastis 3:1, 7) Dị ka e gosiri n’esemokwu  ahụ e kwuru banyere ya n’elu, nsogbu ụfọdụ nwere ike ịkpasu mmadụ iwe. Mgbe nke ahụ mere, jide mmụọ gị, hapụgodị okwu ahụ, ‘gbachi nkịtị,’ tupu iwe ewee gị. I nwere ike ime ka unu na-adị ná mma ma ọ bụrụ na i rube isi na ndụmọdụ a dị na Baịbụl, nke sịrị: “Mmalite esemokwu dị ka mmadụ imeghere mmiri ụzọ; ya mere, tupu esemokwu amalite, si n’ebe ahụ pụọ.”—Ilu 17:14.

Ma, e nwekwara “oge ikwu okwu.” Nsogbu dị ka ahịhịa, ọ na-eto ma e leghara ya anya. N’ihi ya, elegharala nsogbu ahụ anya, wee chee na ọ ga-akwụsị n’onwe ya. Ọ bụrụ na ị gwa di gị ma ọ bụ nwunye gị ka unu kwụsịgodị ihe unu na-ekwu banyere nsogbu ahụ, gosi na ị na-akwanyere ya ùgwù site n’ikwu mgbe na-adịghị anya unu ga-ekwurịta ya. Ikwu mgbe ọzọ unu ga-ekwurịta ya, ga-enyere unu aka itinye ndụmọdụ dị na Baịbụl n’ọrụ, nke bụ́: “Unu anọkwala na-ewe iwe ruo mgbe anyanwụ dara.” (Ndị Efesọs 4:26) I kwesịrị ime ihe i kwuru.

LEE MA Ị̀ GA-EME IHE A: Wepụtanụ oge unu ga na-ekwurịta nsogbu ezinụlọ unu kwa izu. Ọ bụrụ na ị chọpụta na o nwere mgbe ahụ́ na-agbakasịkarị gị n’ụbọchị, dị ka ihe atụ, mgbe ị ka si ọrụ lọta ma ọ bụ tupu i rie nri, unu ekwurịtala nsogbu unu mgbe ahụ. Kama, họrọnụ oge obi nwere ike ịdị unu abụọ mma.

2. Jiri nkwanye ùgwù kwuo otú ọ dị gị n’obi.

“Ka onye ọ bụla n’ime unu na-agwa onye agbata obi ya eziokwu.” (Ndị Efesọs 4:25) Ọ bụrụ na ị lụrụ di ma ọ bụ nwunye, onye agbata obi gị nke kacha nọrọ gị nso bụ di gị ma ọ bụ nwunye gị. Ya mere, mgbe ị na-agwa di gị ma ọ bụ nwunye gị okwu, kwuo otú ọ dị gị n’obi, kpọọkwa okwu aha. Margareta, * onye lụrụ di kemgbe afọ iri abụọ na isii, sịrị: “Mgbe m lụrụ di ọhụrụ, m chere na di m ga-ama otú obi na-adị m mgbe anyị nwere nsogbu. Achọpụtara m na ọ bụghị otú ahụ ka ọ dị. Ugbu a, m na-agbalị ikwu ihe bụ́ uche m na otú obi dị m n’ụzọ doro anya.”

Cheta, ihe mere unu ji ekwurịta nsogbu unu, ọ bụghị iji merie onye iro gị, kama, ọ bụ iji mee ka di gị ma ọ bụ nwunye gị mara ihe bụ́ uche gị. Iji kwurịta nsogbu unu nke ọma, kwuo ihe i chere kpatara ya, kwuo mgbe unu na-eji enwekarị ya, kwuokwa otú obi na-adị gị mgbe unu nwere ya. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na iwe were gị maka na di gị ma ọ bụ nwunye gị edebeghị ụlọ ọcha, i nwere ike iji nkwanye ùgwù kwuo, sị, ‘Mgbe ị lọtara ọrụ wụsa uwe gị n’ala [ya bụ, mgbe nsogbu ahụ malitere na ihe kpatara ya], ọ na-adị m ka i nweghị obi ekele maka mbọ m na-agba ime ka ụlọ anyị na-adị ọcha [ya bụ, otú obi dị gị].’ Mgbe ahụ, jiri akọ kwuo ihe i chere ga-eme ka nsogbu ahụ kwụsị.

LEE MA Ị̀ GA-EME IHE A: Iji mee ka ihe ị chọrọ ịgwa di gị ma ọ bụ nwunye gị doo gị anya, buru ụzọ dee ihe kpatara nsogbu ahụ n’akwụkwọ na otú ị chọrọ ka unu si dozie ya.

3. Gee di gị ma ọ bụ nwunye gị ntị ma ghọta otú obi dị ya.

Jems onye na-eso ụzọ Jizọs dere na Ndị Kraịst kwesịrị ịbụ ndị ‘na-anụ ihe ngwa ngwa, ndị na-adịghị ekwu okwu ngwa ngwa, ndị na-adịghị ewe iwe ngwa ngwa.’ (Jems 1:19) O nweghị ihe na-akpata esemokwu n’alụmdi na nwunye ka mgbe di ma ọ bụ nwunye chere na di ya ma ọ bụ nwunye ya anaghị aghọta otú obi dị ya mgbe ha nwere nsogbu. N’ihi ya, gbalịa ka ị ghara ime ihe ga-eme ka di gị ma ọ bụ nwunye gị chewe otú ahụ!—Matiu 7:12.

Wolfgang, onye lụrụ nwunye kemgbe afọ iri atọ na ise, sịrị: “Mgbe anyị na-ekwurịta nsogbu anyị nwere, obi na-ajọ m njọ, karịchaa mgbe ọ dị m ka nwunye m anaghị aghọta echiche m.” Dianna, onye lụrụ di kemgbe afọ iri abụọ, sịrị: “M na-agwa di m mgbe mgbe na ọ naghị ege m ntị nke ọma mgbe anyị na-ekwurịta nsogbu anyị.” Olee otú ị ga-esi merie nsogbu a?

Echela na ị ma ihe di gị ma ọ bụ nwunye gị na-eche ma ọ bụ na ị ma otú obi dị ya.  Okwu Chineke sịrị: “Site n’ịdị mpako, naanị ihe mmadụ na-akpata bụ ọgụ, ma ndị na-agba izu na-enwe amamihe.” (Ilu 13:10) Kwanyere di gị ma ọ bụ nwunye gị ùgwù site n’ikwe ka o kwuo ihe bụ́ uche ya, n’anapụghị ya okwu n’ọnụ. Iji gosi na ị ghọtara ihe di gị ma ọ bụ nwunye gị kwuru, kwughachi ihe o kwuru, ọ bụghị iji kwaa ya emo, ejikwala iwe ekwu ya. Kwere ka di gị ma ọ bụ nwunye gị gwa gị ihe o kwuru ma ọ bụrụ na i kwutechaghị ya. Ekwula ihe niile naanị gị. Otu onye kwuo, ya echere ka ibe ya kwuo, ruo mgbe onye nke ọ bụla n’ime unu ghọtara ihe ibe ya kwuru, ghọtakwa otú ọ dị ya n’obi.

N’eziokwu, ige di gị ma ọ bụ nwunye gị ntị nke ọma na ịnabata echiche ya chọrọ ịdị umeala n’obi na inwe ndidi. Ọ bụrụ na i bute ụzọ n’ịkwanyere di gị ma ọ bụ nwunye gị ùgwù, ọ ga-eme ka ọ na-akwanyere gị ùgwù.—Matiu 7:2; Ndị Rom 12:10.

LEE MA Ị̀ GA-EME IHE A: Mgbe ị na-ekwughachi ihe di gị ma ọ bụ nwunye gị kwuru, ekwula ya kpọmkwem otú ahụ o si kwuo ya. Gbalịa jiri obiọma kwuo ihe ị ghọtara o kwuru na otú ọ dị ya n’obi.—1 Pita 3:8.

4. Kwekọrịtanụ ihe unu ga-eme.

“Abụọ dị mma karịa otu, n’ihi na ha nwere ezi ụgwọ ọrụ maka ịrụsi ọrụ ike ha. N’ihi na ọ bụrụ na otu n’ime ha adaa, onye nke ọzọ pụrụ ikulite ibe ya.” (Ekliziastis 4:9, 10) O siri ike di na nwunye idozi nsogbu ha ọ̀ gwụla ma ha jikọtara aka ọnụ ma na-akwado ibe ha.

N’eziokwu, Jehova nyere di ikike ịbụ onyeisi ezinụlọ. (1 Ndị Kọrịnt 11:3; Ndị Efesọs 5:23) Ma, ịbụ onyeisi apụtaghị ịbụ onye ọchịchị aka ike. Di nke nwere amamihe agaghị eme mkpebi n’atụleghị ihe bụ́ uche nwunye ya. David, onye lụrụ nwunye kemgbe afọ iri abụọ, sịrị: “Ana m agbalị ịhụ ebe mụ na nwunye m ga-enwe otu olu, m na-ekpebikwa ihe anyị abụọ kwadoro.” Tanya, onye lụrụ di kemgbe afọ asaa, sịrị: “Ihe dị mkpa abụghị ịmata onye meziri emezi na onye mejọrọnụ. Mgbe ụfọdụ, otú di chere a ga-esi dozie nsogbu na-adị iche n’otú nwunye chere a ga-esi dozie ya. Achọpụtala m na isi ihe na-eme ka ihe na-agazi agazi bụ inwe ezi uche na ịghara ịgba isi akwara.”

LEE MA Ị̀ GA-EME IHE A: Gosinụ na unu na-emekọ ihe ọnụ site n’ijikọ aka ọnụ dee ihe ndị unu chere unu nwere ike ime iji dozie nsogbu unu. Mgbe unu dechara ihe ndị unu chetara, tụleenụ ndị unu dere ede, sinụ na ha mee ihe unu abụọ kwekọrịtara. Họrọnụ oge na-adịghị anya mgbe unu ga-atụle ma ùnu mekwara ihe unu kpebiri, ma ọ̀ gakwara nke ọma.

Na-emekọnụ Ihe Ọnụ, Unu Akpala Iche Iche

Jizọs ji alụmdi na nwunye tụnyere yok. (Matiu 19:6) N’oge ọ nọ n’ụwa, yok bụ okporo osisi e ji ekekọta anụmanụ abụọ ka ha nwee ike ịrụ ọrụ. Ọ bụrụ na anụmanụ ndị ahụ arụkọghị ọrụ ọnụ, e nweghị ezigbo ihe ha ga-arụta, yok ahụ ga-emerụkwa ha ahụ́ n’olu. Ọ bụrụ na ha arụkọọ ọrụ ọnụ, ha ga-enwe ike ibu ibu dị arọ ma ọ bụ ịkọ ugbo.

N’otu aka ahụ, ọ bụrụ na di na nwunye anaghị arụkọ ọrụ ọnụ, nsogbu ga na-adị n’alụmdi na nwunye ha. Ma, ọ bụrụ na ha na-arụkọ ọrụ ọnụ, ha ga-enwe ike idozi nsogbu ha niile, nweekwa ike ịrụpụta ezigbo ihe. Otu nwoke nke nwere obi ụtọ n’alụmdi na nwunye ya, onye aha ya bụ Kalala, kwuru, sị: “Kemgbe afọ iri abụọ na ise, mụ na nwunye m anọwo na-edozi nsogbu anyị site n’ikwu otú ọ dị anyị n’obi, site n’ịghọta otú ọ dị ibe anyị n’obi, site n’ịrịọ Jehova ka o nyere anyị aka, sitekwa n’ime ihe Baịbụl kwuru.” Ị̀ ga-emeli otú ahụ?

JỤỌ ONWE GỊ, SỊ . . .

  • Olee nsogbu m kacha chọọ ka mụ na di m ma ọ bụ nwunye m kwurịta?

  • Olee ihe m ga-eme iji hụ na m ghọtara ihe di m ma ọ bụ nwunye m na-ekwu banyere nsogbu a?

  • Ọ bụrụ na m na-esikarị ọnwụ ka e mee ihe m chọrọ, olee nsogbu ndị m nwere ike ịkpata?

^ para. 17 A gbanwere aha ụfọdụ.