Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE 2008-02-01

 Ihe Ndị Na-eme Ka E Nwee Obi Ụtọ n’Ezinụlọ

Otú E Si Edozi Esemokwu

Otú E Si Edozi Esemokwu

Di ya sịrị: “Mgbe mụ na Sarah * lụrụ, anyị binyeere ezinụlọ m n’ụlọ nne m na nna m. Otu ụbọchị, onye nwanne m nwoke chọrọ ịlụ rịọrọ m ka m jiri ụgbọala anyị bulaa ya. M kwetara, m wee buru ya na nwa m nwoke ka dị obere. Ma, mgbe m lọtara, iwe ji Sarah. Mụ na ya sewere okwu, ya anọrọ n’ihu ndị ezinụlọ m kwuo na m na-achụ nwaanyị. Iwe were m, m malitere ikwu ihe ndị mere ka iwe ya dịkwuo ọkụ.”

Nwunye ya sịrị: “N’oge ahụ, nwa anyị nwoke na-arịasi ọrịa ike, ego adịghịkwa anyị n’aka. Ya mere, mgbe Fernando buuru onye nwanne ya nwoke chọrọ ịlụ na nwa anyị nwoke pụwa, e nwere ọtụtụ ihe were m iwe. Mgbe ọ lọtara, emere m ka ọ mara otú obi dị m. Anyị sere ezigbo okwu, o nweghịkwa ihe anyị na-agwafọghị ibe anyị. O wutere m nke ukwuu mgbe e mechara.”

Ọ BỤRỤ na di na nwunye esee okwu, ọ̀ pụtara na ha ahụzighị onwe ha n’anya? Ee e! Fernando na Sarah, bụ́ ndị kwuru ihe ndị a dị n’elu, hụrụ onwe ha n’anya nke ukwuu. Ọbụna di na nwunye ndị kacha ebi n’udo na-ese okwu mgbe ụfọdụ.

Gịnị mere di na nwunye ji ese okwu? Gịnị ka i nwere ike ime ka esemokwu ghara imebiri gị alụmdi na nwunye gị? Ebe ọ bụ Chineke hiwere alụmdi na nwunye, anyị kwesịrị inyocha Okwu ya, bụ́ Baịbụl, mara ihe o kwuru banyere nke a.—Jenesis 2:21, 22; 2 Timoti 3:16, 17.

Ịghọta Ihe Ndị Na-akpata Nsogbu

Ọtụtụ di na nwunye chọrọ iji ịhụnanya na obiọma na-emeso ibe ha ihe. Ma, Baịbụl kwuru eziokwu mgbe ọ sịrị na “mmadụ niile emehiewo, ha adịghịkwa eru ebube Chineke.” (Ndị Rom 3:23) Ya mere, mgbe ha nwere nghọtahie, o nwere ike isiri ha ike ijide mmụọ ha. Ọ bụrụkwa na ha amalite ise okwu, o nwere ike isiri ụfọdụ n’ime ha ike nke ukwuu ijide onwe ha ka ha ghara ịkpa àgwà na-adịghị mma, dị ka ịba mba na ikwu okwu mkparị. (Ndị Rom 7:21; Ndị Efesọs 4:31) Olee ihe ndị ọzọ nwere ike ịkpata nsogbu?

Ọtụtụ mgbe, otú di si ekwu ihe dị ya n’obi na-adị iche n’otú nwunye ya si ekwu nke ya. Michiko kwuru, sị: “Mgbe anyị lụrụ ọhụrụ, m chọpụtara na otú di m si ekwu ihe dị ya n’obi dị nnọọ iche n’otú m si ekwu nke m. Ọ na-adị m mma ikwu ihe mere ihe ji mee na otú o si mee, ọ bụghị naanị ikwu ihe merenụ. O yiri ka ihe di m na-achọ ịnụ bụ naanị ihe mechara mee.”

Ọ bụghị naanị Michiko nwere ụdị nsogbu a. N’ọtụtụ alụmdi na nwunye, otu onye nwere ike ịchọ ka ya na di ya ma ọ bụ nwunye ya kwuchaa ihe niile kpatara esemokwu, ma, onye nke ọzọ anaghị achọ ịkpa isiokwu, ọ na-akara ya mma ka a ghara ikwuwe ihe merela eme. Mgbe ụfọdụ, ọ bụrụ na otu onye achọọ ka e kwuwe ihe ahụ merenụ, onye nke ọzọ ana-agbalị ka ha ghara ikwu ya. Ị̀ chọpụtawo ma nke a ọ̀ na-eme n’alụmdi na nwunye gị? Ò yiri ka otu onye  n’ime unu ọ̀ na-achọ ka e kwuruo ihe niile merenụ n’isi mgbe niile, ma, onye nke ọzọ ana-achọ ka a hapụ ikwu ya?

Ihe ọzọ e kwesịrị ilebara anya bụ na otú ezinụlọ mmadụ si zụlite ya nwere ike imetụta otú ọ ga-achọ ka ya na di ya ma ọ bụ nwunye ya si na-akparịta ụka. Justin, bụ́ onye lụrụ nwunye kemgbe afọ ise, sịrị: “Esi m n’ezinụlọ na-anaghị ekwu ọtụtụ okwu, ọ na-esikwara m ike ịgwa ndị ọzọ ihe dị m n’obi. Nke a na-ewute nwunye m. Ezinụlọ a mụrụ ya nwere nkwuwa okwu, ọ naghịkwa esiri ya ike ịgwa m ihe dị ya n’obi.”

Gịnị Mere Unu Ga-eji Gbalịa Na-edozi Nsogbu Unu?

Ndị mụrụ banyere alụmdi na nwunye achọpụtawo na ihe e ji ama di na nwunye nwere obi ụtọ abụghị ugboro ole ha na-asị ibe ha ‘ahụrụ m gị n’anya.’ Ọ bụghịkwa inwe mmekọahụ mgbe niile ma ọ bụ inwe ego. Kama nke ahụ, ihe e ji ama di na nwunye nwere obi ụtọ bụ otú di na nwunye si edozi esemokwu ha.

Jizọs kwukwara na mgbe nwoke na nwaanyị lụrụ, ọ bụ Chineke jikọtara ha, ọ bụghị mmadụ. (Matiu 19:4-6) Ya mere, ezi alụmdi na nwunye na-enye Chineke otuto. Ma, ọ bụrụ na di anaghị egosi nwunye ya ịhụnanya, ọ bụrụkwa na ọ naghị elezi ya anya, Jehova bụ́ Chineke agaghị anụ ekpere di ahụ. (1 Pita 3:7) Ọ bụrụ na nwunye anaghị asọpụrụ di ya, ọ bụ Jehova ka ọ na-akparị, n’ihi na ọ bụ Jehova mere di ya onyeisi ezinụlọ.—1 Ndị Kọrịnt 11:3.

Ihe Ndị Na-eme Ka Di na Nwunye Nwee Obi Ụtọ—Ekwula Okwu Na-akpasu Iwe

N’agbanyeghị otú i si ekwupụta ihe dị gị n’obi ma ọ bụ otú ezinụlọ gị si zụlite gị, e nwere ụdị okwu ị na-aghaghị izere ma ọ bụrụ na ị chọrọ ime ihe Baịbụl kwuru na idozi esemokwu nke ọma. Jụọ onwe gị ajụjụ ndị a:

‘M̀ na-agbalị ka m ghara ịgwagwara okwu ọjọọ a gwara m?’

Otu ilu onye maara ihe tụrụ sịrị: “Ọ bụ ịpịsi aka ike n’imi na-akpata ọzọimi, ọ bụkwa iwe iwe na-akpata esemokwu.” (Ilu 30:33) Olee ihe nke a pụtara? Chebara ihe atụ a echiche. Di na nwunye nke na-ekwurịta otú ha ga-esi na-emefu ego (“anyị kwesịrị iselata aka n’ihe anyị na-azụ”) nwere ike hapụ ihe ha na-ekwu gwawazie ibe ha okwu ọjọọ (“ị na-emefukarị ego”). N’ezie, di gị ma ọ bụ nwunye gị nwere ike ‘ịpịsi gị aka ike n’imi’ ma ọ bụrụ na ọ hapụ ihe unu na-ekwu gwawazie gị okwu ọjọọ, i nwekwara ike ịchọ ka ‘ị pịgwara’ ya. Ma, ịgwagwara ya ihe ọ gwara gị ga-eduga naanị n’iwe, meekwa ka esemokwu ka njọ.

Onye so dee Baịbụl bụ́ Jems dọrọ aka ná ntị, sị: “Lee ntakịrị ọkụ ọ na-ewe iji suo oké ọhịa ọkụ! Ire bụ ọkụ.” (Jems 3:5, 6) Ọ bụrụ na di na nwunye achịkwaghị ire ha, obere nghọtahie nwere ike ịghọ esemokwu kpụ ọkụ n’ọnụ. Ịhụnanya anaghịkwa adịgide n’alụmdi na nwunye ọ bụla nke a na-enwekarị ụdị esemokwu ahụ na-enye nsogbu n’obi.

Kama ịgwagwara ihe a gwara gị, ọ́ gaghị adị mma ka i ṅomie Jizọs bụ́ onye ‘na-ekwujọgwaraghị mgbe a na-ekwujọ ya’? (1 Pita 2:23) Ihe kacha mfe ị ga-eme ka esemokwu dajụọ bụ ikweta na ihe di gị ma ọ bụ nwunye gị na-ekwu bụ eziokwu ma rịọ ya arịrịọ maka ihe i mejọrọ.

LEE MA Ị̀ GA-EME IHE A: Mgbe ọ bụla ọzọ unu sere okwu, jụọ onwe gị, sị: ‘Ò nwere ihe ga-emebi ma m̀ kweta ihe di m ma ọ bụ nwunye m kwuru? Olee ihe m mere nke so kpata esemokwu a? Olee ihe mere m na-agaghị arịọ di m ma ọ bụ nwunye m arịrịọ maka ihe m mejọrọ?’

‘M̀ na-eleghara echiche di m ma ọ bụ nwunye m anya?’

Okwu Chineke nyere anyị iwu, sị: “Unu niile, nweenụ otu obi, ka ihe banyere onye ọzọ na-emetụ unu n’obi.” (1 Pita 3:8) Tụlee ihe abụọ nwere ike ime ka ị ghara itinye ndụmọdụ a n’ọrụ. Nke mbụ bụ na o nwere ike ị ghọtaghị ihe di gị ma ọ bụ nwunye gị bu n’obi ma ọ bụ ihe ọ na-eche. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na ihe na-echegbu di gị ma ọ bụ nwunye gị anaghị enyecha gị nsogbu, i nwere ike ịsị, “Obere ihe na-enyekarị gị nsogbu.” Ihe i bu n’obi nwere ike ịbụ ka di gị ma ọ bụ nwunye gị  ghara inyewe onwe ya nsogbu gabiga ókè. Ma, ọ bụ mmadụ ole na ole ka ụdị okwu a nwere ike ịkasi obi. Ọ dị ma ndị di ma ndị nwunye mkpa ịmara na ndị ha hụrụ n’anya ghọtara ha nakwa na ihe banyere ha na-emetụ ha n’obi.

Onwe mmadụ iju ya afọ gabiga ókè nwere ike ime ka ọ na-eleghara echiche di ya ma ọ bụ nwunye ya anya. Onye dị mpako na-achọkarị ibuli onwe ya elu site n’iweda ndị ọzọ ala mgbe niile. Otú o nwere ike isi na-eme nke a bụ ịkọ ndị ọzọ ọnụ ma ọ bụ na-akpọ ha ihe masịrị ya. Tụlee banyere ndị Farisii na ndị odeakwụkwọ ndị dịrị ndụ n’oge Jizọs nọ n’ụwa. Ọ bụrụ na onye ọ bụla, ọbụna ndị Farisii ibe ha, ekwuo ihe dị iche n’ihe ndị ahụ dị mpako chere, ihe ha na-eme bụ ịkọ onye ahụ ọnụ na ịkparị ya. (Jọn 7:45-52) Jizọs emeghị otú ahụ. Mgbe ndị mmadụ gwara ya otú ọ dị ha n’obi, ọ na-emetụ ya n’obi.—Matiu 20:29-34; Mak 5:25-34.

Chee echiche ihe ị na-eme mgbe di gị ma ọ bụ nwunye gị gwara gị ihe na-enye ya nsogbu n’obi. Okwu gị, ụda olu gị, na ihu gị, hà na-egosi na ihe na-enye ya nsogbu na-emetụ gị n’obi? Ka ihe ị na-eme ọ̀ bụ igosi ngwa ngwa na ihe ọ na-ekwu adịghị mkpa?

LEE MA Ị̀ GA-EME IHE A: N’izu ndị na-abịa abịa, leba anya n’otú i si agwa di gị ma ọ bụ nwunye gị okwu. Ọ bụrụ na o nwee mgbe i gosiri na ihe di gị ma ọ bụ nwunye gị kwuru abaghị uru ma ọ bụ kwuo okwu wedara ya ala, rịọ ya arịrịọ ozugbo.

‘M̀ na-echekarị na di m ma ọ bụ nwunye m na-achọ naanị ọdịmma nke onwe ya?’

“Ọ̀ bụ n’efu ka Job na-atụ egwu Chineke? Ọ̀ bụ na ị gbaghị ya ogige gburugburu, gbaakwa ụlọ ya na ihe niile o nwere ogige gburugburu?” (Job 1:9, 10) Ihe Setan kwuru bụ na ofufe nwoke ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, bụ́ Job, na-efe Chineke esighị ya n’obi.

Ọ bụrụ na di ma ọ bụ nwunye elezighị anya, o nwere ike ịgwa nwunye ya ma ọ bụ di ya ụdị okwu ahụ. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na di gị ma ọ bụ nwunye gị emeere gị ihe ọma, ị̀ na-amalite iche na ọ ga-enwe ihe dị ya mkpa mere o ji mee ya ma ọ bụ na o nwere ihe ọ na-ezochiri gị? Ọ bụrụ na o mehie ihe, ị̀ na-ewere ya na nke ahụ na-egosi na ọ na-achọ ọdịmma onwe ya naanị ma ọ bụ na ọ hụghị gị n’anya? Ị̀ na-echeta ozugbo ihe ndị na-adịghị mma o mere n’oge gara aga ma gụnye ya n’ebe ị gụnyere ibe ya?

LEE MA Ị̀ GA-EME IHE A: Dee ihe ọma di gị ma ọ bụ nwunye gị meere gị na ihe dị mma kpaliri ya ime ha.

Pọl onyeozi dere, sị: ‘Ịhụnanya adịghị agụkọ ihe ọjọọ.’ (1 Ndị Kọrịnt 13:4, 5) Ezi ịhụnanya ekpughị ìsì. Ma, ọ naghịkwa agụkọ ihe ọjọọ. Pọl kwuru na ịhụnanya “na-ekwere ihe niile.” (1 Ndị Kọrịnt 13:7) Nke a apụtaghị na ịhụnanya a na-ekweta ihe niile a gwara ya, kama, ọ na-atụkwasị mmadụ obi. Ọ naghị enyo mmadụ enyo. Ụdị ịhụnanya Baịbụl chọrọ ka anyị nwee na-adị njikere ịgbaghara ndị ọzọ, ọ na-enwekwa obi ike na ndị ọzọ ebughị ihe ọjọọ n’obi. (Abụ Ọma 86:5; Efesọs 4:32) Ọ bụrụ na di na nwunye na-egosi ibe ha ụdị ịhụnanya a, ha ga-enwe obi ụtọ n’alụmdi na nwunye ha.

JỤỌ ONWE GỊ, SỊ . . .

  • Gịnị ka di na nwunye ahụ e kwuru okwu ha ná mmalite isiokwu a na-emetaghị?

  • Olee otú m nwere ike isi zere ime ụdị ihe ahụ n’alụmdi na nwunye m?

  • Olee ihe e kwuru n’isiokwu a nke m kwesịrị ịrụ ọrụ na ya?

^ para. 3 A gbanwere aha ha.